Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Nke 2 n'Afọ 2017

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | Ị̀ GA-ANABATA ONYINYE KACHANỤ CHINEKE NYERE ANYỊ?

Onyinye Pụrụ Iche Jehova Nyere Anyị

Onyinye Pụrụ Iche Jehova Nyere Anyị

E NWERE otu nwatakịrị nwoke aha ya bụ Jordan. Otu nwoke ya na ezinụlọ ha dị ná mma nyere ya ihe e ji aka pensụl yiri ụgbọ mmiri. Aha nwoke ahụ bụ Russell. Ihe a o nyere ya nwere ike iyi ka o nweghị oké ihe ọ bụ, ma ọ bụ otu n’ime ihe ndị Jordan ji kpọrọ ezigbo ihe. Jordan kwuru, sị: “O nyere m ihe a mgbe m dị obere.” Mgbe Russell nwụrụ, Jordan nụrụ na o nyeere nna mama ya aka, nyekwara nne na nna ya ezigbo aka mgbe ihe siiri ha ike. Jordan mechara kwuo, sị: “Ugbu a m matakwuru onye Russell bụ, m jizi onyinye a o nyere m kpọrọ ihe karịa.”

Ihe a a kọrọ gbasara Jordan na-egosi na ihe e nyere mmadụ nwere ike ịdị ndị ọzọ ka ihe na-abachaghị uru. Ma o nwere ike ịbụ oké ihe n’anya onye ahụ e nyere ya. E nwere otu onyinye na-enweghị atụ Baịbụl kwuru gbasara ya. Ọ sịrị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:16.

Onyinye a Chineke nyere nwere ike ime ka onye nabatara ya nwee ndụ ebighị ebi. È nwere ihe ọzọ a ga-enye mmadụ ga-abara ya uru karịa ihe ga-eme ka ọ dị ndụ ebighị ebi? Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị nwere ike ha amachaghị uru onyinye a bara, ma ezigbo Ndị Kraịst weere ya ka ihe dị “oké ọnụ” ahịa. (Abụ Ọma 49:8; 1 Pita 1:18, 19) Gịnị mere Chineke ji nye Ọkpara ya ka ọ nwụọ maka ụmụ mmadụ?

Pọl onyeozi kọwara ihe mere o ji mee ya. Ọ sịrị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ  esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile.” (Ndị Rom 5:12) Nwoke mbụ ahụ bụ́ Adam kpachaara anya nupụrụ Chineke isi. Ọ bụ ya mere o ji nwụọ. Ọnwụ sizi n’aka ya rute ụmụ ya niile, ya bụ, mmadụ niile.

Baịbụl kwuru na “ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ọnwụ, ma onyinye nke Chineke na-enye bụ ndụ ebighị ebi.” (Ndị Rom 6:23) Chineke zitere Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst n’ụwa ka o jiri ndụ ya zuru okè chụọ àjà iji gbapụta ụmụ mmadụ n’aka ọnwụ. Àjà a ga-eme ka ndị niile nwere okwukwe na Jizọs nweta ndụ ebighị ebi. Ihe a na-akpọ àjà ahụ bụ ‘ihe mgbapụta.’—Ndị Rom 3:24.

Chineke ga-esi n’aka Jizọs Kraịst gọzie ndị niile na-efe ya. Pọl kwuru banyere ngọzi a, sị: “Ekele dịrị Chineke maka onyinye ya a na-apụghị ịkọwa akọwa nke ọ na-enye n’efu.” (2 Ndị Kọrịnt 9:15) N’eziokwu, ihe mgbapụta bụ onyinye magburu onwe ya nke na anyị agaghị akọwachali uru ọ bara. Ma, n’ime onyinye niile Chineke nyere anyị, gịnị mere ihe mgbapụta ahụ ji pụọ iche? * Olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ya? Biko, gụọ ihe Baịbụl kwuru banyere ajụjụ ndị a n’isiokwu abụọ na-esonụ.

^ para. 8 Jizọs ji obi ya niile ‘tọgbọ mkpụrụ obi ya n’ihi anyị.’ (1 Jọn 3:16) Ma, ebe ọ bụ Chineke chọrọ ka Jizọs jiri ndụ ya chụọ àjà, isiokwu atọ mbụ dị n’Ụlọ Nche a kọwara otú Chineke si nye anyị ihe mgbapụta ahụ.