Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE Nke 6 n'Afọ 2016

 AKỤKỌ NDỤ

Otú M Si Mụta Eziokwu Dị na Baịbụl n’Agbanyeghị na Enweghị M Aka

Otú M Si Mụta Eziokwu Dị na Baịbụl n’Agbanyeghị na Enweghị M Aka

Ọ bụrụ na e nwee ihe chọrọ ịkwatu mmadụ, onye ahụ na-achọ ihe ọ ga-ejide aka ka ọ ghara ịda. Ma, ihe chọọ ịkwatu m, m ga-ada n’ihi na enweghị m aka m ga-eji jide ihe. Mgbe m dị afọ asaa, e gbupụrụ m aka ka m nwee ike ịdị ndụ.

A mụrụ m n’afọ 1960. Mama m dị afọ iri na asaa mgbe ahụ. Papa m hapụrụ mama m mgbe ọ dị ime m. Mụ na mama m na ndị mụrụ ya bi n’obere obodo aha ya bụ Bọg. Obodo a dị n’ebe a na-akpọbu Jamanị nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ. Ọtụtụ ndị bí na Bọg ekweghị na Chineke dị. Ezinụlọ anyị kwetakwara na Chineke adịghị. Anyị achọkwanụghị ịma ma ọ̀ dị adị.

Mgbe m na-etolite, nna mama m anaghị eji m egwu egwu. Mụ na ya na-eso arụ ọtụtụ ọrụ ndị ọ na-arụ. Mgbe ụfọdụ, ọ na-agwa m ka m rịa elu osisi gaa gbutusịa alaka ya. Ihe ndị ahụ mụ na ya na-eso aga arụ na-atọ m ụtọ. O nweghị ihe na-echu m ụra, obi na-abụkwa m sọ aṅụrị.

OTU ỌDACHI NKE GBANWERE NDỤ M

E nwere otu ihe dị egwu mere m otu ụbọchị mgbe m dị afọ asaa. Afọ ahụ ka bụ afọ nke abụọ m banyere ụlọ akwụkwọ. Mgbe m na-ala akwụkwọ n’ụbọchị ahụ, m rịgooro nnukwu poolu ọkụ eletrik. Mgbe m rịrị ya ruo mita asatọ, ọkụ eletrik dọrọ m, mụ atụbọọ, e buru m gaa ụlọ ọgwụ. Mgbe m tetara, m chọpụtara na aka m abụọ anwụọla. Ọkụ a rere aka m mebiri m aka nke na e gbupụrụ ya ka nje ghara isi na ha banye m n’ọbara. Ihe a wutere mama m na ndị mụrụ ya. Ma, ebe ọ bụ na m ka bụ nwata n’oge ahụ, amachaghị m nsogbu aka a e gbupụrụ m ga-emecha kpatara m.

Mgbe m pụtara n’ụlọ ọgwụ, alaghachiri m ụlọ akwụkwọ. Ụmụ akwụkwọ ibe m na-eji m eme ihe ọchị. Ha na-akwa m aka, ma na-atụ m ihe dị ka obere okwute. Ha ma na o nweghị ihe m nwere ike ime ha ebe ọ bụ na enweghịzi m aka. Ihe a niile ha na-eme m gbawara m obi. E mechara kpọga m Ụlọ Akwụkwọ Ndị Nwere Nkwarụ e nwere n’obodo Bikenwada. Ụmụ akwụkwọ e nwere n’ụlọ akwụkwọ a bi ebi na ya. Ụlọ akwụkwọ a dị ezigbo anya n’ụlọ anyị. Ọ bụ ya mere mama m na ndị mụrụ ya anaghị abịa eleta m n’ihi na ha enweghị ego ụgbọ ha ga-eji abịa. Naanị mgbe mụ na ha na-ahụ bụ ma anyị mechie akwụkwọ. Mụ na mama m na ndị mụrụ ya ebighị ruo afọ iri.

OTÚ M SI TOO N’ENWEGHỊ AKA

M bịara mụta otú m nwere ike isi jiri ụkwụ na-eme ihe ndị m gaara eji aka na-eme. Chegodị ihe ọ dị ka ya mmadụ iji ụkwụ jide ngaji ma were ya na-eri nri. O siiri m ike ịmụta otú m ga-esi jiri ụkwụ m na-eri ihe, ma m mechara mụta ya. M mụtakwara otú m ga-esi jiri ụkwụ m na-asa ezé, jirikwa ya na-abọ isi. Ọ na-abụkwa mụ na ndị mmadụ na-ekwu okwu, mụ ana-emegharị ụkwụ m iji gosi ihe m na-ekwu. Ejizi m ụkwụ m mere aka.

 Mgbe m na-etolite, m na-agụkarị akwụkwọ ndị kwuru gbasara ihe ndị mmadụ chere ndị sayensi nwere ike imepụta. Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị m ka ya bụrụ na ndị sayensi ga-arụpụta aka a na-akwụnye akwụnye m ga-eji na-eme ihe ọ bụla m chọrọ ime. Mgbe m dị afọ iri na anọ, m malitere ịṅụ sịga. M chere na sịga a m na-aṅụ na-eme ka m na-akata obi ime ihe ọ bụla. O mekwara ka m na-eche na m dị ka ndị ọzọ. Ọ dị ka à ga-asị na m na-ekwu, sị: ‘M ga-emeli ya. Ndị na-aṅụ sịga bụ ndị dimkpa, ma hà nwere aka ma ọ bụ na ha enweghị.’

M malitere iso ibe m na-eme ihe ndị a na-eme n’obodo. M banyere n’otu òtù ndị na-eto eto e nwere n’obodo anyị ma bụrụ odeakwụkwọ ha. Ọ bụ gọọmenti na-akwado òtù a. Ndị òtù anyị na-akwanyere odeakwụkwọ ùgwù. M banyekwara n’òtù ndị na-abụ abụ, sorokwa bụọ abụ n’ihu ọha. M sokwa mee egwuregwu ndị nwere nkwarụ na-eme. Emechakwara m mụọ ọrụ. Mgbe m mụchara ọrụ, m malitere ịrụ ọrụ n’otu ụlọ ọrụ dị n’obodo anyị. Oge m na-etolite, m na-akwụnyekarị aka ahụ a na-akwụnye akwụnye n’ihi na m chọrọ inwe aka otú ibe m nwere.

OTÚ M SI MALITE ỊMỤ BAỊBỤL

Otu ụbọchị m nọ na-eche ụgbọ okporo ígwè ga-ebu m gaa ọrụ, otu nwoke bịakwutere m. Ọ jụrụ ma m̀ ma na e nwere mgbe Chineke ga-eme ka m nweghachi aka. Ihe a ọ jụrụ m juru m anya. Ọ bụ eziokwu na m chọrọ ka m nweghachi aka, ma ihe ahụ ọ jụrụ m dị m ka ịmụ anya arọ nrọ. O doro m anya na Chineke adịghị. Si mgbe ahụ gawa, m malitere ize nwoke ahụ eze.

Mgbe oge ụfọdụ gachara, otu onye mụ na ya na-arụ ọrụ gwara m ka m bịa na nke ha, agakwara m. Ka anyị na-aṅụ kọfi n’ụlọ ha, ndị mụrụ ya malitere ikwu banyere Chineke, ma kwuo na aha ya bụ Jehova. Nke ahụ bụ nke mbụ m na-anụ na Chineke nwere aha. (Abụ Ọma 83:18) Ma, m nọ na-ekwu n’obi m, sị: ‘Chineke adịghị n’agbanyeghị ihe ọ bụla bụ aha ya. M ga-egosi ha na ihe ha na-ekwu abụghị eziokwu.’ Ebe ọ bụ na obi siri m ike na Chineke adịghị, m kwetara ka mụ na ha kwurịta banyere Baịbụl. Mgbe anyị na-ekwu banyere ya, o juru m anya na enwelighị m ike igosi ha na Chineke adịghị.

Ka anyị na-amụ banyere amụma ndị dị na Baịbụl, m bịara kwetawa na Chineke dị. Ọtụtụ amụma ndị dị na Baịbụl emezuola, n’agbanyeghị na e dere ha ọtụtụ narị afọ ma ọ bụ ọtụtụ puku afọ tupu ha emezuo. Otu ụbọchị anyị na-ekwu gbasara Baịbụl, anyị ji ihe ndị na-eme n’ụwa ugbu a tụnyere ihe ndị e kwuru na Matiu isi 24, Luk isi 21, na 2 Timoti isi 3. Otú ahụ ọ na-abụ dọkịta hụ otú ahụ́ si eme mmadụ ya ejiri ya chọpụta ụdị ọrịa onye ahụ na-arịa, ka ihe ndị ahụ Baịbụl kwuru m hụrụ ka ha na-eme n’oge a mere ka m mata na anyị bi n’oge Baịbụl kpọrọ ‘oge ikpeazụ.’ * Ihe ndị ahụ juru m anya. Ahụla m ka ihe ndị ahụ e kwuru na-eme.

Ọ bịaziri doo m anya na ihe m na-amụ bụ eziokwu. M malitere ikpere Jehova Chineke ekpere. M kwụsịkwara ịṅụ sịga, n’agbnyeghị na aṅụọla m ya ihe karịrị afọ iri. M nọgidere na-amụ Baịbụl ruo ihe dị ka otu afọ. Ma, n’abalị iri abụọ na asaa n’ọnwa Eprel, afọ 1986, e mere m baptizim na nzuzo n’otu nnukwu ihe a na-anọ n’ime ya asa ahụ́. Ihe mere e ji mee m baptizim otú ahụ bụ na gọọmenti Jamanị nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ machiri Ndịàmà Jehova ikpe okpukpe ha.

 OTÚ M SI NA-ENYERE NDỊ ỌZỌ AKA

Ebe ọ bụ na gọọmenti machiri Ndịàmà Jehova ikpe okpukpe ha, anyị na-adị ole na ole na-amụ ihe n’ụlọ ụmụnna. Otú a anyị si amụ ihe mere ka m mara naanị ụmụnna ole na ole. Ma, e nwere otu ihe m na-atụghị anya ya mere otu ụbọchị. Gọọmenti obodo anyị nyere m akwụkwọ ikike ịga West Jamanị. Gọọmenti West Jamanị amachighị Ndịàmà Jehova ikpe okpukpe ha. Mgbe m ruru, eso m ọtụtụ puku ụmụnna anyị gaa mgbakọ ukwu. Nke a bụ nke mbụ m na-aga ụdị mgbakọ a. Ahụtụbeghị m ụdị ihe a mbụ.

Mgbe a kwatuchara mgbidi ahụ dị na Belin e ji kewaa Jamanị abụọ, gọọmenti wepụrụ iwu ahụ ha machiri Ndịàmà Jehova. Ugbu a, anyị na-efezi Jehova n’enweghị onye na-enye anyị nsogbu. M chọrọ iwepụtakwu oge na-ekwusa ozi ọma. Ma, ihere na-eme m ma m hụ ndị m na-ahụtụbeghị mbụ. M bịara chewe na ọtụtụ afọ m biri n’ụlọ akwụkwọ ndị nwere nkwarụ na aka m na-enweghị ga-eme ka o siere m ike ịga ozi ọma. Ma, n’afọ 1992, m gara ozi ọma rụta awa iri isii n’otu ọnwa. Eziri m ozi ọma nke ọma, obi tọkwara m ezigbo ụtọ. N’ihi ya, ekpebiri m na m ga na-arụ awa iri isii n’ọnwa ọ bụla. M gbakwara mbọ mee otú ahụ ruo ihe dị ka afọ atọ.

Anaghị m echefu ihe a Baịbụl kwuru echefu. Ọ sịrị: “Ònye bụ onye na-adịghị ike, m wee ghara ịbụ onye na-adịghị ike?”(2 Ndị Kọrịnt 11:29) N’agbanyeghị na enweghị m aka, m na-ekwu okwu, isi zukwara m okè. N’ihi ya, m na-agba mbọ na-enyere ndị ọzọ aka n’agbanyeghị na enweghị m aka. Ebe ọ bụ na enweghị m aka, m nwere ike imetere ndị ọnọdụ ha dị ka nke m ebere. Ama m otú ọ na-adị mmadụ ma e nwee ihe ọ chọrọ ime ma o nweghị ike ime ya. M na-akasi ndị nọ n’ụdị ọnọdụ a obi. Isi otú ahụ enyere ndị ọzọ aka na-eme m obi ụtọ.

Izi ndị ọzọ ozi ọma na-eme m obi ụtọ

JEHOVA NA-ENYERE M AKA KWA ỤBỌCHỊ

Nke bụ eziokwu bụ na e nwere mgbe obi na-anaghị adịcha m mma. Achọrọ m inwe aka ka ibe m. E nwere ọtụtụ ọrụ a na-arụ n’ụbọchị m na-arụ n’onwe m, ma m na-etinyekwu ike na oge ịrụ ha karịa ka m gaara etinye ma a sị na m nwere aka. Ihe m na-ekwukarị n’ụbọchị ọ bụla bụ: “N’ihe niile, enwere m ike site n’aka onye ahụ nke na-enye m ike.” (Ndị Filipaị 4:13) N’ụbọchị ọ bụla, Jehova na-enye m ike m na-eji arụ ọrụ ndị m na-arụ. Ihe a Jehova na-emere m gosiri na ọ hapụbeghị m. Ọ bụ ya mere na achọtụghị m ịhapụ ya.

Jehova ejirila ezigbo ezinụlọ gọzie m. Enweghị m ụdị ezinụlọ a mgbe m na-etolite. Alụtara m ezigbo nwaanyị. Aha ya bụ Elke. Ọ hụrụ m n’anya, nweekwa ọmịiko. Ihe ọzọ Jehova jirila gọzie m bụ ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova e nwere n’ụwa niile. Ha niile bụzi ụmụnne m. Anyị niile dịkwa n’otu.

Ebe mụ na ọmarịcha nwunye m aha ya bụ Elke nọ

Ihe na-akasikwa m obi bụ nkwa Chineke kwere na ya ga-eme ka ụwa bụrụ Paradaịs. O kwukwara na ya ‘ga-eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ.’ Aka m sokwa n’ihe ndị ọ ga-eme ka ha dịrị ọhụrụ. (Mkpughe 21:5) Mgbe ọ bụla m chebaara ihe ndị Jizọs rụrụ mgbe ọ na-eje ozi ya n’ụwa echiche, ọ na-eme ka m ghọtakwuo nkwa a Chineke kwere. Jizọs mere ka onye ngwọrọ gawa ije ozugbo, meekwa ka otu nwoke e bepụrụ ntị nweghachi ntị. (Matiu 12:13; Luk 22:50, 51) Ihe ndị ahụ Jehova kwuru ya ga-emere anyị na ọrụ ebube ndị ahụ Jizọs rụrụ emeela ka m kwetasie ike na m ga-enwetaghachi aka m n’oge na-adịghị anya.

Ma, ihe ọma kachanụ Jehova Chineke meerela m bụ na o mere ka m mata onye ọ bụ. Ọ bụzi nna m na enyi m, bụrụkwa ike m na onye na-akasi m obi. Ekwetakwara m ihe a Eze Devid kwuru. O kwuru, sị: “Jehova bụ ike m . . . E nyewokwara m aka, nke mere na obi m na-enwe aṅụrị.” (Abụ Ọma 28:7) O nwetụghị mgbe m ga-achọ ịhapụ eziokwu a m mụtara n’ihi na o nweghị ihe karịrị ya. Amụtadịrị m ya n’agbanyeghị na enweghị m aka.

^ para. 17 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịhụ ebe a kọwakwuru ihe ndị e ji ama na anyị bi n’oge ikpeazụ, gụọ isiokwu bụ́ “Ọgwụgwụ Ụwa Ọ̀ Dịla Nso?” Ọ dị n’isi nke 9 n’akwụkwọ bụ́ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya. Ọ dịkwa n’Ịntanet na www.jw.org/ig.