Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Septemba 2017

“Okwu Chineke . . . Na-akpa Ike”

“Okwu Chineke . . . Na-akpa Ike”

“Okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike.”​—⁠HIB. 4:⁠12.

ABỤ: 114, 113

1. Olee ihe mere obi ji sie gị ike na Okwu Chineke na-akpa ike? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

OBI siri anyị ike na Okwu Chineke, “dị ndụ ma na-akpa ike.” (Hib. 4:12) Ọtụtụ n’ime anyị ahụla otú Okwu Chineke si na-akpa ike ná ndụ anyị nakwa ná ndụ ndị ọzọ. Tupu ụfọdụ aghọọ Ndịàmà Jehova, ha na-ezu ohi, na-aṅụ ọgwụ ike, ma ọ bụ na-akwa iko. E nwekwara ndị bụbu ndị a ma ama ma ọ bụ ndị bụbu ọgaranya, ma ya adị ha ka è nwere ihe na-efu ná ndụ ha. (Ekli. 2:​3-11) Obi dị anyị ụtọ na ike Baịbụl na-akpa emeela ka ndị ike ụwa gwụburu nwee olileanya. Ọ ga-abụ na ị gụọla ụfọdụ akụkọ ndị ahụ n’isiokwu bụ́ “Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ,” nke na-agba n’Ụlọ Nche. Ị hụkwala na Baịbụl na-enyekwara ndị mmadụ aka ka ha na Jehova na-adị ná mma mgbe ha ghọchara Ndị Kraịst.

2. Olee otú Okwu Chineke si kpaa ike n’oge ndịozi Jizọs?

2 Ò kwesịrị iju anyị anya na ọtụtụ ndị agbanweela ndụ ha n’ihi ịmụ Okwu Chineke? Mbanụ. Ụdị akụkọ ndị ahụ na-echetara anyị otú ụmụnna anyị n’oge ndịozi Jizọs, bụ́ ndị nwere olileanya ịga eluigwe si gbanwee ndụ ha. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 6:​9-11.) Mgbe Pọl kwuchara ụdị ndị na-agaghị eketa Alaeze Chineke, o kwukwara, sị: “Nke ahụ bụkwa ihe ụfọdụ  n’ime unu bụbu.” Ma, Akwụkwọ Nsọ na mmụọ nsọ nyeere ha aka ịgbanwe. Mgbe ha ghọchara Ndị Kraịst, ụfọdụ n’ime ha mere mmehie dị oké njọ nke mere ka ha na Jehova ghara ịdị ná mma. Baịbụl kwuru banyere otu Onye Kraịst e tere mmanụ a chụrụ n’ọgbakọ n’oge ndịozi Jizọs. Ma, o mechara chegharịa, a nabataghachi ya n’ọgbakọ. (1 Kọr. 5:​1-5; 2 Kọr. 2:​5-8) Obi na-atọ anyị ụtọ na ụmụnna anyị agbanweela ọtụtụ ihe ná ndụ ha n’ihi ike Okwu Chineke na-akpa.

3. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

3 Okwu Chineke na-akpa ezigbo ike. Ebe ọ bụ na anyị nwere ya, anyị kwesịrị iji ya kpọrọ ihe. (2 Tim. 2:15) N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe ndị anyị ga-eme ka Okwu Chineke na-akpa ike (1) ná ndụ anyị, (2) n’ozi ọma, na (3) mgbe anyị na-ezi ihe. Ihe anyị ga-amụta ga-enyere anyị aka igosi na obi dị anyị ụtọ, nakwa na anyị hụrụ Nna anyị nke eluigwe n’anya, bụ́ onye na-akụziri anyị otú anyị ga-esi baara onwe anyị uru.​—⁠Aịza. 48:⁠17.

IHE ANYỊ GA-EME KA OKWU CHINEKE NA-AKPA IKE NÁ NDỤ ANYỊ

4. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Okwu Chineke na-akpa ike ná ndụ anyị? (b) Olee oge i wepụtara ị na-eji agụ Baịbụl?

4 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Okwu Chineke na-akpa ike ná ndụ anyị, anyị kwesịrị ịna-agụ ya mgbe niile. Ọ bụrụ na o kwe omume, anyị kwesịrị ịna-agụ ya kwa ụbọchị. (Jọsh. 1:⁠8) Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ n’ime anyị anaghị enwe ohere. Ma, anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ọ bụla, ma ọrụ ndị dị anyị ezigbo mkpa, mee ka anyị ghara ịna-agụ Baịbụl. (Gụọ Ndị Efesọs 5:​15, 16.) Ọtụtụ ụmụnna ewepụtala oge ha ga-eji na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị. E nwere ndị na-agụ n’ụtụtụ, nwee ndị na-agụ n’ehihie, nweekwa ndị na-agụ n’abalị. Obi dị ha otú ahụ ọ dị otu ọbụ abụ, bụ́ onye dere, sị: “Lee ka m si hụ iwu gị n’anya! Ọ bụ ihe m na-atụgharị n’uche ogologo ụbọchị dum.”​—⁠Ọma 119:⁠97.

5, 6. (a) Gịnị mere ịtụgharị uche n’ihe ndị anyị na-agụ ji baa uru? (b) Olee otú anyị ga-esi tụgharịa uche n’ihe ndị anyị gụrụ na Baịbụl ya abaara anyị uru? (c) Olee uru ịgụ Okwu Chineke na ịtụgharị uche n’ihe ndị ị na-agụ baara gị?

5 Ọ bụghị naanị na anyị ga na-agụ Baịbụl, anyị kwesịkwara ịna-echebara ihe ndị anyị na-agụ echiche. (Ọma 1:​1-3) Ịtụgharị uche n’ihe ndị anyị na-agụ ga-enyere anyị aka ịna-eme ihe ndị anyị na-amụta na ya. Ma ànyị na-agụ Okwu Chineke nke e dere n’akwụkwọ ma ànyị na-agụ ya n’Ịntanet, ihe kwesịrị ịbụ mkpa anyị bụ ikwe ka o ruo anyị n’obi ma gbanwee anyị.

6 Olee otú anyị ga-esi tụgharịa uche n’ihe ndị anyị gụrụ na Baịbụl ya abaara anyị uru? Anyị gụwa Baịbụl, anyị kwesịrị  ịkwụsịtụ ma jụọ onwe anyị, sị: ‘Gịnị ka m mụtara banyere Jehova n’ebe a m gụrụ? Olee otú m si na-eme ihe ndị m gụrụ ebe a? Olee ebe ndị m ga-emekwu nke ọma?’ Ọ bụrụ na anyị ana-atụgharị uche n’Okwu Chineke ma na-ekpe ekpere banyere ihe ndị anyị na-agụ, ọ ga-enyere anyị aka ịna-eme ya. Anyị mee otú ahụ, anyị ga-ahụ otú Baịbụl ga-esi na-akpa ike ná ndụ anyị.​—⁠2 Kọr. 10:​4, 5.

IHE ANYỊ GA-EME KA OKWU CHINEKE NA-AKPA IKE N’OZI ỌMA

7. Olee otú anyị ga-esi jiri Okwu Chineke na-ezi ndị mmadụ ozi ọma mgbe niile?

7 Olee ihe ga-enyere anyị aka ịna-eji Okwu Chineke na-ezi ndị mmadụ ozi ọma mgbe niile? Nke mbụ bụ ịna-agụrụ ya ndị mmadụ n’ozi ọma. Otu nwanna kwuru, sị: “Ọ bụrụ na gị na Jehova nọ n’ozi ụlọ n’ụlọ, ị̀ ga na-ekwu naanị gị ka ị̀ ga-ahapụ ya ka o kwuo?” Ihe a o kwuru pụtara na mgbe anyị gụụrụ mmadụ Baịbụl n’ozi ọma, anyị hapụrụ Jehova ka ọ gwa onye ahụ okwu. Amaokwu Baịbụl anyị sara anya ná mmiri họrọ gụọrọ onye ahụ ga-akpa ike karịa ihe ọ bụla anyị ga-ekwu. (1 Tesa. 2:13) Jụọ onwe gị, sị: “M̀ na-agba mbọ ịgụrụ onye ọ bụla m na-ezi ozi ọma Baịbụl?’

8. Gịnị mere ịgụ Baịbụl abụghị naanị ihe anyị ga-eme ma anyị ziwe ozi ọma?

8 Ma, ịgụrụ ndị anyị na-ezi ozi ọma Baịbụl abụghị naanị ihe anyị ga-eme. Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọtụtụ ndị anaghị aghọtacha Baịbụl. Otú ahụ ka ọ dị n’oge ndịozi Jizọs nakwa n’oge anyị a. (Rom 10:⁠2) N’ihi ya, anyị ekwesịghị iche na onye anyị na-ezi ozi ọma ghọtara amaokwu Baịbụl anyị gụụrụ ya. Anyị nwere ike inyere ya aka ka ọ ghọta ihe anyị gụrụ. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịgụghachiri ya okwu ndị gbara ọkpụrụkpụ dị n’amaokwu ahụ ma kọwaa ihe ha pụtara. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ,  ọ ga-eme ka Okwu Chineke ruo ndị anyị na-ezi ozi ọma n’obi.​—⁠Gụọ Luk 24:32.

9. Tupu anyị agụọrọ mmadụ Baịbụl, olee otú anyị ga-esi mee ka o jiri Baịbụl kpọrọ ihe? Nye ihe atụ.

9 Ihe anyị kwuru tupu anyị agụọrọ mmadụ Baịbụl ga-emekwa ka o jiri Baịbụl kpọrọ ihe. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịsị, “Ka anyị hụ ihe Onye kere anyị kwuru gbasara ihe a.” Mgbe anyị na-ezi onye na-anụtụbeghị gbasara Baịbụl ozi ọma, anyị nwere ike ịsị, “Legodị ihe otu Akwụkwọ Dị Nsọ gwara anyị.” Ma ọ bụkwanụ anyị ziwe onye na-enweghị mmasị n’okpukpe ọ bụla ozi ọma, anyị nwere ike jụọ ya, sị: “Ị̀ nụtụla ilu oge ochie a?” Ọ bụrụ na anyị cheta na onye ọ bụla nwere otú e si zụlite ya na ihe ndị o kweere, ọ ga-eme ka anyị gbaa mbọ kwuo ihe ga-amasị onye anyị chọrọ izi ozi ọma.​—⁠1 Kọr. 9:​22, 23.

10. (a) Kọọ ihe otu nwanna mere n’ozi ọma. (b) Olee ihe ị hụrụla n’ozi ọma gosiri na Okwu Chineke na-akpa ike?

10 Ọtụtụ ndị achọpụtala na ịgụrụ ndị ha na-ezi ozi ọma Baịbụl na-eme ka ozi ọma a na-ezi ha ruo ha n’obi. Dị ka ihe atụ, otu nwanna laghachiri na nke otu nwoke katarala ahụ́ o ziri ozi ọma. Nwoke a agụọla magazin anyị ọtụtụ afọ. Kama nwanna ahụ inye ya naanị Ụlọ Nche ọhụrụ, ọ gụụrụ ya amaokwu Baịbụl dị n’Ụlọ Nche ahụ. Ọ gụụrụ ya 2 Ndị Kọrịnt 1:​3, 4, bụ́ ebe sịrị: “Nna nke obi ebere na Chineke nke nkasi obi niile . . . na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị niile.” Ebe a a gụụrụ ya na Baịbụl ruru agadi nwoke ahụ n’obi, ya agwa nwanna ahụ ka ọ gụọ ya ọzọ. Nwoke ahụ gwara nwanna ahụ na ya na nwunye ya chọrọ ihe ga-akasi ha obi. Ebe ahụ a gụụrụ ya mere ka ọ chọọ ịmatakwu ihe Baịbụl na-ekwu. Ọ̀ bụ na i kwetaghị na Okwu Chineke na-akpa ike n’ozi ọma?​—⁠Ọrụ 19:⁠20.

IHE Ị GA-EME KA OKWU CHINEKE NA-AKPA IKE MGBE Ị NA-EZI IHE

11. Olee ọrụ ụmụnna na-akụzi ihe na-arụ?

11 Ọ na-atọ anyị ụtọ ịga ọmụmụ ihe na mgbakọ. Ma, ihe mere anyị ji aga ha bụ ka anyị fee Jehova. Ihe ndị anyị na-amụta na-abakwara anyị ezigbo uru. Obi na-adị ụmụnna ndị na-akụziri anyị ihe ụtọ. Ma, ha kwesịkwara ịghọta na ọrụ a abụghị obere ọrụ. (Jems 3:⁠1) Mgbe ọ bụla ha na-akụzi ihe, ha kwesịrị ịhụ na ihe ha na-akụzi si na Baịbụl. Ọ bụrụ na e nye gị ihe omume, olee ihe ị ga-eme ka Baịbụl kpaa ike n’okwu ị na-ekwu, ya eruo ndị mmadụ n’obi?

12. Olee otú nwanna na-ezi ihe ga-esi hụ na ihe ọ na-akụzi si na Baịbụl?

12 Mgbe ị na-ezi ihe, i kwesịrị ịhụ na ihe ị na-akụzi si na Baịbụl. (Jọn 7:16) Olee ihe ndị ị ga-eme ma i ziwe ihe? Nke mbụ bụ na ị ga-akpachara anya ka ihe atụ ndị ị na-enye ma ọ bụ otú i si ekwu okwu ghara ime ka uche ndị mmadụ pụọ na Baịbụl. Chetakwa na ịgụ Baịbụl na ịkụzi ihe dị na Baịbụl abụghị otu. Nke bụ́ eziokwu bụ na ịgụ ọtụtụ ebe na Baịbụl ga-eme ka ndị mmadụ ghara icheta ha. N’ihi ya, saa anya ná mmiri họrọ amaokwu Baịbụl ndị ị ga-agụ, jiri nwayọọ gụọ ha, kọwaa ha nke ọma, mee ihe atụ dabara adaba, ma kwuo otú ha ga-esi baara ndị mmadụ uru. (Nehe. 8:⁠8) Ọ bụrụ na okwu gị si n’ihe ndepụta, gbalịa mụọ ya nke ọma, mụọkwa amaokwu Baịbụl ndị e dere na ha. Gbaa mbọ ka ị ghọta ihe jikọrọ ihe e dere n’ihe ndepụta gị na amaokwu Baịbụl ndị dị na ha. Họrọzie amaokwu Baịbụl ndị dabara adaba ị ga eji kọwaa ihe ndị dị n’ihe ndepụta  e nyere gị. (I nwere ike ịhụ ihe ndị ga-enyere gị aka n’ihe ọmụmụ nke iri abụọ na otu ruo nke iri abụọ na atọ n’akwụkwọ Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.) Ihe kacha mkpa ị ga-eme bụ ịrịọ Jehova ka o nyere gị aka ka i kwuo ihe bụ́ uche ya e dere n’Okwu ya.​—⁠Gụọ Ezra 7:10; Ilu 3:​13, 14.

13. (a) Olee otú amaokwu Baịbụl a gụrụ n’ọmụmụ ihe si ruo otu nwanna nwaanyị n’obi? (b) Olee otú amaokwu Baịbụl ndị a gụrụ n’ọmụmụ ihe sirila baara gị uru?

13 Mgbe otu nwanna nwaanyị bi n’Ọstrelia bụ nwata, ọtụtụ ihe mere ya. Ma, n’agbanyeghị na o mechara bịa mụta banyere Jehova, obi esichaghị ya ike na Jehova hụrụ ya n’anya. Otu ụbọchị ọ gara ọmụmụ ihe, a gụrụ amaokwu Baịbụl ruru ya n’obi. Ọ tụgharịrị uche n’amaokwu Baịbụl ahụ, mee nchọnchọ, ma gụọkwa amaokwu Baịbụl ndị ọzọ. Obi bịaziri sie ya ike na Jehova hụrụ ya n’anya. * È nweela mgbe ị gara ọmụmụ ihe ma ọ bụ mgbakọ, gị anụ amaokwu Baịbụl metụrụ gị n’obi otú ahụ o mere nwanna nwaanyị ahụ?​—⁠Nehe. 8:⁠12.

14. Olee ihe anyị ga-eme iji gosi na anyị ji Okwu Chineke kpọrọ ihe?

14 Ọ̀ bụ na obi adịghị anyị ụtọ na Jehova nyere anyị Okwu ya, bụ́ Baịbụl? Ọ bụghị naanị na o nyere anyị Okwu ya, o mezukwara nkwa o kwere na ọ ga-adịgide. (1 Pita 1:​24, 25) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, na-eme ihe ndị anyị na-amụta eme, ma jiri ya na-enyere ndị ọzọ aka. Anyị mee otú ahụ, ọ na-egosi na anyị ji akụ̀ a Jehova nyere anyị kpọrọ ihe, gosikwa na anyị hụrụ onye nyere anyị ya, bụ́ Jehova Chineke n’anya.

^ para. 13 Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Otú Baịbụl Si Gbanwee Ndụ M.”