Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Mee 2016

Olee Otú I Si Eme Mkpebi?

Olee Otú I Si Eme Mkpebi?

“Nọgidenụ na-aghọta ihe uche Jehova bụ.”—EFE. 5:17.

ABỤ: 69, 57

1. Olee ụfọdụ iwu Baịbụl nyere anyị, oleekwa otú irubere ha isi si abara anyị uru?

JEHOVA enyela anyị iwu ndị doro anya n’Okwu ya bụ́ Baịbụl. Dị ka ihe atụ, o nyere anyị iwu ka anyị ghara ịkwa iko, ikpere arụsị, izu ohi, na ịṅụbiga mmanya ókè. (1 Kọr. 6:9, 10) E nwekwara iwu na-adịghị mfe Ọkpara Chineke bụ́ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya. Ọ sịrị ha: “Gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ. Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu. Ma, lee! m nọnyeere unu ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ usoro ihe a.” (Mat. 28:19, 20) Iwu ndị Chineke nyere anyị na-echebe anyị. Irubere iwu ndị ahụ isi emeela ka anyị ghara ire ùgwù anyị, mee ka anyị ghara ịna-arịa ọrịa ụfọdụ, meekwa ka anyị na-enwe obi ụtọ n’ezinụlọ anyị. Nke kacha mkpa bụ na irubere iwu Jehova isi, ma iwu o nyere ka anyị na-ekwusa ozi ọma, na-eme ya obi ụtọ, ya ana-agọzikwa anyị.

2, 3. (a) Gịnị mere na Baịbụl enyeghị iwu gbasara ihe niile anyị ga-eme? (b) Olee ajụjụ ndị a ga-aza n’isiokwu a? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

2 Ma, e nwere ọtụtụ ihe Baịbụl na-enyeghị iwu ọ bụla gbasara ha. Dị ka ihe atụ, Baịbụl akpọghị aha ụdị uwe Ndị Kraịst kwesịrị ịna-eyi. Olee otú ihe a si gosi na Jehova ma ihe? Omenala na ụdị uwe a na-eyi abụghị otu ná mba niile.  Ihe ndị a na-agbanwekwa ka oge na-aga. A sị na Baịbụl kpọrọ aha ụdị uwe ndị mmadụ ga na-eyi, ọ gaara aghọla ihe ndị mgbe ochie. Ọ bụ ụdị ihe ahụ mere na Baịbụl enyeghị anyị ọtụtụ iwu gbasara ụdị ọrụ Onye Kraịst kwesịrị ịna-arụ, ihe ndị anyị ga-eji na-atụrụ ndụ, ma ọ bụ ụdị ọgwụ anyị ga na-aṅụ. N’ihi ya, onye ọ bụla na ndị isi ezinụlọ ga-eji aka ha kpebie ihe ha ga-eme.

3 Ọ̀ pụtara na Jehova achọghị ịma banyere ihe ọ bụla anyị kpebiri ime, ọ bụrụgodị ihe nwere ike ịdị ezigbo mkpa ná ndụ anyị? Ihe ọ bụla anyị kpebiri ime ọ̀ ga-adị Nna anyị nke eluigwe mma ọ bụrụhaala na ọ bụghị ịda iwu Baịbụl? Ọ bụrụ na e nweghị iwu Baịbụl nyere, olee otú anyị ga-esi mata ihe ga-adị Jehova mma?

IHE ANYỊ KPEBIRI IME Ò NWERE IHE O MERE?

4, 5. Olee otú mkpebi anyị nwere ike isi gbasa ma anyịnwa ma ndị ọzọ?

4 Ụfọdụ ndị nwere ike iche na ihe anyị kpebiri ime enweghị ihe o mere. Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ihe anyị kpebiri ime dị́ Jehova mma, anyị kwesịrị ichebara iwu na ụkpụrụ ndị dị́ na Baịbụl echiche ma rubere ha isi. Dị ka ihe atụ, anyị chọọ ime ihe dị́ Jehova mma, anyị kwesịrị idebe iwu o nyere gbasara ọbara. (Jen. 9:4; Ọrụ 15:28, 29) Ekpere ga-enyere anyị aka ikpebi ihe ga-adaba adaba n’iwu Baịbụl nakwa n’ụkpụrụ ya.

5 Mkpebi ndị dị́ mkpa anyị na-eme nwere ike ime ka okwukwe anyị sikwuo ike. Ihe ọ bụla anyị kpebiri ime nwere ike ịgbasa adịm ná mma anyị na Jehova. Mkpebi dị́ mma ga-eme ka anyị na Chineke dịkwuo ná mma, ma mkpebi na-adịghị mma ga-eme ka anyị na ya ghara ịdị ná mma. Ihe ọzọ bụ na mkpebi na-adịghị mma nwere ike inye ndị ọzọ nsogbu n’obi ma ọ bụ mee ka ha sụọ ngọngọ, ma ọ bụkwanụ mee ka ọgbakọ ghara ịdị n’otu. Ihe ndị a nwere ike ime ka okwukwe ụmụnna anyị ghara isi ike. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-ekpebi ime ihe dị́ mma.—Gụọ Ndị Rom 14:19; Ndị Galeshia 6:7.

6. Olee ihe kwesịrị ịdị anyị mkpa mgbe anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme?

6 Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na Baịbụl ekwughị ihe anyị ga-eme? Ụdị ihe ahụ mee, kama ime ihe dị́ anyị mma, anyị kwesịrị ichebara ihe anyị chọrọ ime echiche ma mee ihe ọ ga-abụ anyị mee, obi adị Jehova mma. Anyị mee otú ahụ, obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga-eme ka ihe anyị kpebiri ime gaa nke ọma.—Gụọ Abụ Ọma 37:5.

NA-AGHỌTA IHE BỤ́ UCHE JEHOVA

7. Ọ bụrụ na e nweghị iwu Baịbụl nyere n’ihe anyị chọrọ ikpebi, olee otú anyị ga-esi mata ihe Jehova chọrọ ka anyị mee?

7 I nwere ike ịna-eche, sị, ‘Olee otú anyị ga-esi mata ihe dị́ Jehova mma ma ọ bụrụ na Baịbụl ekwughị hoo haa ihe anyị ga-eme?’ Ndị Efesọs 5:17 kwuru, sị: “Na-aghọta ihe uche Jehova bụ.” Ọ bụrụ na e nweghị iwu Baịbụl nyere gbasara ihe anyị chọrọ ikpebi, olee otú anyị ga-esi mata ihe bụ́ uche Chineke? Ọ bụ ikpe ekpere ma kwe ka o jiri mmụọ nsọ ya duzie anyị.

8. Olee otú Jizọs si mata ihe Jehova chọrọ ka o mee? Nye ihe atụ.

8 Chegodị otú Jizọs si ghọta ihe Nna ya chọrọ ka o mee. Baịbụl kọrọ banyere ugboro abụọ Jizọs bu ụzọ kpee ekpere ma rụọ ọrụ ebube nye ìgwè mmadụ nri. (Mat. 14:17-20; 15:34-37) Ma, mgbe agụụ na-agụ Jizọs n’ala ịkpa, Ekwensu asị ya mee ka nkume ghọọ achịcha, o kweghị eme ya. (Gụọ Matiu 4:2-4.)  Ebe Jizọs ma ihe bụ́ uche Nna ya, ọ ma na ya ekwesịghị ime ka nkume ghọọ achịcha. N’eziokwu, Jizọs ghọtara na Chineke achọghị ka o jiri mmụọ nsọ mee ihe ga-abara naanị ya uru. Otú ahụ ọ jụrụ ime ihe Setan gwara ya gosiri na obi siri ya ike na Jehova ga na-eduzi ya ma na-enye ya nri.

9, 10. Olee ihe ga-enyere anyị aka ikpebi ihe dị́ mma? Nye ihe atụ.

9 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime mkpebi dị́ mma otú ahụ Jizọs mere, anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi na ọ ga na-eduzi anyị. Anyị kwesịrị ime ihe Baịbụl kwuru. Ọ sịrị: “Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi, adaberekwala ná nghọta gị. N’ụzọ gị niile, mara ya, ya onwe ya ga-emekwa ka ụzọ gị kwụrụ ọtọ. Abụla onye maara ihe n’anya onwe gị. Tụọ egwu Jehova, hapụkwa ihe ọjọọ.” (Ilu 3:5-7) Ịmụ Baịbụl ma mata uche Jehova nwere ike inyere anyị aka ịmata ihe Chineke chọrọ ka anyị mee n’ihe anyị chọrọ ikpebi. Ọ bụrụ na anyị ana-amatakwu uche Jehova, obi anyị ‘ga-adị nro,’ ya bụ, anyị ga na-anabata nduzi ya.—Ezik. 11:19.

10 Dị ka ihe atụ, chegodị banyere nwaanyị gara ahịa, hụ akpụkpọ ụkwụ ọ chọrọ ịzụ. Ma, ọ dị oké ọnụ. N’ihi ya, ọ jụrụ onwe ya, sị, ‘Olee otú obi ga-adị di m ma m jiri ego há otú a zụọ akpụkpọ ụkwụ?’ O nwere ike ịbụ na ọ ma azịza ya n’agbanyeghị na di ya anọghị ebe ahụ. Olee otú o si mata? Afọ ole ha birila emeela ka ọ mata otú di ya chọrọ ka ha si na-emefu ego ha na-akpata. Ọ bụ ihe nyeere ya aka ịmata otú obi ga-adị di ya ma ọ zụọ ihe ahụ. Otú ahụ ka ọ dị anyị. Ọ bụrụ na anyị ejiri nwayọọ nwayọọ na-amata uche Jehova na ihe ndị o mere n’oge gara aga, anyị ga na-aghọtakwu ihe Nna anyị nke eluigwe chọrọ ka anyị mee n’ihe dị́ iche iche anyị chọrọ ikpebi.

OLEE OTÚ Ị GA-ESI MATA UCHE JEHOVA?

11. Olee ajụjụ ndị anyị nwere ike ịjụ onwe anyị mgbe anyị na-agụ Baịbụl ma ọ bụ na-amụ ya? (Kwuo ihe dị́ n’igbe bụ́ “ Mgbe Ị Na-amụ Okwu Chineke, Jụọ Onwe Gị, Sị.”)

11 Anyị chọọ ịmata ihe bụ́ uche Jehova, anyị kwesịrị ịna-amụsi ihe ike. Anyị gụwa Okwu Chineke ma ọ bụ mụwa ya, anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị, ‘Gịnị ka ihe a na-akụziri m banyere Jehova? Gịnị mere o ji mee ihe a o mere?’ Anyị kwesịrị inwe ụdị obi ahụ ọbụ abụ bụ́ Devid nwere mgbe o dere, sị: “Jehova, biko, mee ka m mara ụzọ gị; zi m ụzọ gị. Mee ka m jee ije n’eziokwu gị, kụziere m ihe, n’ihi na ị bụ Chineke nke nzọpụta m. Ọ bụ n’ebe ị nọ ka olileanya m dị ogologo ụbọchị dum.” (Ọma 25:4, 5) Ị tụgharịwa uche n’ebe ị gụrụ na Baịbụl, i nwere ike ichebara ajụjụ ndị a echiche: ‘Olee otú m ga-esi mee ihe a ná ndụ m? Olee ebe m nwere ike ime ya? Ọ̀ bụ n’ụlọ, n’ụlọ ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, ka ọ̀ bụ n’ozi ọma?’ Ozugbo ị matara ebe i nwere ike ime ya, o nwere ike ịdịkwuru gị mfe ịmata otú ị ga-esi eme ya.

12. Olee otú ọmụmụ ihe na akwụkwọ ndị a na-ebipụtara anyị si enyere anyị aka ịmata ihe Jehova chere gbasara ihe dị́ iche iche?

12 Otú ọzọ anyị ga-esi amata ihe bụ́ uche Jehova bụ ịna-ege ntị n’ihe nzukọ ya ji Baịbụl na-akụziri anyị. Dị ka ihe atụ, ihe mere e ji bipụta Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ bụ ka o nyere anyị aka ịmata ihe Jehova chere banyere ọtụtụ ihe anyị kwesịrị iji aka anyị kpebie. Anyị na-eritekwa ezigbo uru ma anyị gee ntị nke ọma n’ọmụmụ ihe ma zaa ajụjụ. Ịtụgharị uche n’ihe a na-akụziri anyị ga-enyere anyị aka ịmatakwu ihe bụ́ uche Jehova ma chewe echiche ka ya. Ọ bụrụ na anyị ejiri ndokwa ndị Jehova mere maka  ịkụziri anyị Okwu ya kpọrọ ihe, anyị ga-eji nwayọọ nwayọọ na-aghọtakwu otú o si eme ihe. Anyị ga-esi otú ahụ mụta otú anyị ga-esi na-eme mkpebi Chineke anyị hụrụ anyị n’anya ga-agọzi.

TUPU GỊ EMEE MKPEBI, CHEE BANYERE IHE GA-ADỊ JEHOVA MMA

13. Nye ihe atụ na-egosi otú anyị nwere ike isi mee mkpebi dị́ mma ma ọ bụrụ na anyị echee banyere ihe bụ́ uche Jehova.

13 Ka anyị tụlee ihe atụ na-egosi otú ịmata ihe bụ́ uche Jehova ga-esi nyere anyị aka ime mkpebi dị́ mma. Ebe anyị na-ekwusa Alaeze Chineke, anyị nwere ike ịchọ ịbụ ndị ọsụ ụzọ oge niile. Iji mee ya, anyị nwere ike iselata aka n’ịchụ ego. Ma, anyị nwere ike ịchọpụta na anyị na-echegbu onwe anyị ma ànyị ga na-enwekwa ezigbo obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị enweghịzi ego otú anyị nwere na mbụ. O doro anya na o nweghị ebe Baịbụl nyere anyị iwu ka anyị bụrụ ndị ọsụ ụzọ. Anyị chọọ, anyị nwere ike bụrụ naanị ndị nkwusa kwesịrị ntụkwasị obi n’ozi anyị na-ejere Jehova. Ma, Jizọs kwere anyị nkwa na ndị hapụrụ ihe dị́ iche iche maka Alaeze Chineke ga-enweta ngọzi buru ibu. (Gụọ Luk 18:29, 30.) Ihe Baịbụl kwuru gosikwara na obi na-adị Jehova ụtọ ma ọ bụrụ na anyị ana-enye ya otuto sí anyị n’obi, jirikwa obi ụtọ na-eme ihe ọ bụla anyị ga-emeli iji kwado ofufe ya. (Ọma 119:108; 2 Kọr. 9:7) Ihe ndị a Baịbụl kwuru na ikpe ekpere ka Jehova duzie anyị ọ́ naghị eme ka anyị ghọta uche ya? Ichebara ihe ndị a echiche ga-enyere anyị aka ikpebi ihe ga-abara anyị uru nakwa ihe ga-eme ka Nna anyị nke eluigwe gọzie anyị.

14. Olee otú i nwere ike isi mata ma ụdị uwe ị chọrọ iyi ọ̀ dị Jehova mma?

14 Ka anyị tụlee ihe atụ ọzọ: Ka e were ya na e nwere otu ụdị uwe masịrị gị, ma ya abụrụ na ọ ga-akpasu ụfọdụ ndị nọ́ n’ọgbakọ iwe. Ma, o nwere ike ịbụ na o nweghị ebe ị ma Baịbụl kwuru ka a ghara iyi ụdị uwe ahụ. Olee otú ị ga-esi mata ihe Jehova chere? Pọl onyeozi kwuru, sị: “Achọrọ m ka ụmụ nwaanyị jiri uwe dị mma n’anya na-achọ onwe ha mma n’imeru ihe n’ókè na uche zuru okè, ọ bụghị ịkpa ụdị isi dị iche iche na iji ọlaedo ma ọ bụ nkume pel chọọ onwe ha mma, ma ọ̀ bụ iji ejiji dị nnọọ oké ọnụ, kama n’ụzọ kwesịrị ụmụ nwaanyị ndị na-ekwupụta na ha na-asọpụrụ Chineke, ya bụ, site n’ezi ọrụ.” (1 Tim. 2:9, 10) Ihe a Pọl kwuru  gbasakwara ụmụ nwoke bụ́ Ndị Kraịst. Ebe anyị bụ ndị ohu Jehova, anyị na-achọ ịma ihe ndị ọzọ na-eche banyere uwe anyị, ọ bụghị naanị ihe dị́ anyị mma. Imeru ihe n’ókè na ịhụnanya ga-eme ka anyị na-echebara ihe na-amasị ụmụnna anyị echiche ka anyị ghara ịkpasu ha iwe ma ọ bụ mee ihe ga-ewute ha. (1 Kọr. 10:23, 24; Fil. 3:17) Iburu ihe Baịbụl kwuru n’obi ga-enyere anyị aka ịghọta ihe Jehova chere n’ihe a, meekwa ka ihe anyị ga-ekpebi dị́ ya mma.

15, 16. (a) Olee otú obi ga-adị Jehova ma ọ bụrụ na anyị ana-eche banyere omume rụrụ arụ? (b) Anyị chọọ ikpebi ụdị ihe anyị ga-eji na-atụrụ ndụ, olee otú anyị ga-esi mata ihe ga-adị Jehova mma? (ch) Olee otú anyị kwesịrị isi na-eme mkpebi ndị dị́ mkpa?

15 Ihe Baịbụl kwuru gosiri na obi anaghị adị Jehova mma ma ndị mmadụ mewe ihe ọjọọ, ‘ihe niile obi ha na-eche mgbe niile abụrụkwa naanị ihe ọjọọ.’ (Gụọ Jenesis 6:5, 6.) Ihe a na-eme ka anyị ghọta na mmadụ ịna-eche banyere omume rụrụ arụ adịghị mma n’ihi na o nwere ike ime ka onye ahụ mee mmehie dị́ oké njọ Baịbụl sịrị anyị emela, nke na-ewekwa Jehova iwe. Jems bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs dere, sị: “Amamihe nke si n’elu bu ụzọ dị ọcha, na-emekwa udo, nwee ezi uche, dị njikere irube isi, jupụta n’ebere na ezi mkpụrụ, ọ dịghị akpa ókè n’ihi ile mmadụ anya n’ihu, ọ dịghị ihu abụọ.” (Jems 3:17) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịjụ ụdị ntụrụndụ ọ bụla na-eme ka mmadụ chewe banyere ihe na-adịghị mma ma ọ bụ chọwa ime ya. Ọ bụrụ na anyị aghọta nke ọma ihe dị́ Jehova mma na ihe ọ kpọrọ asị, ọ ga-adịrị anyị mfe ịmata akwụkwọ, fim, ma ọ bụ egwuregwu anyị ga-ahọrọ. Baịbụl mere ka ihe o chere banyere ụdị ihe ahụ doo anyị anya.

16 Anyị chọwa ikpebi ihe anyị ga-eme, a na-enwekarị ihe dị́ iche iche ọ ga-abụ anyị mee, ya adị Jehova mma. Ma, ọ bụrụ ihe dị́ ezigbo mkpa, ọ na-adị mma mgbe ụfọdụ ka anyị jụọ ndị okenye ka ha nye anyị ndụmọdụ ma ọ bụ anyị agakwuru Ndị Kraịst ndị ọzọ má nke a na-akọ n’ọgbakọ ka ha tụọrọ anyị aro. (Taị. 2:3-5; Jems 5:13-15) N’eziokwu, ọ gaghị adị mma ka anyị gwa ndị ọzọ ka ha kpebiere anyị ihe anyị ga-eme. Ndị Kraịst kwesịrị ịzụ ikike nghọta ha azụ ma jiri ya na-ekpebi ihe ha ga-eme. (Hib. 5:14) Anyị niile kwesịrị ime ihe ahụ Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ kwuo. Ọ sịrị: “Onye ọ bụla ga-ebu ibu nke ya.”—Gal. 6:5.

17. Olee uru anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị na-eme mkpebi ga-adị Jehova mma?

17 Ọ bụrụ na anyị ana-eme mkpebi dị́ Jehova mma, anyị ga-abịarukwu ya nso. (Jems 4:8) Anyị ga na-eme ihe dị́ ya mma, ya ana-agọzikwa anyị. Anyị ga-esi otú ahụ mee ka okwukwe anyị nwere ná Nna anyị nke eluigwe na-esikwu ike. N’ihi ya, ka anyị na-atụgharị uche n’ihe anyị gụrụ na Baịbụl ka anyị nwee ike ịmata ihe bụ́ uche Jehova. O doro anya na a ga na-enwe ihe ọhụrụ anyị ga na-amụta banyere Jehova. (Job 26:14) Ma, ọ bụrụ na anyị ana-agbasi mbọ ike, anyị ga-enweta amamihe na nghọta ga na-enyere anyị aka ịna-ekpebi ihe ga-abara anyị uru. (Ilu 2:1-5) Echiche ụmụ mmadụ na-ezughị okè na atụmatụ ha na-agbanwe agbanwe. Ma, otu ọbụ abụ kwuru, sị: “Nzube Jehova ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi; echiche obi ya na-adị site n’otu ọgbọ ruo n’ọgbọ ọzọ.” (Ọma 33:11) N’eziokwu, anyị ga-emeli mkpebi magburu onwe ya ma ọ bụrụ na anyị ana-eche echiche otú Jehova si eche, na-emekwa ihe ga-adị ya mma.