Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Nke 2 n'Afọ 2017

Ndị Amerịka bịara zụrụ ndị Afrịka ka ha gbawara ha ohu. Ahịa a nyere ndị mmadụ ezigbo ego

Otú Ụfọdụ Ndị Ohu Si Nwere Onwe Ha n’Oge Ochie na n’Oge A

Otú Ụfọdụ Ndị Ohu Si Nwere Onwe Ha n’Oge Ochie na n’Oge A

E nwere otu nwa agbọghọ aha ya bụ Blessing * a kpọ gaa Yurop. Ndị kpọ ya gaa kwere ya nkwa na ọ ga na-arụ ọrụ ebe a na-eme isi. Ma mgbe ha ruru, ha gwara ya ka ọ gbawa akwụna, ya ajụ. Ha kụrụ ya ezigbo ihe ruo ụbọchị iri, gwakwa ya na ha ga-emesi nne na nna ya nọ n’ụlọ ike, ya ekwetazie gbawa akwụna.

Ndị a bụ ndị ndị Ijipt dọọrọ n’agha ka ha gbawara ha ohu

Nne ya ukwu chọrọ ka ọ na-agbata narị euro abụọ ruo narị euro atọ n’abalị ọ bụla ka o nwee ike ịkwụ ya ihe karịrị puku euro * iri anọ ọ sị na ya mefuru kpọta ya Yurop. Blessing kwuru, sị: “M na-echekarị otú m ga-esi gbafuo, ma m cheta ihe ha ga-eme ndị mụrụ m, ike agwụ m.” Nsogbu a Blessing nọ na ya bụ ụdị nsogbu ihe dị ka nde ụmụ nwaanyị anọ nọ na ya n’ụwa niile.

Ihe fọrọ obere ka o ruo puku afọ anọ gara aga, ụmụnne Josef rere ya. Otu nwoke ọnụ na-eru n’okwu n’Ijipt mechara zụrụ ya ka ọ gbawara ya ohu. Ma, e mekpọghị Josef ọnụ ná mmalite ka Blessing. Mana nwunye nna ya ukwu nọ na-enye ya ezigbo nsogbu ka ya na ya kwaa iko, ya ajụ. Otu ụbọchị, o boro Josef ebubo na ọ chọrọ idina ya n’ike. Ihe a mere ka a tụọ Josef mkpọrọ, keekwa ya agbụ ígwè.—Jenesis 39:1-20; Abụ Ọma 105:17, 18.

Ọ bụ n’oge ochie ka Josef gbara ohu, ma Blessing gbara ohu n’oge a. E rere ma Josef ma Blessing ere. Ire mmadụ ka ọ gbawa ohu ebidoghị taa. Ndị na-ere mmadụ na-ere ha otú e si ere ngwá ahịa naanị ka ha nweta ego.

AGHA MERE KA INWETA NDỊ OHU DỊ MFE

N’oge ochie, ụzọ kacha mfe mba dị iche iche si enweta ndị ohu bụ ma ha lụọ agha. E kwuru na Eze ndị Ijipt aha ya bụ Thutmose nke Atọ dọọrọ ndị Kenan dị iri puku itoolu n’agha mgbe o meriri ha. Ha malitere ịgbara ha ohu. Ha na-egwuru ha ihe dị ka kol na ọlaedo, olulu mmiri, ma na-arụrụ ha ụlọ arụsị.

N’oge ndị Rom na-achị, agha ndị ha lụrụ mekwara ka ha nweta ọtụtụ ndị ohu. Ọ na-abụ ha chọwa ndị ohu,  ha agaa lụso mba ndị ọzọ agha, ma dọrọ ndị mmadụ n’agha. E kwuru na n’oge ndịozi Jizọs, e kee ndị bi na Rom ụzọ abụọ, ihe fọrọ obere ka o ruo otu ụzọ bụ ndị ohu. Ndị Ijipt na ndị Rom mekpọrọ ọtụtụ ndị ohu ha ọnụ. Ihe a mere ka ndị ohu na-egwuru ndị Rom ihe dị ka kol na-anọ ihe dị ka naanị afọ iri atọ nwụọ.

Ma, ire ndị mmadụ ka ha gbawa ohu na ọnụ a na-emekpọ ndị ohu akwụsịghị n’oge ahụ. Dị ka ihe atụ, n’agbata afọ 1501 na afọ 1899, ndị Amerịka na-abịa Afrịka azụrụ ndị ga-agbawara ha ohu. Ahịa a bịara bụrụ otu n’ime ahịa kacha nye ndị mmadụ ego n’ụwa niile n’oge ahụ. Òtù UNESCO kwuru ‘na a kpụụrụ ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị na ụmụaka gaa ree. Ha dị ihe dị ka nde iri abụọ na ise ma ọ bụ nde iri atọ.’ E kwuru na ọtụtụ narị puku n’ime ha nwụrụ mgbe e bu ha na-agafe Oké Osimiri Atlantik. Otu onye bụbu ohu aha ya bụ Olaudah Equiano kwuru banyere ọnụ a e mekpọrọ ndị ohu. O kwuru, sị: “Mkpu ụmụ nwaanyị na-eti n’ihi ọnụ a na-emekpọ ha, nakwa ude ndị mmadụ na-asụ tupu ha anwụọ, abụghị ihe e ji ọnụ ekwu.”

Ma, ọ dị mwute na ịgba ohu akwụsịbeghị. Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ọrụ kwuru na ihe ruru nde mmadụ iri abụọ na otu, ma ụmụ nwoke, ma ụmụ nwaanyị ma ụmụaka ka na-arụ ọrụ ugbu a ka ndị ohu. A na-emegbu ha, na-akwụ ha nchọ nchọ ego. Mgbe ụfọdụ, o nweghịdị ihe a na-akwụ ha akwụ. Ebe ụfọdụ n’ime ha na-arụ ọrụ bụ ebe a na-egwu ihe dị ka kol, ebe a na-akpụ brik, nakwa n’ụlọ ndị akwụna. E nwekwara ndị nke na-arụ ọrụ n’ụlọ mmadụ, na ndị na-arụgbu onwe ha n’ọrụ n’ebe a na-adụ ákwà, a na-akwụ ha obere ego. Ọ bụ eziokwu na iwu akwadoghị ihe a a na-eme ha, ma o juru ebe niile.

A ka na-emekpọ ọtụtụ nde mmadụ ọnụ taa ka ndị ohu

OTÚ HA SI NWERE ONWE HA

Ọnụ a na-emekpọ ndị ohu mere ka ọtụtụ n’ime ha gbasie mbọ ike ka ha nwere onwe ha. N’oge ochie, otu ohu aha ya bụ Spartacus na ihe dị ka otu narị puku ndị ohu ndị ọzọ lụsoro ndị Rom agha n’ihi na ha chọrọ inwere onwe ha. Ma, mbọ a ha gbara kụrụ afọ n’ala. N’agbata afọ 1791 na afọ 1804, ndị ohu bi n’agwaetiti Karịbian, nke dị na Hispaniola, lụsokwara ndị nna ha ukwu agha n’ihi na ha chọrọ inwere onwe ha. Ọnụ e mekpọrọ ha n’ebe ha na-arụ ọrụ n’ugbo shuga ken mere ka ha na ndị nna ha ukwu lụọ agha were afọ iri na atọ. Agha a mere ka ha nwere onwe ha ma ghọọ mba Heiti kwụụrụ onwe ya n’afọ 1804.

N’oge ochie, ndị Izrel gbakwara ohu n’Ijipt. Ma, a bịa ná ndị niile gbarala ohu mechara nwere onwe ha, e nweghị ndị a ga-eji otú ha si nwere onwe ha tụnyere nke ndị Izrel. A napụtara mba ahụ niile otu mgbe n’aka ndị Ijipt ha na-agbara ohu. Ha dị ihe dị ka nde mmadụ atọ. E nweghị ndị ọ bụla gbara ohu  a napụtarala otú ahụ. N’eziokwu, ha kwesịrị inwere onwe ha n’ihi na Baịbụl kwuru na ndị Ijipt ‘ji ọchịchị aka ike mee ka ha na-arụrụ ha ọrụ dị ka ndị ohu.’ (Ọpụpụ 1:11-14) Otu n’ime Fero chịrị ndị Ijipt nyedịrị iwu ka e gbuo nwa ọhụrụ ọ bụla bụ́ nwoke ndị Izrel mụrụ ka ha ghara ịna-amụba.—Ọpụpụ 1:8-22.

Otú ndị Izrel si nwere onwe ha n’ọnụ a na-emekpọ ha n’Ijipt pụrụ iche n’ihi na Chineke gbataara ha ọsọ enyemaka. Chineke gwara Mozis, sị: “M maara nnọọ ihe mgbu ha na-enwe. M na-agbada ịga napụta ha.” (Ọpụpụ 3:7, 8) Kemgbe ahụ, ndị Juu na-eme Ememme Ngabiga kwa afọ n’ebe ọ bụla ha bi iji cheta otú e si napụta ha n’aka ndị Ijipt.—Ọpụpụ 12:14.

OTÚ A GA-ESI MEE KA ỊGBA OHU KWỤSỊ

Baịbụl kwuru na ‘ajọ omume adịghị n’ebe Jehova bụ́ Chineke anyị nọ.’ Ọ gwakwara anyị na ọ gbanwebeghị. (2 Ihe E Mere 19:7; Malakaị 3:6) Chineke zitere Jizọs ka ‘o kwusaara ndị a dọọrọ n’agha na a tọhapụwo ha, na ịtọhapụ ndị a na-echi ọnụ n’ala ka ha lawa.’ (Luk 4:18) Ihe a ọ̀ pụtara na a ga-atọhapụ ndị niile na-agba ohu? Mba. Ihe mere e ji zite Jizọs bụ ka ọ napụta ndị mmadụ n’aka mmehie na ọnwụ. Ọ bụ ya mere o ji mechaa kwuo, sị: ‘Eziokwu ahụ ga-eme ka unu nwere onwe unu.’ (Jọn 8:32) Taakwa, e nwere ọtụtụ ụzọ eziokwu ahụ Jizọs kụziri si na-eme ka ndị mmadụ nwere onwe ha.—Gụọ igbe bụ́ “ Otú O Si Nwere Onwe Ya n’Ụdị Ohu Ọ Gbara.”

Nke bụ́ eziokwu bụ na otú Chineke si nyere Josef aka ya enwere onwe ya dị iche n’otú o si nyere Blessing. Na Baịbụl, a kọrọ akụkọ Josef na Jenesis isi iri atọ na itoolu ruo isi iri anọ na otu. Ọ bụ eziokwu na a kọghị akụkọ Blessing na Baịbụl, ma otú o si mechaa nwere onwe ya dịkwa ịtụnanya.

E mechara chụpụ Blessing n’ebe ahụ o bibu na Yurop, ya agaa biri na Spen. Ndịàmà Jehova gara ebe o bi zie ya ozi ọma, ya na ha amalite ịmụ Baịbụl. Blessing kpebisiri ike ịkwụsị akwụna ọ na-agba. N’ihi ya, ọ chọtara ezigbo ọrụ ma rịọ nne ya ukwu ahụ ka o wepụrụ ya ego n’ego ole ahụ ọ na-akwụ ya kwa ọnwa. Otu ụbọchị, ọ kpọrọ Blessing n’ekwentị ma gwa ya akwụkwala ya ego ahụ ọ na-akwụ ya. Ọ rịọkwara ya ka ọ gbaghara ya ihe ọjọọ niile ya mere ya. Gịnị mere nne ya ukwu ji mee ụdị ihe a? Ọ bụ n’ihi na ya na Ndịàmà Jehova malitekwara ịmụ Baịbụl. Blessing kwuru, sị: “Eziokwu ahụ na-eme ka mmadụ nwere onwe ya n’ụzọ dị iche iche dị ịtụnanya.”

Ọnụ e mekpọrọ ndị Izrel n’Ijipt wutere Jehova Chineke. Otú ahụkwa ka ọnụ a na-echi ndị mmadụ n’ala taa na-ewute ya. Ma tupu ndị mmadụ akwụsị ịgba ohu n’ụdị ya ọ bụla, e kwesịrị ịgbanwe ọtụtụ ihe n’ụwa. Chineke ekwuokwala na ya ga-eme ya. Baịbụl kwuru, sị: “E nwere eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ anyị na-echere dị ka nkwa ya si dị, ezi omume ga-ebikwa n’ime ha.”—2 Pita 3:13

^ para. 2 Aha a kpọrọ ya n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ya.

^ para. 3 Ọ pụtara na ihe a chọrọ ka Blessing kwụọ n’oge ahụ bụ puku naịra iri abụọ na anọ ruo puku naịra iri atọ na isii kwa abalị. Ego niile ọ ga-akwụ nne ya ukwu bụ ihe dị ka nde naịra anọ na narị puku asatọ na puku iri anọ.