Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Nke 5 n'Afọ 2017

A ga-ebibi ihe niile e ji alụ agha

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Ò nwere mgbe udo ga-adị ebe niile n’ụwa?

Gịnị ka ị ga-aza?

  • Ee

  • Mba

  • O nwere ike

Ihe Baịbụl kwuru

Mgbe Jizọs Kraịst ga-achịwa ụwa, ‘udo ga-adị ebe niile ruo mgbe ọnwa na-agakwaghị adị,’ ya bụ, ruo mgbe ebighị ebi.​—⁠Abụ Ọma 72:⁠7.

Olee ihe ọzọ anyị ga-amụta na Baịbụl?

  • A ga-ebibi ndị ajọ omume n’ụwa, ndị ezi omume ana-enwezi “obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.”​—⁠Abụ Ọma 37:​10, 11.

  • Chineke ga-eme ka a kwụsị ịlụ agha n’ụwa.​—⁠Abụ Ọma 46:​8, 9.

Obi ò nwere ike iru mmadụ ala taa?

Ụfọdụ ndị na-ekwu . . . na obi enweghị ike iru mmadụ ala ebe ọ bụ na ahụhụ na mmegbu ka juru n’ụwa. Gịnị ka i chere?

Ihe Baịbụl kwuru

Ndị ha na Chineke dị ná mma ga-enweli “udo nke Chineke nke karịrị echiche niile” ugbu a.​—⁠Ndị Filipaị 4:​6, 7.

Olee ihe ọzọ anyị ga-amụta na Baịbụl?

  • Chineke kwuru na ya ga-akwụsị ahụhụ na mmegbu juru n’ụwa ma ‘mee ka ihe niile dị ọhụrụ.’​—⁠Mkpughe 21:​4, 5.

  • Obi nwere ike iru anyị ala ma anyị mara “mkpa ime mmụọ” anyị, ya bụ, ma anyị jiri ife Chineke kpọrọ ihe.​—⁠Matiu 5:⁠3.

 

GỤKWUO GBASARA YA

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Gịnị Ga-eme Ka Udo Dịrị n’Ụwa?

Chọpụta otú Chineke ga-esi eme ka Alaeze ya weta udo n’ụwa.

ỤLỌ NCHE

Uru Ekpere Ga-abara Gị

Olee uru ikpe ekpere mgbe niile ga-abara gị?