Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Nke 2 n'Afọ 2017

Na-enye Ihe Ka Ị Na-enwe Obi Ụtọ

Na-enye Ihe Ka Ị Na-enwe Obi Ụtọ

OTU ụbọchị, otu nwaanyị aha ya bụ Alexandra nọ n’ụgbọala si n’otu obodo dị n’ebe ndịda Amerịka na-aga obodo ọzọ. Mgbe ha ruru n’ókèala ebe ndị uwe ojii na-eche nche, ha kwụsịrị ha. Ka ọ nọ n’ụgbọala ahụ, otu onye uwe ojii gwara ha, sị: “Unu nwere ike ịgawa, ma nwoke onye Chaịna a unu na ya so enweghị ebe ọ na-aga.” Alexandra si n’ụgbọala ahụ pụta ma hụ ka onye Chaịna ahụ na-agbalị ka ọ kọwaara ndị uwe ojii ahụ nsogbu ya, ma ọ machaghị asụ Spanish. Ebe ọ bụ na Alexandra na-aga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova ebe a na-eji asụsụ Chaịniiz amụ ihe, ọ sịrị ka o nyere nwoke ahụ aka kọwaara ndị uwe ojii ahụ ihe ọ na-ekwu.

Nwoke ahụ kwuru na ya nwere akwụkwọ ikike ya ji biri ná mba ahụ, mana ndị ohi naara ya ma ego ma akwụkwọ ahụ. Mgbe Alexandra nọ na-akọwara onye uwe ojii ahụ ihe nwoke a na-ekwu, o kwetaghị. O chedịrị na Alexandra ji aghụghọ chọọ ịkpọbata ya n’obodo ahụ. Ma, onye uwe ojii ahụ mechara kweta ihe ọ na-ekwu, mana ọ sịrị nwoke ahụ kwụọ ụgwọ maka na o jighị akwụkwọ ikike ya. Ebe ọ bụ na nwoke ahụ ejighịzi ego, Alexandra binyere ya dọla iri abụọ, ya bụ, ihe dị ka puku naịra isii. Nwoke ahụ kelere ya ma sị na ya ga-atụkwasịrị ya ego ma ya kwụghachiwa ya. Alexandra gwara ya na ya achọghị ka ọ tụkwasịrị ya ego n’ego ahụ. Ọ gwakwara ya na obi dị ya ụtọ inyere ya aka n’ihi na ọ bụ ihe ya kwesịrị ime. O nyere nwoke ahụ akwụkwọ ụfọdụ Ndịàmà Jehova ji amụ Baịbụl ma gwa ya ka ọ gbalịa ka ya na Ndịàmà Jehova mụwa Baịbụl.

Otú a Alexandra si nyere onye a ọ na-amabughị aka magburu onwe ya. Ọ bụkwa ihe ma ndị nọ n’okpukpe ma ndị na-anọghị na-eme. Ọ bụrụ gị, ị̀ gaara enyere nwoke ahụ aka? Ajụjụ a dị mkpa n’ihi na Jizọs kwuru, sị: “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.” (Ọrụ Ndịozi 20:35) Ihe ọzọ bụ na ndị sayensị achọpụtala na inye ihe na-abara mmadụ uru. Ka anyị lee ụfọdụ uru ọ na-aba.

“ONYE NA-EJI OBI ỤTỌ ENYE IHE”

Ọtụtụ ihe merela eme na-egosi na mmadụ inye mmadụ ihe na-emekarị ka onye ahụ nyere ihe na-enwe obi ụtọ. Pọl onyeozi kwuru na “Chineke hụrụ onye na-eji obi ụtọ enye ihe n’anya.” O kwuru ihe a mgbe ọ na-ekwu gbasara Ndị Kraịst ji obi ha niile nye onyinye iji nyere Ndị Kraịst ibe ha na-ata ahụhụ aka. (2 Ndị Kọrịnt 8:4; 9:7) Pọl ekwughị na ndị ahụ nyere ihe n’ihi na obi dị ha ụtọ, kama na ha nwere obi ụtọ n’ihi na ha nyere ihe.

E nwere akụkụ ụbụrụ nke na-eme ka ‘mmadụ na ibe ya na-adị ná mma, na-enwe obi ụtọ, ma na-atụkwasị ndị ọzọ obi.’ Otu nchọpụta e mere gosiri na inye ihe na-eme ka ‘akụkụ ụbụrụ a na-arụ ọrụ nke ọma.’ Ọ bụ ya mere onye na-enye ihe ji enwe ‘ezigbo obi ụtọ.’ Ná nchọpụta ọzọ e mere, ndị mmadụ kwuru na ha nwekwuru obi ụtọ “mgbe ha nyere mmadụ ego karịa mgbe ha ji ego ahụ zụrụ ihe.”

È nwetụla mgbe i chere na ị gaghị enyeli mmadụ ihe n’ihi ihe isi ike? Ma, onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike iso ná ndị “na-eji obi ụtọ enye ihe,” ma na-enwe ọṅụ. Anyị chọọ inye mmadụ ihe, ọ bụghị iwu na ihe anyị ga-enye ya ga-ebu ibu. Otu nwaanyị bụ́ Onyeàmà Jehova detaara ndị na-ebipụta Ụlọ Nche a ị na-agụ akwụkwọ ozi, tinyekwa  ego na ya. O kwuru, sị: “Kemgbe ọtụtụ afọ, ego m na-enye n’onyinye ma m gaa ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzụkọ Alaeze anaghị ebu ibu. Ma, Jehova Chineke enyela m ihe karịrị ihe m na-enye. . . . Unu emeela maka otú unu si mee ka m nwee ike izetere unu onyinye a iji na-arụrụ Jehova ọrụ. Obi atọgbuola m.”

Ma, ọ bụghị naanị ego ka anyị nwere ike inye. E nwere ụzọ ndị ọzọ anyị nwere ike isi na-enye ihe.

INYE IHE GA-EME KA AHỤ́ NA-ADỊ GỊ MMA

Inye ihe na-abara gị na ndị ọzọ uru

Baịbụl kwuru, sị: “Onye obiọma na-emeso mkpụrụ obi ya mmeso ọma, ma onye obi tara mmiri na-ewetara anụ ahụ́ ya nsogbu.” (Ilu 11:17) Ndị dị obiọma na-emesapụ aka. Ha na-eji oge ha, ike ha, na obi ha niile enyere ndị ọzọ aka. E nwere ọtụtụ uru ihe a ha na-eme na-abara ha. Otu n’ime ya bụ na ọ na-eme ka ahụ́ na-adị ha mma.

Otu nchọpụta e mere gosiri na obi na-adịkarị ndị wepụtara onwe ha na-enyere ndị ọzọ aka mma, ha anaghịkwa adakarị mbà n’obi. Ihe ọ pụtara bụ na ahụ́ na-esikarị ha ike. Inye ihe na-emedị ka ahụ́ dịtụkwuo ụfọdụ ndị na-arịa ọrịa ọjọọ dị ka ọrịa akwara na ọrịa o biri n’ájá ọcha mma. Nchọpụta e mere gosikwara na inye ihe enyekwarala ndị na-achọ ịkwụsị aṅụrụma aka. E kwukwara na ha anaghị adakarị mbà n’obi, nakwa na ọ na-eme ka o siere ha ike ibidokwa ṅụwa mmanya.

Otu akwụkwọ kwuru ihe mere inye ihe ji akpa ike otú a. O kwuru na ọ bụrụ na mmadụ “ana-emetara ndị ọzọ ebere, na-emesapụ aka, ma dịrị obiọma, ọ gaghị na-echegbucha onwe ya.” Inye ihe nwere ike ime ka obi na-erutụ mmadụ ala, o nwekwara ike ibeleta ọbara mgbali elu. Ndị di ha ma ọ bụ nwunye ha nwụnahụrụ na-enweta onwe ha ngwa ngwa ma ha na-enyere ndị ọzọ aka.

N’eziokwu, inye ihe na-aba uru.

INYE IHE NA-EME KA NDỊ ỌZỌ NA-ENYE IHE

Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Na-enyenụ ihe, ndị mmadụ ga-enyekwa unu ihe. Ha ga-awụnyekwa n’apata ụkwụ unu ọ̀tụ̀tụ̀ dị mma, nke a bịara aka, yọkọta ọnụ, nke jubigakwara ókè. N’ihi na ihe unu ji atụ̀ ihe ka ha ga-eji tụọrọ unu ihe.” (Luk 6:38) Ọ bụrụ na ị na-enye ndị ọzọ ihe, ha ga na-ekele gị ma na-eme ka gị. Ihe ọ pụtara bụ na inye ihe na-eme ka mmadụ na ibe ya na-adị ná mma.

Inye ihe na-eme ka mmadụ na ibe ya na-adị ná mma

Ndị na-amụ gbasara mmekọrịta mmadụ na ibe ya kwuru na “ndị na-enyekarị ndị ọzọ ihe na-eme ka ndị ahụ mewekwa ka ha.” N’eziokwu, “naanị ịgụ gbasara otú mmadụ si nyere onye ọzọ aka na-eme ka ndị mmadụ nyewekwara ndị ọzọ aka.” Ọ bụ ya mere otu akwụkwọ ji kwuo na “otu onye nye mmadụ ihe, o nwere ike ime ka onye ahụ o nyere ihe nyekwa onye ọzọ ihe, onye nke ahụ enyekwa onye ọzọ si otú ahụ mee ka ọtụtụ mmadụ nye ibe ha ihe. Ma, onye nke mbụ ahụ nyere ihe nwere ike ọ maghị ndị ọzọ ihe o nyere mere ka ha nyekwa ndị ọzọ ihe.” E nwere ike ikwu na otu onye nọ n’obodo meere mmadụ ihe ọma, o nwere ike ime ka onye o meere ihe ọma meekwara onye ọzọ ihe ọma, ihe ọma e si otú ahụ zuo obodo ahụ niile. Ọ̀ bụ na ị gaghị achọ ibi n’ụdị obodo a? N’eziokwu, ọ bara uru ma ọtụtụ ndị na-enye ndị ọzọ ihe.

 E nwere otu ihe mere n’obodo Flọrịda nke dị n’Amerịka gosiri na inye ihe na-aba uru. Ụfọdụ Ndịàmà Jehova wepụtara onwe ha gaa ebe ajọ ifufe kpara mkpamkpa ka ha nyere ha aka. Mgbe ha nọ n’ụlọ Onyeàmà Jehova ibe ha na-eche ka e butere ha ihe ha ga-eji meziere ya ụlọ ya, ha chọpụtara na mgbidi ụlọ otu nwoke onye agbata obi ya dakasịrị adakasị. Ha gwara nwoke ahụ na ha ga-arụziri ya mgbidi ahụ. Mgbe obere oge gachara, nwoke ahụ degaara isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova akwụkwọ ozi. O kwuru, sị: “Esi m n’ala ala obi m na-ekele unu maka ihe ọma unu meere m. Ụdị ndị dị ka unu dị ụkọ.” Obi ụtọ o nwere mere ka o si n’ala ala obi ya nye ego ka e jiri ya nye aka n’ihe ọ kpọrọ ọrụ magburu onwe ya Ndịàmà Jehova na-arụ.

NA-EṄOMI ONYE KACHA ENYE IHE

Otu nchọpụta ndị sayensị mere gosiri na “o yiri ka è nwere ihe dị mmadụ n’ime nke na-eme ka onye ahụ na-enyere ndị ọzọ aka.” Nchọpụta ahụ gosikwara na “ụmụaka na-amalite inye mmadụ ihe tupu ha amalitedị ikwu okwu.” Gịnị mere ha ji eme ya? Baịbụl gwara anyị ihe kpatara ya mgbe o kwuru na e kere mmadụ “n’onyinyo Chineke,” ya bụ na Chineke kenyere anyị àgwà ya.—Jenesis 1:27.

Otu n’ime àgwà Onye Kere Anyị bụ́ Jehova Chineke nwere bụ imesapụ aka. O nyere anyị ndụ na ihe niile ga-eme ka ndụ na-atọ anyị ụtọ. (Ọrụ Ndịozi 14:17; 17:26-28) Anyị nwere ike ịmụta gbasara Nna anyị nke eluigwe na ihe ọma ndị ọ ga-emere anyị ma anyị mụọ Baịbụl. Baịbụl kwukwara na Chineke enyela anyị ihe ga-eme ka anyị nwee obi ụtọ n’ọdịnihu. * (1 Jọn 4:9, 10) Ebe ọ bụ n’aka Jehova Chineke ka anyị si mụta inye ihe, nakwa na o kere anyị n’onyinyo ya, o kwesịghị iju anyị anya na inye ihe na-abara anyị uru ma na-emekwa ka obi dị Chineke mma.—Ndị Hibru 13:16.

Ì chetara Alexandra ahụ anyị kọrọ gbasara ya ná mmalite isiokwu a? Anyị ma na ị ga-achọ ịma ihe mechaziri mee. Onye ya na ya nọ n’ụgbọala kwuru na ọ gaghị enweta ego ya ọzọ. Ma nwoke ahụ o binyere ego kpọrọ ndị enyi ya bi ebe ụgbọala ahụ ga-akwụsị, ha ewetara ya ego, ya enyeghachizie Alexandra ego ya. Nwoke ahụ sokwa Ndịàmà Jehova mụwa Baịbụl otú ahụ Alexandra gwara ya ka o mee. Mgbe ọnwa atọ gachara, Alexandra hụrụ ya ọzọ ná mgbakọ ukwu Ndịàmà Jehova mere na Peruu n’asụsụ Chaịniiz. Obi tọrọ ya ezigbo ụtọ mgbe ọ hụrụ ya. Nwoke ahụ kpọọrọ Alexandra na ndị ya na ya so bịa mgbakọ ahụ gaa nye ha nri n’ebe ọ na-ere nri iji kelee ya maka ihe ọma o meere ya.

Inye ihe na imere ndị ọzọ ihe ọma na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ. Ma, ihe ga-aka eme ka i nwee obi ụtọ bụ ị nyere onye ahụ aka, ya amatakwuo Jehova Chineke, bụ́ Onye na-enye anyị ezi onyinye niile. (Jems 1:17) Ị̀ na-enyere ndị ọzọ aka ịmatakwu Jehova ma na-enweta ụdị obi ụtọ ahụ?

^ para. 21 Ị chọọ ịmatakwu ihe ọma ndị Chineke ga-emere anyị, gụọ akwụkwọ bụ́ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya. Ọ dịkwa na www.jw.org/ig. Gaa n’ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE, pịa ebe e dere AKWỤKWỌ NA BROSHỌ.

GỤKWUO GBASARA YA

BỤRỤ ENYI JEHOVA

Adịla Aka Ntagide

Olee ihe ọma ndị na-emenụ n’ihi na ndị ohu Jehova adịghị aka ntagide?