Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Nke 1 n'Afọ 2016

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | ỊKWỤWA AKA ỌTỌ Ọ̀ BARA URU?

Ihe Mere Ịkwụwa Aka Ọtọ Ji Aba Uru

Ihe Mere Ịkwụwa Aka Ọtọ Ji Aba Uru

“Anyị kwenyesịrị ike na anyị nwere akọ na uche ziri ezi, ebe anyị na-achọ ka anyị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.”—Ndị Hibru 13:18.

Na Baịbụl, otu ihe okwu Grik a na-asụgharị “ime ihe n’eziokwu” ma ọ bụ ịkwụwa aka ọtọ pụtara bụ “ime ihe dị ezigbo mma.” O nwekwara ike ịpụta ịkpa àgwà ọma.

Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ kwuo, sị: “Anyị na-achọ ka anyị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.” Ndị Kraịst ji ihe a o kwuru kpọrọ ihe. Ma, gịnị ka ihe a o kwuru pụtara?

ỌGỤ ANYỊ NA MMEHIE ANYỊ BU PỤTA ỤWA NA-ALỤ

Ọtụtụ ndị na-ele onwe ha n’enyo n’ụtụtụ ọ bụla tupu ha apụọ. Maka gịnị? Maka na ha chọrọ ịdị nnọọ mma n’anya tupu ha apụwa. Ma, o nwere ihe ka mkpa karịa ịkpụ isi mara mma ma ọ bụ iyi uwe dị́ sam. Àgwà anyị nwere ike ime ka otú anyị dị n’anya na-amasịkwu ndị ọzọ ma ọ bụkwanụ ghara ịna-amasị ha.

Okwu Chineke kwuru hoo haa na ime ihe ọjọọ na-agụ anyị agụụ. Jenesis 8:21 sịrị: “Ọchịchọ obi mmadụ jọrọ njọ malite n’oge ọ bụ nwata gawa.” N’ihi ya, iji nwee ike ịna-akwụwa aka ọtọ, anyị ga na-alụso ọchịchọ ọjọọ a anyị bu pụta ụwa ọgụ. Pọl onyeozi kọwara otú yanwa si na-alụso mmehie o bu pụta ụwa ọgụ. O kwuru, sị: “N’ezie, iwu Chineke na-eme m obi ụtọ, dị ka mmadụ m bụ n’ime si dị, ma ana m ahụ n’ahụ́ m iwu ọzọ nke na-alụso iwu nke uche m agha, na-adọrọkwa m n’agha gaa n’iwu nke mmehie nke dị n’ahụ́ m.”—Ndị Rom 7:22, 23.

Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na obi anyị na-agwa anyị mee ihe ọjọọ, ya abụrụkwa na ọ na-agụsi anyị ike ịghara ịkwụwa aka ọtọ, anyị ga-ajụli ime ihe ọjọọ ahụ obi anyị na-agwa anyị mee. Anyị gbaa mbọ ghara ịna-eche ihe ọjọọ, anyị ga-anọgide na-akwụwa aka ọtọ n’agbanyeghị na ọtụtụ ndị anaghị akwụwa aka ọtọ.

OTÚ ANYỊ GA-ESI EMERI N’ỌGỤ A

Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-akwụwa aka ọtọ, anyị agaghị na-akpa àgwà otú masịrị anyị. Ọ dị mwute na oge ọtụtụ ndị na-ewepụta iji kpebie ụdị ejiji ha ga-eji karịrị oge ha na-ewepụta iji chọpụta ma àgwà ha ọ̀ dịkwa mma. Ọ bụ ya mere ha ji ewere na o nweghị ihe o mere ma ha ghara ịkwụwa aka ọtọ mgbe ụfọdụ. Legodị otú otu akwụkwọ kwuru gbasara akwụwaghị aka ọtọ si kọwaa ihe a ọtụtụ ndị na-eme. O kwuru, sị: “Anyị na-agbalị akwụwa aka ọtọ ka ndị mmadụ nwee ike ịna-akwanyere anyị ùgwù. Ma, anyị na-aghọ aghụghọ ma anyị chọpụta na ndị mmadụ agaghị ama.” Ma, è nwere ihe ga-enyere anyị aka ikpebi ma ànyị kwesịrị ịna-akwụwa aka ọtọ mgbe niile? Obi dị anyị ụtọ na e nwere.

Ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa niile achọpụtala na Baịbụl ga-enyeliri anyị aka ikpebi ma ànyị kwesịrị ịna-akwụwa aka ọtọ mgbe niile. N’ime akwụkwọ niile na-ekwu gbasara otú mmadụ kwesịrị isi na-akpa àgwà, o nweghị nke dị ka Baịbụl. (Abụ Ọma 19:7) Anyị gụọ Baịbụl, anyị ga-amata ihe anyị ga-eme ka ezinụlọ anyị dịrị n’otu, ọrụ anyị ana-eme anyị obi ụtọ, anyị ana-akpa àgwà ọma, na-efekwa Chineke otú ọ chọrọ. Baịbụl na-abara ndị mmadụ uru kemgbe ụwa. N’agbanyeghị mba ma ọ bụ agbụrụ mmadụ si, onye ahụ mehaala ihe Baịbụl kwuru, ọ na-abara ya uru. Ọ bụrụ na anyị  ana-agụ Baịbụl, na-echebara ihe anyị na-agụ echiche, ma na-eme ihe anyị gụtara, obi anyị ga na-agwa anyị ka anyị na-akwụwa aka ọtọ ma na-eme ihe ziri ezi.

Ma, e wezụga ịmụ Baịbụl nke ọma, o nwere ihe ọzọ anyị ga-eme iji nwee ike ịna-akwụwa aka ọtọ. Anyị kwesịrị ịna-arịọ Chineke ka o nyere anyị aka ịkwụwa aka ọtọ, ebe anyị bi n’ụwa retọrọ eretọ, a na-anwakwa anyị ime ka ha. (Ndị Filipaị 4:6, 7, 13) Chineke ga-enyere anyị aka ịkata obi na-eme ihe dị́ mma ma na-akwụwa aka ọtọ n’ihe niile anyị na-eme.

URU ỊKWỤWA AKA ỌTỌ BARA

Otú Hitoshi anyị kọrọ gbasara ya n’isiokwu mbụ n’akwụkwọ a si kwụwa aka ọtọ mechara baara ya uru. O mechara nweta ọrụ n’ebe onyeisi ọrụ ya ji ya kpọrọ ihe maka na ọ na-akwụwa aka ọtọ. Hitoshi kwuru, sị: “Obi dị m ụtọ na m mechara nweta ọrụ mere ka m nwee ike ịnọgide na-akwụwa aka ọtọ.”

O nweekwala ndị ọzọ chọpụtara na ịkwụwa aka ọtọ bara uru. Ha “na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile” dị ka Baịbụl kwuru ka anyị na-eme. Ka anyị lee otú ụfọdụ n’ime ha sirila rite uru.

  • Ọ Na-eme Ka Mmadụ Nwee Akọnuche Dị Ọcha

    Otu nwaanyị Ayaland aha ya bụ Cheryl kwuru, sị: “M kwụsịrị ịga ụlọ akwụkwọ mgbe m dị afọ iri na atọ, ma soro ndị ohi gawa ohi. E kee ihe niile m nwere n’oge ahụ ụzọ iri, ụzọ itoolu na ọkara bụ ihe ndị m zutere ezute. Emechara m lụọ di, mụ na ya amalitekwa iso Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl. Anyị kpebiri ịkwụsị izu ohi mgbe anyị mụtara na Jehova * Chineke kpọrọ ndị na-anaghị akwụwa aka ha ọtọ asị. N’afọ 1990, anyị nyefere Jehova onwe anyị, e meekwa anyị baptizim, anyị aghọọ Ndịàmà Jehova.”—Ilu 6:16-19.

    “N’oge mbụ, ihe juru n’ụlọ m bụ ihe ndị e zutere ezute. Ma ugbu a, ụdị ihe ndị ahụ adịghịzi na ya. O meela ka akọnuche m dị ọcha. Ọ na-abụ m cheta ọtụtụ afọ m nọbu na-ezu ohi, mụ ekelee Jehova maka otú o si meere m ebere. Obi na-abụ m sọ aṅụrị tupu mụ alaba ụra n’ụbọchị ọ bụla n’ihi na m ma na ihe m na-amasị Jehova ugbu a.”

    Otu nwoke Họng Kọng aha ya bụ Sonny kwuru, sị: “O nwere otu ụbọchị ọga m chọpụtara na m jụrụ ịnara aka azụ onye chọrọ ka anyị na ya zụkọwa ahịa nyere m, ya asị m: ‘N’eziokwu, Chineke gị kere gị ka ị bụrụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi. Ị baara anyị ezigbo uru n’ụlọ ọrụ a.’ Ịkwụwa aka ọtọ n’ihe niile m na-eme emeela ka m nwee akọnuche dị ọcha, mụ na Jehova Chineke adịrịkwa ná mma. O meekwala ka m nwee ike inyere ndị ezinụlọ m na ndị enyi m aka ịna-akwụwa aka ọtọ.”

  • Ọ Na-eme Ka Obi Ruo Mmadụ Ala

    Otu nwoke Amerịka aha ya bụ Tom kwuru, sị: “Abụ m osote onyeisi n’otu ụlọ akụ̀ ngalaba ya dị n’ebe dị iche iche n’ụwa. Ihe ka ọtụtụ ndị ọrụ anyị mkpa bụ ịfọju akpa ha, ọ bụghị ịkwụwa aka ọtọ. Otu ihe ha na-ekwukarị bụ na o nweghị ihe dị njọ ma a na-aghatụ obere ụgha iji nweta nnukwu ego, e jirikwa ego ahụ na-akwalite akụnụba obodo. Ma, obi na-eru m ala maka na m na-akwụwa aka ọtọ. Ekpebiekwala m na m ga-anọgide na-akwụwa aka ọtọ ihe ọ sọkwara ya ya mee. Ndị m na-arụrụ ọrụ ma na agaghị m aghara ha ụgha ma ọ bụ jiri maka ha ghaa ụgha.”

  • Ọ Na-eme Ka A Na-asọpụrụ Mmadụ

    Otu nwaanyị Japan aha ya bụ Kaori kwuru, sị: “Onyeisi ná ngalaba m na-arụ gwara m ka m ghaa ụgha gbasara ihe a na-achọ achọ n’ụlọ ọrụ anyị, mụ ajụ. Mgbe e mechara mata ndị zuuru ihe ahụ, onye m na-arụrụ ọrụ kelere m maka ikwu eziokwu. Mmadụ ga-akatarịrị obi tupu ya enwee ike ịkwụwa aka ọtọ n’ụwa a ọtụtụ ndị na-anaghị akwụwa aka ha ọtọ. Ma mmadụ kata obi na-akwụwa aka ọtọ, ndị ọzọ ga na-atụkwasị ya obi, na-asọpụkwara ya.”

Onye na-akwụwa aka ọtọ ga-enwe akọnuche dị́ ọcha, obi eruo ya ala, ndị ọzọ ana-asọpụkwara ya. Ihe ndị a na-egosi na ọ bara uru ịna-akwụwa aka ọtọ. Gịnị ka i chere?

^ para. 18 Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.

GỤKWUO GBASARA YA

TETA!

Baịbụl Ọ̀ Ka Bara Uru?—Ịkwụwa Aka Ọtọ

Raquel gaara enwe ezigbo ego ma a si na ọ naara aka azụ. Ma, ọjụjụ ọ jụrụ ịna ego aka azụ baara ya ezigbo uru.

OZI ỌMA SI N’AKA CHINEKE!

Olee Otú Iwu Chineke Si Abara Anyị Uru?

Jizọs kọwara ihe mere o ji dị mma ka Chineke na-eduzi anyị, kwuokwa banyere iwu abụọ kacha mkpa.