Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Septemba 2017

“Okwu Chineke Anyị Ga-adịgide Ruo Mgbe Ebighị Ebi”

“Okwu Chineke Anyị Ga-adịgide Ruo Mgbe Ebighị Ebi”

“Ahịhịa ndụ akpọnwụwo, okooko ya achanwụwo; ma okwu Chineke anyị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”​—⁠AỊZA. 40:⁠8.

ABỤ: 116, 115

1, 2. (a) Olee otú ndụ gaara adị ma à sị na e nweghị Baịbụl? (b) Olee ihe ga-eme ka Baịbụl baara anyị uru?

OLEE otú i chere ndụ gị gaara adị ma à sị na e nweghị Baịbụl? Ị gaaraghị enwe ihe ga na-eduzi gị kwa ụbọchị. Ị gaaraghịkwa amata eziokwu banyere Chineke, ndụ, nakwa ọdịnihu. Ị gaaraghị ama ihe Jehova meere ụmụ mmadụ n’oge gara aga.

2 Obi dị anyị ụtọ na anyị ma ihe ndị a. Jehova enyela anyị Okwu ya, bụ́ Baịbụl. O kwekwara anyị nkwa na ihe Baịbụl kwuru ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Pita onyeozi kwuru ihe e dere n’Aịzaya 40:⁠8. N’agbanyeghị na amaokwu a ekwughị hoo haa banyere Baịbụl, ma ihe e dere na ya gbasara ihe ndị e kwuru na Baịbụl. (Gụọ 1 Pita 1:​24, 25.) Nke bụ́ eziokwu bụ na Baịbụl ga-abara anyị uru ma anyị gụọ ya n’asụsụ na-eru anyị n’obi. Ndị ịgụ Baịbụl na-atọ ụtọ ma na ọ bụ eziokwu. Kemgbe ọtụtụ narị afọ, ndị mmadụ agbaala mbọ ịsụgharị Baịbụl ka o nwee ike iru onye ukwu na onye nta aka, n’agbanyeghị nsogbu kpụ ọkụ n’ọnụ e nyere ha. Ihe mere ha ji gbaa mbọ a bụ n’ihi na  ọ bụ uche Chineke ka “a zọpụta ụdị mmadụ niile, ka ha nwetakwa ezi ihe ọmụma nke eziokwu.”​—⁠1 Tim. 2:​3, 4.

3. Olee ihe anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

3 N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú Okwu Chineke si dịgide n’agbanyeghị (1) otú asụsụ si agbanwe, (2) otú ndị ọchịchị si agbanwe ihe, na (3) mgba a gbara ịkwụsị ịsụgharị Baịbụl. Olee uru ịtụle ihe ndị a ga-abara anyị? Ọ ga-eme ka anyị jirikwuo Okwu Chineke kpọrọ ihe, meekwa ka anyị hụkwuo onye nyere anyị ya n’anya. O nyere anyị ya ka ọ baara anyị uru.​—⁠Maị. 4:2; Rom 15:⁠4.

OTÚ ASỤSỤ SI AGBANWE

4. (a) Olee otú asụsụ si agbanwe ka oge na-aga? (b) Gịnị gosiri na o nweghị asụsụ Chineke kpọrọ asị? Olee otú obi dị gị maka ya?

4 Asụsụ na-agbanwe ka oge na-aga. Ihe okwu ụfọdụ pụtara n’otu oge nwere ike ịpụta ihe ọzọ n’oge ọzọ. I nwere ike icheta okwu ndị gbanwerelanụ n’asụsụ gị. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’asụsụ Hibru na Grik, bụ́ asụsụ e ji dee ọtụtụ Baịbụl. Asụsụ Hibru na Grik a na-asụ ugbu a dị iche ná ndị a sụrụ n’oge e dere Baịbụl. Ọtụtụ ndị anaghị aghọta Baịbụl ndị ahụ e ji asụsụ Hibru na Grik oge ochie dee. N’ihi ya, e kwesịrị inwe Baịbụl ndị a sụgharịrị n’asụsụ ha ga-aghọta. Ụfọdụ ndị chere na ha mụọ asụsụ Hibru na Grik oge ochie, na ha ga-aghọtakwu Baịbụl. Ma, o nwere ike ọ gaghị enyere ha aka otú ha chere. * Obi dị anyị ụtọ na a sụgharịala Baịbụl n’ihe karịrị puku asụsụ atọ na narị abụọ, ma ndị nke zuru ezu ma ndị nke na-ezughị ezu. O doro anya na Jehova chọrọ ka Baịbụl baara ndị si ná “mba niile na ebo niile na asụsụ niile,” uru. (Gụọ Mkpughe 14:⁠6.) Nke a kwesịrị ime ka anyị bịarukwuo Chineke anyị nso, bụ́ onye hụrụ anyị n’anya na onye na-anaghị ele mmadụ anya n’ihu.​—⁠Ọrụ 10:⁠34.

5. Olee ihe mere Baịbụl King James Version ji pụọ iche?

5 Ebe ọ bụ na asụsụ na-agbanwe ka oge na-aga, asụsụ ndị e ji sụgharịa Baịbụl na-agbanwekwa. Baịbụl a na-aghọta nke ọma mgbe mbụ a sụgharịrị ya, nwere ike a gaghị na-aghọtacha ya ka oge na-aga. Otu n’ime Baịbụl ndị ahụ bụ King James Version nke a sụgharịrị n’afọ 1611. Ọ bụ otu n’ime Baịbụl Bekee ndị mmadụ kacha agụ. Okwu ndị e ji sụgharịa ya ka e si nweta okwu Bekee ụfọdụ. * Ma, e dere aha Chineke ebe ole na ole na Baịbụl a. N’ọtụtụ ebe aha Chineke kwesịrị ịdị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, ihe e dere n’ebe ndị ahụ bụ “ONYENWE ANYỊ” ná mkpụrụ akwụkwọ okpotokpo. Ná ndị nke e bipụtara ka oge na-aga, ihe e dere n’ebe ndị ahụ aha Chineke kwesịrị ịdị n’Akwụkwọ Nsọ Grik bụ “ONYENWE ANYỊ” ná mkpụrụ akwụkwọ okpotokpo. Ọ pụtara na ndị sụgharịrị Baịbụl King James Version ma ebe dị iche iche aha Chineke kwesịrị ịdị n’Akwụkwọ Nsọ Grịk.

6. Gịnị mere obi ji na-atọ anyị ụtọ na anyị nwere Baịbụl Nsọ​—⁠Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ?

6 Mgbe mbụ e wepụtara Baịbụl King James Version, asụsụ Bekee e ji dee ya bụ okwu Bekee a na-asụ n’oge ahụ. Ma, ka oge na-aga, ụfọdụ okwu ndị e ji sụgharịa ya bịara bụrụ okwu  ndị mgbe ochie. Ha na-esikwara anyị ike nghọta n’oge a. Otú ahụ ka ọ dịkwa Baịbụl ndị ọzọ a sụgharịrị n’oge ochie. Obi dị anyị ụtọ na anyị nwere Baịbụl Nsọ​—⁠Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ e ji asụsụ ndị a na-asụ n’oge a sụgharịa. Baịbụl a dị n’ihe karịrị otu narị asụsụ na iri ise, ma ndị zuru ezu ma ndị na-ezughị ezu. Ọ pụtara na ọtụtụ ndị n’ụwa nwere ike ịgụ ya n’asụsụ ha. Okwu ndị dị mfe e ji sụgharịa ya mere ka Okwu Chineke na-eru anyị n’obi. (Ọma 119:97) Ma, ihe mere Baịbụl Nsọ​—⁠Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ ji pụọ iche bụ na o dere aha Chineke n’ebe ndị o kwesịrị ịdị.

ASỤSỤ ỌTỤTỤ NDỊ NA-ASỤ

7, 8. (a) Gịnị mere o ji siere ọtụtụ ndị Juu ike, bụ́ ndị dịrị ndụ na narị afọ abụọ na iri ise tupu a mụọ Jizọs, ịghọta Akwụkwọ Nsọ Hibru? (b) Gịnị bụ Septuagint Grik?

7 Mgbe ụfọdụ, ndị ọchịchị nwere ike gbanwee asụsụ ndị niile ha na-achị na-asụ n’oge ọ bụla. N’agbanyeghị mgbanwe a, olee ihe Jehova mere iji hụ na ndị mmadụ ga na-aghọta Okwu ya? Ihe ndị mere n’oge gara aga ga-enyere anyị aka ịmata azịza ajụjụ a. Ọ bụ ndị Izrel ma ọ bụ ndị Juu dere akwụkwọ iri atọ na itoolu mbụ nke Baịbụl. Ọ bụ ha bụ ndị mbụ “e nyefere okwu dị nsọ nke Chineke.” (Rom 3:​1, 2) Ma, ihe dị ka narị afọ atọ tupu Jizọs abịa n’ụwa, ọtụtụ ndị Juu anaghịzi aghọta asụsụ Hibru. Maka gịnị? Ọ bụ maka na Alegzanda Onye Ukwu meriri ọtụtụ mba n’ụwa, si otú ahụ mee ka ọchịchị ndị Gris ruo ọtụtụ ebe. (Dan. 8:​5-7, 20, 21) Ka ọchịchị ndị Gris bịara ruo ọtụtụ ebe, ọtụtụ ndị malitere ịsụ asụsụ Grik, ma ndị Juu bi n’obodo dị iche iche ndị Gris na-achị. Ma, ka ọtụtụ ndị Juu malitere ịsụ asụsụ Grik, ịghọta Akwụkwọ Nsọ e dere n’asụsụ Hibru bịara na-esiri ha ezigbo ike. Gịnị ka ha ga-eme?

8 Ihe dị ka narị afọ abụọ na iri ise tupu a mụọ Jizọs, a sụgharịrị Akwụkwọ Nsọ Hibru ise ndị bu ụzọ n’asụsụ Grik. E mechara sụgharịa Akwụkwọ Nsọ Hibru ndị nke ọzọ n’ihe dị ka narị afọ abụọ tupu a mụọ Jizọs. Ihe a kpọrọ Akwụkwọ Nsọ Hibru niile a a sụgharịrị bụ Septuagint Grik. Baịbụl a bụ Akwụkwọ Nsọ Hibru mbụ a sụgharịrị.

9. (a) Olee otú Septuagint na Baịbụl ndị ọzọ e bu ụzọ sụgharia si baara ndị na-agụ Okwu Chineke uru? (b) Olee amaokwu kacha atọ gị ụtọ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru?

9 Septuagint mere ka ọ dịrị ndị Juu na-asụ asụsụ Grik na ndị ọzọ mfe ịgụ Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ì chere na obi agaghị atọ ha ezigbo ụtọ ịgụ ma ọ bụ ịnụ ka a na agụpụtara ha Okwu Chineke n’asụsụ a na-eru ha n’obi? Ka oge na-aga, a sụgharịrị akwụkwọ Baịbụl ụfọdụ n’asụsụ ndị ọzọ ndị mmadụ na-asụkarị. Ha bụ Siriak, Gọtik na Latịn. Ka ndị mmadụ na-agụ Baịbụl n’asụsụ na-eru ha n’obi, o doro anya na ọtụtụ bịara nwee amaokwu Baịbụl ndị na-atọ ha ụtọ otú ahụ anyịnwa nwekwara taa. (Gụọ Abụ Ọma 119:​162-165.) N’eziokwu, Okwu Chineke na-adịgide n’agbanyeghị otú asụsụ si agbanwe.

MGBA A GBARA ỊKWỤSỊ ỊSỤGHARỊ BAỊBỤL

10. N’oge John Wycliffe, gịnị mere ọtụtụ ndị enweghị Baịbụl?

10 Mgbe ụfọdụ, ọtụtụ ndị ọchịchị dị ike agbalịala ime ka Baịbụl ghara iru ndị mmadụ aka. Ma, ndị hụrụ Chineke n’anya agbaala mbọ ịhụ na  ndị mmadụ nwetara Baịbụl ha ga-agụ. Otu n’ime ha bụ John Wycliffe, bụ́ onye dịrị ndụ n’ihe dị ka narị afọ asaa gara aga n’Ịngland. O kwetasiri ike na mmadụ niile kwesịrị ịgụ Baịbụl. Ma n’oge ahụ, ọtụtụ ndị n’Ịngland anụtụbeghị ihe Baịbụl kwuru n’asụsụ ha. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Baịbụl dị oké ọnụ, a na-ejikwa aka edepụtaghachi ya. N’ihi ya, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole nwere Baịbụl n’oge ahụ. Ihe ọzọ abụrụ na ọtụtụ n’ime ha amaghị otú e si agụ ihe. Ọ ga-abụ na a gụpụtarala ọtụtụ ndị na-aga chọọchị Baịbụl e dere n’asụsụ Latịn, ma asụsụ a aghọọla asụsụ ochie ndị nkịtị na-anaghịzi aghọta. Olee otú Jehova si mee ka ndị mmadụ nwee Baịbụl n’asụsụ ha?​—⁠Ilu 2:​1-5.

John Wycliffe na ndị ọzọ chọrọ ime ka Okwu Chineke ruo onye ukwu na onye nta aka. Ị̀ chọrọ ime ka ha? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)

11. Olee uru Baịbụl Wycliffe baara ndị mmadụ?

11 N’afọ 1382, John Wycliffe na ndị ọzọ sụgharịrị Baịbụl n’asụsụ Bekee. E mechara kpọwa ya Baịbụl Wycliffe. Ndị òtù Wycliffe ejighị Baịbụl a egwu egwu. Ha ji ụkwụ gaa n’ime ime obodo dị iche iche dị n’Ịngland ka ha nwee ike ime ka Okwu Chineke ruo ndị nkịtị n’obi. Ha na-agụrụ onye ọ bụla ha hụrụ Baịbụl a ma nye ha nke e ji aka depụta. Mbọ ha gbara mere ka ndị mmadụ malitekwa inwe mmasị na Baịbụl.

12. Olee otú obi dị ndị ụkọchukwu banyere Wycliffe, Baịbụl ya, na ndị òtù ya?

12 Olee otú obi dị ndị ụkọchukwu banyere Baịbụl Wycliffe? Ha achọghị iji anya ahụ Wycliffe, Baịbụl ya, na ndị òtù ya. Ha mesiri ndị òtù Wycliffe ike. Ha chọrọ Baịbụl Wycliffe ebe niile ma kpọọ ndị ha nwetara ọkụ. Ma, mgbe Wycliffe nwụrụ, e weere ya ka onye gbara chọọchị mgba okpuru. Ha bọpụtara ọkpụkpụ ya, kpọọ ha ọkụ ma wụnye ntụ ya n’Osimiri Swift. Ma, ọtụtụ mmadụ chọrọ ịgụ Okwu Chineke, ndị ụkọchukwu enwelighị ike ịkwụsị ha. N’ọtụtụ narị afọ ndị sochirinụ, ndị bi na Yurop na ebe ndị ọzọ n’ụwa malitere ịsụgharị Baịbụl na ibipụta ya n’asụsụ ọtụtụ ndị nwere ike ịghọta.

“ONYE NA-AKỤZIRI GỊ OTÚ Ị GA-ESI BAARA ONWE GỊ URU”

13. Olee ihe doro anyị anya banyere Okwu Chineke? Oleekwa otú nke a nwere ike isi mee ka okwukwe anyị sikwuo ike?

13 Ndị Kraịst taa ekwesịghị iche na Chineke nyere ndị sụgharịrị Septuagint,  Baịbụl Wycliff, King James Version ma ọ bụ nsụgharị Baịbụl ndị ọzọ, mmụọ nsọ ya ha ji sụgharịa Baịbụl ndị a. Ma, ọ bụrụ na anyị eleba anya ná mbọ ndị sụgharịrị Baịbụl ndị a gbara ịsụgharị ha, o doro anya na Okwu Jehova dịgidere otú ahụ o kwere ná nkwa. Nke a kwesịrị ime ka okwukwe anyị sikwuo ike na Jehova ga-emezukwa nkwa ya ndị ọzọ.​—⁠Jọsh. 23:⁠14.

14. Olee otú Okwu Chineke si eme ka anyị hụkwuo Chineke n’anya?

14 Ọ bụrụ na anyị aghọta otú Jehova si mee ka Okwu ya dịgide, ọ ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike, meekwa ka anyị hụkwuo ya n’anya. * Gịnị mere Jehova ji nye anyị Baịbụl ma kwe nkwa na ọ ga-echebe ya? Ọ bụ n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya ma chọọ ka ọ kụziere anyị otú anyị nwere ike isi baara onwe anyị uru. (Gụọ Aịzaya 48:​17, 18.) Nke a kwesịrị ime ka anyị hụkwa ya n’anya ma na-erubere ya isi.​—⁠1 Jọn 4:19; 5:⁠3.

15. Olee ihe ndị anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

15 Ebe ọ bụ na anyị ji Okwu Chineke kpọrọ ihe, olee uru ọ ga-abara anyị ma anyị na-agụ ya? Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị anyị na-ezi ozi ọma aka iji Baịbụl kpọrọ ihe? Olee otú ụmụnna na-ezi ihe nwere ike isi hụ na ihe ha na-akụzi si na Baịbụl? Anyị ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.

^ para. 4 Gụọ isiokwu bụ́ “Ọ̀ Dị Mkpa Ka Ị Mụọ Hibru na Grik?” Ọ gbara n’Ụlọ Nche November 1, 2009.

^ para. 5 E si na Baịbụl King James Version nweta ọtụtụ ilu Bekee a ma ama taa.

^ para. 14 Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Gaa Ka I Jiri Anya Gị Hụ.”