Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE Nke 2 n'Afọ 2016

Ndị Kraịst Hà Kwesịrị Ịna-efe Chineke n’Ebe Ndị E Weere Ka Ebe Nsọ?

Ndị Kraịst Hà Kwesịrị Ịna-efe Chineke n’Ebe Ndị E Weere Ka Ebe Nsọ?

N’AFỌ ọ bụla, ihe karịrị nde mmadụ isii na-aga n’otu oké ọhịa osisi sida juru, nke dị́ n’obodo a na-akpọ Shima Peninsula na Japan. Ndị okpukpe Shinto rụụrụ chi ha ụlọ n’ebe ahụ. Chi a bụ chi anyanwụ nke nwaanyị. Aha ya bụ Amaterasu Omikami. O ruola ihe dị ka puku afọ abụọ ndị Shinto fewere chi a. Ọ na-abụ ndị na-efe chi a bịarute, ha ebu ụzọ kwọọ aka ha, saakwa ọnụ ha iji dị ọcha. Ha na-eguzorozi n’ihu ụlọ arụsị ha na-akpọ isiala, na-akụ aka, na-ekpekukwa chi nwaanyị ha ekpere. * Ndị Shinto ewereghị na o nwere ihe o mere ma ndị òtù ha nweekwa okpukpe ọzọ ha na-ekpe. Ụfọdụ ndị na-ekpe okpukpe Buda, na ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst, nakwa ndị na-ekpe okpukpe ndị ọzọ ewereghịkwa na o nwere ihe o mere ma ha gaa n’ihu arụsị ndị Shinto soro ha fee chi ha.

Ọtụtụ okpukpe ndị a ma ama n’ụwa nwere ebe ndị ha weere na ha dị nsọ, * ọtụtụ nde mmadụ na-agakwa ebe ndị ahụ. N’obodo ebe ọtụtụ ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst, e nwere ọtụtụ chọọchị ndị a rụrụ na ebe ndị a kpụrụ ihe dị iche iche sị na e nyefere ha Jizọs, Meri ma ọ bụ ndị nsọ. E nwekwara ndị nke na-arụ chọọchị ha n’ebe ihe ụfọdụ a kọrọ na Baịbụl mere ma ọ bụ n’ebe a sị na a nọ rụọ ọrụ ebube n’oge ndị na-adịbeghị anya ma ọ bụkwanụ n’ebe e dowere ihe ndị a kpụrụ akpụ e ji echeta ndị a sị na ha dị nsọ. Ọtụtụ ndị na-aga n’ebe e weere ka ebe nsọ n’ihi na ha kweere na Chineke ga-aka anụ ekpere ha ma ha nọrọ ebe ahụ kpee ya. Ndị ọzọ na-ewere ya na ịgba mbọ soro gaa ala nsọ na-egosi na ha ejighị okpukpe ha egwu egwu.

Foto ndị gara n’ebe ndị Shinto rụụrụ chi ha ụlọ n’ebe a na-akpọ Ise na Japan, nakwa n’ebe a kpụrụ Meri n’ime ọgba dị́ na Luude dị́ na Frans

Chineke ọ̀ ga-aka anụ ekpere anyị ma anyị kpee ya n’ebe e weere ka ebe nsọ? Ọ̀ na-amasị Chineke ma mmadụ gaa n’obodo a sị na ọ dị nsọ iji fee ya? Ndị Kraịst hà kwesịdịrị ịna-aga efe Chineke n’ebe ndị ahụ? Anyị mata azịza ajụjụ ndị a, ọ ga-enyere anyị aka ịmata ma ọ̀ dị mma ịga fee Chineke n’ebe ndị ahụ, matakwa otú Chineke chọrọ ka anyị si na-efe ya.

FEE CHINEKE “N’IME MMỤỌ NA N’EZIOKWU”

Gịnị ka Jizọs bu n’uche mgbe ọ sịrị na anyị ga-efe Chineke “n’ime mmụọ na n’eziokwu”?

E nwere otu oge Jizọs si n’obodo Sameria na-agafe, kwụsịtụ ka o zuru ike n’olulu mmiri dị́ nso na Saịka. Ka ọ nọ n’ebe ahụ, otu nwaanyị Sameria bịara isere mmiri, Jizọs ebido kpanyewere ya ụka. Ihe Jizọs gwara nwaanyị a ga-enyere anyị aka ịghọta otú Chineke si ewere ịga fee ya n’ebe e weere ka ebe nsọ. Ka ha na-akparịta ụka, nwaanyị ahụ gwara Jizọs otu ihe dị ezigbote iche n’otú ndị Juu si efe Chineke na otú ndị Sameria si efe ya. Ọ sịrị: “Nna nna anyị hà  fere Chineke n’ugwu a; ma unu na-ekwu na ọ bụ na Jeruselem ka ndị mmadụ kwesịrị ịnọ fee Chineke.”—Jọn 4:5-9, 20.

Ugwu nwaanyị ahụ na-ekwu okwu ya bụ Ugwu Gerizim. Ọ dị ihe dị ka kilomita iri ise ma e si ebe ugwu Jeruselem gawa ya. O nwere oge ndị Sameria rụrụ ụlọ nsọ n’ebe ahụ, na-agakwa na ya eme Ememme Ngabiga na ememme ndị ọzọ. Ma, Jizọs esoghị nwaanyị ahụ rụwa ụka gbasara ebe e kwesịrị ịnọ na-efe Chineke. Kama, ọ gwara ya, sị: “Nwaanyị, kwere ihe m na-ekwu, oge awa na-abịa mgbe ọ na-agaghị abụ n’ugwu a ma ọ bụ na Jeruselem ka unu ga-anọ fee Nna m ofufe.” (Jọn 4:21) Ihe a Jizọs kwuru nwere ike ịtụ nwaanyị ahụ n’anya, karịchaa, maka na Jizọs n’onwe ya bụkwa onye Juu. Gịnị ga-eme ka a kwụsị ịna-aga n’ụlọ nsọ Jeruselem efe Chineke?

Jizọs kwukwara, sị: “Oge awa na-abịa, ọ bụkwa ugbu a, mgbe ndị na-efe ezi ofufe ga-efe Nna m n’ime mmụọ na n’eziokwu, n’ihi na, n’ezie, Nna m na-achọ ka ndị dị otú ahụ fee ya ofufe.” (Jọn 4:23) Kemgbe ọtụtụ narị afọ, ndị Juu weere na agadaga ụlọ nsọ ahụ dị́ na Jeruselem ka bụ ebe onye ọ bụla ga na-abịa efe Chineke. Ha na-aga ebe ahụ ugboro atọ n’afọ achụrụ Jehova Chineke ha àjà. (Ọpụpụ 23:14-17) Ma, Jizọs kwuru na ihe ndị a niile ga-akwụsị, nakwa na “ndị na-efe ezi ofufe” ga-efe Chineke “n’ime mmụọ na n’eziokwu.”

Ụlọ nsọ ndị Juu bụ ụlọ a na-ahụ anya, nke nwere ebe ọ dị. Ma, mmụọ na eziokwu abụghị ihe a na-ahụ anya, nke a ga-asị lekwa ebe ha dị. Ihe Jizọs na-ekwu bụ na ezigbo Onye Kraịst agaghị enwe ebe o weere ka ebe nsọ ọ ga-anọ na-efe Chineke, ma ọ̀ bụ n’Ugwu Gerizim, ma ọ bụ n’ụlọ nsọ dị́ na Jeruselem, ma ọ bụkwanụ n’ebe ọ bụla ọzọ.

Jizọs gwakwara nwaanyị Sameria ahụ na “oge awa” a ga-enwe mgbanwe n’otú ha si efe Chineke “na-abịa.” Olee mgbe oge awa ahụ bịara? Ọ bịara mgbe Jizọs ji ndụ ya chụọ àjà nke mere ka otú Iwu Mozis kwuru ka ndị Juu si na-efe Chineke gharazie ịdị ire. (Ndị Rom 10:4) Jizọs kwukwara na ‘oge awa ahụ bụ ugbu a.’ Gịnị mere o ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na yanwa, bụ́ Mesaya ahụ, ebidola ịkpọkọta ndị na-eso ụzọ ya, bụ́ ndị ga-eme ihe ọzọ o kwuru. Jizọs sịrị: “Chineke bụ Mmụọ, ndị na-efe ya ofufe ga-efe ya ofufe n’ime mmụọ na n’eziokwu.” (Jọn 4:24) Oleezi otú anyị ga-esi na-efe Chineke n’ime mmụọ na n’eziokwu?

Mgbe Jizọs kwuru na anyị ga-efe Chineke n’ime mmụọ, ihe ọ na-ekwu bụ na mmụọ nsọ Chineke ga na-eduzi ihe anyị na-eme. Otu ụzọ mmụọ nsọ si eduzi anyị bụ inyere anyị aka ịghọta ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ. (1 Ndị Kọrịnt 2:9-12) Eziokwu Jizọs  na-ekwu okwu ya bụ eziokwu ndị dị na Baịbụl. Ihe ọ pụtara bụ na anyị chọọ ka Chineke nabata ofufe anyị, anyị agaghị efe ya n’ebe e weere ka ebe nsọ, kama, anyị ga-ahụ na anyị na-efe ya otú Baịbụl kwuru, kwekwa ka mmụọ nsọ ya na-eduzi anyị.

OTÚ NDỊ KRAỊST SI ELE EBE NDỊ MMADỤ NA-AKPỌ EBE NSỌ ANYA

Oleezi otú Ndị Kraịst kwesịrị isi na-ele ịga ala nsọ anya? Oleekwa otú ha kwesịrị isi were ife Chineke n’ebe a sị na ọ bụ ebe nsọ? Anyị cheta na Jizọs kwuru na ndị na-efe Chineke ezi ofufe ga-efe ya n’ime mmụọ na n’eziokwu, ọ ga-edo anyị anya na mmadụ ịga ebe ndị ahụ iji fee Nna anyị nke eluigwe abụghị ya ga-eme ka ọ nabata ofufe ya. Ihe ọzọkwa bụ na Baịbụl gwara anyị otú Chineke si ele iji ihe a kpụrụ akpụ efe ya ofufe anya. Baịbụl kwuru, sị: “Gbaaranụ ikpere arụsị ọsọ” nakwa “kpacharanụ anya ka unu ghara ikpere arụsị.” (1 Ndị Kọrịnt 10:14; 1 Jọn 5:21) N’ihi ya, ezigbo Onye Kraịst agaghị anọ n’ebe ọ bụla e weere ka ebe nsọ fee Chineke ma ọ bụ ebe e nwere ihe ndị a kpụrụ akpụ a sị na e ji efe ya.

Ma, ihe a e kwuru apụtaghị na Baịbụl akwadoghị mmadụ inwe ebe o nwere ike ịga kpee ekpere, mụọ ihe ma ọ bụ tụgharịa uche. Ọ dịghị njọ ma Ndị Kraịst na-ezukọ ebe ọ bụla dị́ mma n’anya mụọ gbasara Chineke. Ọ dịghịkwa njọ ide ihe n’ili mmadụ iji na-echeta onye ahụ ma ọ bụ iji gosi na a hụrụ ya n’anya. Ma, anyị ga-eburu n’uche na iwere ebe ndị dị otú ahụ ka ebe nsọ ma ọ bụ ife ihe ndị e dowere na ha ofufe adabaghị chaa chaa n’ihe Jizọs kwuru.

Ihe a na-ekwu bụ na ịga ebe ndị e weere ka ebe nsọ nọrọ kpee ekpere abụghị ya ga-eme ka Chineke nụ ekpere gị. Ọ bụghịkwa ịga n’ebe ndị dị otú ahụ ga-eme ka Chineke hụ gị n’anya ma ọ bụ gọzie gị. Baịbụl gwara anyị na Jehova Chineke, ‘Onyenwe eluigwe na ụwa, adịghị ebi n’ụlọ nsọ ndị e ji aka wuo.’ Ma, nke a apụtaghị na anyị enweghị ike ịbịaru Chineke nso. Anyị nwere ike ikpe ekpere n’ebe ọ bụla anyị nọ, Chineke anụ ya, n’ihi na “ọ nọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.”—Ọrụ Ndịozi 17:24-27.

^ para. 2 Otú ndị Shinto si efe chi ha n’otu ihu arụsị nwere ike ịdị iche n’otú ha si efe ya n’ihu arụsị ọzọ.

^ para. 3 Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Olee Ebe Ndị Mmadụ Weere Ka Ebe Nsọ?

GỤKWUO GBASARA YA

Ànyị Kwesịrị Iji Ihe Oyiyi Efe Chineke?

Ọ̀ ga-ewe Chineke iwe ma anyị jiri ihe oyiyi ma ọ bụ arụsị fee ya?