Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Nke 4 n'Afọ 2017

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | GỊNỊ KA BAỊBỤL KWURU GBASARA NDỤ NA ỌNWỤ?

Ihe Baịbụl Kwuru Banyere Ndụ na Ọnwụ

Ihe Baịbụl Kwuru Banyere Ndụ na Ọnwụ

Akwụkwọ Jenesis kọọrọ anyị ihe Chineke gwara nwoke mbụ o kere aha ya bụ Adam. Ọ sịrị ya: “I nwere ike iri mkpụrụ nke osisi ọ bụla dị n’ubi a rijuo afọ. Ma erila mkpụrụ si n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ, n’ihi na n’ụbọchị i riri mkpụrụ si na ya, ị ga-anwụrịrị.” (Jenesis 2:​16, 17) Ihe a Chineke gwara Adam gosiri na á sị na o gere Chineke ntị, ọ garaghị anwụ. Kama, ọ gaara anọgide na-adị ndụ n’ogige Iden.

Ọ dị mwute na kama Adam irubere Chineke isi ma dịrị ndụ ebighị ebi, o nupụụrụ ya isi. Nwunye ya nyere ya mkpụrụ osisi ahụ a sịrị ha erila, ya erie. (Jenesis 3:​1-6) Nsogbu ihe a Adam mere kpatara ka na-akpa ụmụ mmadụ aka ọjọọ taa. Pọl onyeozi kwuru banyere ya, sị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere.” (Ndị Rom 5:12) “Otu mmadụ” ahụ bụ Adam. Ma, olee ihe mere ihe ahụ Adam mere ji bụrụ mmehie, oleekwa ihe mere o ji kpata ọnwụ?

Adam kpachaara anya nupụrụ Chineke isi ma ọ bụ mebie iwu ya. Ihe a o mere bụ mmehie. (1 Jọn 3:⁠4) Dị ka Chineke gwara Adam, ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ. Ọ bụrụ na Adam na ụmụ ya ana-erubere Chineke isi, ha agaghị abụ ndị mmehie, ha agaghịkwa anwụ anwụ. Chineke ekeghị ụmụ mmadụ ka ha na-anwụ anwụ, kama o kere ha ka ha dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.

O doro anya na ọnwụ ‘agbasaala ruo mmadụ niile,’ otú ahụ Baịbụl kwuru. Ma, è nwere ihe na-esi anyị n’ahụ́ pụọ gaa biri ebe ọzọ ma anyị nwụọ?  Ọtụtụ mmadụ na-ekwu na e nwere. Ha na-ekwu na e nwere ihe dị anyị n’ime a na-akpọ mkpụrụ obi, nakwa na ọ naghị anwụ anwụ. Ma, ọ bụrụ otú ahụ, ọ pụtara na Chineke ghaara Adam ụgha. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na ọ bụrụ na e nwere ihe na-esi anyị n’ahụ́ pụọ gaa biri ebe ọzọ ma anyị nwụọ, ọ pụtara na ihe ahụ Chineke kwuru, ya bụ, na ụgwọ ọrụ mmehie bụ ọnwụ, abụghị eziokwu. Ma, Baịbụl kwuru, sị: ‘Ọ gaghị ekwe omume na Chineke ga-agha ụgha.’ (Ndị Hibru 6:18) Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ Setan bụ onye na-agha ụgha n’ihi na ọ gwara Iv, sị: “Unu agaghị anwụ ma ọlị.”​—⁠Jenesis 3:⁠4.

Ugbu a, ajụjụ bụ, ọ bụrụ na ozizi ahụ bụ́ na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ abụghị eziokwu, gịnịzi na-eme mmadụ ma ọ nwụọ?

BAỊBỤL MERE KA ANYỊ MATA NKE BỤ́ EZIOKWU

Akwụkwọ Jenesis gwara anyị otú Chineke si kee mmadụ. Ọ sịrị: “Jehova bụ́ Chineke wee jiri ájá si n’ala kpụọ mmadụ ma kunye ume ndụ n’oghere imi ya, mmadụ ahụ wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ.” E si n’okwu Hibru bụ́ ne’phesh, * sụgharịa okwu ahụ bụ “mkpụrụ obi dị ndụ.” Ihe okwu ahụ pụtara bụ “ihe dị ndụ nke na-eku ume.”​—⁠Jenesis 2:⁠7.

Ihe a niile na-egosi na Baịbụl mere ka o doo anya na mgbe Chineke kere mmadụ, o kenyeghị ya mkpụrụ obi na-anaghị anwụ anwụ n’ime. Kama, mmadụ ọ bụla bụ “mkpụrụ obi dị ndụ.” Ọ bụ ya mere na ị chọọ elu, chọọ ala, e nweghị ebe ị ga-ahụ “mkpụrụ obi na-anaghị anwụ anwụ” na Baịbụl.

Ebe ọ bụ na Baịbụl kwuru na Chineke ekenyeghị ihe ụfọdụ ndị na-akpọ mkpụrụ obi na-anaghị anwụ anwụ n’ime mmadụ, oleezi ihe mere ọtụtụ okpukpe ji akụzi na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ? Iji mata, ka anyị leba anya n’ihe ndị Ijipt oge ochie kweere.

 OTÚ OZIZI MKPỤRỤ OBI ANAGHỊ ANWỤ ANWỤ SI GBASAA

E nwere onye Grik na-akọ akụkọ ihe mere eme aha ya bụ Herodotus. Ọ dịrị ndụ n’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ ise gara aga. O kwuru na ndị Ijipt bụ “ndị mbụ kwuru na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ.” Ndị Babịlọn oge ochie bụ ndị ọzọ kweere na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ. Tupu Alegzanda Onye Ukwu emerie Izrel na Mba Ndị Gbara Ya Gburugburu n’afọ 332 Tupu Oge Ndị Kraịst, ndị ọkà mmụta Grik nọ na-akụziri ndị mmadụ na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ. Ihe a mere ka ozizi a gbasaa n’obodo niile ndị Grik na-achị.

E nweghị ebe ị ga-aga na Baịbụl hụ “mkpụrụ obi na-anaghị anwụ anwụ”

N’oge ndịozi Jizọs, òtù ndị Juu abụọ a ma ama aha ha bụ ndị Esin na ndị Farisii kụziri na mmadụ nwụọ, mkpụrụ obi ya na-apụ gaa ebe ọzọ biri. Akwụkwọ a na-akpọ The Jewish Encyclopedia kwuru, sị: “Ọ bụ ndị Grik kụziiri ndị Juu na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ. Onye kacha kụzie ya bụ onye Grik a ma ama aha ya bụ Plato.” Otu onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme n’oge ndịozi Jizọs aha ya bụ Josephus kwuru na ozizi a esighị na Akwụkwọ Nsọ, kama na o si na “nkwenkwe ndị Grik.” Josephus weere nkwenkwe a ka akụkọ ifo.

Ka ozizi ndị Grik a bụ́ na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ nọ na-agbasa, ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst bịara kwere na ya, ma malite ịkụziri ya ndị mmadụ. Otu onye na-akọ akụkọ ihe mere eme aha ya bụ Jona Lendering kwuru, sị: “Plato kụziiri ndị mmadụ na e nwere mgbe mkpụrụ obi anyị nọ n’ebe mara mma, ma ugbu a, na ha nọzi n’ụwa ọjọọ. Ọ bụ ihe a mere ndị ahụ sị na ha bụ Ndị Kraịst ji kwere na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ  ma na-akụzi ya.” Ọ bụ otú a ka ha si malite ịkụzi ozizi ndị ọgọ mmụọ a, ya esoro n’isi ihe ha na-akụziri ndị mmadụ.

“EZIOKWU AHỤ GA-EMEKWA KA UNU NWERE ONWE UNU”

N’oge ndịozi Jizọs, Pọl onyeozi kwuru, sị: “Okwu nke si n’ike mmụọ nsọ kwuru hoo haa na n’oge ikpeazụ, ụfọdụ ga-adapụ n’okwukwe, na-aṅa ntị n’okwu nduhie ndị si n’aka mmụọ na ozizi ndị mmụọ ọjọọ.” (1 Timoti 4:⁠1) Ihe a o kwuru bụ ihe na-eme taa. Ozizi mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ so ‘n’ozizi ndị mmụọ ọjọọ.’ O sighị na Baịbụl, kama, o si n’aka ndị ọgọ mmụọ na ndị ọkà mmụta oge ochie.

Ma, obi dị anyị ụtọ na Jizọs gwara anyị, sị: “Unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.” (Jọn 8:32) Ọ bụrụ na anyị amụta eziokwu dị na Baịbụl, ọ ga-eme ka anyị nwere onwe anyị n’ozizi ụgha na ihe ndị na-adịghị mma ọtụtụ okpukpe na-eme taa. Ọ ga-emekwa ka anyị nwere onwe anyị ná nsogbu dị iche iche nkwenkwe ụgha na omenala ndị a na-eme banyere ndị nwụrụ anwụ na-akpatara ndị mmadụ.​—⁠Gụọ igbe bụ́ “ Olee Ebe Ndị Nwụrụ Anwụ Nọ?

Ọ bụghị uche Chineke ka ụmụ mmadụ na-ebi naanị afọ iri asaa ma ọ bụ afọ iri asatọ n’ụwa a, gazie ebe ọzọ biri ruo mgbe ebighị ebi. Ihe o bu n’uche kee anyị bụ ka anyị biri n’ụwa a ruo mgbe ebighị ebi ma na-erubere ya isi. Ihe a gosiri na Chineke hụrụ ụmụ mmadụ n’anya. E nweghịkwa ihe ga-eme ka ọ ghara imezu ihe a bụ́ uche ya. (Malakaị 3:⁠6) O si n’ọnụ otu ọbụ abụ mee ka obi sie anyị ike. Ọ sịrị: “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi”​—⁠Abụ Ọma 37:29.

 

^ para. 9 Otú Bible Nsọ nke Union Version si sụgharịa ne’phesh bụ, “madụ ahụ we ghọ nkpuru obi di ndu.” Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik sụgharịrị ya “mmadụ ahụ wee ghọọ onye dị ndụ,” ebe Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society sụgharịkwara ya “nke mere ka mmadụ ghọọ mmadụ dị ndụ.”