Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Nke 3 n'Afọ 2016

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ònye bụ nna Josef?

Josef bụ ọkwá nkà n’obodo Nazaret. Ọ bụ ya bụ nna Jizọs n’ụwa. Ma, ònye bụ nna Josef? Mgbe Matiu na Luk na-ede ezinụlọ Jizọs si, Matiu dere na nna Josef bụ Jekọb, ma, Luk dere na Josef bụ “nwa Hilaị.” Gịnịzi mere ihe Matiu dere ji dị iche n’ihe Luk dere?—Luk 3:23; Matiu 1:16.

Matiu dere, sị: “Jekọb amụọ Josef.” N’asụsụ Grik, ihe a o dere gosiri na ọ bụ Jekọb mụrụ Josef. Ihe ọ pụtara bụ na Matiu si n’ezinụlọ ndị nna nna Josef, bụ́ ezinụlọ Eze Devid, kpọrọ aha onye mụrụ onye ọ mụrụ rute na Jizọs. O si otú ahụ gosi na Jizọs ruru eru iketa ocheeze Devid.

Ma, Luk dere, sị: “Josef, nwa Hilaị.” Mgbe ụfọdụ, nna nwunye mmadụ hụ “ọgọ ya nwoke,” ya akpọọ ya “nwa” ya. Ọ bụ ụdị ihe ahụ ka anyị ga-agụta na Luk 3:27. E dere ebe ahụ na Shieltiel bụ “nwa Niraị.” Ma, nna mụrụ Shieltiel bụ Jekonaya. (1 Ihe E Mere 3:17; Matiu 1:12) Ọ ga-abụ na Shieltiel lụrụ nwa Niraị Baịbụl na-akpọghị aha ya, ya na ya abụrụzie ọgọ. Ọ bụkwa otú ahụ ka Josef si bụrụ “nwa” Hilaị, n’ihi na ọ lụrụ Meri nwa Hilaị. Ọ pụtara na Luk si n’ezinụlọ ndị nna nna Meri, bụ́ nne Jizọs “dị ka anụ ahụ́ si dị,” kpọrọ aha onye mụrụ onye ọ mụrụ rute na Jizọs. (Ndị Rom 1:3) Ihe ọ pụtara bụ na Baịbụl gwara anyị gbasara ezinụlọ e si mụta Jizọs, ma ndị ezinụlọ nna ya n’ụwa ma ndị ezinụlọ nne ya.

Olee ụdị ákwà na ihe e ji esiji ákwà e nwere n’oge ochie?

Ajị anụ e sijiri esiji a hụrụ n’ọgba d nso n’oké osimiri nnu. e dere na e sijiri ya tupu afọ 135

N’Izrel oge ochie na ná mba ndị gbara ya gburugburu, a na-eji ajị atụrụ, ajị ewu na ajị kamel emepụta ákwà. Ma, nke a kacha eji emepụta ákwà n’oge ahụ bụ ajị atụrụ. N’ọtụtụ ebe na Baịbụl, e kwuru gbasara atụrụ, ịkpacha ajị, nakwa uwe e ji ajị mee. (1 Samuel 25:2; 2 Ndị Eze 3:4; Job 31:20) Ahịhịa e ji emepụta ákwà linin dị n’Ijipt nakwa n’Izrel. (Jenesis 41:42; Jọshụa 2:6) Ọ ga-abụ na ndị Izrel anaghị akọ ogho. Ma, Baịbụl kwuru na ndị Peshia na-eji ogho eme ihe dị iche iche. (Esta 1:6) Ákwà silk ­na-ada oké ọnụ, o yikwara ka ọ̀ bụ naanị ndị ahịa sí Eshia na-ere ya.Mkpughe 18:11, 12.

Otu akwụkwọ a kpọrọ Jesus and His World, kwuru, sị: “Ajị anụ na-enwe ụcha dị iche iche. E nwere ndị na-acha ọcha, nweekwa ndị tụrụ àgwà.” A na-esijikarịkwa ajị anụ esiji. A na-esi n’ụfọdụ eju enweta ihe na-acha odo odo e ji esiji ákwà. Ọ na-adakwa oké ọnụ. A na-esikwa n’osisi dị iche iche, mgbọrọgwụ, mkpá akwụkwọ, na ụmụ ahụhụ dị iche iche enweta ihe e ji esiji ákwà ka o jiwe oji, chawa ọbara ọbara, odo odo, ma ọ bụ anụnụ anụnụ.