Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MEE 2016

 IHE SÍ N’EBE ANYỊ NA-EDEBE IHE OCHIE

“Ndị E Nyere Ọrụ Ahụ”

“Ndị E Nyere Ọrụ Ahụ”

MGBE mmiri zochara ụbọchị ole na ole, ifufe efeekwa, anwụ chawara na Mọnde, abalị mbụ n’ọnwa itoolu afọ 1919. N’ehihie ụbọchị ahụ, ihe na-erughị otu puku mmadụ zukọrọ n’ụlọ ezumezu na-aba puku mmadụ abụọ na narị ise maka nnọkọ nke mbụ ná mgbakọ e mere na Sida Pọịnt, Ohayo, dị́ n’Amerịka. Ná mgbede, puku mmadụ abụọ ndị ọzọ ji ma ụgbọ mmiri ma ụgbọala ma ụgbọ okporo ígwè pụrụ iche bịarute. Na Tuzdee, ndị bịaranụ karịrị akarị, nke mere ka a nọrọzie n’okpuru nnukwu osisi ndị dị́ n’èzí mee ihe omume fọrọnụ ná mgbakọ ahụ.

Ìhè anyanwụ na-achabata na ndò dị́ n’okpuru osisi ndị ahụ mere ka ọ dị́ ka kootu ndị nke nwoke yi ọ̀ tụrụ àgwà àgwà. Ikuku sí n’Ọdọ Mmiri Irii nọ na-ekusa okpu ndị nke nwaanyị kpu, na-achọ iburu ya. Otu nwanna kwuru, sị: “Ebe ahụ mara ezigbo mma. A naghị anụ mkpọtụ ọ bụla ga-eme ka mmadụ cheta ụwa ochie. Ọ dị nnọọ ka paradaịs.”

Mma ebe ahụ mara enweghị ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere ọṅụ ndị bịara mgbakọ ahụ nwere. Otu akwụkwọ akụkọ obodo ahụ kwuru, sị: “Ndị niile bịaranụ yiri ndị na-anaghị eji ife Chineke egwu egwu. Ma, ọnụ bụ ha ọchị ọchị. Ha na-egwusakwa ndị ọzọ egwu.” Otú ha na ibe ha si nọrịa tọrọ ha ụtọ, nke ka nke, ebe ọ bụ na ọtụtụ ọnwụnwa bịaara ha afọ ole na ole tupu mgbe ahụ, ma mmegide e megidere ha n’oge agha, ma obi abụghị otu e nwere n’ọtụtụ ọgbakọ, ma mmechi e mechiri Betel dị́ na Bruklin, ma mkpọrọ a tụrụ ọtụtụ n’ime ha n’ihi ikwusa gbasara Alaeze Chineke. Ụfọdụ n’ime ndị a tụrụ mkpọrọ ahụ bụ ụmụnna asatọ Jehova ji na-eduzi nzukọ ya, bụ́ ndị a tụrụ mkpọrọ iri afọ abụọ. *

Ụfọdụ Ndị Mmụta Baịbụl kwụsịrị ịna-ekwusa ozi ọma n’ihi na nsogbu ndị e nwere n’afọ ndị ahụ gbara ha gharịị, meekwa ka ha daa mbà. Ma, ọtụtụ n’ime ha gbalịsiri ike ịna-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị na ndị ọchịchị nọ na-emegide ha. Otu onye na-eme nchọpụta kwuru na n’otu mgbe, Ndị Mmụta Baịbụl ọ gbara ajụjụ ọnụ kwuru na n’agbanyeghị na ndị ọchịchị agwasiela ha ike ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma, ha ga “na-ekwusa okwu Chineke ruo ọgwụgwụ.”

N’oge ọnwụnwa ahụ niile, Ndị Mmụta Baịbụl kwesịrị ntụkwasị obi nọ “na-ele anya ka ha mata otú Onyenwe anyị ga-esi duo ha, . . . na-ekpesikwa ekpere ike ka Nna anyị nke eluigwe duzie ha.” Ha niile mechara jiri obi ụtọ zukọọ ná mgbakọ ahụ e mere na Sida Pọịnt. Ihe otu nwanna nwaanyị kwuru gosiri  otú obi dị ọtụtụ n’ime ha, bụ́ ndị nọ na-eche otú ha ga-esi na-ekwusakwu ozi ọma nakwa otú a ga-esi bidokwa ịhazi ozi ọma ha ahazi. Ịmalitekwa ikwusa ozi ọma bụ ihe kacha ha mkpa.

NGWÁ ỌRỤ ỌHỤRỤ A KPỌRỌ “GA”

N’otu izu, ndị bịara mgbakọ ahụ nọ na-eche ihe “GA” pụtara. E dere ya ma n’akwụkwọ usoro ihe omume mgbakọ ahụ ma na kaadị e ji anabata ndị bịaranụ ma n’ihe ndị e dere n’ebe dị́ iche iche n’ala mgbakọ ahụ. Na Fraịdee, nke a kpọrọ “Ụbọchị Ndị Ọrụ Ibe Anyị,” Nwanna Rutherford mechara kọwaa ihe ahụ gbara puku mmadụ isii bịara mgbakọ ahụ gharịị. “GA” pụtara The Golden Age, nke bụ́ magazin ọhụrụ a ga-eji na-ekwusa ozi ọma. *

Nwanna Rutherford kwuru banyere Ndị Kraịst ibe ya e tere mmanụ, sị: “N’agbanyeghị oge nsogbu ahụ, okwukwe ha nwere mere ka ha hụ Oge Pụrụ Iche, ya bụ, oge dị́ ebube Mesaya ga na-achị. . . . Ha ghọtara na ọrụ kacha mkpa na ihe ùgwù ha nwere bụ ịna-agwa ụwa niile na Oge Pụrụ Iche na-abịa. O so n’ọrụ Chineke nyere ha.”

A kpọrọ The Golden Age “magazin eziokwu, olileanya, na obi ike.” A ga-eji ya malite ụzọ ọhụrụ a ga-esizi na-ekwusa eziokwu, ya bụ, ịna-aga n’ụlọ n’ụlọ na-agwa ndị mmadụ ka ha tụọ ọda ya. Mgbe a jụrụ mmadụ ole chọrọ ịmalite ọrụ ahụ, mmadụ niile wụliri elu. Ha jizi ụdị ịnụ ọkụ n’obi naanị ndị na-eso ụzọ Jizọs nwere bụọ abụ, sị: “Onyenwe anyị, zipụta ìhè gị na eziokwu gị.” Otu nwanna aha ya bụ Norris kwuru, sị: “Ọ fọrọ obere ka ụda abụ ahụ mee ka osisi ndị dị́ ebe ahụ mawa jijiji. A gaghị m echefu ya echefu.”

Mgbe a gbasara, ndị bịara mgbakọ ahụ kwụ n’ahịrị ruo ọtụtụ awa ka ha soro ná ndị mbụ ga-atụ ọda magazin ahụ. Obi dị ọtụtụ ndị otú ọ dị otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Mabel Philbrick. Ọ sịrị: “Obi tọrọ anyị ụtọ ịmata na anyị enwetala ọrụ ọzọ anyị ga na-arụ.”

“NDỊ E NYERE ỌRỤ AHỤ”

Ihe dị ka puku Ndị Mmụta Baịbụl asaa jikeere maka ọrụ. A kọwara otú a ga-esi na-arụ ọrụ ahụ n’akwụkwọ e ji kpọsaa magazin ahụ, nke a kpọrọ Organization Method nakwa n’akwụkwọ nta bụ́ To Whom the Work Is Entrusted. Ngalaba Ije Ozi ọhụrụ a ga-ehiwe n’isi ụlọ ọrụ anyị ga na-eduzi ọrụ ahụ. A ga-ehiwe Kọmitii Ije Ozi n’ọgbakọ, nwee nwanna a họpụtara ga na-ekwu ihe a ga-eme, keekwa ókèala ná nkebi ná nkebi. Nkebi nke ọ bụla ga-enwe ihe dị́ ka otu narị ụlọ na iri ise ruo narị abụọ. A ga na-enwe Nzukọ Ije Ozi ná mgbede Tọzdee. Ụmụnna ga-eji oge ahụ na-akọ ihe ndị mere n’ozi ọma, na-enyekwa akụkọ ozi ha.

Otu nwanna aha ya bụ Herman Philbrick sịrị: “Mgbe anyị lara, anyị niile malitere ịgwa ndị mmadụ ka ha tụọ ọda magazin ahụ.” Ha hụrụ ndị chọrọ ige ntị n’ebe ọ bụla ha gara. Nwanna ọzọ aha ya bụ Beulah Covey kwuru, sị: “O yiri ka agha ahụ a lụrụ nke tara ndị mmadụ ezigbo ahụhụ mere ka mmadụ niile chọsie ike ka oge ahụ pụrụ iche bịawa abịawa. Otu nwanna aha ya bụ Arthur Claus dere, sị: “O juru ọgbakọ dum anya nke ukwuu ịhụ ọtụtụ ndị tụrụ ọda magazin ahụ.” Ọnwa abụọ a malitechara ibipụta magazin ahụ, ọ fọrọ obere ka ole e nyere ndị mmadụ ruo narị puku ise. Ndị tụrụ ọda ya rukwara iri puku ise.

Otu isiokwu bụ́ “Ozi Ọma Alaeze Chineke” gbara n’Ụlọ Nche Bekee nke July 1, 1920. Nwanna A. H. Macmillan mechara kwuo na ọ bụ ya bụ nke mbụ nzukọ Jehova gwara ụmụnna niile ka ha kwusawa ozi ọma Alaeze Chineke n’ụwa niile otú anyị si ekwusa ya ugbu a. Isiokwu ahụ gbara Ndị Kraịst niile e tere mmanụ ume ka ha “gbawara ụwa àmà na Alaeze eluigwe adịla nso.” Taa, ọtụtụ nde ndị jí ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma esonyerela Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ “ndị e nyere ọrụ ahụ,” ha na-echekwa oge ahụ pụrụ iche, bụ́ mgbe Mesaya ga na-achị.

^ para. 5 Gụọ akwụkwọ bụ́ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom, isi nke 6, nke isiokwu ya bụ “Oge Ule (1914 ruo 1918).”

^ para. 9 N’afọ 1937, a gbanwere aha The Golden Age ka ọ bụrụ Consolation, malitekwa ịkpọ ya Teta! n’afọ 1946.