Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Nke 2 n'Afọ 2016

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A

Gịnị Mere Jizọs Ji Taa Ahụhụ ma Nwụọ?

Gịnị Mere Jizọs Ji Taa Ahụhụ ma Nwụọ?

“Mmehie si n’aka otu mmadụ [ya bụ, Adam] bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata.”—Ndị Rom 5:12

Ọ bụrụ na mmadụ ajụọ gị ma ị̀ ga-achọ ịdị ndụ ebighị ebi, gịnị ka ị ga-aza? Ọtụtụ ndị ga-asị na ha ga-achọ, mana, ha echeghị na ọ ga-ekwe omume. Ha ga-asịkwa na onye ọ bụla dị ndụ ga-anwụrịrị otu ụbọchị.

Ma ọ bụrụkwanụ na a jụọ gị ma ị̀ chọrọ ịnwụ, gịnị ka ị ga-aza? Ọtụtụ ndị ga-asị mba. Gịnịdị ka anyị na-ekwu? Anyị na-achọ ịdịrị ndụ na-aga n’agbanyeghị ọtụtụ nsogbu ndị na-abịara anyị. Baịbụl kwuru ihe gosiri na Chineke kere anyị ka ịdị ndụ na-agụ anyị agụụ. O kwudịrị na “o tinyewo ọbụna mgbe ebighị ebi n’obi [anyị].”—Ekliziastis 3:11.

Ma, ụmụ mmadụ anaghị adị ndụ ebighị ebi taa. Gịnị meziri? Ò nweela ihe Chineke mere iji napụta anyị? Anyị mata ihe Baịbụl kwuru gbasara ajụjụ ndị a, obi ga-adị anyị ụtọ, anyị ga-amatakwa ihe mere Jizọs ji taa ahụhụ ma nwụọ.

GỊNỊ MERE NA ANYỊ ANAGHỊ ADỊ NDỤ EBIGHỊ EBI?

Jenesis isi nke mbụ ruo nke atọ gwara anyị na Chineke gwara Adam na Iv ihe ha ga-eme iji dịrị ndụ ebighị ebi. Ebe ahụ kọkwara otú ha si nupụrụ Chineke isi nke mere ka ha gharazie ịdị ndụ ebighị ebi. Otú e si kọọ akụkọ a dị nnọọ mfe nghọta nke na ụfọdụ ndị na-asị na ọ bụ akụkọ ifo. Ma, ị gụọ akwụkwọ Jenesis, ị ga-ahụ na ọ kọrọ ihe ndị mere eme otú ahụ Matiu, Mak, Luk na Jọn si kọọ ihe mere eme. *

Gịnị ka nnupụisi Adam kpatara? Baịbụl kwuru, sị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ [ya bụ, Adam] bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere.” (Ndị Rom 5:12) Adam ghọrọ onye mmehie mgbe o nupụụrụ Chineke isi. Ọ bụ ya mere na ọ dịghịzi ndụ ebighị ebi. Ebe anyị bụ ụmụ ya, anyị ketakwara mmehie ya. Ọ bụ ya mere anyị ji arịa ọrịa, na-aka nká ma na-anwụkwa anwụ. Otú a anyị si keta mmehie n’aka Adam dabara n’ihe ndị sayensị chọpụtara gbasara otú ụmụ si eyi ndị mụrụ ha. Ma, ò nweela ihe Chineke mere iji napụta anyị?

 IHE CHINEKE MERELA IJI NAPỤTA ANYỊ

N’eziokwu, Chineke emeela ndokwa ka ụmụ Adam nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi nke Adam na-adịlighị n’ihi nnupụisi ya. Olee otú Chineke si mee ya?

Baịbụl kwuru ná Ndị Rom 6:23 na “ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ọnwụ.” Ọ pụtara na onye mehierenụ ga-anwụ. Adam nwụrụ n’ihi na o mehiere. Anyịnwa na-anwụkwa anwụ n’ihi na anyị na-eme mmehie. Ma, ọ bụghị anyị kpatara ihe mere anyị ji anwụ, kama, anyị ketara mmehie n’aka Adam. N’ihi ya, Chineke gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya zite Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, ka ọ bịa jiri ndụ ya kwụọ ụgwọ mmehie anyị. Olee otú ọ ga-esi eme ya?

Ọnwụ Jizọs mere ka anyị nwee olileanya na anyị ga-adị ndụ ebighị ebi, na-enwe obi ụtọ

Ebe ọ bụ na Adam bụ mmadụ zuru okè tupu ya enupụ isi, mezie ka anyị bụrụ ndị mmehie ma na-anwụ anwụ, onye ga-enweli ike ịnapụta anyị n’aka mmehie na ọnwụ ga-abụ mmadụ zuru okè, nke na-agaghị enupụ isi ruo mgbe ọ nwụrụ. Baịbụl si otú a kọwaa ya: “Ebe ọ bụ na e mere ka ọtụtụ mmadụ ghọọ ndị mmehie site ná nnupụisi nke otu onye ahụ, otú ahụkwa ka a ga-eme ka ọtụtụ mmadụ ghọọ ndị ezi omume site ná nrubeisi nke otu onye ahụ.” (Ndị Rom 5:19) Ọ bụ Jizọs bụ “otu onye ahụ” rubere isi. O si n’eluigwe bịa ghọọ mmadụ zuru okè n’ụwa, * nwụọkwa maka anyị. Ọ bụ ya mere anyị ga-eji nwee ike ịbụ ndị ezi omume n’anya Chineke ma nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi.

IHE MERE JIZỌS JI TAA AHỤHỤ MA NWỤỌ

Ma, gịnị mere Jizọs ji kwesị ịnwụ tupu ya enwee ike ịnapụta anyị? Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile ó nweghị ike ikwu ka ụmụ Adam dịrị ndụ ebighị ebi n’enweghị onye ga-anwụ maka ha? O doro anya na o nwere ikike ime ya. Ma, o mee ya, ihe ọ na-ekwu bụ na iwu ya, bụ́ na ụgwọ ọrụ mmehie bụ ọnwụ, enweghịzi isi. Ma, ọ gaghịnụ eji maka otú ihe si dapụta megharịa iwu a dị ezigbo mkpa. Ọ bụ n’iwu a ka ikpe ziri ezi hiwere isi.—Abụ Ọma 37:28.

Á sị na Chineke ekpeghị ikpe ziri ezi n’okwu a, obi agaaraghị na-esi ụmụ mmadụ ike na ọ ga na-ekpe ikpe ziri ezi n’okwu ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, olee ihe ọ ga-agbakwasị ụkwụ na ya kpebie nwa Adam  nke ruru eru ịdị ndụ ebighị ebi? Ya kwe nkwa, à ga-atụkwasịli ya obi na ọ ga-emezu ya? Ebe ọ bụ na Chineke mere ihe ziri ezi iji gbapụta anyị, obi siri anyị ike na ọ ga na-eme ihe ziri ezi mgbe niile.

Chineke ji àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ mee ka anyị nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi mgbe ụwa ga-aghọ Paradaịs. Legodị ihe a Jizọs kwuru na Jọn 3:16: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” Ihe a Jizọs kwuru pụtara na ọnwụ ya gosiri na Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe niile. Ma, nke ka nke bụ na o gosiri na Chineke hụrụ ụmụ mmadụ n’anya nke ukwuu.

Oleekwanụ ihe mere Jizọs ji taa ezigbo ahụhụ tupu ya anwụọ dị ka Matiu, Mak, Luk na Jọn si kọọ? Otú ahụ Jizọs si die ahụhụ niile ọ tara, rubere Chineke isi ruo mgbe ọ nwụrụ, gosiri na Ekwensu ghara ụgha mgbe ọ sịrị na o nweghị mmadụ ọ bụla ga-erubeliri Chineke isi ma ọ na-ata ahụhụ. (Job 2:4, 5) E nwere ike iche na ihe Setan kwuru bụ eziokwu mgbe ahụ o mere ka Adam, bụ́ onye zuru okè, mehie. Ma, Jizọs, bụ́kwa onye zuru okè ka Adam, rubeere Chineke isi n’agbanyeghị ahụhụ ndị ọ tara. (1 Ndị Kọrịnt 15:45) O si otú ahụ gosi na Adam n’onwe ya gakwaara erubere Chineke isi ma á sị na ọ chọrọ. Jizọs diri ahụhụ ndị ọ tara, si otú ahụ kụziere anyị ihe anyị kwesịrị ịna-eme. (1 Pita 2:21) Chineke gọziri Ọkpara ya maka otú o si rubere ya isi. O nyere ya ndụ na-enweghị ọgwụgwụ n’eluigwe.

OTÚ ỌNWỤ JIZỌS GA-ESI ABARA GỊ URU

Jizọs nwụrụ anwụ n’eziokwu. Ọnwụ ya mere ka anyị nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Ị̀ ga-achọ ịdị ndụ ebighị ebi? Jizọs kwuru ihe anyị ga-eme iji dịrị ndụ ebighị ebi. Ọ sịrị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.”—Jọn 17:3.

Ndị bipụtara Ụlọ Nche a dị njikere inyere gị aka ka ị matakwuo Jehova, bụ́ ezi Chineke, na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova nọ́ n’obodo unu ụtọ inyere gị aka ma ị chọọ. Ị ga-ahụkwa ihe ga-enyere gị aka ma ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.jw.org/ig.

^ para. 8 Gụọ Ụlọ Nche Septemba 1, 2009, peeji nke 13. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

^ para. 13 Chineke si n’eluigwe bufee ndụ Ọkpara ya n’afọ Meri, Meri adịrị ime. Mmụọ nsọ Chineke mekwara ka Jizọs ghara ibute mmehie n’aka Meri.—Luk 1:31, 35.