Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Nke 5 n'Afọ 2017

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | NDỊ MMỤỌ OZI HÀ DỊ ADỊ N’EZIOKWU?

Otú Ndị Mmụọ Ozi Si Enyere Gị Aka

Otú Ndị Mmụọ Ozi Si Enyere Gị Aka

Ndị mmụọ ozi na-erubere Chineke isi nwere mmasị n’ihe banyere ụmụ mmadụ. Ha na-arụsikwa ọrụ ike iji mezuo uche Jehova. Baịbụl kwuru na mgbe Chineke kere ụwa, ndị mmụọ ozi “tikọrọ mkpu ọṅụ ọnụ, ụmụ Chineke niile amalitekwa iti mkpu otuto.” (Job 38:​4, 7) Kemgbe ụwa, ọ na-agụ ndị mmụọ ozi agụụ “inyoba anya” n’ihe ndị amụma kwuru gbasara ihe ga-eme n’ụwa n’ọdịnihu.​—⁠1 Pita 1:​11, 12.

Baịbụl gosiri na e nwere oge ụfọdụ ndị mmụọ ozi chebere ndị na-efe Chineke iji mezuo uche ya. (Abụ Ọma 34:⁠7) Dị ka ihe atụ:

  • Mgbe Jehova na-ebibi Sọdọm na Gọmọra, ndị mmụọ ozi nyeere onye ezi omume bụ́ Lọt na ezinụlọ ya aka ịgbapụ.​—⁠Jenesis 19:​1, 15-26.

  • Na Babịlọn oge ochie, mgbe a tụbara ụmụ okorobịa Hibru atọ n’ime oké ọkụ, Chineke “zitere mmụọ ozi ya wee napụta ndị ohu ya.”​—⁠Daniel 3:​19-28.

  • Mgbe Daniel onye ezi omume nọchara otu abalị n’olulu ọdụm ndị agụ ji, o kwuru na ihe zọrọ ya ndụ bụ na ‘Chineke zitere mmụọ ozi ya wee mechie ọnụ ọdụm ndị ahụ.’​—⁠Daniel 6:​16, 22.

Ọ dịla anya ndị mmụọ ozi nyeweere ndị na-efe Chineke aka

NDỊ MMỤỌ OZI NYEERE NDỊ KRAỊST OGE MBỤ AKA

E nwere mgbe ndị mmụọ ozi nyeere Ndị Kraịst oge mbụ aka mgbe ọ dị mkpa iji mezuo uche Jehova. Dị ka ihe atụ:

  • Otu mmụọ ozi meghere ibo ụzọ nke otu ụlọ mkpọrọ ma gwa ndịozi a tụbara na ya ka ha pụta ma gaa n’ụlọ nsọ, kwusawakwa ozi ọma.​—⁠Ọrụ Ndịozi 5:​17-21.

  • Otu mmụọ ozi gwara Filip onye na-ezisa ozi ọma ka ọ gaa n’ụzọ ọzara si Jeruselem gawa Geza, ka o zie onye Itiopia gara Jeruselem ife Chineke ozi ọma.​—⁠Ọrụ Ndịozi 8:​26-33.

  • Mgbe oge ruru ka ndị na-abụghị ndị Juu ghọọ Ndị Kraịst, onyeisi agha ndị Rom aha ya bụ́ Kọnịliọs hụrụ otu mmụọ ozi n’ọhụụ. Mmụọ ozi ahụ gwara ya ka ọ kpọọ Pita onyeozi ka ọ bịa n’ụlọ ya.​—⁠Ọrụ Ndịozi 10:​3-5.

  • Mgbe a tụrụ Pita onyeozi mkpọrọ, otu mmụọ ozi bịara duru ya pụọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ.​—⁠Ọrụ Ndịozi 12:​1-11.

 OTÚ NDỊ MMỤỌ OZI SI ENYERE GỊ AKA

E nweghị ihe gosiri na Chineke ka na-eji ndị mmụọ ozi arụ ọrụ ebube iji nyere ndị mmadụ aka taa otú ahụ o meere ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. Ma, Jizọs kwuru banyere oge anyị a, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Matiu 24:14) Ị̀ ma na ọ bụ ndị mmụọ ozi na-elekọta ọrụ a ndị na-eso ụzọ Kraịst na-arụ taa?

Ndị mmụọ ozi na-enyere anyị aka ikwusa ozi ọma n’ụwa niile

Akwụkwọ Mkpughe kwuru na ndị mmụọ ozi ga na-enyere ndị mmadụ aka n’ụwa niile ịmụta gbasara Jehova Chineke na ihe ọ ga-emere ụmụ mmadụ. Jọn onyeozi dere, sị: “M wee hụ mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efegharị n’etiti eluigwe, o nwekwara ozi ọma ebighị ebi nke bụ́ ozi obi ụtọ ọ ga-ezisara ndị bi n’ụwa, mba niile na ebo niile na asụsụ niile na ndị niile, o ji oké olu na-asị: ‘Tụọnụ egwu Chineke, nyekwa ya otuto, n’ihi na oge awa nke ikpe si n’aka ya eruwo, n’ihi ya, feenụ Onye ahụ nke kere eluigwe na ụwa na oké osimiri na isi mmiri niile.’ ” (Mkpughe 14:​6, 7) E nweela ọtụtụ ihe ndị merela n’oge anyị a na-egosi na ndị mmụọ ozi na-akwado ozi ọma anyị na-ekwusa n’ụwa niile. N’eziokwu, mgbe ọ bụla otu onye mmehie chegharịrị ma laghachikwute Jehova, ‘ndị mmụọ ozi Chineke na-enwe ọṅụ.’​—⁠Luk 15:⁠10.

Gịnị ka ndị mmụọ ozi ga-eme ma e kwusachaa ozi ọma? Mgbe ahụ, ndị mmụọ ozi bụ́ “ụsụụ ndị agha nọ n’eluigwe” ga-akwado Jizọs Kraịst, bụ́ Eze nke ndị eze. Ha ga-eso ya lụọ “agha nke oké ụbọchị nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile” n’Amagedọn. (Mkpughe 16:​14-16; 19:​14-16) Ọ bụ ndị mmụọ ozi ka Onyenwe anyị Jizọs ga-eji emezu uche Chineke “mgbe ọ na-abọ ọbọ n’ahụ́ ndị . . . na-adịghị erube isi n’ozi ọma banyere Onyenwe anyị Jizọs.”​—⁠2 Ndị Tesalonaịka 1:​7, 8.

N’ihi ya, ka obi sie gị ike na ndị mmụọ ozi nwere mmasị n’ebe ị nọ. Ha chọsiri ike ka ihe dịrị ndị chọrọ ife Chineke mma. Jehova ejirikwala ha nyere ndị na-efe ya n’ụwa aka ma mee ka obi sie ha ike ọtụtụ ugboro.​—⁠Ndị Hibru 1:⁠14.

N’ihi ya, e nwere ihe dị ezigbo mkpa onye ọ bụla n’ime anyị ga-ekpebi. Anyị ga-ekpebi ma ànyị ga-ege ntị ma rube isi n’ozi ọma a na-ekwusa n’ụwa niile taa, ma ọ̀ bụ na anyị agaghị ege ntị. Ndịàmà Jehova nọ n’obodo unu ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka ka i soro ná ndị Chineke si n’aka ndị mmụọ ozi na-enyere aka.