Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Nke 3 n'Afọ 2016

 ṄOMIE OKWUKWE HA | RIBEKA

“Achọrọ M Iso Ya Laa”

“Achọrọ M Iso Ya Laa”

WEREGODỊ ya na ị na-ahụ Ribeka ka ọ na-elepụ anya na-ahụ ebe ọ na-aga. O meela izu ole na ole ọ pụrụ ije a. Ịnọ n’elu kamel amawakwala ya ahụ́ n’ihi na ọ bụ kamel bu ya na-aga. O si Heran, bụ́ ebe a mụrụ ya, na-aga ebe dị ezigbo anya. O nwere ike ọ gaghị ahụ ndị ezinụlọ ha ọzọ. Ọ ga-abụ na ọ nọ na-eche otú ihe ga-adịrị ya n’ebe ọhụrụ a ọ na-aga ibi, karịchaa, ugbu a o rutewerela.

Ribeka na ndị ya na ha so agafeela ọtụtụ ebe na Kenan. Ha nọzi na Negeb bụ́ ebe ala na-adịchaghị mma na Kenan. (Jenesis 24:62) Ka ha na-aga, ọ ga-abụ na Ribeka na-ahụ atụrụ n’ebe a. O yiri ka ebe a adịchaghị mma maka ịkọ nri, ma, ọ ga-adị mma maka ịkpa anụ ụlọ. Otu agadi nwoke dú ya ma ebe a nke ọma. Ọ na-enu agadi nwoke ahụ enu n’obi ịga kọọrọ Aịzik nna ya ukwu na ya alụtarala ya Ribeka. Ma, ọ ga-abụ na Ribeka ka nọ na-eche otú ihe ga-adịrị ya ebe a nakwa ụdị onye nwoke a ga-alụ ya bụ. Aha nwoke ahụ bụ Aịzik. Ya na ya ahụtụbeghị mbụ. Ihe ya ọ̀ ga-amasị Aịzik? Ihe Aịzik ọ̀ ga-amasị yanwa?

N’ọtụtụ ebe n’ụwa taa, ọ bụghị nne na nna na-ahọtara nwa ha onye ọ ga-alụ. Ma, ọ bụ otú e si eme ya n’ebe ụfọdụ. N’agbanyeghị otú e si alụ nwaanyị n’ebe unu, i nwere ike ikwu na Ribeka na-aga ịlụ onye ọ na-amaghị. N’eziokwu, obi kara ya, o nwekwara okwukwe pụrụ iche. Anyị nwee àgwà abụọ a, ọ ga-abara anyị uru ma e nwee otú ihe si gbanwee ná ndụ anyị. Ma, Ribeka nwekwara àgwà ọma ndị ọzọ ọtụtụ ndị na-enweghị taa.

“M GA-ESETAKWARA KAMEL GỊ MMIRI”

Ihe mere Ribeka ji na-aga ịlụ di ugbu a bụ ihe ọma o mere. Ma, ọ ga-abụ na o chere na o nweghị oké ihe ya mere. O nwere ike ịbụ na o toro n’obodo Heran dị́ na Mesopotemia. Ndị mụrụ ya anaghị eme ka ọtụtụ ndị bí na Heran. Ha anaghị efe chi ọnwa a na-akpọ Sin. Kama, ha na-efe Jehova.—Jenesis 24:50.

Ribeka bụ asampete. Ma, mma ya anaghị ebu ya isi. Ọ gbasiri ike, bụrụkwa nwa agbọghọ na-amaghị nwoke. Ndị mụrụ ya bara ọgaranya nke na ha nwere ndị ohu. Ma, a zụtọghị Ribeka ma ọ bụ na-eme ya ka ọ̀ bụ ada eze. A kụziiri ya ịrụsi ọrụ ike. Ọ na-arụ ọrụ ụfọdụ tara akpụ otú ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị dịrị ndụ n’oge ahụ na-arụ. Dị ka ihe atụ, ná mgbede, ọ na-atụkwasị ite mmiri n’ubu ya, gawa isetara ezinụlọ ha mmiri n’olulu mmiri.—Jenesis 24:11, 15, 16.

E nwere otu mgbede Ribeka gara isere mmiri. Mgbe ọ gbajuchara ite ya mmiri, otu agadi nwoke gbakwuuru ya, medaa obi rịọ ya, sị: “Biko, ka m ṅụrụtụ mmiri n’ite gị.” Ribeka hụrụ na o teela nwoke a pụtara ije. O buturu ite ya ozugbo, nye nwoke ahụ mmiri jụrụ oyi, ya aṅụọ ṅụjuo afọ. Ribeka chọpụtara na nwoke ahụ nwere kamel iri ndị makpu n’akụkụ olulu mmiri ahụ nakwa na mmiri adịghị n’ihe anụmanụ ji aṅụ mmiri dị́ n’ebe ahụ. Ọ hụrụ na nwoke ahụ na-ele ya anya. Ọ chọkwara inyere ya aka otú o nwere ike. Ọ bụ ya mere o ji sị ya: “M ga-esetakwara kamel gị mmiri ruo mgbe ha ṅụjuru afọ.”—Jenesis 24:17-19.

Ị̀ hụrụ na Ribeka asịghị naanị na ya ga-enye kamel iri ndị ahụ mmiri ka ha ṅụọ, kama, ọ sịrị na ya ga-enye ha mmiri ruo mgbe ha ṅụjuru afọ? Ọ bụrụ na akpịrị kpọrọ kamel nkụ, o nwere ike ịṅụ ihe karịrị lita mmiri iri itoolu na ise otu mgbe. Ọ bụrụzie na akpịrị na-akpọ kamel iri ahụ nkụ, Ribeka ga-eji ọtụtụ awa setara ha mmiri ha  ga-aṅụ ṅụjuo afọ. Ma o yiri ka akpịrị anaghị akpọcha kamel ndị ahụ nkụ ná mgbede ahụ. * Ribeka ọ̀ makwanụ na ezigbo mmiri anaghị agụ kamel ndị ahụ mgbe o kwere nkwa inye ha mmiri? Mba. O ji obi ya dum chọọ ime ike ya niile iji nyere agadi nwoke ahụ aka. Nwoke ahụ hapụrụ ya ka o mee ihe ọ chọrọ ime, nọrọzie na-ele ya ka ọ na-aga ugboro ugboro na-esetara kamel ndị ahụ mmiri.—Jenesis 24:20, 21.

Ribeka gbasiri ike, na-elekwa ọbịa nke ọma

E nwere ezigbo ihe anyị kwesịrị ịmụta n’ihe a Ribeka mere. Ọtụtụ ndị taa na-achọ ihe ga-abara naanị ha uru. Baịbụl kwuru na ndị mmadụ ga-abụ “ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya,” ndị na-adịghị njikere imere ndị ọzọ ihe ọma. (2 Timoti 3:1-5) Ma, Ndị Kraịst na-agba mbọ ka ha ghara ịna-achọ ihe ga-abara naanị ha uru. N’ihi ya, ha kwesịrị ịna-echeta ihe nwa agbọghọ a mere ma na-adị njikere mgbe niile inyere ndị ọzọ aka.

O doro anya na Ribeka hụrụ ka agadi nwoke ahụ nọ na-ele ya. Ọ bụghị anya iberiibe ka ọ na-ele ya. Kama, ọ na-ele ya anya ka onye ihe juru anya na onye ọṅụ juru obi. Mgbe Ribeka nyechara kamel ndị ahụ mmiri, nwoke ahụ nyere ya ọla ndị dị́ oké ọnụ ahịa ma jụọ ya, sị: “Ị̀ bụ nwa onye? Biko, gwa m. Ò nwere ebe anyị ga-arahụ n’ụlọ nna gị?” Mgbe ọ gwara ya ezinụlọ o si, obi tọkwuru nwoke ahụ ụtọ. Ọ dịkwa ka obi ụtọ ò mere ka Ribeka gwakwuo nwoke ahụ, sị: “Anyị nwere ma okporo ọka ma nri anụ dị ukwuu, nweekwa ebe unu ga-arahụ.” Ihe a ọ chọrọ imere nwoke a magburu onwe ya n’ihi na e nwere ndị ọzọ ha na ya so. Ọ hapụrụ nwoke ahụ gbara ọsọ gaa gwa mama ya ihe merenụ.—Jenesis 24:22-28, 32.

Ihe a merenụ gosiri na Ribeka ma ele ọbịa nke ọma. Ọ bụ otu n’ime àgwà ndị kọrọ ụkọ n’ụwa taa. Anyị kwesịrị ịna-ele ndị ọzọ ọbịa ka nwa agbọghọ a nwere obiọma. Ọ bụrụ na anyị nwere okwukwe na Chineke, anyị ga na-ele ndị ọzọ ọbịa. Jehova na-elekwa ọbịa n’ihi na ọ na-emesapụrụ onye ọ bụla aka. Ọ chọkwara ka ndị ya na-eme ka ya. Ọ bụrụ na anyị na-emesapụrụ onye ọ bụla aka, ma ndị na-enweghị ihe ha ga-enyeli anyị, Jehova ga-enwe obi ụtọ.—Matiu 5:44-46; 1 Pita 4:9.

 “LỤTARA NWA M NWOKE NWAANYỊ”

Ònye bụ agadi nwoke ahụ bịara n’olulu mmiri ahụ? Ọ bụ onye na-ejere Ebreham ozi. Ebreham bụ nwanne nna nna Ribeka. Ọ bụ ya mere Betuel nna Ribeka ji nabata nwoke ahụ. Ọ dị ka aha nwoke ahụ ọ̀ bụ Elịiza. * Ndị be Betuel bupụtaara ya nri, ma, o kweghị eri ruo mgbe o kwuru ihe bụ́ isi ije ya. (Jenesis 24:31-33) Anyị manụ ụdị obi ụtọ ọ ga na-eji akọ ihe mere o ji bịa, ebe ọ bụ na ọ hụla ezigbo ihe gosiri na Jehova Chineke ya agọziwela ije ya. Olee otú anyị si mara?

Weregodị ya na ị na-ahụ ka Elịiza na-akọrọ Betuel na Leban nwanne Ribeka ihe merenụ, ha ahapụ ihe ha na-eme na-ege ya ntị. Ọ gwara ha na Jehova agọziela Ebreham nke ukwuu na Kenan. Ọ gwakwara ha na Ebreham na Sera mụtara otu nwa nwoke aha ya bụ Aịzik, onye ga-eketa ihe niile nna ya nwere. Ugbu a, Ebreham dunyere ya ozi dị́ oké mkpa. Ọ gwara ya ka ọ gaa Heran, ebe ndị ikwu Ebreham, lụtara Aịzik nwaanyị.—Jenesis 24:34-38.

Ebreham mere ka Elịiza ṅụọrọ ya iyi na ọ gaghị e si na Kenan lụtara Aịzik nwaanyị. Maka gịnị? Maka na ndị Kenan anaghị asọpụrụ Jehova, ha anaghịkwa efe ya. Ebreham ma na Jehova ga-emecha bibie ndị obodo a. Ọ chọghịkwa ka e nwee ihe ga-ejikọ Aịzik nwa ya nwoke na ndị ọjọọ a. Ọ makwa na o nwere ọrụ dị ezigbote mkpa nwa ya ga-arụ ka nkwa Chineke kwere wee mezuo.—Jenesis 15:16; 17:19; 24:2-4.

Elịiza gwakwara Betuel na Leban na mgbe ya rutere n’olulu mmiri ahụ, na ya rịọrọ Jehova Chineke otu ihe. E nwere ike ịsị na ọ rịọrọ Jehova ka ọ họtara Aịzik nwa agbọghọ ọ ga-alụ. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Elịiza rịọrọ Chineke ka o mee ka nwa agbọghọ Aịzik ga-alụ bịa n’olulu mmiri ahụ, nakwa na ọ bụrụ na ya arịọ nwa agbọghọ ahụ ka o nye ya mmiri ka ọ ṅụọ, ka o kweta inye ya ma kwuo na ya ga-enyekwa kamel ya niile mmiri. (Jenesis 24:12-14) Ọ bụ Ribeka bịara mee ihe a niile. Chegodị otú obi dị Ribeka ma ọ bụrụ na e nwere ebe ọ nọ na-ege ihe a Elịiza na-akọrọ ndị ezinụlọ ha.

Ihe a Elịiza kọrọ metụrụ Betuel na Leban n’ahụ́, ha asị: “Ihe a si n’aka Jehova.” Ebe ọ bụ na omenala ha kwadoro ka nne na nna kpebie onye nwa ha ga-alụ, ha kwetara ka Aịzik lụwa Ribeka. (Jenesis 24:50-54) Ma, nke a ọ̀ pụtara na Ribeka ga-ekwetarịrị ihe a ha kwuru?

N’ụlọ Ebreham, tupu Elịiza abịawa ije a, ọ jụrụ Ebreham, sị: “Ọ́ bụrụkwanụ na nwaanyị ahụ ekweghị iso m bịa?” Ebreham asị ya: “Ị ga-enwere onwe gị n’iyi ị ṅụụrụ m.” (Jenesis 24:39, 41) N’ụlọ Betuel kwa, ọ bụghị iwu na Ribeka ga-ekweta ihe ndị mụrụ ya kpebiri n’okwu a. Ma, obi dị Elịiza ezigbo ụtọ na ije ya nwere isi. Ọ bụ ya mere na mgbe chi bọrọ, ọ jụrụ ma ya nwere ike ịkpọrọ Ribeka lawa Kenan ozugbo. Ma, ndị ezinụlọ Ribeka chọrọ ka ya na ha nọtụkwuo, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ruo abalị iri ọzọ. N’ikpeazụ, ha sịrị: “Ka anyị kpọọ nwa agbọghọ ahụ jụọ ya ka o jiri ọnụ ya kwuo.”—Jenesis 24:57.

Ihe ọ bụla Ribeka zara ugbu a ga-emetụta ndụ ya. Gịnịkwanụ ka ọ ga-aza ha? Ọ̀ ga-eji maka ihe papa ya hà kwuru jụ iso nwoke ahụ na-ejere Ebreham ozi gaa biri ebe ọ na-amaghị? Ka ọ̀ ga-ele ya anya na ihe ọma meere ya ma o soro mezuo ihe a doro anya na ọ bụ Jehova na-eduzi? Ihe ọ zara gosiri otú obi dị ya n’ihe a ga-agbanwe ndụ ya n’otu ntabi anya, nke nwekwara ike ịna-echegbu ya. Ọ zara ha, sị: “Achọrọ m iso ya laa.”—Jenesis 24:58.

Ihe a Ribeka zara gosiri na o nwere okwukwe pụrụ iche. Ọ bụ eziokwu na otú e si alụ nwaanyị n’obodo anyị taa nwere ike ịdị iche, ma o nwere ihe anyị ga-amụta n’aka Ribeka. Ihe kacha ya mkpa abụghị ihe ọ chọrọ, kama ihe Jehova, bụ́ Chineke ya, chọrọ. Anyị chọwa onye anyị ga-alụ, ihe Chineke kwuru ga-akacha abara anyị uru otú ọ baara Ribeka. Ihe Okwu Chineke kwuru gbasara ihe anyị ga-eme ka anyị bụrụ ezigbo di ma ọ bụ ezigbo nwunye ka bakwara uru taa. (2 Ndị Kọrịnt 6:14, 15;  Ndị Efesọs 5:28-33) Anyị kwesịrị ịmụta ime ka Ribeka ma na-agbalị eme ihe otú Chineke chọrọ.

“ÒNYE BỤ NWOKE AHỤ?”

Betuel na ezinụlọ ya gọziri Ribeka nwa ha nwaanyị ha hụrụ n’anya. Ribeka na ụfọdụ ụmụ agbọghọ na-ejere ya ozi na Debora, onye lekọtara ya mgbe ọ dị obere, sozi Elịiza hà lawa. (Jenesis 24:59-61; 35:8) O teghị aka, ha apụọ na Heran. Ebe ha na-aga ruru ihe dị ka narị kilomita asatọ. O wekwara ha ihe dị ka izu atọ tupu ha agaruo. Ọ ga-abụ na njem ahụ adịghịrị ha mfe. Ribeka ahụla ọtụtụ kamel ná ndụ ya, ma ọ ga-abụ na ịnọ n’elu kamel amabeghị ya ahụ́ n’ihi na ihe Baịbụl kwuru bụ na ndị ezinụlọ ha na-azụ atụrụ, o kwughị na ha bụ ndị ahịa na-eji kamel aga ebe dị iche iche. (Jenesis 29:10) Ịnọ n’elu kamel na-enye ndị ọ na-amabeghị ahụ́ nsogbu, ọ bụrụgodị na ebe o bu ha aga eteghị aka.

N’agbanyeghị otú njem ha si dịrị, o doro anya na Ribeka chọsiri ike ịma gbasara Aịzik na ezinụlọ ha. Ọ ga-abụ na ọ jụrụ Elịiza ajụjụ gbasara ha. Weregodị ya na ị na-ahụ ha n’ime abalị n’otu ebe ha kwụsịtụrụ, kwanye ọkụ n’èzí, agadi nwoke ahụ ana-akọrọ ya banyere nkwa Jehova kwere Ebreham, na ọ bụ n’ezinụlọ ya ka a ga-esi amụta onye ga-ewetara ndị niile nọ́ n’ụwa ngọzi. Chegodị otú obi dị Ribeka mgbe ọ ghọtara na ọ bụ n’ezinụlọ onye ga-alụ ya ka a ga-esi amụta onye Jehova ga-eji mezuo nkwa ya.—Jenesis 22:15-18.

Ribeka mere ihe gosiri na ọ dị umeala n’obi

N’ikpeazụ, ha rutere Negeb. Ka ha na-erute ebe ahụ n’isi ụtụtụ, Ribeka lepụrụ anya hụ ka otu nwoke nọ na-ejegharị n’ọhịa. Nwoke ahụ yiri onye na-atụgharị uche. Ribeka “si na kamel ahụ wụtuo” ozugbo. O nwere ike o cheghịdị ka kamel bú ya sekpuru ala. Mgbe ọ wụturu, ya ajụọ Elịiza, sị: “Ònye bụ nwoke ahụ si n’ọhịa na-abịa izute anyị?” Mgbe ọ gwara ya na ọ bụ Aịzik, o weere ákwà isi kpuchie onwe ya. (Jenesis 24:62-65) Maka gịnị? Ọ bụ iji kwanyere di ga-alụ ya ùgwù. Ihe a o mere nwere ike iyi ụfọdụ ndị ka ihe ndị mgbe ochie. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ma ànyị bụ nwoke ma ànyị bụ nwaanyị, anyị nwere ike ịmụta ihe n’otú Ribeka si dị umeala n’obi n’ihi na àgwà a dị anyị niile mkpa.

N’oge ahụ, Aịzik dị ihe dị ka afọ iri anọ. Ọ ka na-eru uju Sera nne ya nwụrụ ihe dị ka afọ atọ gara aga. Ihe a gosiri na Aịzik bụ nwoke ihe na-emetụ n’obi. N’eziokwu, ọ bụ ihe ọma meere Aịzik na ọ lụtara Ribeka, bụ́ nwaanyị gbasiri ike, na-ele ọbịa nke ọma ma dị umeala n’obi. Ma ihe ọ̀ dabakwaara ha abụọ? Baịbụl kwuru, sị: “[Aịzik] wee hụ ya n’anya.”—Jenesis 24:67; 26:8

Ọ bụ eziokwu na o ruola ihe dị ka puku afọ atọ na narị itoolu ihe a mere, anyị gụọ akụkọ a, anyị ga-ahụkwa Ribeka n’anya n’ihi otú o si kata obi, gbasie ike, na-ele ọbịa nke ọma, dịkwa umeala n’obi. Anyị niile, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị, ma ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye ma ndị na-alụbeghị, kwesịrị iṅomi okwukwe ya.

^ para. 10 Ọ bụ ná mgbede ka ihe a na-eme. Baịbụl ekwughịkwanụ ihe gosiri na Ribeka nọrọ ọtụtụ awa n’olulu mmiri ahụ. O kwughị na ndị ezinụlọ Ribeka hà ehiwela ụra mgbe ọ lọtara ma ọ bụ na mmadụ chọọrọ ya bịa ka ọ mara ihe mere o ji nọtee aka.

^ para. 15 A kpọghị Elịiza aha n’akụkọ a. Ma, ọ ga-abụ ya bụ onye ahụ na-ejere Ebreham ozi. Ọ bụ Elịiza ka Ebreham bubu n’obi inyefe ihe niile o nwere ma ọ bụrụ na yanwa bụ́ Ebreham amụtaghị nwa. O doro anya na ọ bụ ya kacha mee okenye ná ndị niile na-ejere Ebreham ozi, ọ bụkwa ya ka Ebreham kacha tụkwasị obi. Ọ bụkwa otú a ka e si kọwaa onye ahụ na-ejere Ebreham ozi n’akụkọ a.—Jenesis 15:2; 24:2-4.