OLEE IHE I CHERE?

Olee onyinye kachanụ Chineke nyerela anyị?

Baịbụl kwuru, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya.”Jọn 3:16.

Ụlọ Nche a kwuru ihe mere Chineke ji zite Jizọs n’ụwa ka ọ nwụọ n’ihi anyị. O kwukwara otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka onyinye a o nyere anyị.