Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Nke 6 n'Afọ 2017

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Gịnị bụ Amagedọn?

Ụfọdụ ndị na-ekwu . . .

na ọ ga-abụ mbibi a ga-eji ngwá agha ọgwụrụ mba bibie ụwa ma ọ bụkwanụ mgbe ọdachi ndị na-emere onwe ha ga-ebibi ụwa a. Gịnị ka i chere?

Ihe Baịbụl kwuru

Amagedọn bụ “agha nke oké ụbọchị nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile” ga-eji ebibi ndị ajọ omume.—Mkpughe 16:14, 16.

Olee ihe ọzọ anyị ga-amụta na Baịbụl?

  • Ihe mere Chineke ga-eji alụ agha Amagedọn abụghị ka o bibie ụwa, kama, ka o chebe ya ka ụmụ mmadụ ghara ibibi ya.—Mkpughe 11:18.

  • Agha Amagedọn ga-akwụsị agha niile.—Abụ Ọma 46:8, 9.

Ò Nwere Ndị Agha Amagedọn Na-agaghị Egbu?

Gịnị ka ị ga-aza?

  • Ee

  • Mba

  • O nwere ike

Ihe Baịbụl kwuru

“Oké ìgwè mmadụ” ndị si ná mba niile agaghị anwụ “n’oké mkpagbu ahụ.” Agha Amagedọn bụ ihe ikpeazụ ga-eme “n’oké mkpagbu ahụ.”—Mkpughe 7:9, 14.

Olee ihe ọzọ anyị ga-amụta na Baịbụl?

  • Chineke chọrọ ka ọtụtụ ndị ghara ịnwụ n’Amagedọn. Ma, ọ ga-egbu ndị ajọ omume n’ihi na ha achọghị ichegharị.—Ezikiel 18:32.

  • Baịbụl kwuru ihe anyị ga-eme ka a ghara ibibi anyị n’Amagedọn.—Zefanaya 2:3.

 

GỤKWUO GBASARA YA

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Gịnị Ka Akwụkwọ Mkpughe Na-ekwu?

Akwụkwọ Mkpughe kwuru na obi ụtọ ga-adịrị onye ọ bụla na-agụ ihe ndị e dere na ya, na-aghọta ha ma na-eme ha eme.

ỤLỌ NCHE

Ndị Mmadụ Hà Ga-emebiru Ụwa A Otú Ọ Na-agaghịzi Ekwe Mmekwata?

Baịbụl buru amụma na ndị mmadụ ga na-emebi ụwa otú a ha si emebi ya ugbu a, ma o kwukwara ihe Chineke ga-eme.