Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Nke 4 n'Afọ 2017

Mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ nọchiri anya aha Chineke bụ́ Jehova. A na-esi n’aka nri gụrụ mkpụrụ akwụkwọ Hibru gaa aka ekpe

Mkpụrụ Akwụkwọ Hibru Kacha Nta Na-eme Ka Obi Sie Anyị Ike

Mkpụrụ Akwụkwọ Hibru Kacha Nta Na-eme Ka Obi Sie Anyị Ike

Obi ò kwesịrị isi anyị ike na nkwa niile Chineke kwere ga-emezu? Obi siri Jizọs ike na Chineke ga-emezu ihe niile o kwuru. Ihe ndị ọ kụziiri ndị mmadụ mekwara ka obi sie ha ike na Chineke ga-emezu nkwa ya niile. Ka anyị leba anya n’ihe atụ o nyere mgbe ọ na-akụzi ihe n’elu ugwu. E dere ihe atụ a na Matiu 5:18. Ọ sịrị: “N’ezie, ana m asị unu na ọ dị mfe eluigwe na ụwa ịgabiga karịa otu mkpụrụ akwụkwọ kasị nta ma ọ bụ otu akụkụ mkpụrụ akwụkwọ nke dị n’Iwu ahụ ịgabiga ma ọlị, ihe niile e dere n’ime ya agharakwa imezu.”

Mkpụrụ akwụkwọ Hibru kacha nta bụ י (yod). Ọ bụ ya bụ mkpụrụ akwụkwọ mbụ dị na mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ nọchiri anya aha Chineke bụ́ Jehova. * Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii anaghị eji okwu ọ bụla ma ọ bụ mkpụrụ okwu ọ bụla dị n’Iwu Chineke egwu egwu. Ha wekwaara “akụkụ mkpụrụ akwụkwọ” nke ọ bụla ka ihe dị oké mkpa.

Ihe Jizọs na-ekwu bụ na eluigwe na ụwa nwere ike ịgabiga kama ihe kacha nta n’Iwu ahụ na-agaghị emezu. Ma, Akwụkwọ Nsọ mere ka anyị mata na eluigwe na ụwa ga-adịru mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 78:69) Ihe a o kwuru mere ka o doo anya na Chineke ga-emezurịrị nkwa niile o kwere ma ihe ndị kacha nta e kwuru n’Iwu ahụ.

Jehova Chineke ọ̀ na-eji ụmụ obere ihe ndị e chere na o nweghị ihe ha bụ kpọrọ ihe? Eenụ. Dị ka ihe atụ, ọ gwara ndị Izrel oge ochie ka ha ghara ịgbaji ọkpụkpụ nwa atụrụ ha ji eme Ememme Ngabiga. (Ọpụpụ 12:46) Ihe a ọ gwara ha nwere ike iyi obere ihe n’enweghị ihe ọ bụ. Ndị Izrel hà ghọtara ihe mere o ji gwa ha agbajila ọkpụkpụ nwa atụrụ e ji eme ememme a? O yiri ka ha aghọtaghị. Ma, Jehova Chineke ma na ihe a ọ gwara ha nwere ihe ọ nọchiri anya ya. Ọ na-egosi na a gaghị agbaji ọkpụkpụ Mesaya ahụ mgbe a ga-akpọgbu ya n’osisi ịta ahụhụ.​—⁠Abụ Ọma 34:20; Jọn 19:​31-33, 36.

Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe ahụ Jizọs kwuru? Obi kwesịkwara isi anyị ike na ihe niile Jehova Chineke kwere ná nkwa ga-emezu, ma ndị nke kacha nta. N’eziokwu, mkpụrụ akwụkwọ Hibru nke kacha nta na-eme ka obi sie anyị ike.

^ para. 3 Mkpụrụ akwụkwọ Grik nke kacha nta bụ iota. Ọ ga-abụkwa na ya na nke Hibru bụ́ י (yod) yiri. Ebe ọ bụ na e ji asụsụ Hibru dee Iwu Mozis, jirikwa ya kụziere ya ndị mmadụ, ọ ga-abụ mkpụrụ akwụkwọ Hibru kacha nta ka Jizọs na-ekwu gbasara ya.