Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Nke 4 n'Afọ 2016

Tigbuo Zọgbuo Ọ̀ Ga-ala Ala n’Ụwa A?

Tigbuo Zọgbuo Ọ̀ Ga-ala Ala n’Ụwa A?

Ò nwetụla mgbe ndị tigbuo zọgbuo mesiri gị ma ọ bụ onye ezinụlọ gị ike? Ò nwere ihe mere ka ụjọ ndị tigbuo zọgbuo na-atụ gị? Ọtụtụ ndị ekwuola na ndị tigbuo zọgbuo na-akpa ndị mmadụ aka ọjọọ taa karịa n’oge ndị gara aga. Legodị ihe ndị gosiri na ọ bụ eziokwu.

TIGBUO ZỌGBUO A NA-ENWE N’EZINỤLỌ NA IDINA MMADỤ N’IKE: Òtù Mba Ụwa kwuru na “e kee ụmụ nwaanyị niile ụzọ atọ, a kụọla otu ụzọ n’ime ha ezigbo ihe ma ọ bụkwanụ dinaa ha n’ike. Ndị mekwara ha ihe ndị a bụ ndị ha na ha dị n’ezigbo mma.” Ọ dị mwute na n’ihi otú ihe si na-aka njọ, Òtù Mba Ụwa kwukwara na “a na-atụ anya na n’ụwa niile, e kee ụmụ nwaanyị niile ụzọ ise, a ga-edina otu ụzọ n’ime ha n’ike ma ọ bụkwanụ anwaa idina ha n’ike.”

TIGBUO ZỌGBUO A NA-ENWE N’OKPORO ÁMÁ: Nchọpụta e mere gosiri na ihe karịrị òtù ndị tigbuo zọgbuo puku iri atọ na-enye ndị mmadụ nsogbu n’Amerịka. Na Latịn Amerịka, e kwuru na a kụọla ihe dị ka otu onye n’ime mmadụ atọ ọ bụla ihe.

MMADỤ IGBU MMADỤ IBE YA: E kwuru na n’afọ 2012, ndị ụmụ mmadụ ibe ha gburu ruru ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ narị puku ise. Ha karịrị mmadụ ole nwụrụ n’agha ndị a lụrụ n’afọ ahụ. Ọ bụ n’Ebe Ndịda Afrịka nakwa n’Etiti Kọntinent Amerịka ka ndị mmadụ kacha gbuo mmadụ ibe ha. E gburu ihe karịrị otu narị puku mmadụ na Latịn Amerịka n’otu afọ, gbuokwa ihe dị ka puku mmadụ iri ise na Brazil. Ò nwere mgbe a na-agaghịzi enwe ndị tigbuo zọgbuo?

Ò NWERE MGBE TIGBUO ZỌGBUO NA-AGAGHỊZI ADỊ?

Gịnị mere tigbuo zọgbuo ji ju ebe niile? E nwere ọtụtụ ihe na-akpata ya. Otu n’ime ha bụ na o nwere ndị obi na-adịghị mma maka na ndị ọzọ ka ha n’ọkwá ma ọ bụ ka ha nwee ego. Ọzọ bụ na e nwere ọtụtụ ndị na-ejighị ndụ ndị ọzọ kpọrọ ihe, nweekwa ndị mmanya na ọgwụ ọjọọ na-akpa ike ọjọọ n’ahụ́ ha. Ọzọkwa bụ na ụmụaka ndị na-ahụ ka ndị toro eto na-alụ ọgụ na-achọkwa ime ka ha. Mgbe ụfọdụkwa, a naghị ata ndị tigbuo zọgbuo ahụhụ kwesịịrị ha.

Ma, e nweela ebe ụfọdụ n’ụwa ndị mmadụ gbara mbọ kwụsịlatatụ tigbuo zọgbuo. N’ime afọ iri gara aga, n’obodo Saụ Paụlo dị́ na Brazil, ọ bụrụ na mmadụ ole mmadụ ibe ha na-egbu bụbu iri n’otu afọ, ha bịara gbadaa bụrụzie abụọ n’otu afọ. Ma, tigbuo zọgbuo n’ụdị ya dị iche iche ka juru ebe niile n’obodo a. E nweekwa mmadụ puku iri nwụrụ n’obodo a, ọ bụ mmadụ gburu otu onye n’ime ha. Oleezi ihe ga-eme ka tigbuo zọgbuo kwụsị kpamkpam?

Tupu tigbuo zọgbuo akwụsị, ndị na-eme ya ga-agbanwe otú ha si eche echiche na otú ha si akpa àgwà. Ha ga-akwụsị ịdị mpako, imere ndị ọzọ anyaụfụ, na ịchọ ọdịmma onwe ha naanị, malitezie hụwa ndị ọzọ n’anya, na-asọpụrụ ha ma na-eche gbasara ha.

Olee ihe ga-eme ka onye tigbuo zọgbuo chọwa ịgbanwe ndụ ya otú a? Legodị ihe Baịbụl kwuru:

  • “N’ihi na nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị na-edebe ihe o nyere n’iwu.”—1 Jọn 5:3.

  • “Ịtụ egwu Jehova pụtara ịkpọ ihe ọjọọ asị.” *Ilu 8:13.

 Ọ bụrụ na onye tigbuo zọgbuo ebido hụwa Chineke n’anya, na-agba mbọ ka ọ ghara ime ihe ga-ewute ya, ọ ga-eme ka ndụ ya gbanwee, ya emewezie ihe dị mma. Ma ụdị ihe a ọ̀ na-eme eme?

Legodị ihe mere otu nwoke aha ya bụ Alex. * A tụrụ ya mkpọrọ na Brazil n’ihi imesi ndị ọzọ ike. Ọ nọọkwala afọ iri na itoolu ugbu a na mkpọrọ. Ndịàmà Jehova mụụrụ ya Baịbụl, ya emee baptizim, ghọọ Onyeàmà Jehova n’afọ 2000. Ma ọ̀ gbanweela n’eziokwu? Ee. Alex na-akwa ụta maka ihe ọjọọ niile o mere. O kwuru, sị: “Ugbu a, ahụrụ m Chineke n’anya maka otú o si mee ka obi sie m ike na ọ gbagharala m. Ihe mere m ji gbanwee bụ maka na m hụrụ Jehova n’anya, chọọkwa ikele ya maka ihe o meere m.”

Na Brazil kwa, otu nwoke aha ya bụ Charles bụbu oji égbè ezu ohi. O bigidere ụdị ndụ ọjọọ a ruo ihe dị ka afọ iri na ise. Gịnị mere o ji gbanwee? Ndịàmà Jehova bịara zie ya ozi ọma mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ, ya esorokwa ha mụọ Baịbụl. Charles kwuru, sị: “Mgbe mụ na ha malitere ịmụ Baịbụl ka ndụ m bịara nwewa isi. M bidoro hụwa Chineke n’anya. M bidokwara na-agba mbọ ka m ghara ime ihe ọ bụla ga-ewute Jehova. Achọghị m ime ihe ọ bụla ga-egosi na eji m obiọma Chineke meere m egwuri egwu. Otú a m si hụ Chineke n’anya ma na-atụ ụjọ ime ihe ga-ewute ya mere ka m gbanwee ndụ ọjọọ m na-ebibu.”

Mụtakwuo ihe ị ga-eme ka i ruo eruo ibi n’ụwa tigbuo zọgbuo na-adịghịzi

Olee ihe anyị na-amụta n’ihe ndị a ha kọrọ? Anyị na-amụta na Baịbụl nwere ike ịgbanwe otú mmadụ si eche echiche, mee ka onye ahụ mewe ihe dị mma. (Ndị Efesọs 4:23) Alex anyị kwuru okwu ya ná mbụ kwuru, sị: “Ihe m mụtara na Baịbụl bịara dị m ka mmiri dị ọcha e ji na-asachapụ echiche ọjọọ dị n’ime m nwayọọ nwayọọ. Echebughị m na o nwere ihe gaara eme ka m gbanwee.” N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị ana-eche gbasara ihe ndị e dere na Baịbụl, ọ ga-ewepụ ma ọ bụ sachapụ echiche ọjọọ dị n’ime anyị. Okwu Chineke nwere ike ịsachapụ ihe ọjọọ dị anyị n’ime. (Ndị Efesọs 5:26) Ihe ọ pụtara bụ na ndị tigbuo zọgbuo na ndị na-eme ihe na-abara naanị onwe ha uru nwere ike ịgbanwe, nwewe obiọma ma na-emekwa udo. (Ndị Rom 12:18) Ha bido mewe ihe Baịbụl kwuru, ha ga na-enwe udo.—Aịzaya 48:18.

Ndịàmà Jehova dị́ ihe karịrị nde asatọ nọ́ na narị mba abụọ na iri anọ achọpụtala na ịhụ Chineke n’anya na ịgba mbọ ka ha ghara ime ihe ga-ewute ya na-eme ka ha dịrị n’udo. N’agbanyeghị na agbụrụ ha dị iche iche, otú ihe si dịrị ha nakwa otú e si zụlite ha dịkwa iche iche, ha na-ebi n’udo n’ụwa niile dị ka otu ezinụlọ. (1 Pita 4:8) Otú a ha si eme na-egosi na a ga-enweli mgbe tigbuo zọgbuo na-agaghịzi adị n’ụwa a.

TIGBUO ZỌGBUO GA-ALA N’OGE NA-ADỊGHỊ ANYA

Baịbụl kwuru na Chineke ga-akwụsị tigbuo zọgbuo n’ụwa a n’oge na-adịghị anya. Ihe na-echezi ụwa a tigbuo zọgbuo juru bụ “ụbọchị ikpe na ụbọchị mbibi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.” (2 Pita 3:5-7) A gaghịzi enwe ndị tigbuo zọgbuo. Ma, olee ihe ga-eme ka obi sie anyị ike na Chineke chọrọ ịkwụsị tigbuo zọgbuo kpamkpam?

Baịbụl kwuru na Chineke “kpọrọ onye ọ bụla nke hụrụ ime ihe ike n’anya asị.” (Abụ Ọma 11:5) Chineke hụrụ udo na ikpe ziri ezi n’anya. (Abụ Ọma 33:5; 37:28) Ọ bụ ya mere na ọ gaghị ekwe ka ndị na-eme ihe ike ma ọ bụ ndị tigbuo zọgbuo nọrọ ruo ebighị ebi.

N’eziokwu, udo ga-adị n’ụwa niile n’oge na-adịghị anya. (Abụ Ọma 37:11; 72:14) Gbalịa mụtakwuo ihe ị ga-eme ka i ruo eruo ibi n’ụwa tigbuo zọgbuo na-adịghịzi.

^ para. 14 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

GỤKWUO GBASARA YA

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Gịnị Ga-eme Ka Udo Dịrị n’Ụwa?

Chọpụta otú Chineke ga-esi eme ka Alaeze ya weta udo n’ụwa.

TETA!

Ihe Baịbụl Kwuru Gbasara Tigbuo Zọgbuo

Olee otú Chineke si ele tigbuo zọgbuo anya? Ndị e ji tigbuo zọgbuo mara hà nwere ike ịgbanwe?