“Obi ụtọ na-adịrị ndị Chineke ha bụ Jehova!”​—⁠ỌMA 144:15.

ABỤ: 44, 125

1. Gịnị mere Ndịàmà Jehova ji enwe obi ụtọ? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

NDỊÀMÀ JEHOVA na-enwe ezigbo obi ụtọ. Mgbe ọ bụla ha zụkọrọ ma ọ̀ bụ n’ọmụmụ ihe, mgbakọ, ma ọ̀ bụ ná nnọkọ oriri, ha na ibe ha na-ekwurịta okwu, na-achịkwa ọchị. Olee ihe mere ha ji enwe ezigbo obi ụtọ? Ihe kpatara ya bụ na ha maara Jehova, bụ́ ‘Chineke onye obi ụtọ.’ Ha na-efe ya ma na-agbalị iṅomi ya. (1 Tim. 1:11; Ọma 16:11) Ebe ọ bụ na Chineke bụ onye obi ụtọ, ọ chọrọ ka anyị na-enwe obi ụtọ, nyekwa anyị ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji na-enwe obi ụtọ.​—⁠Diut. 12:7; Ekli. 3:​12, 13.

2, 3. (a) Gịnị ka mmadụ inwe obi ụtọ pụtara? (b) Olee ihe nwere ike ime ka o siere anyị ike inwe obi ụtọ?

2 Gịnwa kwanụ? Ị̀ na-enwe obi ụtọ? Ì nwere ike ịna-enwekwu obi ụtọ? A sị na mmadụ nwere obi ụtọ, ọ pụtara na obi dị onye ahụ mma, na ndụ ya juru ya afọ, ma ọ bụkwanụ na ọ na-aṅụrị ezigbo ọṅụ. Ihe Baịbụl kwuru gosiri na ọ bụ naanị ndị ha na Jehova dị ná mma ga-enweli ezigbo obi ụtọ. O nwere ike isiri anyị ike inwe obi ụtọ n’ụwa taa. N’ihi gịnị?

3 O nwere ike isiri anyị ike inwe obi ụtọ mgbe mmadụ nwụnahụrụ anyị, mgbe a chụrụ onye anyị hụrụ n’anya n’ọgbakọ,  mgbe anyị na di ma ọ bụ nwunye anyị gbara alụkwaghịm, ma ọ bụkwanụ a chụọ anyị n’ọrụ. Ihe ọzọ nwere ike ime ka o siere anyị ike ịna-enwe obi ụtọ bụ mgbe ihe na-ada ájá ájá n’ezinụlọ, mgbe ndị ọrụ ibe anyị ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe anyị na-akwa anyị emo, ma ọ bụkwanụ mgbe a na-akpagbu anyị ma ọ bụ tụọ anyị mkpọrọ n’ihi na anyị na-efe Jehova. Ọrịa anyị na-arịa nwekwara ike ịka njọ, ma ọ bụ anyị arịawa ọrịa na-anaghị ala ala, ma ọ bụkwanụ daa mbà n’obi. Ma cheta na Jizọs Kraịst, “onye obi ụtọ ahụ na onye naanị ya bụ Eze Ukwu,” chọrọ inyere ndị mmadụ aka ma mee ka ha na-enwe obi ụtọ. (1 Tim. 6:15; Mat. 11:​28-30) N’Ozizi Elu Ugwu Jizọs, o kwuru ọtụtụ àgwà ndị ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị na ụwa Setan na-echi anyị ọnụ n’ala.

ANYỊ NA CHINEKE ỊDỊ NÁ MMA BỤ IHE GA-AKACHA EME KA ANYỊ NA-ENWE OBI ỤTỌ

4, 5. Olee otú anyị ga-esi nweta obi ụtọ ma nọgide na-enwe ya?

4 Ihe mbụ Jizọs kwuru dị ezigbo mkpa. Ọ sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha, n’ihi na alaeze eluigwe bụ nke ha.” (Mat. 5:⁠3) Anyị mara mkpa ime mmụọ anyị, anyị ga-aghọta na anyị kwesịrị ịmata onye Chineke bụ, ghọtakwa na ọ bụ ya kwesịrị iduzi anyị ma na-enyere anyị aka. Olee otú anyị nwere ike isi mata mkpa ime mmụọ anyị? Ọ bụ ịmụ Baịbụl, irubere Chineke isi, na ime ka ofufe ya bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ anyị. Ime ihe ndị a ga-enyere anyị aka ịna-enwe obi ụtọ. Ọ ga-emekwa ka okwukwe anyị sikwuo ike na Chineke ga-emezu nkwa ya n’oge na-adịghị anya. “Olileanya ahụ nke na-enye obi ụtọ” anyị na-ahụ na Baịbụl, ga-enyere anyị aka idi nsogbu ndị nwere ike ịbịara anyị.​—⁠Taị. 2:⁠13.

5 Ihe ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ mgbe niile bụ ime ka anyị na Jehova na-adịkwu ná mma. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe niile n’ime Onyenwe anyị [Jehova]. Aga m asị ọzọ, Na-aṅụrịnụ ọṅụ!” (Fil. 4:⁠4) Ka anyị na Jehova nwee ike ịna-adị ná mma, anyị kwesịrị inwe amamihe Chineke. Baịbụl kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị onye chọtaworo amamihe, na onye nwetara nghọta, ọ bụụrụ ndị na-ejide ya aka osisi nke ndụ, ndị na-ejidesikwa ya aka ike ka a ga-akpọ ndị obi ụtọ.”​—⁠Ilu 3:​13, 18.

6. Gịnị ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ mgbe niile?

6 Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ inwe obi ụtọ mgbe niile, anyị kwesịrị ịna-agụ Baịbụl ma na-eme ihe anyị na-amụta na ya. Jizọs kwuru na ọ dị ezigbo mkpa ka anyị na-eme ihe ndị anyị na-amụta na Baịbụl. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na unu maara ihe ndị a, unu ga-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na unu ana-eme ha.” (Jọn 13:17; gụọ Jems 1:25.) Ihe a Jizọs kwuru dị ezigbo mkpa ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na Chineke dịrị ná mma, anyị ana-enwekwa obi ụtọ. Ma, olee otú anyị ga-esi na-enwe obi ụtọ ebe ọ bụ na e nwere ọtụtụ ihe na-eme ka anyị ghara ịna-enwe obi ụtọ? Ka anyị tụlee ihe ọzọ Jizọs kwuru n’Ozizi Elu Ugwu ya.

ÀGWÀ NDỊ GA-EME KA ANYỊ NA-ENWE OBI ỤTỌ

7. Olee otú ndị na-eru uju ga-esi na-enwe obi ụtọ?

7 “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eru uju, n’ihi na a ga-akasi ha obi.” (Mat. 5:⁠4) Ụfọdụ nwere ike ịna-eche, sị, ‘Olee otú ndị na-eru uju ga-esi na-enwe obi ụtọ?’ Jizọs anaghị ekwu gbasara ndị niile na-eru uju. Ọtụtụ ndị ọjọọ na-eru uju ma ọ bụ obi ana-ajọ ha njọ n’ihi na ihe na-esiri ha ike “n’oge ikpeazụ” a “tara akpụ.” (2 Tim.  3:⁠1) Ma, ihe mere ha ji eru uju bụ n’ihi na ha na-eche gbasara onwe ha, ọ bụghị gbasara Jehova. N’ihi ya, ha na ya adịghị ná mma, ha agaghịkwanụ enwe obi ụtọ. Ndị Jizọs bu n’obi bụ ndị maara mkpa ime mmụọ ha. Ha na-eru uju n’ihi na ọtụtụ ndị ajụla Chineke ma ọ bụ ghara ịna-eme ihe ọ chọrọ. Ha makwa na ha bụ ndị mmehie, ha na-ahụkwa ihe ndị jọgburu onwe ha na-eme n’ụwa taa. Jehova ma ndị na-eru ezigbo uju. Ọ na-eji Okwu ya na-akasi ha obi, na-eme ka ha na-enwe obi ụtọ, na-emekwa ka ha nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi.​—⁠Gụọ Ezikiel 5:11; 9:⁠4.

8. Olee otú mmadụ ịdị nwayọọ n’obi ga-esi eme ka ọ na-enwe obi ụtọ?

8 “Obi ụtọ na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi, n’ihi na ha ga-eketa ụwa.” (Mat. 5:⁠5) Olee otú mmadụ ịdị nwayọọ n’obi ga-esi eme ka onye ahụ na-enwe obi ụtọ? Ụfọdụ ndị bụbu ndị na-akparị mmadụ, na-emekwa ihe ara ara, bụ́kwanụ ihe na-akpata nsogbu. Ma mgbe ha mụtara eziokwu Baịbụl, ha agbanwee ma ‘yiri mmadụ ọhụrụ ahụ.’ Ma ugbu a, ha na-enwezi ‘ọmịiko, dịrị obiọma, dịrị umeala n’obi, dịrị nwayọọ, ma na-enwe ndidi.’ (Kọl. 3:​9-12) Ọ bụ ya mere ha ji enwe udo, ha na ndị ọzọ adịrị n’ezigbo mma, ha ana-enwekwa obi ụtọ. Baịbụl kwukwara na ha “ga-enweta ụwa.”​—⁠Ọma 37:​8-10, 29.

9. (a) Olee otú ndị dị nwayọọ n’obi ga-esi ‘eketa ụwa’? (b) Gịnị mere ‘ndị agụụ na-agụ na ndị akpịrị na-akpọ nkụ maka ezi omume’ ji aṅụrị ọṅụ?

9 Olee otú ndị dị nwayọọ n’obi ga-esi ‘eketa ụwa’? Ndị na-eso ụzọ Jizọs e tere mmanụ ga-eketa ụwa mgbe ha na-achị ụwa ka ndị eze na ndị nchụàjà. (Mkpu. 20:⁠6) Ma, ọtụtụ nde ndị ọzọ ndị a na-akpọghị ịga eluigwe ga-eketa ụwa mgbe ha ga-ebi na ya ruo mgbe ebighị ebi. Ha ga-ezu okè, nwee udo na obi ụtọ. Ndị e tere mmanụ na atụrụ ọzọ bụ ndị Jizọs kwuru banyere ha, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị agụụ na-agụ, ndị akpịrị na-akpọkwa nkụ maka ezi omume.” (Mat. 5:⁠6) Mgbe Jehova ga-ebibi ndị ọjọọ, ha ga na-eme ezi omume na-agụsi ha agụụ ike ịna-eme. (2 Pita 3:13) Mgbe Chineke wepụchara ihe ọjọọ niile, mmebi iwu na mmehie agaghịzi eme ka ndị ezi omume ghara ịna-enwe obi ụtọ.​—⁠Ọma 37:⁠17.

10. Olee ihe ime ebere pụtara?

10 “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eme ebere, n’ihi na a ga-emere ha ebere.” (Mat. 5:⁠7) Ime ebere pụtara ịdị obiọma na inwe ọmịiko, ya bụ, ihe banyere ndị na-ata ahụhụ imetụ mmadụ n’obi. Ma, ime ebere abụghị naanị ihe imetụ mmadụ n’obi. Baịbụl na-akụzi na ime ihe iji nyere ndị ọzọ aka so n’ime ebere.

11. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe atụ Jizọs mere banyere onye Sameria bụ́ onye agbata obi?

11 Gụọ Luk 10:​30-37. Ihe atụ Jizọs mere banyere onye Sameria bụ́ ezigbo onye agbata obi gosiri ihe ime ebere pụtara. Onye Sameria ahụ nweere nwoke ahụ e merụrụ ahụ́ ọmịiko, metekwara ya ebere. Ọ bụ ya mere o ji mee ihe iji nyere ya aka. Mgbe Jizọs mechara ihe atụ ahụ, ọ sịrị: “Gawa, gị onwe gị, na-emekwa otú ahụ.” N’ihi ya, anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘M̀ na-eme otú ahụ? M̀ na-eme ihe onye Sameria ahụ nwere ọmịiko mere? Mgbe ndị ọzọ na-ata ahụhụ, m̀ na-emetere ha ebere? M̀ nwere ike imekwu ihe iji nyere ha aka? Dị ka ihe atụ, oleekwanụ maka ndị agadi nọ n’ọgbakọ anyị, ụmụ nwaanyị isi mkpe, na ụmụaka ndị mụrụ ha na-abụghị Ndịàmà Jehova? M̀ nwere ike inyere ha aka? M̀ nwere ike ‘ịgụgụ mkpụrụ obi dara mbà’?​—⁠1 Tesa. 5:14; Jems 1:⁠27.

Na-emere ndị mmadụ ebere, ị ga-ahụ otú ị ga-esi na-enwe obi ụtọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12)

12. Olee otú ime ebere ga-esi mee ka anyị na-enwe obi ụtọ?

 12 Oleezi otú ime ebere ga-esi eme ka anyị na-enwe obi ụtọ? Mgbe anyị meere ndị mmadụ ebere, anyị na-enye ihe. Jizọs kwukwara na inye ihe ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ. Nke kachanụ bụ na anyị na-eme ihe dị Jehova mma. (Ọrụ 20:35; gụọ Ndị Hibru 13:16.) Eze Devid kwuru banyere onye na-eme ebere, sị: “Jehova ga-eche ya nche ma chebe ya ndụ. A ga-akpọ ya onye obi ụtọ n’ụwa.” (Ọma 41:​1, 2) Ọ bụrụ na anyị ana-emere ndị mmadụ ebere ma na-enwere ha ọmịiko, Jehova ga-emere anyị ebere, anyị ga-enwekwa obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi.​—⁠Jems 2:13.

IHE MERE “NDỊ DỊ ỌCHA N’OBI” GA-EJI NA-ENWE OBI ỤTỌ

13, 14. Olee otú ndị dị ọcha n’obi ga-esi na-enwe obi ụtọ?

13 Jizọs kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị dị ọcha n’obi, n’ihi na ha ga-ahụ Chineke.” (Mat. 5:⁠8) Ka anyị nwee ike ịdị ọcha n’obi, ihe ndị anyị na-eche n’echiche na ihe ndị na-agụ anyị agụụ kwesịrị ịbụ ihe ndị dị ọcha. Anyị kwesịrị ime ka obi anyị dịrị ọcha ka a ghara inwe ihe ọ bụla ga-akpa ofufe anyị na-efe Jehova aka ọjọọ.​—⁠Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 4:2; 1 Tim. 1:⁠5.

14 Ndị dị ọcha n’obi na Jehova ga na-adị ná mma. Jehova kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị sara uwe mwụda ha.” (Mkpu. 22:14) Olee otú ha si saa “uwe mwụda ha”? Mgbe e kwuru na Ndị Kraịst e tere mmanụ sara uwe mwụda ha, ọ pụtara na ha dị ọcha n’anya Chineke. Chineke ga-eme ka ha ghara ịnwụ anwụ n’eluigwe, meekwa ka ha na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi. Oké ìgwè mmadụ, ndị nwere olileanya ibi n’ụwa na Chineke nwekwara ike ịbụ enyi n’ihi na o weere ha ka ndị ezi omume. Ugbu a, ha ‘na-asa uwe mwụda ha, na-emekwa ka ọ na-acha ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ.’​—⁠Mkpu. 7:​9, 13, 14.

15, 16. Olee otú ndị dị ọcha n’obi ga-esi ‘ahụ Chineke’?

15 Ma, olee otú ndị dị ọcha n’obi ga-esi ‘ahụ Chineke,’ ebe ọ bụkwanụ na “ọ dịghị mmadụ ga-ahụ ihu [Chineke] ma dị ndụ”? (Ọpụ. 33:20) Okwu Grik e si sụgharịa ‘ịhụ’ nwere ike ịpụta “iji uche ahụ ihe, ịghọta ihe, na ịmata ihe.” Ndị ji “anya nke obi” ha ahụ Chineke bụ ndị ma ya nke ọma na ndị àgwà ya na-amasị. (Efe. 1:18) Jizọs ṅomiri àgwà Chineke nke ọma. Ọ bụ ya mere o ji kwuo, sị: “Onye hụrụ m ahụwokwa Nna m.”​—⁠Jọn 14:​7-9.

16 E wezụga ịmata àgwà Chineke, ndị na-efe Chineke nwere ike ‘ịhụ Chineke’ ma ha na-ahụ ihe ndị ọ na-emere ha. (Job 42:⁠5) Ha na-elekwasịkwa “anya nke obi” ha n’ihe ndị magburu onwe ya ọ ga-emere ndị na-agbalị ịnọgide na-adị ọcha ma na-efe ya. N’eziokwu, ndị e tere mmanụ ga-eji anya ha ahụ Jehova  mgbe a ga-akpọlite ha n’ọnwụ ha agaa eluigwe.​—⁠1 Jọn 3:⁠2.

INWE OBI ỤTỌ N’AGBANYEGHỊ IHE ISI IKE

17. Olee otú ime udo ga-esi eme ka anyị na-enwe obi ụtọ?

17 Jizọs kwukwara, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eme udo.” (Mat. 5:⁠9) Ndị na-agbalị ka ha na-eme udo na-enwe obi ụtọ. Jems onye na-eso ụzọ Jizọs kwuru, sị: “A na-aghakwa mkpụrụ nke ezi omume n’ebe udo dị maka ndị na-eme udo.” (Jems 3:18) E nwee onye ezinụlọ anyị ma ọ bụ nwanna anyị na ya nwere nghọtahie, anyị nwere ike ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka ime udo. Anyị mee otú ahụ, Jehova ga-enye anyị mmụọ ya nke ga-eme ka anyị na-akpa àgwà ka Ndị Kraịst ma na-enwe obi ụtọ. Jizọs kwuru na ọ dị mkpa ka anyị na-ebute ụzọ n’ime udo. Ọ sịrị: “Ya mere, ọ bụrụ na i ji onyinye gị gaa n’ebe ịchụàjà, i wee nọrọ n’ebe ahụ cheta na obi adịghị nwanne gị mma n’ebe ị nọ, hapụ onyinye gị n’ebe ahụ n’ihu ebe ịchụàjà gawa; buru ụzọ mee ka gị na nwanne gị dị n’udo, mgbe ị bịaghachikwara, nye onyinye gị.”​—⁠Mat. 5:​23, 24.

18, 19. Gịnị mere Ndị Kraịst ga-eji na-aṅụrị ọṅụ ọ bụrụgodị na a na-akpagbu ha?

18 “Obi ụtọ na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu ma na-akpagbu unu, na-aghagide unu ụgha, na-ekwukwa ụdị ihe ọjọọ niile megide unu n’ihi m.” Gịnị ka ihe a Jizọs kwuru pụtara? O kwukwara, sị: “Ṅụrịanụ ọṅụ, nweekwanụ obi ụtọ nke ukwuu, n’ihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu n’eluigwe; n’ihi na otú ahụ ka ha kpagburu ndị amụma bu unu ụzọ.” (Mat. 5:​11, 12) Mgbe a pịara ndịozi ihe ma nye ha iwu ka ha ghara ikwusa ozi ọma, “ha si n’ihu Sanhedrin ahụ pụọ, na-aṅụrị ọṅụ.” Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị na ihe a pịara ha tọrọ ha ụtọ. Ma, ha ṅụrịrị ọṅụ “n’ihi na a gụwo ha ná ndị ruru eru ịbụ ndị a ga-emenye ihere n’ihi aha [Jizọs].”​—⁠Ọrụ 5:⁠41.

19 N’oge anyị a, ndị na-efe Jehova na-eji ọṅụ edi ahụhụ a na-ata ha n’ihi aha Jizọs, na-ejikwa ọṅụ edi ọnwụnwa tara akpụ bịaara ha. (Gụọ Jems 1:​2-4.) Ọ naghị atọ anyị ụtọ ka anyị na-ata ahụhụ ma ọ bụ ka a na-akpagbu anyị otú ahụ ọ na-atọghị ndịozi Jizọs. Ma, ọ bụrụ na anyị anọgide na-efe Chineke n’agbanyeghị mkpagbu, ọ ga-enye anyị ike anyị ga-eji na-edi ya. Dị ka ihe atụ, n’ọnwa Ọgọst afọ 1944, ndị ọchịchị aka ike kpọgara Nwanna Henryk Dornik na nwanne ya nwoke n’ogige ịta ahụhụ. Ma, ndị na-emegide ha kwuru, sị: “E nweghị ike ịmanye ha ime ihe ha na-achọghị ime. Ọ na-atọ ha ụtọ ka e gbuo ha n’ihi okwukwe ha.” Nwanna Dornik kwuru, sị: “Ọ bụ eziokwu na achọghị m ịghọ onye e gburu n’ihi okwukwe ya, iji obi ike na-ata ahụhụ na ùgwù a na-akwanyere m n’ihi irubere Jehova isi nyere m ọṅụ. . . . Ikpesi ekpere ike mekwara ka m bịarukwuo Jehova nso, Jehova gosikwara na ya bụ Onye enyemaka e nwere ike ịtụkwasị obi.”

20. Gịnị mere obi ji atọ anyị ụtọ ife “Chineke bụ́ onye obi ụtọ”?

20 Mgbe ihe anyị na-amasị “Chineke bụ́ onye obi ụtọ,” obi ga na-atọ anyị ụtọ n’agbanyeghị mmegide a na-emegide anyị n’ihi okpukpe anyị, ọrịa, nká ma ọ bụ na ndị ezinụlọ anyị na-emegide anyị. (1 Tim. 1:11) Obi na-atọkwa anyị ụtọ n’ihi na Chineke, “onye na-apụghị ịgha ụgha,” kwere anyị nkwa ndị magburu onwe ha. (Taị. 1:⁠2) Mgbe Jehova ga-emezu nkwa ndị a, anyị agatụdịghị echeta ahụhụ ndị anyị na-ata taa. Na Paradaịs na-abịanụ, Jehova ga-agọzi anyị otú anyị na-enweghị ike ichetụ n’echiche. Anyị ga-enwe obi ụtọ na-enweghị atụ. N’eziokwu, anyị ‘ga-enwe obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.’​—⁠Ọma 37:11.