Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Nke 6 n'Afọ 2017

Ihe mgbapụta ahụ Chineke nyere anyị ga-eme ka anyị nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi. Ọ bụ ya bụ onyinye kachanụ e nyetụrụla anyị

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE ONYINYE KACHA ONYINYE NIILE?

Olee Onyinye Kacha Onyinye Niile?

Olee Onyinye Kacha Onyinye Niile?

Baịbụl sịrị: “Ezi onyinye ọ bụla na onyinye ọ bụla zuru okè si n’elu bịa, n’ihi na ọ na-esi n’aka Nna nke ìhè eluigwe abịa.” (Jems 1:17) Amaokwu a na-ekwu na Nna anyị nke eluigwe bụ́ Jehova Chineke na-emesapụ aka. Ma, n’ime onyinye niile o nyerela ụmụ mmadụ, e nwere otu nke kachanụ. Olee nke ọ bụ? Jizọs gwara anyị nke ọ bụ na Jọn 3:16. Ọ sịrị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”

Onyinye a Chineke nyere anyị Ọkpara ọ mụrụ naanị ya bụ onyinye kachanụ onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike inweta, n’ihi na ọ ga-eme ka anyị nwere onwe anyị pụọ n’aka mmehie, ịka nká na ọnwụ. (Abụ Ọma 51:5; Jọn 8:34) E nweghị ihe anyị ga-emeli n’onwe anyị iji nwere onwe anyị. Ma, n’ihi na Chineke hụrụ anyị n’anya nke ukwuu, o nyere anyị ihe ga-eme ka anyị nwere onwe anyị. Jehova Chineke nyere anyị Ọkpara ọ mụrụ naanị ya bụ́ Jizọs Kraịst ka ọ bụrụ ihe mgbapụta. O si otú ahụ mee ka ụmụ mmadụ bụ́ ndị na-erubere ya isi nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Ma, gịnị bụ ihe mgbapụta? Gịnị mere o ji dị mkpa? Oleekwa otú ọ ga-esi abara anyị uru?

Ihe mgbapụta bụ ụgwọ a kwụrụ iji zụtaghachi ihe furu efu ma ọ bụ iji gbapụta ihe e ji eji. Baịbụl gosiri na nne na nna anyị mbụ bụ́ Adam na Iv enweghị mmehie mgbe e kere ha, ha nwekwara olileanya na ha na ụmụ ha ga-amụta ga-adị ndụ ebighị ebi na paradaịs. (Jenesis 1:26-28) Ọ dị mwute na ha nupụụrụ Chineke isi, si otú ahụ tụfuo olileanya ahụ ha nwere ma ghọọ ndị mmehie. Gịnị ka ihe a ha mere kpatara? Baịbụl sịrị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere.” (Ndị Rom 5:12) Adam nyefere ụmụ ya mmehie na ọnwụ, kama inyefe ha ndụ zuru okè.

A chọọ ịgbapụta ihe, ihe mgbapụta a ga-akwụ na ihe e tụfuru ga-aharịrị. Mgbe Adam kpachaara anya nupụrụ Chineke isi, o mehiere Chineke, si otú ahụ tụfuo ndụ ya, ya bụ, ndụ mmadụ zuru okè. Baịbụl kwuru na mmehie ahụ Adam mere mere ka ụmụ ya bụrụ ohu mmehie na ọnwụ. N’ihi ya, a ga-ejikwa ndụ mmadụ zuru okè, ya bụ, ndụ Jizọs, chụọ àjà ka e nwee ike ime ka ụmụ mmadụ nwere onwe ha n’aka mmehie na ọnwụ. (Ndị Rom 5:19; Ndị Efesọs 1:7) Ọ bụ n’ihi na Chineke ji aka ya kwụọ ihe mgbapụta ahụ mere anyị ji nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ụwa mgbe ọ ga-aghọ paradaịs. Ihe a ka Adam na Iv tụfuru.—Mkpughe 21:3-5.

Ebe ọ bụ na ihe mgbapụta ahụ Chineke nyere anyị ga-eme ka anyị nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi, o doro anya na ọ bụ ya bụ onyinye kachanụ e nyetụrụla anyị. Iji ghọta ihe mere o ji bụrụ ‘onyinye zuru okè,’ ka anyị hụ otú o si daba n’ihe ndị ahụ anyị kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ nke na-eme ka onyinye mee mmadụ obi ụtọ.

O mezuru ihe na-agụ anyị. E kere ụmụ mmadụ ka ịdị ndụ ebighị ebi na-agụsi ha agụụ ike. (Ekliziastis 3:11) Ọ bụ eziokwu na anyị agaghị enyeli onwe anyị ndụ ebighị ebi, ma, n’ihi ihe mgbapụta ahụ, anyị nwere ike ịdị ndụ ebighị ebi. Baịbụl kwuru, sị: “N’ihi na ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ọnwụ, ma onyinye nke Chineke na-enye bụ ndụ ebighị ebi site n’aka Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.”—Ndị Rom 6:23.

 O gboro mkpa anyị. Ụmụ mmadụ agaghị enyeli ihe mgbapụta ahụ. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ dịghị otu n’ime ha pụrụ ịnapụta nwanne ya ma ọlị, Ọ dịghịkwa nke pụrụ inye Chineke ihe mgbapụta maka ya; (Ihe mgbapụta a ga-akwụ maka mkpụrụ obi ha dị oké ọnụ Nke na ọ dịghị adị ruo mgbe ebighị ebi).” (Abụ Ọma 49:7, 8) N’ihi ya, ọ dị anyị ezigbo mkpa ka Chineke nyere anyị aka ka anyị nwee ike inwere onwe anyị n’aka mmehie na ọnwụ. Chineke nyere anyị ihe dị anyị mkpa “site ná ntọhapụ nke si n’ihe mgbapụta ahụ Kraịst Jizọs kwụrụ.”—Ndị Rom 3:23, 24.

E nyere ya n’oge dabara nnọọ adaba. Baịbụl gwara anyị, sị: “Mgbe anyị ka bụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ n’ihi anyị.” (Ndị Rom 5:8) Ebe ọ bụ “mgbe anyị ka bụ ndị mmehie” ka Chineke nyere anyị ihe mgbapụta ahụ, o gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya n’eziokwu n’agbanyeghị na anyị bụ ndị mmehie. Ihe mgbapụta ahụ mekwara ka anyị nwee olileanya na ihe ga-aka mma n’agbanyeghị na anyị na nsogbu ndị mmehie na-akpata ka na-alụ.

E bu ezigbo ihe n’obi nye ya. Baịbụl gwara anyị ihe mere Chineke ji nye anyị Ọkpara ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta. O kwuru, sị: “Ọ bụ site n’ihe a ka e mere ka ịhụnanya Chineke pụta ìhè n’ebe anyị nọ, n’ihi na Chineke zitere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya n’ụwa ka anyị nwee ike inweta ndụ site n’aka ya. Ịhụnanya ahụ si otú a dịrị, ọ bụghị na ọ bụ anyị hụrụ Chineke n’anya, kama na ọ bụ ya hụrụ anyị n’anya.”—1 Jọn 4:9, 10

Olee otú ị ga-esi egosi na obi dị gị ụtọ maka onyinye a kacha onyinye niile? Cheta na Jizọs kwuru na Jọn 3:16, na ọ bụ naanị ndị “nwere okwukwe” na ya ka a ga-azọpụta. Baịbụl kwuru na okwukwe bụ “atụmanya e ji n’aka na ihe ndị a na-ele anya ha ga-emezu.” (Ndị Hibru 11:1) Ọ bụrụ na ị chọrọ inwe ụdị atụmanya ahụ e ji n’aka, i kwesịrị ịmata Chineke nke ọma. Ọ bụ ya mere anyị ji na-agba gị ume ka ị mụọ banyere Jehova Chineke, bụ́ Onye nyere anyị ‘onyinye a zuru okè,’ mụọkwa gbasara ihe ị ga-eme ka i nweta ndụ ebighị ebi nke àjà Jizọs chụrụ ga-eme ka i nwee ike inweta.

I nwere ike ịmụta ihe ndị a ma ị gụọ ihe ndị Baịbụl na-akụzi dị na www.jw.org/ig. Obi ga-atọ Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka. Obi siri anyị ike na ka ị na-amụ banyere onyinye a kachanụ Chineke nyere anyị, ya ana-abara gị uru, ọ ga-eme ka i kwuo, sị: “Ekele dịrị Chineke site n’aka Jizọs Kraịst Onyenwe anyị!”—Ndị Rom 7:25.

GỤKWUO GBASARA YA

OZI ỌMA SI N’AKA CHINEKE!

Gịnị Mere Jizọs Ji Nwụọ?

Baịbụl gosiri na ọnwụ Jizọs bara ezigbo uru. È nwere uru ọnwụ ya bara?