• A MỤRỤ M N’AFỌ: 1974

  • ABỤ M ONYE: JAMAN DEMOKRATIK RIPỌBLIK

  • NDỤ M BIRI: EKWEGHỊ M NA CHINEKE DỊ

NDỤ M BIRI NA MBỤ

Amụrụ m n’obodo Sazoni, n’ebe a na-akpọbu Jaman Demokratik Ripọblik (ya bụ, GDR). Obi na-adị anyị ụtọ n’ụlọ anyị n’ihi na onye ọ bụla hụrụ ibe ya n’anya. Ndị mụrụ m kụziiri m ịna-akpa àgwà ọma. Ọ bụ ndị Kọmunist na-achị obodo anyị. Ọ bụ ya mere na ọtụtụ ndị nọ na Sazoni ejighị okpukpe kpọrọ ihe. Ekweghị m na Chineke dị. Malite mgbe m dị obere ruo mgbe m dị afọ iri na asatọ, m kweere na Chineke adịghị, kwerekwa n’ihe ndị Kọmunist na-ekwu. Ọ bụ ihe ndị a m kweere mere m ji eme ihe ọ bụla m na-eme.

Gịnị mere Ọchịchị Kọmunist ji na-amasị m? Ọ bụ n’ihi na ha na-ekwu na mmadụ niile hà. Ihe ọzọ bụ na m kweere na e kwesịrị ịna-eke ihe niile obodo nwere otú hà nhata, n’ihi na ọ ga-eme ka a ghara inwe ndị bara oké ọgaranya na ndị ogbenye ọnụ ntụ. Ọ bụ ya mere m ji banye n’òtù ndị na-eto eto nke ndị Kọmunist. Mgbe m dị afọ iri na anọ, m bidoro ịna-atụtụkọta akwụkwọ ndị a tụfuru n’ụzọ iji dowe gburugburu obodo anyị ọcha. E mechaa, mụ ewega ha ebe a ga-eji ha rụpụta ihe ọzọ. Ihe a m na-eme masịrị ndị obodo Aue nke mere ka ndị isi ha nye m asambodo na onyinye iji kelee m. N’agbanyeghị na m dị obere, mụ na ọtụtụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị obodo anyị a ma ama bịara dị ná mma. Ọ dị m ka ihe ndị a m na-eme bụ ihe kacha mma m ga-eme ná ndụ nakwa na ihe ga-adịrị m mma n’ọdịnihu.

Na mberede, ihe niile gbanwere ná ndụ m. N’afọ 1989, mgbidi Belin e ji kewaa Jamani abụọ dara. Ọchịchị ndị Kọmunist nke na-achị ebe Ọwụwa Anyanwụ Yurop dakwara. Otu na-emepụ, ọzọ esochie. M bịara chọpụta na arụrụala juru eju bara abara n’obodo anyị n’oge ahụ ndị Kọmunist na-achị. Dị ka ihe atụ, a na-eme ndị na-akwadoghị ọchịchị Kọmunist ka ndị na-abaghị uru. Oleekwanụ otú ụdị ihe a si na-eme? Ọ̀ bụ na anyị bụ́ ndị Kọmunist ekwughị na e kwesịrị ịna-emeso mmadụ niile otú ha nhata? Ọ̀ bụ aghụghọ ka ndị Kọmụnist nọ na-aghọ ndị mmadụ? Ezigbo ụjọ jidere m.

M gbanwere ihe m ji ndụ m eme, tinyezie isi n’ịmụ egwú na ise ihe. M banyere n’ụlọ akwụkwọ na-akụzi egwú, buru n’uche imecha gaa mahadum ma ghọzie onye egwú a zụrụ azụ ma na-esekwa ihe. M kwụsịrị ịkpa àgwà ọma niile ndị mụrụ m kụziiri m mgbe m bụ nwata. Ihe kazi m mkpa bụ ikpori ndụ na inwe  ọtụtụ ndị enyi nwaanyị. Egwú, ise ihe nakwa ibi ndụ otú masịrị m emeghị ka ụjọ na-atụ m kwụsị. Ihe ndị m na-ese na-egosidị na ụjọ na-atụ m. M na-ajụ onwe m, sị: ‘Olee ihe ga-eme n’ọdịnihu? Olee ihe mere anyị ji dị ndụ?’

Mgbe m mechara mata azịza ajụjụ ndị a, ha tụrụ m n’anya. E nwere otu abalị mụ na ụmụ akwụkwọ ibe m nọ n’ụlọ akwụkwọ ebe ahụ m na-amụ egwú na-ekwurịta ihe anyị chere ọdịnihu ga-adị ka ya. Otu nwa akwụkwọ ibe m aha ya bụ Mandy * gwara m ihe ga-enyere m aka. Nwata nwaanyị a bụ Onyeàmà Jehova. Ọ gwara m, sị: “Andreas, ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata azịza ajụjụ gị niile gbasara ndụ na ihe ọdịnihu ga-abụ, mụọ Baịbụl.”

O doghị m anya ma azịza ajụjụ ndị ahụ ọ̀ dịkwa na Baịbụl. Ma m kpebiri ịmụ Baịbụl. Mandy gwara m ka m gụọ Daniel isi nke abụọ. Ihe m gụtara ebe ahụ tụrụ m n’anya. Amụma ahụ kọwara ike ọchịchị ụwa dị iche iche ndị ga na-akpa ike n’ụwa ruo taa. Mandy gosiri m amụma Baịbụl ndị ọzọ kwuru gbasara ọdịnihu. Emechaala m chọtawa azịza ajụjụ ndị na-echu m ụra. Ma, ònye dere amụma ndị ahụ? Ònye nwere ike ikwu ihe ga-eme n’ọdịnihu, ya emee kpọmkwem otú ahụ? Ọ̀ ga-abụ na e nwere Chineke n’eziokwu?

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M

Mandy gwara otu di na nwunye bụ́ Ndịàmà Jehova ka ha mụwara m Baịbụl. Aha ha bụ Horst na Angelika. Ha nyeere m aka ịghọta Okwu Chineke nke ọma. Achọpụtara m ozugbo na Ndịàmà Jehova bụ naanị okpukpe na-akpọkarị aha Chineke bụ́ Jehova ma na-akụzikwara ya ndị ọzọ. (Abụ Ọma 83:18; Matiu 6:⁠9) M mụtara na Jehova Chineke kwere nkwa na ụmụ mmadụ ga-adị ndụ ebighị ebi mgbe ọ ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs. Abụ Ọma 37:9 kwuru, sị: “Ndị nwere olileanya n’ebe Jehova nọ ga-enweta ụwa.” Obi tọrọ m ezigbo ụtọ ịmata na onye ọ bụla gbalịrị na-eme ihe Chineke kwuru ga-adị ndụ ebighị ebi.

Ma, o siiri m ike ịgbanwe ndụ ọjọọ m na-ebi ma biwe ndụ otú Baịbụl kwuru. Otú ihe si agaziri m n’ịkụ egwú na ise ihe mere ka isi na-ebu m. N’ihi ya, ihe mbụ m kwesịrị ịmụta bụ ịna-adị umeala n’obi. Ihe ọzọkwa bụ na ọ dịghịrị m mfe ịkwụsị ịchụ nwaanyị. Ma, obi dị m ụtọ na Jehova na-enwere ndị na-agba mbọ ime ihe Baịbụl kwuru ndidi, na-emere ha ebere ma na-aghọta ihe ha na ha na-alụ.

Ihe na-ekpebibu ihe m na-eme bụ ihe ndị Kọmunist kwuru nakwa ihe m kweere bụ́ na Chineke adịghị. Ma ọ bụzi Baịbụl na-agbanwe ndụ m kemgbe ahụ. Ihe ndị m mụtara mere ka ụjọ na-atụ m gbasara ọdịnihu kwụsị ma mee ka ndụ m nwee isi. E mere m baptizim n’afọ 1993, mụ aghọọ Onyeàmà Jehova. N’afọ 2000, m lụrụ Onyeàmà Jehova ibe m aha ya bụ Tabitha. Mụ na ya na-ewepụta oge buru ibu enyere ndị mmadụ aka ịghọta ihe Baịbụl na-ekwu. Otú ọ dịbu m ka ọ dị ọtụtụ ndị anyị na-ezi ozi ọma. Ha ekweghị na Chineke dị, ha ejighịkwa ihe ndị Kọmụnist na-ekwu egwu egwu. Obi na-adị m ezigbo ụtọ ma m na-akụziri ha gbasara Jehova.

URU NDỊ M RITERELA

Mgbe m malitere iso Ndịàmà Jehova, ezigbo iwe were ndị mụrụ m. Ma kemgbe ahụ, ha na-ahụ otú iso Ndịàmà Jehova si mee ka ndụ m ka mma. Obi dị m ụtọ ugbu a na ha na-agụzi Baịbụl, na-agakwa ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova.

Mụ na nwunye m na-ebi n’udo n’ihi na anyị na-agbalị eme ihe Baịbụl kwuru na ndị di na nwunye kwesịrị ịna-eme. Dị ka ihe atụ, ime ihe Baịbụl kwuru ka di ma ọ bụ nwunye ghara ịkwa iko emeela ka anyị na-adịkwu ná mma.​—⁠Ndị Hibru 13:⁠4.

Anaghịzi m echegbu onwe m maka ihe echi ga-abụ. Obi dị m ụtọ na m nọ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova, bụ́ ezinụlọ dị n’otu n’ụwa niile. N’ọgbakọ Ndịàmà Jehova, mmadụ niile ha nhata, enweghị onye ka ibe ya. Ọ bụ ihe m na-achọ kemgbe ụwa m.

^ para. 12 Aha a kpọrọ ya n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ya.