Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Septemba 2017

Na-enwe Ọmịiko Ka Jehova

Na-enwe Ọmịiko Ka Jehova

“Jehova, Jehova, Chineke nke na-eme ebere, na-emekwa amara [Ọmịiko].”​—⁠ỌPỤ. 34:⁠6.

ABỤ: 142, 12

1. Olee otú Jehova si mee ka Mozis mata onye ọ bụ? Gịnị mere o ji dị mkpa?

O NWERE mgbe Chineke mere ka Mozis mata onye ọ bụ. Otú o si mee ya bụ ịgwa ya aha ya na àgwà ndị o nwere. Ụfọdụ àgwà ndị ọ gwara Mozis bụ ebere na amara [ọmịiko]. (Gụọ Ọpụpụ 34:​5-7.) Jehova gaara ekwusi okwu ike banyere ike ya ma ọ bụ amamihe ya. Ma, Mozis chọrọ ịma ma Jehova ọ̀ ga-akwado ya. N’ihi ya, Jehova kwusiri okwu ike gbasara àgwà ndị gosiri na ọ chọrọ inyere ndị na-efe ya aka. (Ọpụ. 33:13) Ọ̀ bụ na obi ekwesịghị ịdị gị ụtọ na Chineke kwuru gbasara àgwà ndị a karịa àgwà ya ndị ọzọ? Isiokwu a ga-ekwu gbasara mmadụ inwe ọmịiko, nke bụ́ imetere onye na-ata ahụhụ ebere, na ịchọ inyere ya aka.

2, 3. (a) Gịnị gosiri na ndị mmadụ na-enwere ibe ha ọmịiko? (b) Gịnị mere ị ga-eji kwesị ịmụ ihe Baịbụl kwuru gbasara inwe ọmịiko?

2 Jehova nwere ọmịiko. O kere mmadụ n’onyinyo ya. N’ihi ya, ma ndị na-efe Chineke ma ndị na-anaghị efe ya na-enwere mmadụ ibe ha ọmịiko, ihe gbasara mmadụ ibe ha na-emetụkwa ha n’obi. (Jen. 1:27) Na Baịbụl, e nwere ọtụtụ ndị nweere mmadụ ibe ha ọmịiko. Ì chetara ndị akwụna abụọ ahụ nọ n’ihu  Solomọn na-azọ nwa? Mgbe Solomọn chọrọ ịmata onye nke mụrụ nwa ahụ, o kwuru ka a kpọwaa nwa ahụ abụọ. Mgbe nwaanyị nke mụrụ nwa ahụ nụrụ ya, o nweere nwa ya ọmịiko. N’ihi ya, ọ rịọrọ ka eze kunye nwaanyị nke ọzọ nwa ahụ. (1 Eze 3:​23-27) Onye ọzọ nweere mmadụ ibe ya ọmịiko bụ ada Fero. Mgbe ọ hụrụ nwa ọhụrụ bụ́ Mozis, ọ ma na ọ bụ onye Hibru, marakwa na e kwesịrị igbu ya. Ma, ‘o nweere ya ọmịiko,’ kpebie na ya ga-azụ nwa ahụ ka ọ bụrụ nwa ya.​—⁠Ọpụ. 2:​5, 6.

3 Gịnị mere anyị ji kwesị ịmụkwu gbasara mmadụ inwe ọmịiko? Ọ bụ n’ihi na Baịbụl gwara anyị ka anyị na-eṅomi Jehova. (Efe. 5:⁠1) Jehova kere ụmụ mmadụ ka ha na-enwe ọmịiko, ma ezughị okè anyị ketara n’aka Adam na-eme ka anyị na-achọ ihe ga-abara naanị anyị uru. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike isiri anyị ike ikpebi mà anyị ga-enyere onye ọzọ aka ma ọ bụ na-emere naanị onwe anyị ihe. O nwere ndị ime ihe a ka na-esiri ike. Gịnị ga-enyere anyị aka ịna-enwekwu ọmịiko? Nke mbụ, anyị ga-eleba anya n’otú Jehova na ndị mmadụ sirila gosi na ha nwere ọmịiko. Nke abụọ, anyị ga-elebakwa anya n’otú anyị ga-esi na-enwe ọmịiko ka Chineke, nakwa uru ọ ga-abara anyị ma anyị mee otú ahụ.

JEHOVA KACHA ENWE ỌMỊIKO

4. (a) Gịnị mere Jehova ji ziga ndị mmụọ ozi na Sọdọm? (b) Gịnị ka akụkọ Lọt na ndị ezinụlọ ya na-akụziri anyị?

4 Baịbụl gwara anyị ọtụtụ ihe Jehova mere nke gosiri na o nwere ọmịiko. Chegodị gbasara ihe o meere Lọt, bụ́ onye ezi omume. Lọt “nwere oké mwute” n’ihi omume rụrụ arụ ndị Sọdọm na Gọmọra na-eme n’asọghị anya. N’ihi ya, Chineke kpebiri ibibi ndị ahụ niile na-eme ihe ọjọọ. (2 Pita 2:​7, 8) Chineke zigara ndị mmụọ ozi ya ka ha napụta Lọt. Ha gwara ya na ezinụlọ ya ka ha si n’obodo ahụ Chineke chọrọ ibibi gbapụ. Baịbụl kwuru na “mgbe ọ nọ na-egbu oge, ndị ikom ahụ jidere ya na nwunye ya na ụmụ ya ndị inyom abụọ n’aka n’ihi ọmịiko Jehova nwere n’ebe ọ nọ, ha wee kpọpụta ya ma mee ka o guzoro ná mpụga obodo ahụ.” (Jen. 19:16) Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ma nsogbu ndị anyị na ha na-alụ otú ahụ ọ ma nke Lọt.​—⁠Aịza. 63:​7-9; Jems 5:11; 2 Pita 2:⁠9.

5. Olee otú 1 Jọn 3:17 si nyere anyị aka ịna-enwe ọmịiko?

5 Ọ bụghị naanị na Jehova na-enwere ndị na-efe ya ọmịiko, kama, ọ na-akụzikwara ha ka ha na-enwe ọmịiko. Chegodị gbasara otu n’ime iwu Jehova nyere ndị Izrel. Iwu ahụ kwuru na ọ bụrụ na mmadụ agbazinye mmadụ ego, onye ahụ gbazinyere ego ga-ewere uwe onye ahụ iji mee ka obi sie ya ike na ọ ga-akwụghachi ya. (Gụọ Ọpụpụ 22:​26, 27.) Ma, onye ahụ gbazinyere mmadụ ego ga-eweghachiri onye ahụ uwe ya tupu anyanwụ adaa ka ọ hụ ákwà ọ ga-eji kpuchie onwe ya n’abalị. Onye na-enweghị ọmịiko nwere ike ọ gaghị achọ iweghachiri onye ahụ uwe ya. Ma, Jehova gwara ndị Izrel ka ha na-enwere ibe ha ọmịiko. Olee ihe iwu a Chineke nyere na-akụziri anyị? Ọ na-akụziri anyị na anyị kwesịrị inyere ụmụnna anyị na-ata ahụhụ aka. E nwee nwanna na-ata ahụhụ anyị nwere ike inyere aka, anyị kwesịrị inyere ya aka.​—⁠Kọl. 3:12; Jems 2:​15, 16; gụọ 1 Jọn 3:⁠17.

6. Gịnị ka anyị mụtara n’otú Jehova si nweere ndị Izrel nupụụrụ ya isi ọmịiko?

6 Jehova nweere ndị Izrel ọmịiko ma mgbe ha nupụụrụ ya isi. Baịbụl kwuru, sị: “Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha wee na-ezigara ha ndị ozi ya ka ha dọọ ha aka ná ntị, o zigara ha ugboro ugboro,  n’ihi na o nweere ndị ya ọmịiko, nweekwa ọmịiko maka ebe obibi ya.” (2 Ihe 36:15) Anyị kwesịkwara ime ka Chineke, na-enwere ndị na-amabeghị ya ọmịiko, ya bụ, ndị ka nwere ike ichegharị ma bụrụ enyi ya. Jehova achọghị ka e bibie onye ọ bụla mgbe ọ ga-ebibi ndị ajọ omume. (2 Pita 3:⁠9) N’ihi ya, tupu Chineke ebibie ha, ka anyị na-ekwusara onye ọ bụla anyị nwere ike ikwusara ozi a e ji na-adọ ndị mmadụ aka ná ntị, ma nyere ọtụtụ ndị aka ka ha rite uru n’ọmịiko Chineke na-enwere anyị.

7, 8. Gịnị mere obi ji sie otu ezinụlọ ike na Jehova meere ha ebere?

7 Taa, e nweela ọtụtụ ndị na-efe Jehova o meerela ebere ma ọ bụ nweere ọmịiko. Chegodị ihe mere otu di na nwunye na nwa ha nwoke dị afọ iri na abụọ. Ihe anyị ga-akpọ nwa ha nwoke a bụ Milan. Ihe a mere n’agbata afọ 1991 na afọ 1994 mgbe agbụrụ ndị dị na Bọznia na-alụ ọgụ, na-egburịtakwa onwe ha. Milan, nwanne ya nwoke na ndị mụrụ ha, nakwa ụmụnna ndị ọzọ si na Bọznia na-aga mgbakọ na Sebia. Ọ bụ ná mgbakọ ahụ ka ndị mụrụ Milan chọrọ ime baptizim. Mgbe ha ruru n’ókè ndị Bọznia na Sebia, ndị amị nọ ebe ahụ kwụsịrị ụgbọala ha ma sị Milan, nwanne ya na ndị mụrụ ha pụta n’ihi na ha bụ ndị agbụrụ ọzọ. Ha hapụrụ ụmụnna ndị ọzọ ka ha gawa. Mgbe ha nọchara abalị abụọ ebe ahụ, onyeisi ndị amị ahụ kpọrọ onye ka ya n’ọ́kwá ma jụọ ya ihe ọ ga-eme ezinụlọ a. Ezinụlọ a nụrụ ihe a zara onyeisi ahụ n’ihi na ha guzo ebe ahụ. Ọ gwara ya, sị: “Kpọrọ ha gaa gbagbuo!”

8 Mgbe onyeisi ndị amị na-agwa ndị amị ndị ọzọ okwu, ụmụ nwoke abụọ ha na-amaghị bịakwutere ezinụlọ ahụ ma jiri nwayọọ gwa ha na ha bụ Ndịàmà Jehova. Ha gwara ezinụlọ a na ụmụnna ndị ahụ ha na ha nọ n’ụgbọala ahụ gwara ha ihe merenụ. Ha gwaziri Milan na nwanne ya nwoke ka ha baa n’ụgbọala nke ha ka ha bufee ha n’ókè Bọznia na Sebia n’ihi na ndị amị anaghị ele ma akwụkwọ ụmụaka ò zuru ezu. Ha gwakwara ndị mụrụ Milan ka ha si n’azụ bịakwute ha n’akụkụ nke ọzọ. Mgbe Milan nụrụ ihe a, ọ maghị ma ọ̀ ga-achịwa ọchị ma ọ bụ bewe ákwá. Ndị mụrụ ya jụrụ ụmụnna abụọ ahụ, sị: “Ùnu chere na ha ga-ahapụ anyị ka anyị laa?” Ma, mgbe ha na-apụ, ya adị ka ndị amị ahụ anaghị ahụ ha. Ndị mụrụ Milan bịakwutere ya na nwanne ya nwoke n’ebe ahụ ha nọ n’akụkụ nke ọzọ. Ha gawara mgbakọ ahụ, obi sikwara ha ike na Jehova zara ha ekpere ha nọ na-ekpe kemgbe ka o nyere ha aka. Anyị mụtara na Baịbụl na ọ bụghị mgbe niile ka Jehova na-eme ihe ozugbo iji chebe ndị na-efe ya. (Ọrụ 7:​58-60) Ma, Milan kwuru otú obi dị ya. Ọ sịrị: “Ọ dị m ka ndị mmụọ ozi mechiri ndị amị ahụ anya, Jehova napụtakwara anyị.”​—⁠Ọma 97:⁠10.

9. Gịnị ka Jizọs meere ìgwè mmadụ ahụ sooro ya mgbe ọ hụrụ nsogbu ha nọ na ya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

9 Anyị ga-amụtakwa ihe n’otú Jizọs si nweere ndị mmadụ ọmịiko. O nweere ìgwè mmadụ ọ hụrụ ọmịiko n’ihi na “a gbara ha akpụkpọ, na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” Olee otú o si nweere ha ọmịiko? Baịbụl sịrị na ‘ọ malitere izi ha ọtụtụ ihe.’ (Mat. 9:36; gụọ Mak 6:34.) Jizọs adịghị ka ndị Farisii, bụ́ ndị na-achọghị inyere ndị mmadụ aka. (Mat. 12:​9-14; 23:4; Jọn 7:49) Ọ̀ na-agụsi gị agụụ ike inyere ndị mmadụ aka ma na-akụziri ha banyere Jehova otú ahụ Jizọs mere?

10, 11. Ọ̀ bụ mgbe niile ka anyị kwesịrị ịna-enwere ndị mmadụ ọmịiko? (b) Kọwaa.

10 Nke a apụtaghị na anyị ga na-enwere  ndị mmadụ ọmịiko mgbe niile. Ọmịiko Jehova nweere ụfọdụ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, bụ́ ndị anyị kwuburu okwu ha n’isiokwu a, kwesịrị ekwesị. Ma, e nwere ndị nweere ndị mmadụ ọmịiko na-ekwesịghị ekwesị. Dị ka ihe atụ, Eze Sọl nupụụrụ Jehova isi mgbe o chere na ọ na-enwere mmadụ ọmịikọ. O gbughị Egag, bụ́ onye iro ndị Chineke, nakwa anụmanụ niile nke ndị Amalek. N’ihi ya, Jehova jụrụ ya ka ọ ghara ịbụkwa eze. (1 Sam. 15:​3, 9, 15) Jehova na-ekpe ikpe ziri ezi. Ọ na-enyocha obi, marakwa mgbe a na-ekwesịghị inwere mmadụ ọmịiko. (Ákwá 2:17; Ezik. 5:11) N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-ebibi ndị niile na-enupụrụ ya isi. (2 Tesa. 1:​6-10) Oge ahụ abụghị oge ọ ga-emetere ha ebere. Ma, ibibi ha bụ otú ọ ga-esi nweere ndị ezi omume ọ ga-echebe, ọmịiko.

11 O doro anya na ọ bụghị anyị ga-ekwu ndị a ga-ebibi na ndị a na-agaghị ebibi. Ma, anyị kwesịrị ime ihe ọ bụla anyị ga-eme ugbu a iji nyere ndị mmadụ aka. N’ihi ya, olee otú anyị ga-esi na-enwere ndị mmadụ ọmịiko? Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ha.

OTÚ ANYỊ GA-ESI NA-ENWERE NDỊ MMADỤ ỌMỊIKO

12. Olee otú ị ga-esi nweere ndị ọzọ ọmịiko?

12 Na-enyere ndị mmadụ aka kwa ụbọchị. Jehova chọrọ ka Ndị Kraịst na-enwere ma ụmụnna ha ma ndị ọzọ ọmịiko, si otú ahụ na-eṅomi Jizọs. (Jọn 13:​34, 35; 1 Pita 3:⁠8) Otu n’ime ihe ọmịiko pụtara bụ “iso ndị ọzọ taa ahụhụ.” Onye na-enwere mmadụ ibe ya ọmịiko na-agba mbọ ka o nyere ndị na-ata ahụhụ aka. Chọpụta otú i nwere ike isi nyere ndị ọzọ aka. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịrụrụ ha ọrụ n’ụlọ ma ọ bụ gaara ha ozi ndị ọzọ.​—⁠Mat. 7:⁠12.

Na-enyere ndị mmadụ aka si otú ahụ na-enwere ha ọmịiko (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12)

13. Olee ihe ụmụnna anyị na-eme mgbe ọdachi dakwasịrị ụmụnna ha?

13 Na-agbatara ndị ọzọ ọsọ enyemaka. Mgbe anyị na-ahụ otú ndị ọdachi dakwasịrị si na-ata ahụhụ, anyị na-enwere ha ọmịiko. A ma ndị Jehova ama na ha na-agbatara ndị ọzọ ọsọ enyemaka mgbe ọdachi dakwasịrị ha. (1 Pita 2:17) Otu nwanna nwaanyị na Japan bi n’ebe ala ọma jijiji kpara mkpamkpa n’afọ 2011. O kwuru na “obi tọrọ ya ezigbo ụtọ” mgbe ọ hụrụ ọtụtụ ụmụnna si ebe dị iche  iche na Japan na obodo ndị ọzọ bịa ịrụzigharị ụlọ ha. O kwukwara, sị: “Ihe a ha meere anyị mere ka m ghọta na ihe banyere anyị na-emetụ Jehova na ụmụnna anyị n’obi. Ọtụtụ ụmụnna anyị n’ụwa niile na-ekpekwara anyị ekpere.”

14. Olee otú ị ga-esi nyere ndị ọrịa na ndị agadi aka?

14 Na-enyere ndị ọrịa na ndị agadi aka. Anyị hụ ndị na-ata ahụhụ n’ihi ọrịa na ime agadi, anyị na-enwere ha ọmịiko. Anyị na-atụsi anya ike mgbe ọrịa na ime agadi na-agaghị adịkwa ọzọ. Ọ bụ ya mere anyị ji ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa. Tupu mgbe ahụ, ka anyị mee ihe ọ bụla anyị nwere ike ime iji nyere ndị ọrịa na ndị agadi aka. E nwere ihe otu nwoke na-ede akwụkwọ kwuru banyere mama ya merela agadi. Mama ya na-arịa ọrịa na-eme ka ụbụrụ ghara ịkpakọ mmadụ ọnụ. Nwoke a kwuru na e nwere otu ụbọchị mama ya metọrọ ákwà ya. Mgbe ọ na-achọ ihicha ya, mgbịrịgba ụzọ ha kụrụ. Ndị pịrị mgbịrịgba ahụ bụ ụmụnna nwaanyị abụọ na-abịakarị na nke mama ya. Ha jụrụ ma è nwere ihe ha ga-enyere ha aka mee. Mama ya sịrị na “e nwere, ma o nwere otú ọ dị.” Ụmụnna nwaanyị ahụ nyeere ya aka hichaa ákwà ya. Ha meere ya tii ma soro ya kwurịta okwu. Obi tọrọ nwa ya ezigbo ụtọ, ya asị na Ndịàmà Jehova “na-eme ihe ha na-akụziri ndị mmadụ.” Ọmịiko ị na-enwere ndị ọrịa na ndị agadi, ọ̀ na-eme ka i mee ihe niile nwere ike ime iji nyere ha aka?​—⁠Fil. 2:​3, 4.

15. Olee otú ozi ọma si enyere ndị mmadụ aka?

15 Na-enyere ndị mmadụ aka ka ha mata Jehova. Nsogbu ndị mmadụ na-enwe na otú ha si na-echegbu onwe ha na-eme ka anyị na-akụziri ha Okwu Chineke. Otú kacha mma anyị nwere ike isi eme ya bụ ịkụziri ha banyere Chineke na ihe Alaeze ya ga-emere ụmụ mmadụ. Otú ọzọ bụ ime ka ha mata ihe mere irubere Jehova isi ji baa uru. (Aịza. 48:​17, 18) Ozi ọma anyị na-ezi ndị mmadụ bụ ụzọ magburu onwe ya anyị si na-asọpụrụ Jehova ma na-enwere ndị ọzọ ọmịiko. Ì nwere ike iwepụtakwu oge zie ndị mmadụ ozi ọma?​—⁠1 Tim. 2:​3, 4.

INWE ỌMỊIKO GA-ABAKWARA GỊ URU

16. Olee uru onye na-enwere mmadụ ibe ya ọmịiko na-erite?

16 Ndị dọkịta kwuru na ọ bụrụ na mmadụ na-enwere mmadụ ibe ya ọmịiko na o nwere ike ime ka ahụ́ na-agbasi ya ike, meekwa ka ya na ndị ọzọ na-adịkwa ná mma. Inyere ndị na-ata ahụhụ aka ga-eme ka obi na-atọkwu gị ụtọ, na-esikwu gị ike. Ọ ga-eme ka owu ghara ịna-amakarị gị, meekwa ka ị ghara ịna-echekarị echiche ọjọọ. O doro anya na inwere ndị mmadụ ọmịiko ga-abara gị uru. (Efe. 4:​31, 32) Ndị Kraịst na-enyere ndị ọzọ aka na-enwe ezigbo akọnuche n’ihi na ha ma na ha na-eme ihe dị Jehova mma. Inwere ndị mmadụ ọmịiko ga-eme ka anyị bụrụ ezigbo nna ma ọ bụ nne, ezigbo di ma ọ bụ nwunye, na ezigbo enyi. Ndị mmadụ na-agbatakarịrị onye na-enyere mmadụ ibe ya aka ọsọ enyemaka ma o nwee nsogbu.​—⁠Gụọ Matiu 5:7; Luk 6:⁠38.

17. Gịnị mere anyị ji enwere ndị mmadụ ọmịiko?

17 Anyị ma na inwere ndị mmadụ ọmịiko bara uru, ma ọ bụghị ya mere anyị ji enwere ndị mmadụ ọmịiko. Ihe mere anyị ji eme ya bụ n’ihi na anyị chọrọ iṅomi Jehova Chineke, meekwa ka e too ya. Ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya, na-enwekwara ha ọmịiko. (Ilu 14:31) Ọ chọrọ ka anyị na-eme ka ya. N’ihi ya, ka anyị niile mee ihe anyị nwere ike ime iji na-enwere ndị mmadụ ọmịiko ka Chineke. Anyị mee otú ahụ, anyị ga-ahụkwu ụmụnna anyị n’anya, anyị na ndị ọzọ ana-adịkwu ná mma.​—⁠Gal. 6:10; 1 Jọn 4:⁠16.