Gịnị na-agbata gị n’uche ma ị nụ banyere Paradaịs? Ọ na-abụ anyị hụ ebe ndị mara mma a kpọrọ “paradaịs” e gosiri n’akwụkwọ ma ọ bụ na tiivi, ya ana-adị anyị ka anyị gaa ebe ndị ahụ kporie ndụ ma chefuo ụwa anyị. Ma, o doro anya na anyị gagodị ebe ndị ahụ kporichaa ndụ lọta, ihe na-ebenụ ka ga na-ebekwa.

Mgbe ọ bụla e kwuru banyere paradaịs, ọ na-atọgbu ndị mmadụ atọgbu. Ma anyị nwere ike ịna-ajụ, sị: Mmadụ ikwere na a ga-enwe “paradaịs” n’ụwa a, ọ̀ bụghị ịmụ anya arọ nrọ? Ọ bụrụ ya, gịnịzi mere obi ji atọ ndị mmadụ ụtọ ma e kwuta okwu ya? À ga-emecha nwee paradaịs n’ụwa a?

AKỤKỌ GBASARA PARADAỊS

Kemgbe ụwa, obi na-atọ ndị mmadụ ụtọ ma ha nụ banyere paradaịs. Ihe mere o ji atọ ọtụtụ ndị ụtọ bụ maka ihe a kọrọ na Baịbụl gbasara ‘ubi Iden nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ.’ Olee ihe mere ubi a ji amasị ọtụtụ ndị? Baịbụl kwuru, sị: “Jehova bụ́ Chineke wee mee ka osisi ọ bụla nke dị mma ile anya, nke dịkwa mma oriri, pupụta n’ala.” Ubi ahụ mara mma n’eziokwu. Ma ihe kacha mee ka ọ maa mma bụ na Chineke “mekwara ka osisi nke ndụ pupụta n’etiti ubi ahụ.”​—⁠Jenesis 2:​8, 9.

Akwụkwọ Jenesis kwukwara na e nwere osimiri anọ si n’ubi ahụ na-asọpụta. A ka ma abụọ n’ime ha ama taa. Otu bụ Osimiri Taịgris (ma ọ bụ Hidekel), nke ọzọ abụrụ Osimiri Yufretis. (Jenesis 2:​10-14) Osimiri abụọ ndị a na-esi n’Ịrak asọba n’Oké Osimiri Peshia. Ebe a na-akpọ Ịrak ugbu a dịbu na Peshia oge ochie.

O doro anya na ndị Peshia ma ihe gbasara paradaịs mbụ ahụ nke ọma. E nwere otu kapet ha mere n’ihe dị ka narị afọ ise gara aga. E sere ubi a gbara ogige nke nwere osisi na okooko osisi ndị mara mma na ya. Kapet a dị n’ebe a na-egosi ihe mgbe ochie na Filadelfịa dị na Pensụlvenịa nke dị n’Amerịka. Okwu ndị Peshia a sụgharịrị “ubi a gbara ogige” pụtakwara “paradaịs.” Ihe e sere na kapet ahụ yiri ihe a kọrọ na Baịbụl gbasara otú ogige Iden si maa mma.

N’ebe dị iche iche n’ụwa, ndị mmadụ na-akọ gbasara paradaịs. Ka ndị mmadụ na-amụba ma na-agbasa n’ụwa, ndị ọ bụla na-akọ gbasara paradaịs mbụ ahụ. Ka oge na-aga, ha bịara gwakọta ya na nkwenkwe ha na akụkọ ifo ndị obodo ha. Taakwa, ndị mmadụ hụ ebe mara mma, ha na-asị na ọ bụ paradaịs.

HA CHỌRỌ ỊMATA EBE PARADAỊS MBỤ AHỤ DỊ

Ụfọdụ ndị na-eme nchọpụta na-ekwu na ha ahụla ebe paradaịs mbụ ahụ dị. Dị ka ihe atụ, mgbe otu ọchịagha ndị Briten aha ya bụ Charles Gordon gara ileta obodo Seshel n’afọ 1881, ọ hụrụ otu ebe mara mma a na-akpọ Vallée de Mai. Otú ebe ahụ si maa ezigbo mma masịrị ya, ya asị na ọ bụ ogige Iden. Ndị mmadụ na-agazi ebe ahụ elegharị anya. N’afọ 1492, otu onye Ịtali na-akwọ ụgbọ mmiri aha ya bụ Christopher Columbus rutere n’agwaetiti Hispaniola, bụ́ ebe a na-akpọ Dọminikan Ripọblik na Heiti ugbu a. Mgbe ọ hụrụ otú ebe ahụ si maa mma, o chere na ya ahụla ogige Iden ahụ Baịbụl kwuru banyere ya.

Otu akwụkwọ aha ya bụ Mapping Paradise, nwere map oge ochie karịrị otu narị na iri itoolu. E sere ebe Adam na Iv nọ n’Iden n’ọtụtụ n’ime ha. E nwere otu nke pụrụ iche e sere n’ihe dị ka narị afọ asatọ gara aga. E si n’akwụkwọ Beatus onye Liébana dere nweta ya. A bịa n’elu elu map a, e nwere ebe a kabichiri ihe ma see paradaịs n’etiti ya. E gosikwara ebe osimiri anọ si na ya na-asọpụta. A kpọrọ osimiri anọ ndị ahụ “Taịgris,” “Yufretis,” “Indus,” na “Jọdan.” Mmiri ndị ahụ na-asọga n’akụkụ anọ nke ubi ahụ. A sịrị na ọ nọchiri anya otú Ndị Kraịst si gbasaa n’akụkụ anọ nke ụwa. Ihe ndị a na-egosi na n’agbanyeghị na o nweghịzi onye ma ebe Paradaịs mbụ ahụ dị, akụkọ ya ka na-atọ ndị mmadụ ụtọ.

 E nwere otu onye Bekee na-ede abụ n’ihe dị ka narị afọ anọ gara aga. Aha ya bụ John Milton. E ji otu abụ o dere aha ya bụ Paradise Lost mara ya nke ọma. O si n’ihe a kọrọ n’akwụkwọ Jenesis banyere otú Adam si mehie na otú e si chụpụ ya n’ogige Iden dee abụ ahụ. N’abụ a, o dere banyere nkwa Chineke kwere ime ka ndị mmadụ dị ndụ ebighị ebi n’ụwa. O kwuru, sị: “Mgbe ahụ ka ụwa niile ga-aghọ paradaịs.” Milton mechakwara dee abụ ọzọ aha ya bụ Paradise Regained.

EGWÚ ADAGHARỊA

O doro anya na kemgbe ụwa, ndị mmadụ kwetara na e nwere mgbe paradaịs dị n’ụwa a. Gịnị mere ọtụtụ ndị anaghịzi ekweta na ya taa? Akwụkwọ ahụ bụ́ Mapping Paradise kwuru ihe kpatara ya. O kwuru na “ndị na-akụzi ihe gbasara okpukpe . . . achọghịzi ịma ihe ọ bụla a na-ekwu gbasara ebe paradaịs mbụ ahụ dị.”

A na-akụziri ọtụtụ ndị na-aga chọọchị na ọ bụ n’eluigwe ka ha ga-adị ndụ ebighị ebi, ọ bụghị n’ụwa a mgbe ọ ga-aghọ paradaịs. Ma Baịbụl kwuru n’Abụ Ọma 37:​29, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” Ebe ọ bụ na ụwa abụghị paradaịs ugbu a, è nwere ihe mere anyị ga-eji kwere na Chineke ga-emezu nkwa a? *

ỤWA GA-EMECHA GHỌỌ PARADAỊS

Jehova Chineke, onye mere Paradaịs mbụ ahụ ekwela nkwa na ya ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs. Olee otú ọ ga-esi eme ya? Ì chetara na Jizọs gwara anyị na-ekpe ekpere, sị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe”? (Matiu 6:10) Alaeze ahụ bụ ọchịchị ga-achị ụwa niile. Ọ bụ Jizọs Kraịst ga-abụ eze ya. Ọchịchị a ga-anọchi ọchịchị niile. (Daniel 2:44) Jizọs chịwa, uche Chineke bụ́ na ụwa ga-aghọ paradaịs, ‘ga-eme.’

Tupu Jizọs abịa n’ụwa, Chineke nyere Aịzaya onye amụma mmụọ nsọ, ya ekwuo otú ihe ga-adị mgbe ụwa ga-aghọ Paradaịs. N’oge ahụ, ihe niile na-enye ndị mmadụ nsogbu taa agaghịzi adị. (Aịzaya 11:​6-9; 35:​5-7; 65:​21-23) Gbalịa gụọ amaokwu ndị a na Baịbụl gị. Ọ ga-eme ka obi sikwuo gị ike na Chineke ga-emezu nkwa niile o kwere ndị na-erubere ya isi. Ha ga-ebi na paradaịs, obi ana-atọkwa ha ụtọ. Ha na Chineke ga-adịkwa ná mma. Ọ bụ ihe ọma ndị a ka Adam tụfuru.​—⁠Mkpughe 21:⁠3.

Olee ihe mere obi ji kwesị isi anyị ike na a ga-emecha nwee Paradaịs n’ụwa a? Ọ bụ n’ihi na Baịbụl kwuru, sị: “Eluigwe bụ eluigwe Jehova, ma ụwa ka o nyere ụmụ mmadụ.” Na ụwa ga-aghọ Paradaịs bụ ihe “Chineke, onye na-apụghị ịgha ụgha, kwere nkwa ya tupu mgbe dị anya gara aga.” (Abụ Ọma 115:16; Taịtọs 1:⁠2) N’eziokwu, Baịbụl kwuru na ụmụ mmadụ ga-adị ndụ ebighị ebi na Paradaịs. Ihe a bụ olileanya magburu onwe ya.

^ para. 15 E dekwara ụdị ihe a Baịbụl kwuru na Koran. Na sura 21, amaokwu 105 Al-Anbiya’ [Ya bụ, Ndị Amụma] kwuru, sị: “Ndị ezi omume n’etiti ndị ohu M ga-eketa ụwa.”