Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Febụwarị 2016

Mụta Ihe n’Aka Ndị Ji Obi Ha Niile Kwado Jehova

Mụta Ihe n’Aka Ndị Ji Obi Ha Niile Kwado Jehova

“Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị ma ọ́ bụghị ime ihe n’ikpe ziri ezi na ịhụ obiọma n’anya nakwa iji obi umeala soro Chineke gị na-eje ije?”—MAỊKA 6:8.

ABỤ: 63, 43

1, 2. Olee otú Devid si gosi na ọ na-akwado Chineke? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

E NWERE mgbe Sọl na puku ndị agha ya atọ nọ na-achọ Devid n’ala ịkpa Juda ka ha gbuo ya. Ma n’otu abalị, Devid na ndị ikom ya hụrụ ebe Sọl na ndị agha ya mara ụlọikwuu. Ha niile nọ n’ụra. N’ihi ya, Devid na Abishaị ji nwayọọ gafere ndị agha ahụ niile ma hụ Sọl. Abishaị takwụnyeere Devid, sị: “Hapụ m ka m jiri ube a magide ya n’ala naanị otu ugboro, agaghị m ama ya ugboro abụọ.” Ma Devid ekweghị ka o gbuo Sọl. Ọ sịrị Abishaị: “Egbula ya, n’ihi na ònye setịworo aka ya metụ onye Jehova tere mmanụ ma ka bụrụ onye aka ya dị ọcha?” Devid sịkwara: “Tụfịakwa! Dị ka Jehova si ele ihe anya, agaghị m esetị aka m metụ onye Jehova tere mmanụ.”—1 Samuel 26:8-12.

2 Devid ma ihe o kwesịrị ime iji gosi na ọ na-akwado Jehova. Ọ ma na ya kwesịrị ịna-akwanyere Sọl ùgwù.  O chetụdịghị echiche imerụ ya ahụ́. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Chineke họọrọ Sọl ka ọ bụrụ eze ndị Izrel. Taa, Jehova chọkwara ka ndị ohu ya niile na-akwado ya ma na-akwanyere ndị ọ hapụrụ ka ha bụrụ ndị ọchịchị ma ọ bụ ndị na-elekọta ndị ọzọ ùgwù.—Gụọ Maịka 6:8.

3. Olee otú Abishaị si kwado Devid?

3 Abishaị kwanyeere Devid ùgwù n’ihi na ọ ma na Chineke họọrọ Devid ka ọ bụrụ eze. Ma mgbe Devid ghọchara eze, o mere mmehie ndị dị́ oké njọ. Ya na nwunye Yuraya nwere mmekọahụ, ya agwa Joab ka ọ hụ na e gburu Yuraya n’agha. (2 Samuel 11:2-4, 14, 15; 1 Ihe E Mere 2:16) Ebe Abishaị bụ nwanne Joab, o nwere ike ịbụ na Abishaị nụrụ ihe ahụ Devid mere. Ma, ọ kwụsịghị ịkwanyere Devid ùgwù. Ihe ọzọ bụ na Abishaị bụ ọchịagha. A sị na ọ chọrọ, ọ gaara eji ikike a o nwere mee onwe ya eze. Ma, o meghị otú ahụ. Kama, o jeere Devid ozi ma chebe ya ka ndị iro ghara igbu ya.—2 Samuel 10:10; 20:6; 21:15-17.

4. (a) Olee otú Devid si gosi na ọ na-akwado Chineke? (b) Olee ndị ọzọ anyị ga-amụ banyere ha?

4 Devid kwadoro Jehova ruo mgbe ọ nwụrụ. Mgbe ọ ka na-eto eto, o gburu dike a na-akpọ Golayat bụ́ onye nọ na-akparị Jehova na ndị Izrel. (1 Samuel 17:23, 26, 48-51) Mgbe Devid bụ eze, Netan bụ́ onye amụma Jehova gbaziri ya n’ihi mmehie ndị o mere. Devid kwetara ozugbo na o mehiere ma chegharịa. (2 Samuel 12:1-5, 13) Mgbe Devid kara nká, o wetara ọtụtụ ọlaedo na ihe ndị ọzọ a ga-eji rụọ ụlọ nsọ Jehova. (1 Ihe E Mere 29:1-5) O doro anya na n’agbanyeghị na Devid mere ihe ndị jọgburu onwe ha, o nweghị mgbe ọ kwụsịrị ịkwado Chineke. (Abụ Ọma 51:4, 10; 86:2) N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe Devid na ndị ọzọ bí n’oge ya mere, mụtakwa otú anyị ga-esi na-akwado Jehova karịa onye ọ bụla ọzọ. Anyị ga-atụlekwa àgwà ndị ọzọ ga-enyere anyị aka ime otú ahụ.

Ị̀ GA NA-AKWADO JEHOVA?

5. Gịnị ka ihe Abishaị mejọrọ na-akụziri anyị?

5 Ihe mere Abishaị ji chọọ igbu Sọl bụ na ọ chọrọ ịkwado Devid. Ma ebe Devid ma na ọ dịghị mma imerụ “onye Jehova tere mmanụ” ahụ́, o kweghị ka Abishaị gbuo Sọl. (1 Samuel 26:8-11) Ihe dị́ mkpa anyị na-amụta n’ihe a bụ na ányị chọọ ịmata onye anyị ga-akwado karịa onye ọ bụla ọzọ, anyị kwesịrị iche echiche mata ihe Baịbụl kwuru nke ga-enyere anyị aka.

Anyị kwesịrị ịkwado Jehova karịa onye ọ bụla ọzọ

6. N’agbanyeghị na obi na-adị anyị ụtọ ịkwado ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi anyị, gịnị mere anyị kwesịrị iji kpachara anya?

6 Obi na-adị anyị ụtọ ịkwado onye anyị hụrụ n’anya, dị́ ka enyi anyị ma ọ bụ onye ezinụlọ anyị. Ma ebe anyị bụ ndị na-ezughị okè, obi anyị nwere ike iduhie anyị. (Jeremaya 17:9) N’ihi ya, ọ bụrụ na onye anyị hụrụ n’anya na-eme ihe ọjọọ, sikwa n’ọgbakọ pụọ, anyị kwesịrị  icheta na ọ bụ Jehova ka anyị kwesịrị ịkwado karịa onye ọ bụla ọzọ.—Gụọ Matiu 22:37.

7. Olee otú otu nwanna nwaanyị si gosi na ọ na-akwado Chineke mgbe nsogbu bịaara ya?

7 A chụọ onye ezinụlọ unu n’ọgbakọ, i nwere ike igosi Jehova na ị na-akwado ya. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Ana. Otu ụbọchị, mama ya a chụrụ n’ọgbakọ kpọrọ ya na fon gwa ya na ya chọrọ ịbịa leta ya. [1] (Lee ihe e dere ná ngwụcha isiokwu a.) Mama Ana sịrị na obi adịghị ya mma n’ihi na ndị ezinụlọ ya ekweghị atụpụrụ ya ọnụ. O wutere Ana, ya ekwe mama ya nkwa na ya ga-eji akwụkwọ ozi zaa ya. Tupu Ana edee akwụkwọ ozi ahụ, ọ tụgharịrị uche n’ihe ụfọdụ e kwuru na Baịbụl. (1 Ndị Kọrịnt 5:11; 2 Jọn 9-11) N’akwụkwọ ozi ahụ, o weturu obi kọwaara mama ya na ọ bụ yanwa hapụrụ ezinụlọ ha mgbe o mehiere ma jụ ichegharị. Ana gwara mama ya na naanị ihe ọ ga-eme ka obi bidokwa ịdị ya ụtọ bụ ịlọghachikwute Jehova.—Jems 4:8.

8. Olee àgwà ndị ga-enyere anyị aka ịna-akwado Chineke?

8 Ndị ji obi ha niile na-efe Chineke n’oge Devid dịkwa umeala n’obi, nweekwa obiọma na obi ike. Ka anyị hụ otú àgwà ndị a ga-esi nyere anyị aka ịna-akwado Jehova.

ANYỊ KWESỊRỊ ỊDỊ UMEALA N’OBI

9. Gịnị mere Abna ji gbalịa ka o gbuo Devid?

9 Jọnatan nwa Sọl na Abna bụ́ onyeisi ndị agha Izrel hụrụ ka Devid buteere Eze Sọl isi Golayat. Jọnatan metara Devid enyi ma na-akwado ya. (1 Samuel 17:57–18:3) Ma Abna emeghị otú ahụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na o nyedịịrị Sọl aka mgbe ọ na-agbalị igbu Devid. (1 Samuel 26:1-5; Abụ Ọma 54:3) Jọnatan na Abna ma na Chineke chọrọ ka ọ bụrụ Devid ga-achị Izrel ma Sọl chịchaa. Ma mgbe Sọl nwụrụ, Abna akwadoghị Devid. Kama ịkwado ya, ọ gbara mbọ ka o mee Ish-boshet nwa Sọl eze. O nwere ike ịbụ na Abna mechara chọọ ịbụ eze. Ọ ga-abụ ihe mere o ji dinaa otu n’ime ndị iko Eze Sọl. (2 Samuel 2:8-10; 3:6-11)  Gịnị mere otú Jọnatan si lee Devid anya ji dị́ iche n’otú Abna si lee ya anya? Ọ bụ n’ihi na Jọnatan kwadoro Jehova, dịkwa umeala n’obi, ma Abna akwadoghị Jehova, ọ dịghịkwa umeala n’obi.

10. Gịnị mere Absalọm akwadoghị Chineke?

10 Nwa Eze Devid aha ya bụ Absalọm akwadoghị Chineke n’ihi na ọ dịghị umeala n’obi. Ọ chọrọ ịbụ eze. Ọ bụ ya mere o ji nweta ‘ụgbọ ịnyịnya, nwetakwa ọtụtụ ịnyịnya na ndị ikom iri ise na-agba ọsọ n’ihu ya.’ (2 Samuel 15:1) O mekwara ka ọtụtụ ndị Izrel kweta ịna-akwado ya. Ọ gbadịrị mbọ ka o gbuo nna ya Devid n’agbanyeghị na ọ ma na ọ bụ Jehova mere nna ya eze Izrel.—2 Samuel 15:13, 14; 17:1-4.

11. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Baịbụl kọrọ banyere Abna, Absalọm, na Barọk?

11 Ọ bụrụ na mmadụ adịghị umeala n’obi, na-achọkwa ka e nyekwuo ya ikike ma ọ bụ ọkwá, ọ ga-esiri ya ike ịna-akwado Chineke. N’eziokwu, anyị hụrụ Jehova n’anya. Anyị achọghịkwa ịna-achọ naanị ọdịmma onwe anyị ma ọ bụ bụrụ ndị ọjọọ otú ahụ Abna na Absalọm mere. Ma anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyaukwu ghara ime ka anyị chụwa ego ma ọ bụ rụwa ọrụ ga-eme ka anyị bụrụ ndị ukwu n’ụwa. Ọ ga-eme ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma. O nwere mgbe Barọk, bụ́ odeakwụkwọ Jeremaya, nọ na-achọ ihe ndị ọ na-enweghị, nke mere ka ọ ghara ịna-enwe obi ụtọ n’ozi ọ na-ejere Chineke. Jehova sịrị Barọk: “Lee! M ga-etida ihe m wuru, m ga-efopụkwa ihe m kụrụ, bụ́ ala a dum. Ma gị onwe gị, ị na-achọrọ onwe gị ihe ukwu. Kwụsị ịchọ ya.” (Jeremaya 45:4, 5) Barọk gere Jehova ntị. Anyịnwa kwesịkwara ige ya ntị n’ihi na ọ ga-ebibi ụwa ochie a n’oge na-adịghị anya.

Ọ bụrụ na ị gwa nwanna ka ọ gakwuru ndị okenye ka ha nyere ya aka, ọ ga-egosi na ị dị obiọma nakwa na ị na-akwado Jehova

12. Kọọ akụkọ gosiri na anyị agaghị akwadoli Chineke ma ọ bụrụ na anyị na-eche naanị banyere onwe anyị.

12 E nwere otu nwanna bí na Meksiko aha ya bụ Daniel. Ọ chọburu ịlụ otu nwa agbọghọ na-anaghị efe Jehova. Daniel sịrị: “Mgbe m malitechara ịsụ ụzọ, m ka nọkwa na-edegara ya akwụkwọ ozi.” Ma Daniel mechara ghọta na ya na-eche naanị banyere onwe ya, mata na ya anaghị  akwado Jehova, nakwa na o kwesịrị ịdị umeala n’obi. N’ihi ya, ọ kọọrọ otu nwanna bụrụla okenye ọtụtụ afọ banyere nwa agbọghọ ahụ. Daniel mechara kpebie onye ọ ga-akwado. O kwuru, sị: “Okenye ahụ nyeere m aka ịghọta na ọ bụrụ na m chọrọ ịna-akwado Chineke, m kwesịrị ịkwụsị idegara nwa agbọghọ ahụ akwụkwọ ozi. Mgbe m kpere ekpere ugboro ugboro, beekwa ákwá, m mere otú ahụ. N’oge na-adịghị anya, m malitere inwekwu obi ụtọ n’ozi ọma.” Daniel alụọla nwanna nwaanyị hụrụ Jehova n’anya. Ọ bụkwa onye nlekọta sekit ugbu a.

ỊKWADO CHINEKE GA-ENYERE ANYỊ AKA ỊDỊ OBIỌMA

Ọ bụrụ na ị mata na enyi gị emeela mmehie dị́ oké njọ, ị̀ ga-agwa ya banyere ya ma hụ na ọ gakwuuru ndị okenye ka ha nyere ya aka? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)

13. Mgbe Devid mehiere, olee otú Netan si gosi na ya na-akwado Jehova, na-akwadokwa Devid?

13 Ọ bụrụ na anyị na-akwado Jehova, anyị ga na-akwadokwa ndị ọzọ ma na-enyere ha aka otú kacha mma. Netan onye amụma kwadoro Jehova, kwadokwa Devid. Mgbe Devid kpọọrọ nwunye onye ọzọ ma gbuo di ya, Jehova gwara Netan ka ọ gaa dụọ Devid ọdụ. Netan nwere obi ike ma rubere Jehova isi. Ma, o mere ihe gosiri na ọ ma ihe. O ji obiọma gwa Devid okwu. Ọ chọrọ inyere Devid aka ịghọta na mmehie o mere jọgburu onwe ya. N’ihi ya, ọ kọọrọ ya banyere otu ọgaranya nke zuuru naanị otu nwa atụrụ otu nwoke bụ́ ogbenye nwere. Mgbe Devid nụrụ ya, ihe ọgaranya ahụ mere were ya ezigbo iwe. Netan gwaziri ya, sị: “Ọ bụ gị bụ nwoke ahụ!” Devid ghọtara na ya mehiere Jehova.—2 Samuel 12:1-7, 13.

14. Olee otú ị ga-esi na-akwado Jehova, ndị enyi gị ma ọ bụ ndị ikwu gị?

14 Inwe obiọma ga-enyere gị aka ibu ụzọ na-akwado Jehova, na-akwadokwa ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịhụ ihe gosiri na nwanna mere mmehie dị́ oké njọ. I nwere ike ịchọ ịkwado ya, nke ka nke, ma ọ bụrụ na ọ bụ ezigbo enyi gị ma ọ bụ onye ezinụlọ unu. Ma, ị makwa na ihe ka mkpa bụ ịkwado Jehova. N’ihi ya, rubere Jehova isi ma jiri obiọma gwa nwanna gị okwu. Gwa ya na o kwesịrị ịgwa ndị okenye ka ha nyere ya aka nakwa na o kwesịrị ime otú ahụ n’egbughị oge. Ọ bụrụ na o meghị ya, i kwesịrị ịgwa ndị okenye. Ime otú ahụ ga-egosi na ị na-akwado Jehova. Ọ ga-egosikwa na ị dị obiọma n’ihi na ndị okenye nwere ike inyere ya aka ka ya na Jehova dịkwa ná mma. Ha ga-ewetu obi ma jiri nwayọọ gbazie ya.—Gụọ Levitikọs 5:1; Ndị Galeshia 6:1.

INWE OBI IKE GA-EME KA ANYỊ NA-AKWADO CHINEKE

15, 16. Gịnị mere Hushaị ji kwesị inwe obi ike ka o nwee ike ịkwado Chineke?

15 Hushaị so ná ndị bụ́ ezigbo enyi Eze Devid. Mgbe ndị Izrel chọrọ ime Absalọm eze, ọ bụ inwe obi ike nyeere  Hushaị aka ịkwado Devid, kwadokwa Chineke. Ọ ma na Absalọm du ndị agha ya bịa Jeruselem nakwa na Devid agbaala ọsọ. (2 Samuel 15:13; 16:15) Ma, gịnị ka Hushaị mere? Ọ̀ hapụrụ Devid, kwadowazie Absalọm? Mba. N’agbanyeghị na Devid emeela agadi mgbe ahụ, ọtụtụ ndị ana-achọkwa igbu ya, Hushaị ji obi ya niile kwado ya n’ihi na ọ bụ Jehova họọrọ Devid ka ọ bụrụ eze. Ọ bụ ya mere Hushaị ji gaa izute Devid n’Ugwu Oliv.—2 Samuel 15:30, 32.

16 Devid gwara Hushaị ka ọ laghachi Jeruselem, mee ka ọ̀ bụ enyi Absalọm ka o nwee ike ime ka Absalọm kweta ime ihe o kwuru kama ime ihe Ahitofel kwuru. Hushaị nwere obi ike, rubere Devid isi ma kwado Jehova n’agbanyeghị na o nwere ike ịta isi ya. Devid rịọrọ Jehova ka o nyere Hushaị aka. Jehova mere otú ahụ. Absalọm gere Hushaị ntị kama ige Ahitofel ntị.—2 Samuel 15:31; 17:14.

17. Gịnị mere anyị ji kwesị inwe obi ike ka anyị nwee ike ịna-akwado Jehova?

17 Anyị kwesịrị inwe obi ike ka anyị nwee ike ịna-akwado Jehova ma na-erubere ya isi kama ime ihe ndị ezinụlọ anyị, ndị ọrụ ibe anyị, ma ọ bụ ndị ọchịchị chọrọ ka anyị mee. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwanna bí na Japan aha ya bụ Taro. Malite mgbe ọ bụ nwata, ọ na-eme ihe niile o nwere ike ime ka obi dị́ nne ya na nna ya ụtọ. Ọ na-erubere ha isi, na-akwadokwa ha, ọ bụghị iji mezuo iwu, kama n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya. Ma, mgbe ya na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl, nne ya na nna ya chọrọ ka ọ kwụsị. O wutere ya, ịgwa ha na ya ekpebiela ịna-aga ọmụmụ ihe sikwaara ya ike. Ọ sịrị: “Otú iwe si wee ha mere na ruo ọtụtụ afọ, ha ekweghị ka m lọta ụlọ hụ ha. M kpere ekpere ka Jehova nye m obi ike ime ihe m kpebiri. Iwe ha adajụọla ugbu a. M na-agazi ahụ ha mgbe niile.”—Gụọ Ilu 29:25.

18. Olee uru i ritere n’isiokwu a anyị mụrụ?

18 Ka anyị na-akwado Jehova otú Devid, Jọnatan, Netan, na Hushaị mere. Anyị mee otú ahụ, anyị ga-enwe obi ụtọ. Anyị achọghị ime ka Abna na Absalọm, bụ́ ndị na-akwadoghị Jehova. N’eziokwu, anyị bụ ndị na-ezughị okè, anyị na-emejọkwa. Ma, ka anyị na-egosi na ihe kacha anyị mkpa bụ ịkwado Jehova.

^ [1] (paragraf nke 7) Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.