Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Nke 2 n'Afọ 2017

Mgbe Jizọs gara leta nne nwunye Pita ma gwọọ ya.—Matiu 8:14, 15; Mak 1:29-31

Baịbụl Ò Kwuru na Ndị Wepụtara Onwe Ha Ijere Chineke Ozi Agaghị Alụ Di ma Ọ Bụ Nwunye?

Baịbụl Ò Kwuru na Ndị Wepụtara Onwe Ha Ijere Chineke Ozi Agaghị Alụ Di ma Ọ Bụ Nwunye?

OKPUKPE ụfọdụ e nwere n’ụwa taa anaghị ekwe ka ndị ụkọchukwu ha na ndị ọzọ wepụtara onwe ha ijere Chineke ozi na-alụ di ma ọ bụ nwunye. Ụfọdụ okpukpe ndị ahụ bụ Chọọchị Roman Katọlik, Chọọchị Ọtọdọks na okpukpe Buda. Ọtụtụ ndị na-ekwu na ọ bụ ihe a mere ụfọdụ ndị isi okpukpe n’oge a ji akwa iko.

Ọ bụ ya mere anyị ji kwesị ịmata ma Baịbụl ò kwuru na ndị wepụtara onwe ha ijere Chineke ozi agaghị alụ di ma ọ bụ nwunye. Iji chọpụta, ka anyị leba anya n’otú ozizi a si malite na ihe Chineke kwuru banyere ya.

OTÚ OZIZI A SI MALITE

N’afọ 2006, mgbe Poopu Benedict nke Iri na Isii na-agwa Ndị Isi Chọọchị Katọlik okwu, o kwuru na ịmachibido ndị wepụtara onwe ha ijere Chineke ozi iwu ịlụ di ma ọ bụ nwunye “malitere obere oge Ndịozi Jizọs nwụchara.”

N’oge ndịozi Jizọs, enweghị mgbe Ndị Kraịst sịrị na onye wepụtara onwe ya ijere Chineke ozi agaghị alụ di ma ọ bụ nwunye. Pọl onyeozi, bụ́ onye dịrị ndụ n’oge ahụ gwadịrị Ndị Kraịst ibe ya ka ha kpachara anya maka ụfọdụ ndị ga na-ekwu ‘okwu nduhie ndị si n’aka mmụọ’ ma “na-amachibido ịlụ di na nwunye iwu.”—1 Timoti 4:1-3.

Ọ bụ mgbe ndịozi nwụchara ka Chọọchị Katọlik malitere ịmachibido ndị wepụtara onwe ha ijere Chineke ozi iwu ịlụ di ma ọ bụ nwunye. Otu akwụkwọ kwuru na ihe a “dabara n’ihe a malitere ime n’obodo niile ndị Rom na-achị, ya bụ, igbochi ndị mmadụ inwe mmekọahụ.”

 Mgbe o ruru ihe dị ka narị afọ abụọ ndịozi nwụchara, ndị isi chọọchị, nakwa ndị a na-akpọ Ndị Nna Chọọchị kwuru na ndị wepụtara onwe ha ijere Chineke ozi ekwesịghị ịlụ di ma ọ bụ nwunye. Ha chere na inwe mmekọahụ ga-eme ka ha ghara ịdị nsọ. Ma, akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica kwuru na “ọtụtụ ndị ụkọchukwu na ụfọdụ ndị bishọp nọgidere na-alụ nwaanyị ruokwa ihe dị ka narị afọ isii ọzọ.”

Ná Nnọkọ Ndị Isi Chọọchị Katọlik nwere na Rom n’afọ 1123, nakwa n’afọ 1139, ha nyere iwu ka ndị ụkọchukwu na ndị bishọp ha ghara ịna-alụ nwaanyị. Kemgbe ahụ, ọ bụ ihe a ka Chọọchị Roman Katọlik na-eme. N’oge ahụ ndị isi chọọchị Katọlik na-alụ nwaanyị, ha na-ekenye ụmụ ha ihe chọọchị nwe n’ékpé. Ha nwụọ, chọọchị anaghịzi enwe ikike n’ihe ndị ahụ, ego chọọchị na-enweta na ha na-efunahụkwa ha. Ma iwu a ha mere mere ka ihe ndị ahụ gharazie ịna-eme.

OTÚ CHINEKE SI ELE MMADỤ ỊNỌ NA-ALỤGHỊ DI MA Ọ BỤ NWUNYE ANYA

Baịbụl kwuru otú Chineke si ele okwu a anya. Jizọs kwuru na e nwere ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye “n’ihi alaeze eluigwe,” otú ahụ yanwa na-alụghị. (Matiu 19:12) Pọl onyeozi alụghịkwa nwaanyị. O kwukwara na e nwere ụfọdụ Ndị Kraịst ibe ya kpebiri ime ka ya, ghara ịlụ di ma ọ bụ nwunye “n’ihi ozi ọma.”—1 Ndị Kọrịnt 7:37, 38; 9:23.

Ma, enweghị mgbe ma Jizọs ma Pọl nyere Ndị Kraịst iwu alụla di ma ọ bụ nwunye. Jizọs kwuru na ọ bụghị Ndị Kraịst niile nwere “onyinye” ịnọ na-alụghị di ma ọ bụ nwunye. Mgbe Pọl na-ekwu okwu banyere ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye, ọ sịrị: “Enweghị m iwu ọ bụla nke si n’aka Onyenwe anyị, ma m na-ekwu uche m.”—Matiu 19:11; 1 Ndị Kọrịnt 7:25.

Ihe ọzọkwa bụ na Baịbụl gosiri na ọtụtụ Ndị Kraịst n’oge ndịozi lụrụ nwaanyị. Pita onyeozi sokwa na ha. (Matiu 8:14; Mak 1:29-31; 1 Ndị Kọrịnt 9:5) N’ihi otú ịkwa iko si ju ebe niile ndị Rom na-achị n’oge ahụ, Pọl kwudịrị na ọ bụrụ na onye nlekọta e nwere n’ọgbakọ Ndị Kraịst alụọla nwaanyị, o kwesịrị ịbụ “di nke otu nwunye.” O kwukwara na o kwesịrị ịbụ “onye nwere ụmụ na-edo onwe ha n’okpuru ya.”—1 Timoti 3:2, 4.

Anyị ekwesịghị iche na Ndị Kraịst ahụ bụ́ di na nwunye enweghị mmekọahụ n’ihi na Baịbụl kwuru hoo haa na ‘di kwesịrị ịna-enye nwunye ya ihe ruuru ya.’ O kwukwara na ndị di na nwunye ekwesịghị ‘ịjụ inye ya ibe ha,’ ya bụ, ha inwe mmekọahụ. (1 Ndị Kọrịnt 7:3-5) O doro anya na Chineke amachibidoghị ịlụ di ma ọ bụ nwunye iwu. O nyeghịkwa iwu ka ndị wepụtara onwe ha ijere ya ozi ghara ịlụ di ma ọ bụ nwunye.

N’IHI OZI ỌMA

Ebe ọ bụ na Chineke amachibidoghị ịlụ di ma ọ bụ nwunye iwu, gịnịzi mere Jizọs na Pọl ji kwuo okwu ọma gbasara ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye? Ọ bụ n’ihi na ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye nwere ike ime ka mmadụ nwekwuo ohere na-ekwusa ozi ọma. Ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye nwere ike iwepụtakwu oge maka ozi Chineke n’ihi na ihe na-echegbu ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye anaghị echegbu ha.—1 Ndị Kọrịnt 7:32-35.

Dị ka ihe atụ, otu nwoke aha ya bụ David na-arụ ọrụ a na-akwụ ya ezigbo ụgwọ n’isi obodo Meksiko. Ma, ọ hapụrụ ya kwaga n’otu ime obodo dị na Kosta Rika ka o nwee ike ịkụziri ndị mmadụ Baịbụl. David kwuru na ihe nyeere ya aka ime ihe a bụ na ya alụbeghị nwaanyị. Ọ sịrị: “O siiri m ike imewe ihe otú ndị obodo a si eme, nakwa ịhapụ ebe marala m ahụ́. Ma, ihe dịtụụrụ m mfe n’ihi na ọ bụ naanị m.”

E nwekwara otu nwaanyị na-alụbeghị di aha ya bụ Claudia. O si n’ebe o bibu kwaga n’ebe a chọkwuru ndị ga-ekwusa ozi ọma. Claudia kwuru, sị: “Ozi ọma m na-ekwusa ebe a na-atọ m ụtọ. Ọ na-abụ m hụ otú Chineke si na-elekọta m, ya ana-eme ka okwukwe m na-esikwu ike, mụ na ya ana-adịkwukwa ná mma.”

“Ma ị̀ lụrụ di ma ọ bụ na ị lụghị, i jiri obi gị niile na-ejere Jehova Chineke ozi, ị ga na-enwe obi ụtọ.”Claudia

Onye na-alụghị di ma ọ bụ nwunye ekwesịghị iche na nke ya agwụla. Claudia kwukwara, sị: “Ma ị̀ lụrụ di ma ọ bụ na ị lụghị, i jiri obi gị niile na-ejere Jehova Chineke ozi, ị ga na-enwe obi ụtọ.”—Abụ Ọma 119:1, 2.

GỤKWUO GBASARA YA

AJỤJỤ NDỊ MMADỤ NA-AJỤKARỊ

Ndịàmà Jehova Hà Tiri Iwu Gbasara Otú Nwoke na Nwaanyị Ga-esi Na-akpa Tupu Ha Alụọ?

Nwoke na nwaanyị ịkpa tupu ha alụọ ọ̀ bụ ihe eji egwu egwu, ka è nwere ihe ọ pụtara?