Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Nke 4 n'Afọ 2017

Elias Hutter na Ọmarịcha Baịbụl Ndị Ọ Sụgharịrị n’Asụsụ Hibru

Elias Hutter na Ọmarịcha Baịbụl Ndị Ọ Sụgharịrị n’Asụsụ Hibru

Ị̀ GA-AGỤTALI asụsụ Hibru e ji dee Baịbụl? O nwere ike ị gaghị agụtali ya. O nwedịrị ike ị hụtụbeghị Baịbụl e dere n’asụsụ Hibru mbụ. Ma, e nwere ihe nwere ike inyere gị aka iji Baịbụl i nwere kpọrọkwuo ihe. Olee ihe ọ bụ? Ọ bụ ịgụ gbasara otu onye ọkà mmụta dịrị ndụ n’ihe dị ka narị afọ ise gara aga nakwa Baịbụl Hibru abụọ o bipụtara. Aha ya bụ Elias Hutter.

A mụrụ Elias Hutter n’afọ 1553 n’obere obodo a na-akpọ Görlitz. Obodo a dị nso n’ókè mba Jamanị, Poland na Chek Ripọblik. Hutter mụrụ asụsụ Arabik, Hibru na Aramaịk na Mahadum Lutheran dị na Jena. Mgbe ọ dị naanị afọ iri abụọ na anọ, ọ ghọrọ prọfesọ n’asụsụ Hibru n’obodo Leipzig. Elias Hutter chọrọ ịgbanwe otú agụmakwụkwọ si na-aga n’oge ya. N’ihi ya, o mechara mepee otu ụlọ akwụkwọ n’obodo Nurembeg. N’ụlọ akwụkwọ a, a na-eji afọ anọ mụọ asụsụ Hibru, Grik, Latịn na Jamanị. E nweghị ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ mahadum ọzọ na-emeli ụdị ihe a n’oge ahụ.

“IHE MERE BAỊBỤL Ọ SỤGHARỊRỊ JI MAA EZIGBO MMA”

Ihe a bụ isimbido peeji nke Baịbụl ahụ Hutter sụgharịrị n’asụsụ Hibru n’afọ 1587

N’afọ 1587, Hutter bipụtara ihe ọtụtụ ndị na-akpọ Agba Ochie ọ sụgharịrị n’asụsụ Hibru. Aha ọ kpọrọ Baịbụl a bụ Derekh ha-Kodesh. Ihe ọ pụtara bụ “Ụzọ nke Ịdị Nsọ.” E si n’Aịzaya 35:8 nweta ya. Otú mkpụrụ akwụkwọ e ji dee ya si maa mma mere ka ndị mmadụ kwuo na “ihe niile gbasara Baịbụl a mara ezigbo mma.” Ma, ihe kacha mee ka ọ maa mma bụ n’ihi otú o si e nyere ụmụ akwụkwọ aka ịmụta asụsụ Hibru.

Ka i nwee ike ịghọta ihe mere Baịbụl a ji maa mma, legodị ihe abụọ mere o ji esiri onye na-amachaghị asụsụ Hibru ike ịgụ Baịbụl e dere n’asụsụ Hibru. Nke mbụ bụ na e ji mkpụrụ akwụkwọ dị iche ọtụtụ ndị na-amaghị dee ya. Nke abụọ bụ na okwu a gbakwunyere n’ihu ma ọ bụ n’azụ okwu dị iche iche mere ka ọ na-esi ike ịmata nke bụ okwu bụ́ isi. Dị ka ihe atụ, tụlee okwu Hibru a sụpere ne’phesh (otú e si dee ya na Hibru bụ נפשׁ), nke pụtara “mkpụrụ obi.” N’Ezekiel 18:​4, a gbakwunyere okwu Hibru a sụpere ha (otú e si dee ya na Hibru bụ ה) n’ihu okwu Hibru ahụ a sụpere ne’phesh, ya aghọọ okwu bụ́ han·ne’phesh, (otú e si dee ya na Hibru bụ הנפשׁ), ya bụ, “mkpụrụ obi.” Onye na-amachaghị agụ asụsụ Hibru a e ji dee Baịbụl nwere ike iche na okwu bụ́ han·ne’phesh (הנפשׁ) dị iche na ne’phesh (נפשׁ).

Iji nyere ụmụ akwụkwọ ya aka ịna-amata okwu bụ́ isi na okwu ndị a gbakwunyere agbakwunye, Hutter bidoro ibipụta okwu Hibru n’ụzọ pụrụ iche. O dere okwu Hibru ndị bụ́ isi ná mkpụrụ akwụkwọ  okpotokpo, deekwanụ okwu mgbakwunye na-adị n’ihu ma ọ bụ n’azụ okwu ndị ahụ bụ́ isi ná mkpụrụ akwụkwọ na-agbaghị okpotokpo. Otú a o si dee ya mere ka ọ dịkwuoro ndị na-amụ asụsụ Hibru mfe ịmata okwu Hibru ndị bụ́ isi, ya enyeziere ha aka mgbe ha na-amụ asụsụ a. E si otú ahụ Hutter si dee mkpụrụ okwu Hibru dee okwu ndị dị n’ala ala peeji nke New World Translation of the Holy Scriptures​—⁠With References. * E dere okwu ndị bụ́ isi ná mkpụrụ akwụkwọ gbara okpotokpo, deekwanụ ndị a gbakwunyere n’ihu ma ọ bụ n’azụ ha ná mkpụrụ akwụkwọ na-agbaghị okpotokpo. Foto dị na peeji a gosiri otú e si dee ihe dị n’Ezikiel 18:4 na Baịbụl ahụ Hutter sụgharịrị n’asụsụ Hibru, nakwa otú e si dee okwu ndị dị n’ala ala peeji nke amaokwu a na New World Translation of the Holy Scriptures​—⁠With References.

“AKWỤKWỌ NSỌ GRIK” E JI ASỤSỤ HIBRU SỤGHARỊA

Hutter bipụtakwara Akwụkwọ Nsọ Grik, bụ́ ihe ọtụtụ ndị na-akpọ Agba Ọhụrụ. I mepee ya, amaokwu ọ bụla dị na ya dị n’asụsụ iri na abụọ. O bipụtara ya na Nurembeg, n’afọ 1599. Ihe a na-akpọkarị ya bụ Nuremberg Polyglot. Mgbe Hutter na-akwadebe ibipụta Baịbụl a, ọ chọrọ ka otu n’ime ya bụrụ nke a sụgharịrị n’asụsụ Hibru. Ma, o kwuru na ọ bụrụgodị na ya “dị njikere ịkwụ nnukwu ụgwọ” iji nweta Baịbụl Hibru a, ọ gaghị abara ya uru. * N’ihi ya, o kpebiri iji aka ya sụgharịa Akwụkwọ Nsọ Grik ahụ n’asụsụ Hibru. Ọ hapụrụ ihe niile ọ na-eme malite ịsụgharị ya. O were ya naanị otu afọ iji sụgharịchaa ya.

Olee otú Baịbụl a Hutter sụgharịrị maruru ná mma? Otu onye ọkà mmụta aha ya bụ Franz Delitzsch, nke dịrị ndụ n’ihe dị ka narị afọ abụọ gara aga kwuru, sị: “Baịbụl Hibru ọ sụgharịrị gosiri na ọ ma asụsụ Hibru nke ọma, ọ bụ eziokwu na ọtụtụ Ndị Kraịst amaghị ya nke ọma. Baịbụl a ka bara uru taa. Ọ sakwara anya ná mmiri họrọ okwu ndị dabara adaba sụgharịa ya.”

Ọ BAALA EZIGBO URU TAA

Baịbụl a Hutter sụgharịrị emeghị ka ọ baa ọgaranya n’ihi na ọ ga-abụ na ọ gachaghị ahịa. Ma, ọ baala ezigbo uru taa. Dị ka ihe atụ, William Robertson dezigharịrị ma bipụta ya n’afọ 1661. N’afọ 1798, Richard Caddick mekwara otu ihe ahụ. Mgbe Hutter na-asụgharị Akwụkwọ Nsọ Grik ahụ gaa n’asụsụ Hibru, ọ hụ ebe e dere utu aha bụ́ Kyʹri·os (Onyenwe Anyị) na The·osʹ (Chineke), ya edee ya “Jehova” (יהוה, JHVH) ma ọ bụrụ na e si n’Akwụkwọ Nsọ Hibru nweta ihe ahụ ọ na-asụgharị. Ọ hụkwanụ ebe o chere na ọ bụ Jehova kwesịrị ịdị ya, ya edee ya Jehova. Ihe a o mere dị mma n’ihi na ọtụtụ ndị sụgharịrị Akwụkwọ Nsọ Grik wepụrụ aha Chineke ebe ndị o kwesịrị ịdị. Baịbụl ahụ Hutter sụgharịrị nyere aka mee ka a mata ebe ndị aha Chineke kwesịrị ịdị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.

Mgbe ọ bụla ị na-agụ Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst hụ ebe e dere aha Chineke, bụ́ Jehova, ma ọ bụ hụ ya n’ihe e dere n’ala ala peeji nke New World Translation of the Holy Scriptures​—⁠With References, cheta Elias Hutter na ọ marịcha Baịbụl ndị ahụ ọ sụgharịrị n’asụsụ Hibru.

^ para. 7 Lee ihe nke abụọ e dere n’ala ala peeji n’Ezikiel 18:4 nke New World Translation of the Holy Scriptures​—⁠With References na Appendix 3B nke Baịbụl a.

^ para. 9 E nwere ndị ọkà mmụta ndị ọzọ sụgharịrịla Akwụkwọ Nsọ Grik n’asụsụ Hibru. Otu n’ime ha bụ Simon Atoumanos. Ọ sụgharịrị nke ya n’ihe dị ka afọ 1360. Onye ọzọ bụ onye Jamanị aha ya bụ Oswald Schreckenfuchs. Ọ sụgharịkwara nke ya n’ihe dị ka afọ 1565. Ma, e bipụtaghị Baịbụl ndị a. E nweghịkwa ebe a ga-ahụ ha taa.

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

Aha Chineke—Otú E Si Eji Ya Eme Ihe na Ihe Ọ Pụtara