Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Nke 6 n'Afọ 2017

Olee Otú Jizọs Dị n’Eziokwu?

Olee Otú Jizọs Dị n’Eziokwu?

N’oge Jizọs nọ n’ụwa, e nweghị onye sere ya foto ma ọ bụ kpụọ ya n’ihe. N’agbanyeghị ya, kemgbe ọtụtụ narị afọ, ọtụtụ ndị e seela ya n’akwụkwọ na n’ihe ndị ọzọ.

O doro anya na ndị ahụ sere Jizọs amaghị otú ọ dị n’eziokwu. E nwere ihe ụfọdụ na-ekpebi otú ha si ese Jizọs. Otu bụ omenala ha, ọzọ abụrụ okpukpe ha, nakwa ihe onye sịrị ha see ya chọrọ. Otú ha si ese Jizọs ma ọ bụ na-akpụ ya nwere ike ime ka ndị mmadụ ghọtahie onye Jizọs bụ na ihe ndị ọ kụziri.

Ụfọdụ ndị na-ese Jizọs ya adịrị ka onye na-enweghị ume, nwee ogologo ntutu, nweekwa obere afụ ọnụ, ma ọ bụ ha esee ihu Jizọs, ya adị ka onye ike ụwa gwụrụ. E nwekwara ndị na-ese ya ka onye dị ebube nke nwere ihe dị ka ọkụ gburugburu isi ya ma ọ bụ mee ka o yie ihu atọ ọchị. Ihe ndị a ha na-ese, ọ̀ bụ otú Jizọs dị n’eziokwu? Olee otú anyị ga-esi amata otú ọ dị? Otu n’ime ihe ndị ga-enyere anyị aka ịmata otú ọ dị bụ ịmụ ihe ndị Baịbụl kwuru gbasara ya. Ha ga-enyere anyị aka ịmata otú ọ ga-abụ na ọ dị.

“Ị KWADEBEERE M AHỤ́”

O yiri ka Jizọs ó kwuru ihe a n’ekpere mgbe a na-eme ya baptizim. (Ndị Hibru 10:5; Matiu 3:13-17) Olee otú ahụ́ ahụ dị? Ihe dị ka afọ iri atọ tupu e mee Jizọs baptizim, mmụọ ozi Gebriel gwara Meri, sị: “Ị ga-atụrụ ime, mụọ [Ọkpara Chineke].” (Luk 1:31, 35) N’ihi ya, Jizọs zuru okè otú ahụ Adam zuru okè mgbe e kere ya. (Luk 3:38; 1 Ndị Kọrịnt 15:45) Ọ ga-abụrịrị na Jizọs bụ dimkpa nwoke mara mma. Ọ ga-abụkwa na o nwere otú ya na Meri nne ya, bụ́ onye Juu, si yie.

Jizọs nwere afụ ọnụ n’ihi na ọ bụ ihe e ji ama ndị Juu. Ma, ndị Rom anaghị eruwe afụ ọnụ. Ụdị afụ ọnụ ahụ na-egosi na e kwesịrị ịkwanyere onye nwere ya ùgwù. Ọ naghị eto oké ogologo ma ọ bụ dịrị ghaa ghaa ghaa. O doro anya na Jizọs na-akpụlata afụ ọnụ ya, na-akpụdakwa isi ya ka ọ dị mma n’anya. N’oge ahụ, ọ bụ naanị ndị Naziraịt, dị ka Samsịn, bụ ndị na-anaghị akpụ isi ha.—Ọnụ Ọgụgụ 6:5; Ndị Ikpe 13:5.

Si mgbe Jizọs bụ nwata ruo mgbe ọ dị ihe dị ka afọ iri atọ, ọ nọ na-arụ ọrụ ịkwa nkà. O jighịkwa ngwá ọrụ ọgbara ọhụrụ ndị e nwere ugbu a na-arụ ya. (Mak 6:3) N’ihi ya, ọ ga-abụrịrị na Jizọs siri ike. Mgbe Jizọs malitere ikwusa ozi ọma n’ụwa, o ji aka ya “chụpụ ndị niile chị atụrụ na ehi bịa n’ụlọ nsọ, ọ wụfukwara mkpụrụ ego nke ndị na-agbanwe ego ma kpuo tebụl ha ihu.” (Jọn 2:14-17) Ọ bụ onye siri ezigbo ike ga-emeli ụdị ihe a. Jizọs ji ahụ́ ahụ Chineke kwadebeere ya rụzuo ọrụ Chineke nyere ya. Ọ sịrị: “Aghaghịkwa m izisara obodo ndị ọzọ ozi ọma alaeze Chineke, n’ihi na ọ bụ nke a mere e ji zite m.” (Luk 4:43) Jizọs ji ụkwụ gazuo ebe niile na Palestaịn, na-ekwusa ozi ọma. Ihe a abụghị obere ọrụ. O gosiri na ọ gbasiri ike n’eziokwu.

“BỊAKWUTENỤ M, . . . M GA-EMEKWA KA UNU NWETA UME”

Jizọs na-emesapụrụ ndị mmadụ ihu. Otú a o si eme mere ka ọ dịrị ‘ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ na ndị e boro ibu dị arọ’ mfe ịbịakwute ya. (Matiu 11:28-30) Otú o si hụ ndị mmadụ n’anya ma na-egosi ha obiọma gosiri na ihe o kwuru na ọ ga-eme ka ndị chọrọ ịmụta ihe n’aka ya nweta ume, bụ eziokwu. Ụmụaka chọdịrị ịbịakwute Jizọs n’ihi na  Baịbụl kwuru, sị: “O kukwaara ụmụaka” n’aka ya.—Mak 10:13-16.

Ọ bụ eziokwu na Jizọs hụsiri anya tupu ya anwụọ, ma ọ pụtaghị na ọ bụ onye ike ụwa gwụrụ. Dị ka ihe atụ, o nyeere ndị na-agba akwụkwọ na Kena aka, mee ka mmiri ghọọ mmanya na-atọ ezigbo ụtọ. (Jọn 2:1-11) N’oge ndị ọzọ, ọ kụziiri ndị mmadụ ihe ndị ga-abara ha uru.—Matiu 9:9-13; Jọn 12:1-8.

Karịchaa, Jizọs kụziiri ndị mmadụ ihe otú mere ka ọ gụsiwa ha agụụ ike ịdị ndụ ebighị ebi. (Jọn 11:25, 26; 17:3) Mgbe ndị na-eso ụzọ ya iri asaa si ikwusa ozi ọma lọta ma kọọrọ ya otú ozi ha si gaa nke ọma, ọ gwara ha sị: “Ṅụrịanụ ọṅụ n’ihi na e dewo aha unu n’eluigwe.” Jizọs ‘nwekwara oké ọṅụ.’—Luk 10:20, 21.

“UNU ONWE UNU AGAGHỊ ADỊ OTÚ AHỤ”

Ndị isi okpukpe n’oge Jizọs biri ndụ n’ụwa, na-achọ ụzọ ha ga-esi eme ka ndị mmadụ mara na ha bụ ndị isi ha ma na-akwanyere ha ùgwù pụrụ iche. (Ọnụ Ọgụgụ 15:38-40; Matiu 23:5-7) Ma Jizọs adịghị ka ha. Ọ gwara ndịozi ya ka ha ghara ịna-eme ndị ọzọ ka “à ga-asị na ọ bụ ha nwe ha.” (Luk 22:25, 26) Jizọs gwadịrị ha, sị: “Lezienụ anya maka ndị odeakwụkwọ bụ́ ndị na-achọ ka ha yiri uwe mwụda na-ejegharị ma na-achọ ka a na-ekele ha n’ọma ahịa.”—Mak 12:38.

Jizọs anaghị eme onwe ya ka ọ pụọ iche n’ebe ndị ọzọ nọ. O nwedịrị oge ọ na-adịrịghị ndị mmadụ mfe ịmata ya n’ebe ìgwè mmadụ nọ. (Jọn 7:10, 11) Jizọs na ndịozi ya iri na otu kwesịrị ntụkwasị obi nọrọ, ị gaghị eji otú ọ dị n’anya mata ya. Ọ bụ ya mere Judas ji sị na ọ ga-esusu Jizọs ọnụ ka ọ bụrụ “ihe àmà” ndị ọ ga-arara ya nye ga-eji amata ya.—Mak 14:44, 45.

Ọ bụ eziokwu na Baịbụl ekwughị ọtụtụ ihe gbasara otú Jizọs dị, o doro anya na otú ọtụtụ ndị si esekarị ya abụghị otú ọ dị n’eziokwu. Ma, e nwere ihe kwesịrị ịdị anyị mkpa ugbu a karịa ịma otú Jizọs dị n’eziokwu. Ọ bụ ịma otú anyị si were Jizọs taa.

“N’OGE NA-ADỊGHỊ ANYA, ỤWA AGAGHỊKWA AHỤ M ỌZỌ”

Awa ole na ole Jizọs kwuchara ihe a, ọ nwụrụ, e liekwa ya. (Jọn 14:19) O nyere ndụ ya ka ọ bụrụ “ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Matiu 20:28) N’ụbọchị nke atọ ọ nwụchara, Chineke kpọlitere ya ka “mmụọ” ma “mee ka ọ pụta ìhè,” n’ihu ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya. (1 Pita 3:18; Ọrụ Ndịozi 10:40) Olee otú Jizọs dị mgbe ahụ ọ pụtara n’ihu ha? O doro anya na ọ dị iche n’otú ha sibu mara ya n’ihi na ndị na-eso ụzọ ya ha na ya na-esokarị amatalighị ya ozugbo. Meri Magdalin chere na ọ bụ onye na-elekota ubi ebe ahụ e liri ya. Ndị na-eso ụzọ ya abụọ nọ na-aga Emeọs chere na ọ bụ onye mbịarambịa n’obodo ahụ.—Luk 24:13-18; Jọn 20:1, 14, 15.

Olee otú anyị kwesịrị isi were Jizọs taa? Mgbe ihe karịrị afọ iri isii Jizọs nwụrụ gachara, Jọn onyeozi hụrụ Jizọs n’ọhụụ. Jọn ahụghị Jizọs ka onye na-anwụ anwụ a kpọgidere n’elu obe. Kama, ọ hụrụ “Eze nke ndị eze na Onyenwenụ kasị ndị nwenụ niile,” Eze nke Alaeze Chineke, onye ga-ebibi ndị iro Chineke niile ma ndị bụ́ mmụọ ma ndị bụ́ mmadụ n’oge na-adịghị anya, gọziekwa ndị niile na-erubere Chineke isi ruo mgbe ebighị ebi.—Mkpughe 19:16; 21:3, 4.

GỤKWUO GBASARA YA

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Ọ̀ Bụ Ahụ́ Mmadụ Ka Jizọs Nwere Mgbe O Si n’Ọnwụ Bilie Ka Ọ̀ Bụ Ahụ́ Mmụọ?

Baịbụl kwuru na e mere ka Jizọs “dị ndụ na mmụọ,” oleezi otú ndị na-eso ụzọ ya si hụ ya, metụkwa ya aka mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ?

JIZỌS BỤ ỤZỌ, EZIOKWU, NA NDỤ

Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

Ihe ndị Jizọs kụziri na ihe ndị o mere nke dị́ n’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn nwere ike ịgbanwe ndụ gị.