Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MEE 2016

Jiri Ịhụnanya Na-edozi Nghọtahie

Jiri Ịhụnanya Na-edozi Nghọtahie

“Unu na ibe unu dị n’udo.”MAK 9:50.

ABỤ: 39, 77

1, 2. Olee ndị akwụkwọ Jenesis kwuru na ha nwere nghọtahie? Gịnịkwa mere o ji gbasa anyị?

Ì CHETỤLA banyere ndị Baịbụl kwuru na ha nwere nghọtahie? Naanị n’isi ole na ole ndị mbụ nke Jenesis, Ken gburu Ebel (Jen. 4:3-8); Lemek gburu otu nwa okorobịa tiri ya ihe (Jen. 4:23); ndị na-azụrụ Ebreham atụrụ na ndị na-azụrụ Lọt atụrụ sere okwu (Jen. 13:5-7); Hega ledara Sera anya, Sera wesakwara Ebreham iwe (Jen. 16:3-6); Ishmel nọ na-emegide onye ọ bụla, onye ọ bụla ana-emegidekwa ya.—Jen. 16:12.

2 Gịnị mere e ji kwuo banyere nghọtahie ndị ahụ na Baịbụl? Ọ bụ n’ihi na ọ na-enyere ndị mmadụ na-ezughị okè aka ịmata ihe mere ha ji kwesị ime ka ha na ndị ọzọ dịrị n’udo. Ọ na-emekwa ka anyị mata otú anyị ga-esi eme ya. Ọ na-abara anyị uru ma anyị gụọ ihe Baịbụl kọrọ banyere ndị mmadụ ibe anyị ha na nsogbu dị́ iche iche nọ na-alụ. Anyị na-amụta uru mbọ ha gbara baara ha. Anyị nwere ike isi otú ahụ mata otú anyị ga-esi mee ihe anyị mụtara ma ụdị nsogbu ahụ bịara anyị. N’eziokwu, ihe a niile na-enyere anyị aka ịmata ihe anyị kwesịrị ime na ihe anyị na-ekwesịghị ime ma ụdị ihe ahụ mee.—Rom 15:4.

3. Olee ihe ndị a ga-amụ n’isiokwu a?

3 Isiokwu a ga-akọwa ihe mere ndị ohu Jehova ji kwesị ịna-edozi nghọtahie ha na ndị ọzọ nwere nakwa otú ha ga-esi  na-eme ya. Ọ ga-ekwukwa ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru ga-enyere ha aka idozi nghọtahie, nke ga-eme ka ha na Jehova na ndị agbata obi ha dị́ ná mma.

IHE MERE NDỊ NA-EFE CHINEKE JI KWESỊ IDOZI NGHỌTAHIE HA NWERE

4. Olee àgwà juru n’ụwa taa? Oleekwa nsogbu ọ kpatarala?

4 Ọ bụ Setan bụ isi sekpụ ntị mere na ndị mmadụ adịghị n’otu, na-enwekwa ọtụtụ nghọtahie. N’ogige Iden, o kwuru na onye ọ bụla kwesịrị ịna-ekpebiri onwe ya ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ n’achọghị ịma ihe bụ́ echiche Chineke. (Jen. 3:1-5) Ma, nsogbu ụdị echiche ahụ na-akpata doro ewu na ọkụkọ anya. Ihe juru n’ụwa bụ ndị mmadụ na òtù dị́ iche iche na-eme ihe sọrọ ha, nke na-akpata mpako, itu ọnụ, na ịmarịta aka. Ọ bụrụ na mmadụ ana-akpa àgwà ndị a, ọ pụtara na ọ na-akwado ihe ahụ Setan kwuru na onye ọ bụla kwesịrị ịna-eme ihe masịrị ya n’agbanyeghị nsogbu o nwere ike ịkpatara ndị ọzọ. Ụdị àgwà ahụ na-akpata esemokwu. Anyị kwesịrị ịna-echeta na “onye na-ewekarị iwe na-akpalite esemokwu, onye ọ bụla nke na-ewekarị oké iwe na-eme ọtụtụ mmehie.”—Ilu 29:22.

5. Olee otú Jizọs si kụziere ndị mmadụ ihe ha ga-eme ma e nwee nghọtahie?

5 Ma, Jizọs kụziiri ndị mmadụ ka ha na-achọ udo, ọ bụrụgodị na o yiri ka ọ̀ ga-eme ka ihe siere ha ike. N’ihe Jizọs kụziri n’elu ugwu, o nyere ndụmọdụ magburu onwe ya gbasara idozi nghọtahie ma ọ bụ izere ihe nwere ike ịkpata esemokwu. Dị ka ihe atụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha dịrị obiọma, na-eme udo, ghara ịna-ebu iwe n’obi, ka ha na-edozi nghọtahie ozugbo, na-ahụkwa ndị iro ha n’anya.—Mat. 5:5, 9, 22, 25, 44.

6, 7. (a) Gịnị mere o ji dị́ mkpa ka anyị na-edozi nghọtahie ozugbo? (b) Olee ajụjụ ụfọdụ ndị niile na-efe Jehova kwesịrị ịjụ onwe ha?

6 Taa, ikpe ekpere, ikwusa ozi ọma, na ịga ọmụmụ ihe socha n’otú anyị si efe Chineke. Ma ihe a niile ga-abụ ihe efu ma ọ bụrụ na anyị emeghị ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’udo. (Mak 11:25) Anyị agaghị abụli enyi Chineke ma ọ bụrụ na anyị anaghị agbaghara ndị ọzọ ihe ha mere anyị.—Gụọ Luk 11:4; Ndị Efesọs 4:32.

7 Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị iche echiche nke ọma ma gwa onwe ya eziokwu ma ọ̀ na-agbaghara ndị ọzọ, na-agbakwa mbọ ka ya na ndị ọzọ dịrị n’udo. Ị̀ na-agbaghara ụmụnna gị n’egbughị oge? Obi ọ̀ na-adị gị ụtọ ma gị na ha nọrọ? Jehova chọrọ ka ndị ohu ya na-agbaghara ndị ọzọ. Ọ bụrụ na akọnuche gị agwa gị na ị naghị emecha nke ọma n’ịgbaghara ndị ọzọ, rịọ Jehova ka o nyere gị aka ịgbanwe. Ọ bụrụ na anyị ejiri obi umeala kpee ụdị ekpere ahụ, Nna anyị nke eluigwe ga-anụ ya ma za ya.—1 Jọn 5:14, 15.

Ì NWERE IKE ILEGHARA IHE E MERE GỊ ANYA?

8, 9. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma mmadụ mee ihe were anyị iwe?

8 Ebe ọ bụ na anyị niile ezughị okè, mmadụ ga-ekwu ma ọ bụ mee ihe ga-ewe anyị iwe. Anyị agaghị agbanahụli ya. (Ekli. 7:20; Mat. 18:7) Gịnị ka ị ga-eme ma ụdị ihe ahụ mee? Chegodị banyere ihe mere n’otu ebe. N’ebe ụmụnna gara oriri na nkwari, otu nwanna nwaanyị kelere ụmụnna nwoke abụọ. Ma otu n’ime ha chere na otú o si kelee ha adịghị mma. Mgbe nwanna nwaanyị ahụ pụwara, nwanna ahụ iwe ji malitere ịkatọ nwanna nwaanyị ahụ maka ihe o kwuru. Ma nwanna nke ọzọ chetaara ya na nwanna nwaanyị ahụ ejirila obi ya niile  fee Jehova ruo afọ iri anọ n’agbanyeghị ọtụtụ nsogbu bịaara ya. Obi siri ya ike na nwanna nwaanyị ahụ ebughị ihe ọjọọ n’obi. Mgbe nwanna ahụ iwe ji chebachaara ihe a echiche, ọ sịrị, “I kwuru eziokwu.” Ya ekpebizie ịhapụwa okwu ahụ.

9 Gịnị ka akụkọ a na-akụziri anyị? Mmadụ mee ihe nwere ike iwe gị iwe, ọ bụ gị ga-ekpebi ihe ị ga-eme. Onye hụrụ mmadụ n’anya na-eleghara obere ihe ndị onye ahụ mejọrọ anya. (Gụọ Ilu 10:12; 1 Pita 4:8.) Ọ bụrụ na i ‘leghara mmejọ anya,’ ọ ga-amagbu onwe ya n’anya Jehova. (Ilu 19:11; Ekli. 7:9) N’ihi ya, mmadụ mee gị ihe i chere na ọ bụ mkparị ma ọ bụ ihe na-adịghị mma, ihe mbụ i kwesịrị ịjụ onwe gị bụ: ‘M̀ nwere ike ileghara ihe a anya? M̀ kwesịrị ịna-eche banyere ya mgbe niile?’

10. (a) Olee otú obi dị otu nwanna nwaanyị mgbe e kwuru ihe na-adịghị mma banyere ya? (b) Olee ihe Baịbụl kwuru nke nyeere ya aka ka ọ ghara ịna-echegbu onwe ya?

10 O nwere ike ọ gaghị adị mfe ileghara nkatọ anya. Chegodị banyere otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ, onye anyị ga-akpọ Ụlọma. Ụfọdụ ụmụnna kwuru ihe na-adịghị mma banyere ozi ọma ọ na-aga na ihe ọ na-eji oge ya eme. O wutere ya, ya agakwuru ụfọdụ ụmụnna má nke a na-akọ ka ha tụọrọ ya aro. Ọ sịrị: “Ndụmọdụ ha nyere m nke sí na Baịbụl nyeere m aka ka m ghara ịna-echegbu onwe m banyere ihe ndị ọzọ chere, kama ka m lekwasị anya n’ihe kacha mkpa, ya bụ, ihe gbasara Jehova.” Ịgụ Matiu 6:1-4 gbara Ụlọma ume. (Gụọ ya.) Amaokwu ndị a mere ka o cheta na o kwesịrị ilekwasị anya n’otú ọ ga-esi mee Jehova obi ụtọ. Ọ sịrị: “Ọ bụrụgodị na ndị ọzọ ekwuo ihe na-adịghị mma banyere ihe m na-eme, obi na-adị m ụtọ n’ihi na m ma na m na-agbalịsi ike ime ihe ga-adị Jehova mma.” Mgbe o chebachaara ihe a echiche, o kpebiri ileghara ihe ahụ ha kwuru anya.

Ọ BỤRỤ NA Ị GAGHỊ ELEGHARALI IHE E MERE GỊ ANYA

11, 12. (a) Gịnị ka Onye Kraịst kwesịrị ime ma ọ mata na ‘obi adịghị nwanne ya mma n’ebe ọ nọ’? (b) Olee ihe anyị kwesịrị ịmụta n’ihe Ebreham mere ka nsogbu ghara ịdị? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

11 “Anyị niile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro.” (Jems 3:2) Ka e were ya na ị chọpụtara na ihe i kwuru ma ọ bụ ihe i mere were nwanna iwe. Gịnị ka i kwesịrị ime? Jizọs sịrị: “Ọ bụrụ na i ji onyinye gị gaa n’ebe ịchụàjà, i wee nọrọ n’ebe ahụ cheta na obi adịghị nwanne gị mma n’ebe ị nọ, hapụ onyinye gị n’ebe ahụ n’ihu ebe ịchụàjà gawa; buru ụzọ mee ka gị na nwanne gị dị n’udo, mgbe ị bịaghachikwara, nye onyinye gị.” (Mat. 5:23, 24) N’ihi ndụmọdụ a Jizọs nyere, gaa ka gị na nwanna ahụ kwurịta ya. Echefula ihe i kwesịrị ibu n’obi gaa. Ọ bụghị ka ị taa nwanna gị ụta maka ihe merenụ, kama ọ bụ ikweta ebe gịnwa mejọrọ, gị na ya emeekwa udo. Ihe kacha mkpa bụ ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’udo.

12 Ì chetara ihe e kwuru ná mmalite banyere Ebreham na nwa nwanne ya bụ́ Lọt? Ọ bụ otu n’ime ihe Baịbụl kọrọ gbasara otú ndị ohu Chineke si dozie nsogbu gaara eme ka ha kewaa. Ha abụọ nwere ọtụtụ anụ ụlọ. Ọ dị ka ihe seere ndị na-azụrụ ha atụrụ okwu ọ̀ bụ ebe anụ ụlọ ha ga na-ata nri. Ebe Ebreham chọrọ ka nsogbu ghara ịdị, o kwere ka Lọt buru ụzọ họrọ ebe kacha mma. (Jen. 13:1, 2, 5-9) Ihe ahụ Ebreham mere magburu onwe ya. Ihe bụ́ mkpa ya bụ ka udo dị, ọ bụghị ihe dị́ ya mma. Ma, ihe ahụ o mere ọ̀ ghọrọ ya ahịa? Mbanụ. Ozugbo ihe a mechara, Jehova kwere Ebreham nkwa ịgọzi ya nke ukwuu. (Jen. 13:14-17)  Ihe a na-akụziri anyị na ọ bụrụ na anyị emee ihe Chineke chọrọ ma jiri ịhụnanya dozie nghọtahie, Chineke agaghị ekwe ka ọ ghọọ anyị ahịa. [1]

13. Gịnị ka nwanna na-elekọta otu ngalaba ná mgbakọ mere mgbe a gwara ya okwu ọjọọ? Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’ihe ahụ o mere?

13 Chegodị banyere ihe mere n’oge anyị a. Nwanna a họpụtara ọhụrụ ka o lekọtawa otu ngalaba ná mgbakọ kpọrọ nwanna ọzọ n’ekwentị, jụọ ya ma ọ̀ ga-achọ ịrụ ọrụ ná ngalaba ahụ. Nwanna ahụ ọ kpọrọ gwara ya ọtụtụ okwu ọjọọ ma pịnyụọ ekwentị ya n’ihi na ọ ka na-ewesa onye na-elekọtabu ngalaba ahụ iwe. Nwanna ahụ a họpụtara ọhụrụ eweghị iwe. Ma, o legharaghị ihe ahụ merenụ anya. Mgbe otu awa gara, ọ kpọrọ nwanna ahụ ọzọ, gwa ya na ya chọrọ ka ha abụọ hụ ma kwurịta ihe ahụ merenụ. N’izu na-esonụ, ụmụnna abụọ ahụ hụrụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ha bu ụzọ kpee ekpere ma kwurịta ihe ahụ merenụ ruo otu awa. Nwanna ahụ kọrọ ihe onye na-elekọtabu ngalaba ahụ mere ya. Nwanna a a họpụtara ọhụrụ weturu obi gee ya ntị, gụọrọ ya amaokwu ụfọdụ na Baịbụl. Ha abụọ si otú ahụ mee udo, rụkọọkwa ọrụ ná mgbakọ ahụ. Obi dị nwanna ahụ ụtọ na nwanna na-elekọta ngalaba ahụ weturu obi jiri obiọma gwa ya okwu.

Ì KWESỊRỊ ỊKỌRỌ YA NDỊ OKENYE?

14, 15. (a) Olee mgbe anyị kwesịrị ime ihe Jizọs kwuru na Matiu 18:15-17? (b) Olee ihe atọ Jizọs kwuru ka anyị mee, oleekwa ihe anyị kwesịrị ibu n’obi mee ha?

14 Ọtụtụ mgbe, nwanna na nwanna nwee nghọtahie, naanị ha abụọ nwere ike idozi ya. Ha kwesịkwara ime otú ahụ. Ma, Jizọs kwuru na e nwere mgbe ụfọdụ ọgbakọ nwere ike inye aka. (Gụọ Matiu 18:15-17.) Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na onye mejọrọnụ ekweghị echegharị  ma nwanna ya, ndị akaebe, na ndị okenye gwachaa ya okwu? E kwesịrị iwere ya ka “onye mba ọzọ na onye ọnaụtụ.” Ọ bụrụ n’oge anyị a, ọ pụtara na e kwesịrị ịchụ onye ahụ n’ọgbakọ. Ihe a Jizọs kwuru e kwesịrị ime gosiri na “mmehie” ahụ abụghị obere nghọtahie. Kama ọ bụ (1) ụdị mmehie mmadụ abụọ nwere ike ikwurịta, nakwa (2) mmehie dị́ oké njọ nke na o nwere ike ime ka a chụọ mmadụ n’ọgbakọ ma ọ bụrụ na e dozilighị ya. Ụdị mmehie ahụ nwere ike ịbụ igwu wayo ma ọ bụ nkwutọ, nke na-emebi aha mmadụ. E kwesịrị ime ihe atọ ahụ Jizọs kwuru naanị ma ọ bụrụ ụdị mmehie ndị a e kwuru okwu ha. Mmehie ndị dị́ ka ịkwa iko, nwoke idina nwoke na nwaanyị idina nwaanyị, isi n’ezi ofufe dapụ, ikpere arụsị, ma ọ bụ mmehie ndị ọzọ dị́ oké njọ ndị okenye kwesịrị ilebara anya esoghị n’ụdị mmehie a na-ekwu okwu ya.

O nwere ike ịdị mkpa ka gị na nwanna gị kwurịta okwu ugboro ugboro iji mee udo (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)

15 Ihe mere Jizọs ji nye ndụmọdụ a bụ ka anyị mata otú anyị ga-esi eji ịhụnanya nyere nwanna anyị aka. (Mat. 18:12-14) Nke mbụ bụ na anyị kwesịrị ịgbalị ka anyị na nwanna mee udo n’akọrọghị ya ndị ọzọ. O nwere ike ịdị mkpa ka anyị na onye mejọrọ anyị kwurịta ya ugboro ugboro. Ọ bụrụ na o nweghị isi, kpọrọ ndị akaebe ma ọ bụ ndị ọzọ nwere ike inye aka mata ma è nwere ihe ọjọọ e mere gakwuru nwanna ahụ. Ọ bụrụ na ha enye aka dozie nsogbu ahụ, “i ritewo nwanna gị n’uru.” Ọ gwụla mgbe gị na ya kwurịtara ya ugboro ugboro, ya abụrụ na o nweghị isi, ka i kwesịrị ịkọrọ ya ndị okenye.

16. Olee ihe na-egosi na ime ihe ndị ahụ Jizọs kwuru na-aba uru, na-egosikwa na anyị hụrụ nwanna n’anya?

16 Ọ bụghị mgbe niile ka ọ na-adị mkpa ka e mechaa ihe atọ ahụ Jizọs kwuru na Matiu 18:15-17. O kwesịrị ime anyị obi ụtọ n’ihi na ọtụtụ mgbe, a na-edozi nghọtahie tupu ya eruo nke na a ga-achụ onye ahụ mejọrọnụ n’ọgbakọ n’ihi na o kweghị echegharị. Ọtụtụ mgbe, onye ahụ ga-aghọta na ya mejọrọ ma dozie nsogbu ahụ. Onye ahụ e mejọrọ nwere ike ịmata na ya ekwesịghịzi iwewe iwe, ya agbagharazie onye ahụ. Ihe ọ sọrọ ya bụrụ, ihe Jizọs kwuru gosiri na anyị ekwesịghị ịgbara ọsọ gaa kọọrọ ndị okenye nghọtahie anyị na nwanna nwere. Tupu anyị akọọrọ ha, anyị kwesịrị ibu ụzọ mechaa ihe abụọ ndị mbụ ahụ Jizọs kwuru, ya abụrụkwa na e nwere ezigbo ihe gosiri na nwanna ahụ mere ihe ọjọọ.

17. Olee uru ndị anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị na-agbalịsi ike ka anyị na ibe anyị dịrị n’udo?

17 Ọ bụrụhaala na anyị ka bi n’ụwa ochie a, anyị na ezughị okè ka ga na-alụ, anyị ga na-emejọkwa ndị ọzọ. Jems bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs dere, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị asụ ngọngọ n’okwu, ọ bụ onye zuru okè, nke nwere ike ịchịkwa ahụ́ ya dum.” (Jems 3:2) Ọ bụrụ na anyị chọrọ idozi nghọtahie, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ‘ịna-achọ udo, na-achụsokwa ya.’ (Ọma 34:14) Ọ bụrụ na anyị na-eme ka anyị na ndị ọzọ dịrị n’udo, anyị na ụmụnna anyị ga na-adị ná mma, anyị ga na-emekwa ka udo dịrị n’ọgbakọ. (Ọma 133:1-3) Nke kacha mkpa bụ na anyị na Jehova, bụ́ “Chineke onye na-enye udo,” ga-adị ná mma. (Rom 15:33) Ihe a niile bụ uru anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị na-eji ịhụnanya edozi nghọtahie anyị na mmadụ nwere.

^ [1] (paragraf nke 12) Jekọb mekwara ka ya na Isọ kpezie (Jen. 27:41-45; 33:1-11); Josef emee ka ya na ụmụnne ya kpezie (Jen. 45:1-15); Gidiọn emeekwa ka ya na ndị Ifrem ghara ise okwu. (Ikpe 8:1-3) I nwere ike icheta ndị ọzọ Baịbụl kwuru na ha mere ụdị ihe ahụ.