Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Nke 6 n'Afọ 2017

 NDỊ NA-AGỤ AKWỤKWỌ ANYỊ NA-AJỤ, SỊ . . .

Ndị Kraịst, Hà Kwesịrị Ịna-agba Krismas?

Ndị Kraịst, Hà Kwesịrị Ịna-agba Krismas?

Ọtụtụ nde mmadụ nọ n’ụwa kweere na Krismas bụ ememme e ji echeta ụbọchị a mụrụ Jizọs Kraịst. Ma, ị̀ jụtụla onwe gị ma Ndị Kraist oge mbụ, dị ka ndịozi Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya, hà gbara Krismas? Ị̀ ma ihe Baịbụl kwuru gbasara ememme ncheta ụbọchị ọmụmụ? Ọ bụrụ na anyị amata azịza ajụjụ ndị a, ọ ga-enyere anyị aka ịma ma Ndị Kraịst hà kwesịrị ịna-agba Krismas.

Ihe mbụ anyị kwesịrị ịma bụ na o nweghị ebe Baịbụl kwuru na Jizọs ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ fere Chineke chetara ụbọchị ọmụmụ ya. Akwụkwọ Nsọ kọrọ naanị gbasara mmadụ abụọ mere ememme ncheta ụbọchị ọmụmụ ha. Mmadụ abụọ ndị a anaghị efe Jehova, bụ́ Chineke e dere Okwu ya na Baịbụl. Baịbụl akọghị akụkọ ọma gbasara ememme ncheta ọmụmụ abụọ ndị a. (Jenesis 40:20; Mak 6:21) Otu akwụkwọ aha ya bụ Encyclopædia Britannica, kwuru na Ndị Kraịst oge mbụ akwadoghị “ememme ndị ọgọ mmụọ bụ́ icheta ụbọchị ọmụmụ.”

Olee ụbọchị a mụrụ Jizọs?

Baịbụl ekwughị kpọmkwem ụbọchị a mụrụ Jizọs. Otu akwụkwọ aha ya bụ McClintock and Strong’s Cyclopedia kwuru, sị: “Anyị agaghị esili n’Agba Ọhụrụ ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ mata ụbọchị a mụrụ Kraịst.” O doro anya na ọ bụrụ na Jizọs chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya na-echeta ụbọchị a mụrụ ya, ọ gaara eme ka ha mata kpọmkwem ụbọchị a mụrụ ya.

Ihe nke abụọ bụ na o nweghị ebe e dere na Baịbụl na Jizọs ma ọ bụ onye ọ bụla n’ime ndị na-eso ụzọ ya gbara Krismas. Akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia kwuru na ebe mbụ a kpọtụrụ ịgba Krismas aha bụ na kalenda Philocalus, bụ́ kalenda ndị Rom. Ọ bụ n’afọ 336 ka e dere akwụkwọ e si nweta ihe ndị e dere na kalenda ahụ. Ihe ọ pụtara bụ na e dechaala Baịbụl, ihe dị ka narị afọ atọ agaakwa Jizọs bịara n’ụwa tupu e nwee ebe mbụ a kpọtụrụ Krismas aha. Akwụkwọ ahụ kwuziri, sị: “O doro anya na ọ bụghị Chineke kwuru ka a na-agba Krismas, e kwughịkwa ka a na-agba ya n’Agba Ọhụrụ.” *

Olee ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-echeta?

Onye Ozizi Ukwu anyị bụ́ Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ihe doro anya ọ chọrọ ka ha na-eme, e dekwara ihe ndị ahụ na Baịbụl. Ịgba Krismas esoghị n’otu n’ime ha. Otú ahụ onye nkụzi na-agaghị achọ ka ụmụ akwụkwọ ya hapụ ihe ọ gwara ha mee, mewa ihe ọzọ, Jizọs achọghịkwa ka ndị na-eso ụzọ ya ‘gabiga ihe e dere ede’ n’Akwụkwọ Nsọ.—1 Ndị Kọrịnt 4:6.

Ma, e nwere otu ihe dị oké mkpa Ndị Kraịst oge mbụ mere. Ọ bụ Ncheta Ọnwụ Jizọs. Jizọs ji aka ya gwa ndị na-eso ụzọ ya mgbe ha ga na-echeta ọnwụ ya, gosikwa ha otú ha ga-esi na-eme ya. E dere otú ọ chọrọ ka ha si na-eme ya na ụbọchị ọ nwụrụ na Baịbụl.—Luk 22:7, 19; 1 Ndị Kọrịnt 11:25.

Dị ka anyị hụrụla, Krismas bụ ememme ncheta ụbọchị ọmụmụ. Ndị Kraịst oge mbụ emeghịkwa ememme ndị ọgọ mmụọ a. Ihe ọzọkwa bụ na e nweghị ebe Baịbụl kwuru na Jizọs ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ gbara Krismas. N’ihi ihe ndị a anyị lebara anya na ha, ọtụtụ nde Ndị Kraịst nọ n’ụwa niile ekpebiela na ha agaghị na-agba Krismas.

^ para. 6 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu otú ihe ndị a na-eme na Krismas si malite, gụọ isiokwu bụ́ “Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . . Olee Ihe Ndị I Kwesịrị Ịma Banyere Krismas?” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Disemba 1, 2014. Ọ dịkwa na www.jw.org/ig.

 

GỤKWUO GBASARA YA

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Olee Mgbe A Mụrụ Jizọs?

Gụọ ihe a ka ị chọpụta ihe mere ndị mmadụ ji agba Krismas n’abalị iri abụọ na ise n’ọnwa Disemba.

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Baịbụl Ò Kwuru Ka Anyị Na-agba Krismas?

Otú ihe isii a na-eme n’oge Krismas si bido nwere ike iju gị anya.

AJỤJỤ NDỊ MMADỤ NA-AJỤKARỊ

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Agba Krismas?

Ọtụtụ ndị na-agba Krismas n’agbanyeghị na ha ma otú o si malite. Gụọ ihe a ka ị mata ihe mere Ndịàmà Jehova anaghị agba Krismas.