“Ịhụnanya na-ewuli elu.”​—⁠1 KỌR. 8:⁠1.

ABỤ: 109, 121

1. Olee ihe dị mkpa Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya n’abalị ikpeazụ ya na ha nọ?

N’ABALỊ ikpeazụ Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nọrọ, o kwuru banyere ịhụnanya ihe fọrọ obere ka o ruo ugboro iri atọ. Jizọs kwuru hoo haa na ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ‘ịhụrịta ibe ha n’anya.’ (Jọn 15:​12, 17) Otú ha si hụ ibe ha n’anya ga-eme ka ndị mmadụ mata na ha bụ ezigbo ndị na-eso ụzọ ya. (Jọn 13:​34, 35) Ịhụnanya a abụghị naanị otú obi na-adị mmadụ. Ọ bụ ezigbo àgwà nke na-eme ka mmadụ na-eme ihe ndị ga-abara ndị ọzọ uru. Jizọs kwuru, sị: “Ọ dịghị onye nwere ịhụnanya karịrị nke a, na mmadụ ga-atọgbọ mkpụrụ obi ya n’ihi ndị enyi ya. Unu bụ ndị enyi m ma ọ bụrụ na unu emee ihe m na-enye unu n’iwu.”​—⁠Jọn 15:​13, 14.

2. (a) Olee ihe e ji mara ndị ohu Chineke taa? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?

2 Otú ndị na-efe Jehova taa si hụ ibe ha n’anya ma dịrị n’otu na-eme ka ndị mmadụ mata na ha bụ ndị ohu Chineke. (1 Jọn 3:​10, 11) Obi na-atọ anyị ụtọ na ndị ohu Jehova taa hụrụ ibe ha n’anya otú ahụ Jizọs kwuru, n’agbanyeghị obodo ha, agbụrụ ha, asụsụ ha ma ọ bụ otú e si zụlite ha. Ma, anyị nwere ike ịna-ajụ, sị: ‘Gịnị mere ịhụnanya ji dị ezigbo  mkpa taa? Olee otú Jehova na Jizọs si e ji ịhụnanya ewuli anyị elu? Olee otú onye ọ bụla n’ime anyị ga-esi egosi ịhụnanya nke “na-ewuli elu”?’​—⁠1 Kọr. 8:⁠1.

IHE MERE ỊHỤNANYA JI DỊ EZIGBO MKPA TAA

3. Olee aka ‘oge a dị oké egwu’ na-akpa ndị mmadụ?

3 Anyị bi ‘n’oge dị oké egwu,’ ndụ anyị ‘jupụtakwara ná nsogbu na ihe ọjọọ.’ (Ọma 90:10; 2 Tim. 3:​1-5) Ọtụtụ ndị na-atagbu onwe ha n’ahụhụ nke na ha chọrọ ka ọnwụ bịa gburu ha. Ihe karịrị narị puku mmadụ asatọ na-egbu onwe ha kwa afọ. Ihe ọ pụtara bụ na ihe dị ka otu mmadụ na-egbu onwe ya n’ime tịnkọm tịnkọm iri anọ ọ bụla. Ọ dị mwute na ụfọdụ ụmụnna anyị achọọla ka ọnwụ bịa gburu ha, ha emechaa gbuo onwe ha.

4. Olee ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl kwuru ka ọnwụ bịa gburu ha?

4 N’oge Baịbụl, nsogbu ụfọdụ ndị ohu Chineke nwere mere ka obi na-ajọ ha ezigbo njọ nke na ha chọrọ ka ọnwụ bịa gburu ha. Dị ka ihe atụ, mgbe ahụ́ na-egbu Job ezigbo mgbu nke mere ka ọ chọọ ịnwụ, o kwuru, sị: “Mkpụrụ obi m akpọwo ndụ m asị.” (Job 10:1; 14:13) Obi adịghị Jona mma n’ihi otú egwú si dagharịa n’ozi o jere, ya emee ka o kwuo, sị: “Ugbu a, Jehova, biko, wepụ mkpụrụ obi m, n’ihi na ọ kaara m mma ịnwụ anwụ karịa na m dị ndụ.” (Jona 4:⁠3) Otú ahụ ka ọ dịkwa Ịlaịja onye amụma. Nsogbu ndị bịaara ya mere ka ọ rịọ Jehova ka o mee ka ọ nwụọ. Ọ sịrị: “O zuwo! Ugbu a, Jehova, wepụ mkpụrụ obi m.” (1 Eze 19:⁠4) Ma, Jehova hụrụ ndị ohu ya ndị a n’anya nke na ọ chọrọ ka ha dịrị ndụ. Jehova akatọghị ha maka otú o si dịrị ha n’obi. Kama, o nyeere ha aka ka ndụ malitekwa ịtọ ha ụtọ ka ha nwee ike ịnọgide na-efe ya.

5. Gịnị mere anyị ji kwesị ịhụ ụmụnna anyị n’anya ugbu a?

5 Ọ bụrụgodị na ụmụnna anyị anaghị eche echiche igbu onwe ha, ọtụtụ n’ime ha nọ n’ezigbo nsogbu, anyị kwesịkwara ịna-egosi ha na anyị hụrụ ha n’anya. A na-emekpọ ụfọdụ n’ime ha ọnụ, na-akwakwa ha emo. E nwekwara ndị nke a na-akparị n’ebe ha na-arụ ọrụ ma na-eji ha agba asịrị, ma ọ bụ na ike gwụkasịrị ha ahụ́ n’ihi na ha rụrụ ọrụ ọtụtụ awa ma ọ bụkwanụ na ha rụrụ ọrụ karịrị akarị ka ha nwee ike ịrụpụta ya mgbe a chọrọ ya. A ka nwere ndị nke nwere nnukwu nsogbu n’ezinụlọ ha. O nwere ike ịbụ na di ha ma ọ bụ nwunye ha anọghị n’ọgbakọ, ya ana-akatọ ha mgbe niile. N’ihi nsogbu ndị a na ndị ọzọ, ike ụwa na-agwụ ọtụtụ ụmụnna anyị, ya emee ka ha na-eche na ha abaghịzi uru. Ònye ga-enyere ụmụnna ndị a aka?

ỊHỤNANYA JEHOVA NA-EWULI ANYỊ ELU

6. Olee otú ịhụnanya Jehova si eme ka ndị ohu ya dị ike?

6 Jehova mere ka obi sie ndị ohu ya ike na ya hụrụ ha n’anya ugbu a, nakwa na ya ga na-ahụ ha n’anya ruo mgbe ebighị ebi. Chegodị otú obi dị ndị Izrel mgbe Jehova gwara ha, sị: “Ị dị oké ọnụ ahịa n’anya m, a gụọla gị n’onye kwesịrị nsọpụrụ, m hụkwara gị n’anya. . . . Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị.” (Aịza. 43:​4, 5) Ebe ị bụ ohu Jehova, obi kwesịrị isi gị ike na Jehova hụrụ gị n’anya nke ukwuu. * Baịbụl gwara ndị na-efe Chineke, sị: “Dị ka Dike, ọ ga-azọpụta gị. Ọ ga-enwe aṅụrị n’ihi gị.”​—⁠Zef. 3:​16, 17.

7. Olee otú ịhụnanya Jehova nwere n’ebe anyị nọ si yie nke nne na-enye nwa ara? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

7 Jehova kwere ndị ohu ya nkwa na ya ga-akasi ha obi, meekwa ka ha dị ike  n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla bịaara ha. Baịbụl kwuru, sị: “Unu ga-aṅụkwa ara. A ga-eku unu n’akụkụ, a ga-ekukwasị unu n’ikpere, na-adịda unu aka. Dị ka nwoke nke nne ya na-akasi obi, otú ahụ ka mụ onwe m ga na-akasi unu obi.” (Aịza. 66:​12, 13) Chegodị otú obi na-esi atọ nwatakịrị ụtọ mgbe nne ya ku ya ma ọ bụ na-egwusa ya egwú. Jehova hụrụ gị n’anya nke ukwuu ma chọọ ka obi na-atọ gị ụtọ. Ka obi sie gị ike na ọ hụrụ gị n’anya ma jiri gị kpọrọ ihe.​—⁠Jere. 31:⁠3.

8, 9. Olee otú ịhụnanya Jizọs nwere n’ebe anyị nọ nwere ike isi mee ka anyị dị ike?

8 Ihe ọzọ mere ezigbo Ndị Kraịst ji mara na Chineke hụrụ ha n’anya bụ ihe a Baịbụl kwuru. Ọ sịrị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Jizọs gosikwara na ya hụrụ anyị n’anya mgbe ọ nwụrụ n’ihi anyị. Ịhụnanya a o nwere n’ebe anyị nọ na-eme ka anyị dị ike. Baịbụl gwara anyị na ‘ahụhụ, ma ọ bụ nsogbu’ enweghị ike “ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke nke o gosiri site n’aka Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.”​—⁠Rom 8:​35, 38, 39.

9 Mgbe ụfọdụ, nsogbu ndị na-abịara anyị nwere ike ime ka ike ụwa gwụ anyị, ma ọ bụ mee ka anyị kwụsị ịna-enwe obi ụtọ n’ozi Jehova. Ma, anyị icheta otú Kraịst si hụ anyị n’anya ga-eme ka anyị na-adị ike ma na-edi nsogbu ọ bụla bịaara anyị. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 5:​14, 15.) Ịhụnanya Jizọs nwere n’ebe anyị nọ ga-eme ka anyị chọọ ịna-adị ndụ, meekwa ka anyị nọgide na-efe Chineke ma mgbe ọnwụnwa ndị dị ka ọdachi, mmegide, ihe agaghị otú anyị chere ya ma ọ bụ nchegbu bịaara anyị.

ANYỊ KWESỊRỊ ỊHỤ ỤMỤNNA ANYỊ N’ANYA

Ịmụ ihe Jizọs mere ga-agba anyị ume (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10 na nke 11)

10, 11. Ònye ka ọ dị n’aka ịgba ndị dara mbà n’obi ume? Kọwaa.

10 Jehova na-eji ọgbakọ Ndị Kraịst eme ka anyị na-adị ike iji gosi na ọ hụrụ anyị n’anya. Ọ bụrụ na anyị ahụ ụmụnna anyị n’anya, anyị na-egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya. Anyị na-eme ihe ọ bụla anyị nwere ike ime iji mee ka ụmụnna anyị mara na anyị ji ha kpọrọ ihe, nakwa na Jehova hụrụ ha n’anya. (1 Jọn 4:​19-21) Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst,  sị: “Na-akasirịtanụ ibe unu obi ma na-ewulirịtanụ ibe unu elu, dị nnọọ ka unu na-eme.” (1 Tesa. 5:11) N’eziokwu, mmadụ niile nọ n’ọgbakọ ga-emeli ka Jehova na Jizọs ma ọ bụrụ na ha ana-akasi ụmụnna ha obi ma na-eme ka ha dị ike. Ọ bụghị ihe a ga-ahapụrụ naanị ndị okenye.​—⁠Gụọ Ndị Rom 15:​1, 2.

11 E nwere ụfọdụ ndị uche na-akpakọghị ọnụ n’ọgbakọ o nwere ike ịdị mkpa ka a kpọga ha ụlọ ọgwụ. (Luk 5:31) Ndị okenye na ụmụnna ndị ọzọ ma na ha abụghị ndị dọkịta na-agwọ ndị uche na-akpakọghị ọnụ. Ma ha niile nwere ọrụ dị mkpa ha kwesịrị ịrụ. Ha ga ‘na-agụgụ mkpụrụ obi dara mbà, na-akwado ndị na-adịghị ike, na-enwe ogologo ntachi obi n’ebe mmadụ niile nọ.’ (1 Tesa. 5:14) Anyị kwesịrị ịgbalị ka anyị ghọta otú obi na-adị ụmụnna anyị. Anyị kwesịkwara ịna-enwere ha ndidi ma na-agwa ha okwu ga-akasi ha obi mgbe ha dara mbà n’obi. Ị̀ na-akasị ụmụnna anyị obi ma na-agba ha ume? Ọ bụrụ na ị mata otú i nwere ike isi na-akasi ha obi, ọ ga-eme ka mbọ ndị ị na-agba baa uru.

12. Nye ihe atụ onye ụmụnna nọ n’ọgbakọ ya nyeere aka n’ihi na ha hụrụ ibe ha n’anya.

12 Olee otú ịhụnanya anyị nwere n’ebe ndị obi na-ajọ njọ nọ nwere ike isi mee ka ha na-adị ike? Otu nwanna nwaanyị bi na Yurop kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, m na-eche echiche igbu onwe m, ma enwere m ndị na-enyere m aka. Ụmụnna mụ na ha nọ n’ọgbakọ azọọla m ndụ. Ha na-agba m ume ma na-eme ihe ndị gosiri na ha hụrụ m n’anya. Ọ bụ eziokwu na ọ bụ ụmụnna ole na ole ma na uche akpakọchaghị m ọnụ, ma ọgbakọ na-enyere m aka mgbe niile. Otu di na nwunye ji m mere nwa n’ọgbakọ. Ha na-elekọta m nke ọma, na-enyekwara m aka mgbe niile.” Nke bụ́ eziokwu bụ na otú anyị nwere ike isi na-enyere ụmụnna ndị ahụ aka agaghị aha otu. Ma, anyị niile nwere ike inyere ụmụnna anyị aka. *

OTÚ ANYỊ GA-ESI JIRI ỊHỤNANYA NA-EWULI NDỊ ỌZỌ ELU

13. Olee ihe anyị kwesịrị ime iji gbaa ndị ọzọ ume?

13 Na-ege ha ntị nke ọma. (Jems 1:19) Ige nwanna ntị nke ọma na-egosi na ị hụrụ ya n’anya. I nwere ike iji akọ na-ajụ ya ajụjụ ndị na-egosi na ihe banyere ya na-emetụ gị n’obi. Ajụjụ ndị ahụ ga-eme ka ị ghọta otú obi dị ya. Ime otú a ga-eme ka i nweere ya ọmịiko ma gbaa ya ume. Ka otú ihu gị dị gosi na ihe banyere ya na-emetụ gị n’obi. Ọ chọọ ịkọwakwuru gị otú obi dị ya, gee ya ntị nke ọma, gbalịa ka ị ghara ịnara ya okwu n’ọnụ. Ọ bụrụ na i gee ya ntị nke ọma, i nwere ike ịghọta otú obi dị ya. Nke a ga-eme ka ọ tụkwasị gị obi, meekwa ka o gee gị ntị mgbe ị na-agba ya ume. Ọ bụrụ na i gosi na ihe banyere ya na-emetụ gị n’obi, okwu ndị ị ga-agwa ya ga-akasi ya obi.

14. Gịnị mere anyị ekwesịghị ịkatọ ndị dara mbà n’obi?

14 Akatọla ha. Ọ bụrụ na onye dara mbà n’obi echee na ị na-akatọ ya, ọ ga-eme ka ọ dakwuo mbà n’obi. Ọ ga-emekwa ka mbọ ị na-agba ịgba ya ume kụọ afọ n’ala. Baịbụl kwuru, sị: “E nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị echiche dị ka ebe e ji mma agha maa mmadụ, ma ire ndị maara ihe na-agwọ ọrịa.” (Ilu 12:18) O doro anya na anyị agaghị ama ụma gwa onye dara mbà n’obi okwu ọjọọ. Ma, anyị nwere ike ime ka ọnọdụ ya ka njọ ma anyị gwa ya okwu n’echeghị echiche. Iji mee ka obi sie ya ike, i kwesịrị  ime ka o doo ya anya na ị na-agbalị ka ị ghọta otú ihe si dịrị ya.​—⁠Mat. 7:⁠12.

15. Olee ihe anyị nwere ike iji kasie ndị ọzọ obi?

15 Jiri Okwu Chineke na-akasi ndị ọzọ obi. (Gụọ Ndị Rom 15:​4, 5.) Baịbụl si n’aka “Chineke onye na-enye ntachi obi na nkasi obi.” Ka a sịkwa ihe mere na o jughị anyị anya na anyị nwere ike inweta ọtụtụ okwu ndị nwere ike ịkasi anyị obi na ya. Anyị nwekwara Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ. Ọ ga-enyere anyị aka ịchọta amaokwu Akwụkwọ Nsọ nakwa akwụkwọ anyị ndị anyị nwere ike iji kasie ụmụnna anyị obi ma gbaa ha ume.

16. Olee àgwà ndị ga-enyere anyị aka ịgba onye dara mbà n’obi ume?

16 Na-eme ebere ma na-adị nwayọọ. Ime ebere na ịdị nwayọọ dị ezigbo mkpa mgbe anyị na-agba mmadụ ume ma na-akasi ya obi iji gosi na anyị ji obi anyị niile hụ ya n’anya. Jehova n’onwe ya bụ “Nna nke obi ebere na Chineke nke nkasi obi,” ọ na-enwekwara ndị na-efe ya “obi ọmịiko.” (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 1:​3-6; Luk 1:78; Rom 15:13) Pọl ṅomiri Chineke n’ime ebere nakwa n’inwe ọmịiko, anyị kwesịkwara ime ka ya. Ọ bụ ya mere Pọl ji kwuo, sị: “Anyị ghọrọ ndị dị nwayọọ n’etiti unu, dị ka mgbe nne nke na-enye nwa ara na-elekọta ụmụ ya. Ya mere, ebe anyị nwere ịhụnanya dị ukwuu n’ebe unu nọ, ọ masịrị anyị ọ bụghị naanị izi unu ozi ọma Chineke, kamakwa inye unu mkpụrụ obi anyị, n’ihi na unu ghọrọ ndị anyị hụrụ n’anya.” (1 Tesa. 2:​7, 8) Ọ bụrụ na anyị a na-emere onye dara mbà n’obi ebere ka Chineke, o nwere ike ịbụ na Chineke ji anyị zaa onye ahụ ekpere ya.

17. Olee otú ile ụmụnna anyị anya otú kwesịrị ekwesị ga-esi enyere anyị aka ịna-agba ha ume?

17 Atụla anya na ụmụnna gị ga-emetacha ihe niile. Na-ele ụmụnna gị anya otú kwesịrị ekwesị. Ọ bụrụ na ị na-atụ anya na ha ga-emetacha ihe niile, obi nwere ike ịna-agbawa gị. (Ekli. 7:​21, 22) Cheta na Jehova anaghị atụ anya ka anyị metachaa ihe niile. Ọ bụrụ na anyị ana-eṅomi ya, anyị ga-adị njikere idi ihe ọjọọ ụmụnna anyị nwere ike ime anyị n’ihi ezughị okè. (Efe. 4:​2, 32) Kama ime ka ha chewe na ha anaghị eme ihe ha kwesịrị ime, gbalịa na-aja ha mma n’ihe ndị ha na-eme. Ime otú ahụ ga-agba ha ume. Anyị jiri obi anyị niile na-aja ndị ọzọ mma, o nwere ike ịna-agba ha ume, meekwa ka ha ‘na-enwe aṅụrị’ n’ozi ha na-ejere Chineke. Ọ ka mma ka anyị na-aja ha mma kama iji ha na-atụnyere ndị ọzọ n’ihi na o nwere ike ime ka ha daa mbà n’obi.​—⁠Gal. 6:⁠4.

18. Olee ihe ga-enyere anyị aka iji ịhụnanya na-ewuli ụmụnna anyị elu?

18 Onye ọ bụla na-efe Jehova dị oké ọnụ ahịa n’anya Jehova na Jizọs, bụ́ onye ji ndụ ya gbapụta anyị. (Gal. 2:20) Anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya nke ukwuu. Anyị kwesịrị ịna-emere ha ebere ma na-egosi ha na anyị hụrụ ha n’anya. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka obi na-eru ha ala, anyị ga “na-achụso ihe na-eweta udo na ihe na-ewuli ibe anyị elu.” (Rom 14:19) Anyị niile na-atụsi anya Paradaịs ike, mgbe a na-agaghịkwa enwe ihe ga-eme ka anyị daa mbà n’obi. Mgbe ahụ, ọrịa, agha, ọnwụ, mkpagbu, esemokwu ezinụlọ na ihe agaghị otú anyị tụrụ anya ya, agaghịzi adị. Jizọs chịchaa otu puku afọ, ndị mmadụ ga-ezu okè. Ndị gafere ule ikpeazụ ga-abụ ụmụ Jehova n’ụwa a, ha ga-enweta “nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.” (Rom 8:21) Ka anyị niile nọgide na-ahụ ụmụnna anyị n’anya ma na-ewuli ha elu. Ka anyị na-enyere ibe anyị aka ịlanahụ ụwa ochie a ma banye n’ime ụwa ọhụrụ Chineke nke magburu onwe ya.

^ para. 6 Gụọ isi nke 24 n’akwụkwọ Bịaruo Jehova Nso.

^ para. 12 Iji nyere ndị na-eche echiche igbu onwe ha aka, gụọ isiokwu ndị a gbara na Teta! Ha bụ, “Ànọ M Ndụ Eme Gịnị?​—⁠Ihe Atọ Mere Anyị Ga-eji Nọrọ Ndụ” (Mee-Jun 2014); “Ihe I Nwere Ike Ime ma Ọ Dị Gị Ka Ndụ Ọ̀ Gwụla Gị Ike” (Eprel 2012); nakwa “Life Is Worth Living” (October 22, 2001, nke Bekee).