Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Nke 6 n'Afọ 2017

Otú E Kwesịrị Isi Na-ele Mmejọ Anya

Otú E Kwesịrị Isi Na-ele Mmejọ Anya

E nwere otu di na nwunye aha ha bụ Don na Margaret. * Nwa ha nwaanyị na di ya na ụmụ ha abụọ bịara leta ha. Margaret kpebiri isikọta makaroni na chiiz ka ha niile rie tupu ụmụ ụmụ ya na ndị mụrụ ha alawa. Ụdị nri a na-atọgbu ụmụ ụmụ ya ahụ atọgbu. Ihe Margaret na-arụ tupu ya alaa ezumike nká bụ isi nri. Ọ bụ osi ite ma nke ọ na-eme.

Mgbe ha niile nọdụrụ iri nri, Margaret bubatara efere nri ma dọsa ya n’etiti tebụl. Mgbe o kpughere ya, ya eju ya anya na ihe dị n’efere ahụ bụ naanị chiiz o siiri esi. Margaret echefuola itinye makaroni bụ́ isi ihe o kwesịrị iji sie nri ahụ.

N’agbanyeghị afọ ole anyị dị ma ọ bụ otú anyị maruru ihe, anyị niile na-emejọ ihe. O nwere ike ịbụ ikwu okwu na-echeghị ya eche ma ọ bụ ime ihe mgbe anyị na-ekwesịghị ime ya ma ọ bụkwanụ na anyị leghaara ihe anya ma ọ bụ chefuo ya. Gịnị mere anyị ji emejọ ihe? Olee ihe ga-enyere anyị aka ma anyị mejọọ ihe? Ò nwere otú anyị ga-esi ghara ịna-emejọ ihe chaa chaa? Ile mmejọ anya otú kwesịrị ekwesị ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ ndị a.

OTÚ ANYỊ SI ELE MMEJỌ ANYA NA OTÚ CHINEKE SI ELE YA

Obi na-adị anyị ezigbo ụtọ ma mmadụ kelee anyị maka ihe anyị mere nke ọma. Ọ bụrụ na anyị emejọọ ihe, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ikweta na anyị mejọrọ, ọ bụrụgodị na anyị mere ya n’amaghị ama ma ọ bụ na ndị ọzọ amaghị na anyị mejọrọ ihe? Ihe ga-enyere anyị aka ime ya bụ ịdị umeala n’obi.

Ọ bụrụ na onwe anyị na-ebu anyị isi, anyị nwere ike ịchọwa otú anyị ga-esi gosi na ihe anyị mere adịchaghị njọ ma ọ bụ chọwa onye anyị ga-ebo ya ma ọ bụkwanụ gọọ na ọ bụghị anyị mere ya. Ime ụdị ihe a na-akpatakarị nsogbu. O nwere ike ime ka a ghara idozi nsogbu ahụ ma ọ bụ mee ka a tawa onye aka ya dị ọcha ụta. Ọ bụrụgodị na anyị agbaara ihe anyị metere ọsọ ugbu a, anyị kwesịrị icheta na ‘onye ọ bụla n’ime anyị ga-emecha zaa Chineke ajụjụ maka onwe ya.’—Ndị Rom 14:12.

Otú Chineke si ele mmejọ anya dị iche n’otú anyị si ele ya. N’Abụ Ọma, a kọwara Chineke ka onye na-eme “ebere, na-emekwa amara.” Ebe ahụ kwukwara, sị: “Ọ gaghị na-ahụta mmejọ mgbe niile, ọ gaghịkwa anọgide na-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi.” Ọ ma na anyị ezughị okè, marakwa na ọ bụ ya mere anyị ji emejọkarị ihe. “Ọ na-echeta na anyị bụ ájá.”—Abụ Ọma 103:8, 9, 14.

Ihe ọzọ bụ na Chineke bụ nna anyị na-eme ebere. Ọ chọkwara ka anyị bụ́ ụmụ ya na-ele mmejọ anya otú yanwa si ele ya. (Abụ Ọma 130:3) Okwu Chineke bụ́ Baịbụl na-enyere anyị aka ịma ihe anyị ga-eme mgbe anyị mejọrọ ihe ma ọ bụkwanụ mgbe ndị ọzọ mejọrọ ihe.

IHE Ị GA-EME MGBE GỊ MA Ọ BỤ NDỊ ỌZỌ MEJỌRỌ IHE

Ọ na-abụkarị mmadụ mejọọ ihe, ya achọwa onye ọ ga-asị na ọ bụ ya mejọrọ ma ọ bụkwanụ kwuwe ihe ọ ga-asị mere o ji kwuo ihe o kwuru ma ọ bụ mee ihe o mere. Ma, o kwesịghị ịdị otú ahụ. Ọ bụrụ na ihe i kwuru kpasuru mmadụ iwe, rịọ  ya mgbaghara ma gbalịa mee ka unu dịrịkwa ná mma. Olee ihe i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na i mejọrọ ihe ma ọ bụ mee ihe kpataara gị ma ọ bụ ndị ọzọ nsogbu? Kama igbuwe onwe gị ma ọ bụ tawa ndị ọzọ ụta, gbalịa mezie ihe i mebiri. Ọ bụrụ na ị chọwa onye ị ga-ebo ya, ọ ga-eme ka nsogbu ahụ dịrị na-aga ma ọ bụ kakwuo njọ. N’ihi ya, e nwee ihe i mejọrọ, mụta ihe na ya, ma gbalịzie mee ihe i kwesịrị ime.

Ọ bụrụ na onye ọzọ emejọọ ihe, anyị na-egosikarị na ihe onye ahụ mere adịghị anyị mma. Ma, ọ ga-aka mma ma anyị mee ihe Jizọs kwuru. Ọ sịrị: “Ya mere, ihe niile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.” (Matiu 7:12) Ọ bụrụ na i mejọrọ ihe, ya bụrụgodị obere ihe, ị ga-achọ ka ndị ọzọ meere gị ebere ma ọ bụdị leghara ihe ahụ i mejọrọ anya kpamkpam. Ọ̀ bụ na i kwesịghị ịgbalị na-emekwara ndị mejọrọ gị ebere?—Ndị Efesọs 4:32

IHE NDỊ GA-ENYERE ANYỊ AKA ỊGHARA ỊNA-EMEJỌKARỊ IHE

Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kwuru na mmadụ na-emejọkarị ihe mgbe “ọ na-emeghị mkpebi dị mma, ọ na-amachaghị ihe gbasara ihe ọ na-eme ma ọ bụkwanụ na o lezighị anya mee ihe.” O doro anya na otu n’ime ihe ndị a nwere ike ime ka onye ọ bụla n’ime anyị mejọọ ihe. Ma, anyị nwere ike ibelata otú anyị si emejọ ihe ma anyị mee ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru.

E dere otu n’ime ha n’Ilu 18:13. Ebe ahụ sịrị: “Mgbe onye ọ bụla na-aza okwu tupu ya anụ ya, ọ bụụrụ ya nzuzu na mmechuihu.” Ọ bụrụ na i wepụta oge nụ otú ihe niile si mee, chebara ihe ị chọrọ ikwu echiche, ọ ga-eme ka ị ghara ikwu ma ọ bụ mee ihe ị ga-emecha kwaara mmakwaara. Ichebara ihe echiche nke ọma tupu anyị emee ya ga-enyere anyị aka ịghara ime mkpebi na-adịghị mma ma ọ bụ imejọ ihe.

Ihe ọzọ ga-enyere anyị aka dị ná Ndị Rom 12:18. Ebe ahụ sịrị: “Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, unu na mmadụ niile dịrị n’udo.” Mee ike gị niile ka gị na ndị ọzọ na-adị ná mma. Gị na ndị ọzọ na-emekọ ihe, na-echebara ha echiche ma na-akwanyere ha ùgwù. Gbalịakwa na-ekele ha maka ihe ndị ha metara ma na-agba ha ume. Ị na-eme ihe ndị a, ọ ga-adịrị unu mfe ịgbaghara ibe unu ma e nwee onye kwuru okwu n’echeghị ya eche. O nwedịrị ike ime ka e nwee ike idozi oké ihe e mejọrọ.

Lee ma ò nwere ihe ị ga-amụta n’ihe i mejọrọ. Kama ịna-achọ ihe ị ga-asị mere i ji kwuo ihe i kwuru ma ọ bụ mee ihe i mere, gbalịa lee ma ị̀ ga-eji ya mụtakwuo ịkpa àgwà ọma. Lee ma ihe merenụ ò gosiri na i kwesịrị ịna-enwekwu ndidi, obiọma ma ọ bụ na-ejidekwu onwe gị. Ka ò gosiri na i kwesịrị ịdịkwu nwayọọ, na-emekwu udo ma ọ bụ na-ahụkwu ndị ọzọ n’anya. (Ndị Galeshia 5:22, 23) Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ị ga-amụta ihe ị na-ekwesịghị ime mgbe ọzọ. Gbalịa wepụtụ obi n’ihe i mejọrọ, ọ bụ eziokwu na ị gaghị eme ka ihe i mere agbasaghị gị. Ịchịfu ihe ụfọdụ n’ọchị nwedịrị ike ime ka obi rutụ gị ala.

ILE MMEJỌ ANYA OTÚ KWESỊRỊ EKWESỊ GA-ABARA ANYỊ URU

Ile mmejọ anya otú kwesịrị ekwesị ga-enyere anyị aka ịma ihe anyị ga-eme mgbe anyị mejọrọ ihe ma ọ bụ mgbe ndị ọzọ mejọrọ. Obi ga na-eru anyị ala, anyị na ndị ọzọ ana-adịkwa n’udo. Ọ bụrụ na anyị agbalịa mụta ihe n’ihe ndị anyị mejọrọ, anyị ga-enwekwu amamihe, ndị ọzọ ga-ahụkwa anyị n’anya. Ọ ga-eme ka anyị ghara ịna-ada mbà n’obi mgbe niile ma ọ bụkwanụ na-eche na o nweghị ihe anyị dị mma ya. Ọ bụrụ na anyị ana-echeta na ndị ọzọ na-agbalịkwa ka ha ghara ịna-emejọ ihe, ọ ga-eme ka anyị na ha na-adịkwu ná mma. Uru kachanụ anyị ga-erite bụ na anyị ga-amụta ịna-ahụ ndị ọzọ n’anya ma na-agbaghara ha otú Chineke na-eme.—Ndị Kọlọsi 3:13.

Ihe ahụ Margaret anyị kwuru gbasara ya ná mbido isiokwu a mejọrọ, ò mere ka ezinụlọ ya gharazie inwe obi ụtọ ná nnọkọ ha ahụ? Mbanụ. Onye ọ bụla chịsara ihe ahụ merenụ n’ọchị, Margaret kachadị chịa ọchị. Ha rikwara nri ahụ otú ahụ n’ejighị makaroni. Mgbe ọtụtụ afọ gachara, ụmụ ụmụ ya ndị ahụ kọọrọ ụmụ nke ha ihe ahụ merenụ, kọọkwara ha ihe ndị ha na-echeta gbasara ndị nne na nna ha ochie na-eme ha obi ụtọ. A sị ka e kwuwe, e nweghị onye na-enweghị ike imejọ ihe.

^ para. 2 Aha a kpọrọ ha n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.