Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE Nke 6 n'Afọ 2016

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | IHE ỌHỤỤ NDỊ E GOSIRI BANYERE ELUIGWE NA-AKỤZIRI ANYỊ

Ajụjụ Ndị Mmadụ Na-ajụ Gbasara Ndị Bí n’Eluigwe

Ajụjụ Ndị Mmadụ Na-ajụ Gbasara Ndị Bí n’Eluigwe

È nwetụla mgbe i chere banyere eluigwe na ndị bi na ya? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ bụghị naanị gị cherela otú ahụ. Kemgbe ụwa, ọtụtụ ndị na-ekwu ihe dị iche iche banyere eluigwe na ndị bi na ya. Ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ ndị nna nna anyị hà nwụrụla anwụ bi n’eluigwe, nakwa na e kwesịrị ịna-akwanyere ha ùgwù. Ndị ọzọ na-ekwu na eluigwe bụ ebe e nwere udo na obi ụtọ, nakwa na ọ bụ ndị ezi omume nwụrụla anwụ na ndị mmụọ ozi bi na ya. E nwekwara ndị nke na-ekwu na eluigwe bụ ebe ọtụtụ nde chi dị iche iche bi.

Ọtụtụ ndị na-ekwukwa na e nweghị ihe ọ bụla anyị nwere ike ịma banyere eluigwe n’ihi na e nwebeghị onye si ebe ahụ bịara gwa anyị banyere ya. Ma, ihe a ha na-ekwu abụghị eziokwu. Jizọs Kraịst biri n’eluigwe tupu ya abịa n’ụwa. N’oge ahụ ọ nọ n’ụwa, ọ gwara ndị ndú okpukpe ndị Juu hoo haa, sị: “Esi m n’eluigwe bịa ime, ọ bụghị uche m, kama uche onye zitere m.” Ihe a Jizọs kwuru gosiri na ọ ma eluigwe nke ọma. Ọ bụ ya mere o ji gwa ndịozi ya, sị: “N’ụlọ Nna m, ọtụtụ ebe obibi dị.”—Jọn 6:38; 14:2.

Nna Jizọs bụ Chineke. Aha ya bụ Jehova. Eluigwe bụkwa “ụlọ ya.” (Abụ Ọma 83:18) N’ihi ya, e nweghị onye nwere ike ịkọrọ anyị otú eluigwe dị karịa Jehova Chineke na Jizọs Kraịst. Ha akọọrọla anyị ọtụtụ ihe gbasara eluigwe. Ha si n’ọhụụ ndị dị ebube ha gosiri ụfọdụ ndị fere Chineke n’oge ochie kọọrọ anyị gbasara ya.

Isiokwu nke na-esonụ ga-akọwa amaokwu Baịbụl ụfọdụ kwuru gbasara ihe ndị dị n’eluigwe e gosiri ndị ohu Chineke n’ọhụụ. Ka ị na-agụ gbasara ihe ndị ahụ e gosiri ha, cheta na eluigwe adịghị ka ụwa, nke nwere ihe ndị anyị na-ahụ anya ma ọ bụ ihe ndị anyị nwere ike ibitụ aka. N’ihi ya, mgbe Chineke na-egosi ụfọdụ ndị ahụ fere ya n’oge ochie ihe ụfọdụ dị n’eluigwe, o ji ihe ndị anyị nwere ike ịghọta gosi ha ya ka anyị nwee ike ịghọta ha. Ihe ndị ahụ o gosiri ha ga-enyere gị aka ịmata ndị bi ‘n’ọtụtụ ebe obibi’ ndị ahụ dị n’eluigwe.