Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Septemba 2017

 AKỤKỌ NDỤ

Obi Dị M Ụtọ na Mụ na Ụmụnna Hụrụ Jehova n’Anya Rụkọrọ Ọrụ

Obi Dị M Ụtọ na Mụ na Ụmụnna Hụrụ Jehova n’Anya Rụkọrọ Ọrụ

IHE dị ka n’afọ 1935, papa m aha ya bụ James Sinclair na mama m Jessie, kwagara Bronz dị na Niu Yọk. Otu n’ime ndị mbụ ha matara bụ Willie Sneddon. Ya na mama m na papa m bụ ndị Skọtland. Nkeji ole na ole ha matara, ha atọ malitere ikwu banyere ezinụlọ ha. Ihe a mere afọ ole na ole tupu a mụọ m.

Mama m gwara Willie na obere oge tupu a malite ịlụ Agha Ụwa nke Mbụ, na mmiri riri nwanne ya nwoke tọrọ ya na papa ya mgbe ụgbọ ha ji na-egbu azụ̀ kpuru n’Oké Osimiri. Willie gwara mama m, sị: “Papa gị nọ na hel.” Willie bụ Onyeàmà Jehova. Ihe a ọ gwara mama m nwụrụ ya akpata oyi n’ahụ́ n’ihi na ọ bụ nke mbụ ọ na-anụ eziokwu Baịbụl.

Nwanna Willie Sneddon na nwunye ya Liz

Ihe Willie kwuru were mama m iwe n’ihi na ọ ma na papa ya bụ ezigbo mmadụ. Willie jụziri ya, sị: “Obi ọ̀ ga-atọ gị ụtọ ma m gwa gị na Jizọs gara na hel?” Mama m chetara ihe ndị chọọchị ha na-akụzi nke kwuru na Jizọs nọrọ na hel abalị atọ, a kpọlite ya n’ọnwụ mgbe ụbọchị atọ gachara. N’ihi ya, mama m jụrụ onwe ya, sị: ‘Ọ bụrụ na hel bụ ebe a na-ata ndị ajọ omume ahụhụ, gịnị mere Jizọs ji gaa ebe ahụ?’ Ihe a bụ otú mama m si nwewe mmasị n’eziokwu Baịbụl. Ọ malitere iso ọgbakọ a na-akpọ Bronz mụwa ihe, e mee ya baptizim n’afọ 1940.

Mụ na mama m mgbe m dị obere, na mụ na papa m mgbe m toturu

N’oge ahụ, a naghị agwakarị ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst ka ha na-akụziri ụmụ ha Baịbụl. Mgbe m dị obere, ọ na-abụ mama m gaa ozi ọma ma ọ bụ gaa ọmụmụ ihe ná ngwụcha izu, ọ bụ papa m na-elekọta m. Mgbe afọ ole na ole gachara, mụ na ya malitere iso mama m na-aga ọmụmụ ihe. Mama m ji ozi ọma kpọrọ ihe, ya na ọtụtụ mmadụ na-amụkwa Baịbụl. O nwere mgbe ọ na-akpọkọta ụfọdụ ndị ọ na-amụrụ ihe, mụọrọ ha ihe n’ihi na ha bi ibe ha nso. M na-eso ya aga ozi ọma ma anyị mechie akwụkwọ. M si otú ahụ mụta ọtụtụ ihe na Baịbụl, mụtakwa otú e si akụziri ndị mmadụ ihe Baịbụl kwuru.

Ọ dị mwute ikwu na mgbe m dị obere, aghọtachaghị m eziokwu. N’ihi ya, ejighị m eziokwu kpọrọ ihe. Ma, mgbe m dị ihe dị ka afọ iri na abụọ, m ghọrọ onye nkwusa, si mgbe ahụ gawa, m na-ejechi ozi ọma anya.  Mgbe m dị afọ iri na isii, m nyefere Jehova onwe m, e meekwa m baptizim n’abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa asaa, n’afọ 1954, ná mgbakọ ukwu e nwere na Toronto, dị na Kanada.

IJE OZI NA BETEL

Ụfọdụ ụmụnna anyị na ha nọ n’ọgbakọ na-eje ozi na Betel, ụfọdụ jebukwara ozi na Betel. M mụtara ọtụtụ ihe n’aka ha. Otú ha si eji Baịbụl akụzi ihe n’ozi ọma ma n’ọmụmụ ihe na-atọgbu m atọgbu. Ọ bụ eziokwu na ndị nkụzi m chọrọ ka m gaa mahadum, ma obi m niile bụ ịga Betel. N’ihi ya, mgbe anyị gara mgbakọ ukwu na Toronto, edejupụtara m akwụkwọ maka ịga Betel. M dejupụtara akwụkwọ ọzọ n’afọ 1955 ná mgbakọ ukwu anyị nọ n’Ámá Egwuregwu Yanki nke dị na Niu Yọk mee. Obere oge e mechara mgbakọ ahụ, a kpọrọ m ka m bịa jewe ozi na Betel dị na Bruklin n’abalị iri na itoolu n’ọnwa itoolu n’afọ 1955. M dị afọ iri na asaa n’oge ahụ. N’ụbọchị nke abụọ m bịara Betel, m malitere ịrụ ọrụ n’ebe a na-ekwe akwụkwọ na 117 Adams Street. Obere oge, amalitere m iji ígwè na-achịkọta akwụkwọ n’ùkwù n’ùkwù na-arụ ọrụ. Ùkwù nke ọ bụla na-adị peeji iri atọ na abụọ. E mechazie ígwè ọzọ adụkọta ha ọnụ, ha aghọọ otu akwụkwọ.

Mgbe m malitere ije ozi na Betel dị na Bruklin. Adị m afọ iri na asaa mgbe ahụ

Mgbe m rụrụ ọrụ ihe dị ka otu ọnwa n’ebe ahụ a na-ekwe akwụkwọ, e zigara m na ngalaba na-ahụ maka Ụlọ Nche na Teta! n’ihi na m ma otú e si eji ígwè taịpraịta ede ihe. N’oge ahụ, ụmụnna na-eji ígwè taịpraịta edepụta aha na adres nke ndị ọhụrụ tụrụ ọda Ụlọ Nche na Teta! Ha dechaa, ha etinyezie ya n’ihe a na-akpọ stensụl a ga-eji na-ebipụta aha na adres ndị ahụ tụrụ ọda. Mgbe ọnwa ole na ole gachara, m malitere ịrụ na Ngalaba Na-ezipụ Akwụkwọ. Onye na-elekọta ngalaba a aha ya bụ Klaus Jensen jụrụ m ma m̀ ga-achọ iso otu nwanna na-anya  nnukwu ụgbọala na-ebu akwụkwọ aga n’ọdụ ụgbọ mmiri, bụ́ ebe a ga-esi na-ezipụ ya ná mba dị iche iche. Anyị na-ebukwa magazin na-aga na post ọfịs, bụ́ ebe a ga-esi na-ezigara ya ọgbakọ dị iche iche dị n’Amerịka. Nwanna Jensen sị na ụdị ọrụ a ga-adị m mma n’ahụ́. M na-akụ ihe dị ka kilogram iri ise na asaa, ma i lee mụ anya, mụ eyie ogwu azụ̀. Oge ndị ahụ anyị bu akwụkwọ gaa n’ọdụ ụgbọ mmiri nakwa na post ọfis mere ka ahụ́ gbasie m ike. O doro anya na Nwanna Jensen ma ihe ahụ́ m chọrọ.

Ngalaba Na-ahụ Maka Ụlọ Nche na Teta! na-edeba akwụkwọ ọgbakọ ji tụọ ọda n’akwụkwọ. Ọ bụ ya mere m ji mata asụsụ dị iche iche a na-ebipụta magazin anyị na ha ma ziga ha ná mba dị iche iche n’ụwa. Anụtụbeghị m ihe ọ bụla gbasara ọtụtụ asụsụ ndị ahụ. Ma obi dị m ụtọ ịma na a na-eziga ọtụtụ puku magazin anyị n’obodo ndị dị ezigbo anya. Amaghị m n’oge ahụ na m ga-emecha gaa n’ọtụtụ obodo ndị a na-asụ asụsụ ndị ahụ.

Mụ na Nwanna Robert Wallen, Nwanna Charles Molohan, na Nwanna Don Adams

N’afọ 1961, a gwara m ka m rụwa n’Ọfịs Onye Na-ahụ Maka Ego. Onye na-elekọta ya bụ Nwanna Grant Suiter. Mgbe afọ ole na ole gachara, a gwakwara m ka gaa rụwa ọrụ n’ọfịs Nwanna Nathan Knorr. Ọ bụ ya na-elekọta ọrụ anyị n’ụwa niile n’oge ahụ. Ọ gwara m na otu n’ime ụmụnna na-arụ ọrụ n’ọfịs ya ga-aga Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze otu ọnwa. Ọ lọta, ọ ga-aga rụwa ọrụ na Ngalaba Ije Ozi. Ọ gwaziri m ka m rụwa ọrụ nwanna ahụ na-arụ. Ọ bụkwa mụ na Nwanna Don Adams ga-eso na-arụ ọrụ. Ọ dabara na ọ bụ nwanna a ka m nyere akwụkwọ m dejupụtara maka ịga Betel ná mgbakọ ahụ e nwere n’afọ 1955. Ụmụnna abụọ na-arụ n’ọfịs ahụ bụ Nwanna Robert Wallen na Nwanna Charles Molohan. Anyị anọ rụkọrọ  ọrụ ihe karịrị afọ iri ise. Obi dị m ezigbo ụtọ na mụ na ụmụnna ndị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe rụkọrọ ọrụ.​—⁠Ọma 133:⁠1.

Mgbe m nọ na Venezuela, bụ́ obodo mbụ m gara mgbe m ghọrọ onye nlekọta zoonu n’afọ 1970

Malite n’afọ 1970, a gwara m ka m na-eji izu ole na ole n’afọ na-aga eleta alaka ụlọ ọrụ anyị dị iche iche. Ihe a na-akpọ onye na-arụ ọrụ a n’oge ahụ bụ onye nlekọta zoonu. Ihe m na-arụ bụ ịga na-eleta ụmụnna ndị na-arụ n’alaka ụlọ ọrụ na ndị ozi ala ọzọ na-eje ozi n’ụwa niile. M na-eji Okwu Chineke agba ha ume, na-elebakwa anya n’ihe ndị a na-arụ n’ọfịs. Obi dị m ụtọ ịhụ ụfọdụ ụmụnna ndị mbụ gụrụla akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied ma ka na-eje ozi ha nke ọma ná mba ndị e zigara ha. Obi na-atọgbu m atọgbu na ọrụ a emeela ka m gaa ihe karịrị mba iri itoolu.

Obi na-atọgbu m atọgbu na mụ agaala leta ụmụnna anyị n’ihe karịrị mba iri itoolu

M CHỌTARA NWAANYỊ HỤRỤ JEHOVA N’ANYA

Ụmụnna niile na-eje ozi na Bruklin nwere ọgbakọ e kenyere ha na Niu Yọk Siti. Ọgbakọ e kenyere m dị n’obodo Bronz. Ndị nkwusa e nwere n’ọgbakọ mbụ e nwere n’obodo a bịara buo ibu, e sizie na ya kewapụta ọgbakọ ọzọ. A kpọwaziri ọgbakọ mbụ ahụ Ọgbakọ Upper Bronx. Ọ bụkwa n’ọgbakọ a ka m nọ.

N’ihe dị ka n’afọ 1965, otu ezinụlọ bụ́ ndị Latvian batara n’ọgbakọ mgbe ha nọ n’ebe ndịda Bronz. Ha kwabatara n’ókèala ọgbakọ ahụ m nọ na ya. Ada ha aha ya bụ Livija ghọrọ ọsụ ụzọ oge niile ozugbo ọ gachara ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Mgbe ọnwa ole na ole gachara, ọ gawara Masakuset, bụ́ ebe a chọkwuru ndị nkwusa. M malitere idere ya akwụkwọ ozi, na-akọrọ ya ihe ndị na-eme n’ọgbakọ anyị. Ọ na-edekwara m akwụkwọ ozi, na-akọrọ m otú ozi ya si na-aga na Bostin.

Mụ na Livija nwunye m

Mgbe afọ ole na ole gachara, Livija ghọrọ ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ebe ọ bụ na ọ chọrọ iji oge ya niile jeere Jehova ozi, o tinyere akwụkwọ ịga Betel, a kpọọ ya n’afọ 1971. O nwere ike ịbụ otú Jehova si chọọ ya. N’abalị iri abụọ na asaa n’ọnwa iri, afọ 1973, mụ na ya lụrụ. Ọ bụ Nwanna Knorr kwuru okwu agbamakwụkwọ anyị. Ilu 18:22 kwuru, sị: “Mmadụ ọ̀ chọtawo ezi nwunye? Onye ahụ achọtawo ihe ọma, ọ na-enwetakwa amara n’aka Jehova.” Mụ na nwunye m ejeela ozi na Betel ihe karịrị afọ iri anọ. Anyị ka nọ n’otu n’ime ọgbakọ ndị e nwere na Bronz.

MỤ NA ỤMỤNNA KRAỊST RỤKỌRỌ ỌRỤ

Obi tọgburu m atọgbu na mụ na Nwanna Knorr rụkọrọ ọrụ. Ike anaghị agwụ ya agwụ n’ọrụ. Ọ naghị eji ndị ozi ala ọzọ na-eje ozi n’ụwa niile egwu egwu. Ọtụtụ n’ime ha bụ Ndịàmà Jehova mbụ e nwere n’obodo ndị ahụ e zigara ha. O wutere m na Nwanna Knorr rịawara ọrịa kansa n’afọ 1976. Mgbe ọrịa na-ekweghịzi ya pụta èzí, e nwere otu ụbọchị ọ gwara m ka m gụọrọ ya ụfọdụ akwụkwọ a chọrọ ibipụta. Ọ gwakwara m ka m kpọọrọ ya Nwanna Frederick Franz ka ọ bịa soro gere ihe m ga-agụ. M mechara chọpụta na Nwanna Knorr na-eji oge buru ibu agụrụ Nwanna Franz akwụkwọ ndị a chọrọ ibipụta n’ihi na Nwanna Franz anaghị ahụcha ụzọ.

Mgbe mụ na Nwanna Daniel Sydlik na Marina nwunye ya letara alaka ụlọ ọrụ dị na Togo, n’afọ 1977

 Nwanna Knorr nwụrụ n’afọ 1977, ma ihe kasiri ndị maara ya ma hụ ya n’anya obi bụ na o kwesịrị ntụkwasị obi ruo mgbe o jechara ozi ya n’ụwa. (Mkpu. 2:10) Si mgbe ahụ gawa, ọ bụ Nwanna Franz na-elekọtazi ọrụ anyị.

N’oge ahụ, abụ m odeakwụkwọ Nwanna Milton Henschel. Nwanna a na Nwanna Knorr rụkọrọ ọrụ ọtụtụ afọ. Nwanna Henschel gwara m na ọrụ m na Betel ga-abụzi ịrụrụ Nwanna Franz ihe ọ bụla ọ chọrọ ka m rụọrọ ya. Kwa ụbọchị, m na-agụrụ ya akwụkwọ ndị a chọrọ ibipụta. Ụbụrụ na-aghọ Nwanna Franz nkọ. A gụwara ya ihe, uche ya na-adị na ya. Obi dị m ụtọ na m megideere ya ihe a ruo mgbe o jechara ozi ya n’ụwa n’ọnwa iri na abụọ n’afọ 1992.

Ihe a bụ 124 Kolọmbịa Haịts, bụ́ ebe m jere ozi ọtụtụ afọ

Afọ iri isii na otu m jereela ozi na Betel dị m ka ọ̀ bụ ụnyaahụ. Nne na nna m fegidere Jehova ruo ọnwụ. M na-atụsikwa anya ike ịhụ ha n’ụwa ọhụrụ mgbe a ga-akpọlite ha n’ọnwụ. (Jọn 5:​28, 29) O nweghị uru mmadụ ga-erite n’ụwa ochie a a ga-eji tụnyere mmadụ iso ụmụnna ndị kwesịrị ntụkwasị obi jeere ụmụnna ha nọ n’ụwa niile ozi. N’eziokwu, mụ na nwunye m nwere ike ikwu na n’oge niile ahụ anyị jirila jee ozi oge niile na ‘ọṅụ Jehova bụ ebe anyị e wusiri ike.’​—⁠Nehe. 8:⁠10.

A bịa ná nzukọ Jehova, o nweghị onye a ga-asị ma ọ nọghị ya ozi ọma agaghị aga aga. Obi dị m ụtọ na mụ na ọtụtụ ụmụnna ndị hụrụ Jehova n’anya ma jiri ọrụ ha kpọrọ ihe, rụkọrọ ọrụ. Ọtụtụ n’ime ndị e tere mmanụ mụ na ha rụkọrọ ọrụ anwụọla gaa eluigwe. Ma obi dị m ụtọ na mụ na ha rụkọrọ ọrụ n’ozi Jehova.