Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Septemba 2016

Ndị Na-eto Eto, Meenụ Ka Okwukwe Unu Sie Ike

Ndị Na-eto Eto, Meenụ Ka Okwukwe Unu Sie Ike

“Okwukwe bụ . . . ihe àmà doro anya na ihe ndị a na-adịghị ahụ anya dị adị n’ezie.”HIB. 11:1.

ABỤ: 41, 69

1, 2. Olee ihe nwere ike ịna-enye ndị na-eto eto nsogbu n’obi? Oleekwa ihe ga-enyere ha aka?

NA Briten, otu nwa agbọghọ gwara nwa klas ha bụ́ Onyeàmà Jehova, sị: “Agaghị m ekweta na onye ma ihe ka gị ga-ekwere na Chineke.” Otu nwanna nwoke bí na Jamanị dere, sị: “Ndị nkụzi anyị weere ihe Baịbụl kọrọ banyere okike ka akụkọ ifo. Obi ha niile bụ na ụmụ akwụkwọ niile kweere na e keghị mmadụ eke.” Otu nwanna nwaanyị bí na Frans kwuru, sị: “Ọ na-eju ndị nkụzi nọ́ n’ụlọ akwụkwọ anyị anya na a ka nwere ụmụ akwụkwọ kweere na Baịbụl.”

2 Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto na-efe Jehova ma ọ bụ na ị ka na-amụ banyere Chineke, ọ̀ na-adị gị ka i kwere na e keghị mmadụ eke otú ahụ ọtụtụ ndị kweere, kama ikwere na ọ bụ Chineke kere ihe niile? Ọ bụrụ otú ahụ, e nwere ihe ndị ị ga-eme ka okwukwe gị sie ike. Nke mbụ bụ iji ikike iche echiche Chineke nyere gị chebara ihe ị nụrụ echiche. Baịbụl kwuru na ‘ikike iche echiche ga-eche gị nche.’ Ọ ga-eme ka a ghara iji amamihe ụwa mee ka okwukwe gị nyụọ ka ọkụ.—Gụọ Ilu 2:10-12.

3. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

3 Ọ bụ ihe ndị anyị mụtara gbasara Chineke ga-eme ka okwukwe anyị sie ike. (1 Tim. 2:4) N’ihi ya, ị mụwa Okwu Chineke  ma ọ bụ akwụkwọ anyị ji amụ Baịbụl, agụla ya naanị elu elu. Chebara ihe ị na-agụ echiche ka i nwee ike ‘ịghọta’ ya. (Mat. 13:23) Ka anyị tụlee ihe mere ime otú ahụ ga-eji mee ka obi sie gị ike na ọ bụ Chineke kere ihe niile nakwa na Baịbụl bụ Okwu ya. Ihe ga-eme ka i kwetasie ike juru eju bara abara.—Hib. 11:1.

OTÚ Ị GA-ESI MEE KA OKWUKWE GỊ SIE IKE

4. Olee otú ikwere na e keghị mmadụ eke na ikwere na Chineke si yie? Gịnịzi ka anyị niile kwesịrị ime?

4 Mmadụ nwere ike ịsị gị, “M kweere na e keghị mmadụ eke n’ihi na ndị ọkà mmụta sayensị kwuru na ọ bụ eziokwu. Olee otú ị ga-esi kwere na Chineke ebe ọ bụ na e nwebeghị onye hụtụrụla ya?” Ọtụtụ ndị chere otú ahụ. N’eziokwu, e nweghị onye n’ime anyị hụtụrụla Chineke ma ọ bụ hụ ka ọ na-eke ihe. (Jọn 1:18) Chegodị banyere ndị kweere na e keghị mmadụ eke. Hanwa kwekwaara n’ihe ha na-ahụtụbeghị. E nweghị onye ọkà mmụta sayensị ma ọ bụ onye ọzọ hụtụrụla ebe otu ihe ji nwayọọ nwayọọ ghọọ ụdị ihe ọzọ. Dị ka ihe atụ, o nweghị onye hụtụrụla ebe agwọ ma ọ bụ ngwere ji nwayọọ nwayọọ ghọọ ọdụm ma ọ bụ enyí. (Job 38:1, 4) N’ihi ya, anyị niile kwesịrị ileru ihe niile anya, chebara ha echiche, kpebie ihe ha na-egosi. Ọtụtụ ndị eleela ihe niile e kere eke anya ma ‘ghọta’ na Chineke dị. O doola ha anya na ọ bụ ya kere ihe niile, na ọ dị ike, nakwa na o nwere ọtụtụ àgwà magburu onwe ha.—Rom 1:20.

Jiri akwụkwọ na ihe ndị ọzọ e nwere n’asụsụ unu na-akọwara ndị ọzọ ihe i kweere (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5)

5. Olee ihe ndị e ji eme nchọnchọ ga-enyere anyị aka ịmụtakwu ihe gbasara ihe ndị Chineke kere?

5 Anyị lee ihe ndị e kere eke anya ma chebara ha echiche, anyị ga-aghọta na ihe niile Chineke kere dị egwu. ‘Anyị ji okwukwe ghọta’ na e nwere Onye kere ihe niile n’agbanyeghị na a naghị ahụ ya anya. Anyị amatala na o nwere amamihe na àgwà magburu onwe ya. (Hib. 11:3, 27) Anyị ga-amatakwu banyere ihe ndị o kere ma anyị gụọ gbasara ihe ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtarala. Ị ga-ahụ ụfọdụ n’ime ihe ndị ha chọpụtara na vidio bụ́ The Wonders of Creation Reveal God’s Glory, na broshọ abụọ bụ́ Was Life Created? na The Origin of Life—Five Questions Worth Asking, nakwa n’akwụkwọ bụ́ Is There a Creator Who Cares About You? Na Teta!  ị ga-ahụ ajụjụ ọnụ a gbara ndị ọkà mmụta sayensị na ndị ọzọ, ha ekwuo ihe mere ha ji kwere na Chineke ugbu a. Ị ga-ahụkwa isiokwu bụ́ “È Kere Ya Eke?” Ọ na-akọ ihe dị́ iche iche gbasara ụmụ anụmanụ na ihe ndị ọzọ Chineke kere nakwa otú ndị ọkà mmụta sayensị si na-agbalị imepụta ihe na-eme ka ha.

6. Olee uru ịgụ akwụkwọ ndị a na-ebipụtara anyị bara? Olee uru ịgụ ha baarala gị?

6 Broshọ abụọ ndị ahụ e kwuru banyere ha, nyeere otu nwanna dị́ afọ iri na itoolu bí n’Amerịka aka. Ọ sịrị: “Ha abaarala m ezigbo uru. Amụọla m broshọ abụọ a ọtụtụ ugboro.” Otu nwanna nwaanyị bí na Frans dere, sị: “Isiokwu bụ́ ‘È Kere Ya Eke?’ na-atụ m n’anya. Ọ na-egosi na ndị ọkachamara nwere ike ịgbawa mbọ ka ha mepụta ihe yiri ihe ndị dị́ mgbagwoju anya Chineke kere, ma ha emekataghị mepụta nke dị́ ịtụnanya ka nke Chineke kere.” E nwere otu nwata nwaanyị dị́ afọ iri na ise bí na Saụt Afrịka. Ndị mụrụ ya kwuru, sị: “Nwa anyị nwaanyị nweta Teta! ihe mbụ ọ na-agụkarị bụ ‘Ajụjụ Ọnụ’ na-agba na ya.” Gịnwa kwanụ? Ị̀ na-agụ akwụkwọ ndị a a na-ebipụtara anyị? Ha ga-enyere gị aka ka okwukwe gị kwụrụ chịm ka osisi mgbọrọgwụ ya bamiri n’ime ala. I mee otú ahụ, okwukwe gị ga-eme ka ifufe ozizi ụgha ghara ịna-ebugharị gị.—Jere. 17:5-8.

OKWUKWE I NWERE NA BAỊBỤL

7. Gịnị mere Chineke ji chọọ ka i jiri ike iche echiche gị chọpụta nke bụ́ eziokwu?

7 Ọ̀ dị njọ ma mmadụ jụọ ajụjụ ụfọdụ gbasara Baịbụl? Mbanụ. Jehova chọrọ ka i jiri “ike iche echiche” gị chọpụta nke bụ́ eziokwu. Ọ chọghị ka i kweta ihe Baịbụl kwuru naanị maka na ndị ọzọ kwetara. N’ihi ya, jiri ike iche echiche gị mụta nke bụ́ eziokwu. Ihe ahụ ị ga-amụta ga-eme ka i nwee ezigbo okwukwe. (Gụọ Ndị Rom 12:1, 2; 1 Timoti 2:4.) Otu n’ime ụzọ ndị i nwere ike isi matakwuo ihe Baịbụl kwuru bụ ịmụ isiokwu ndị ị chọrọ imekwu nchọnchọ banyere ha.

8, 9. (a) Olee ihe na-atọ ụfọdụ ndị ụtọ ma ha mụọ gbasara ya? (b) Olee uru ụfọdụ ndị riterela n’ịtụgharị uche n’ihe ha na-amụ?

8 Ụfọdụ na-amụ gbasara amụma Baịbụl ma ọ bụ otú ndị na-akọ ihe ndị mere n’oge ochie, na ndị sayensị, ma ọ bụ ndị na-achọpụta gbasara ihe ndị mgbe ochie si gosi na Baịbụl na-ekwu eziokwu. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịmụ gbasara Jenesis 3:15. Jehova buru amụma ahụ dị́ mkpa ozugbo Adam na Iv nupụchaara ya na ọchịchị ya isi. Ọ bụ ya bụ nke mbụ n’ọtụtụ amụma na-enyere anyị aka ịghọta otú Alaeze Chineke ga-esi gosi na ọchịchị Chineke kacha mma nakwa otú ọ ga-esi mee ka ahụhụ niile kwụsị. Olee otú i nwere ike isi mụọ Jenesis 3:15? I nwere ike idepụta amaokwu Baịbụl ndị kọwakwuru otú amụma ahụ ga-esi mezuo. Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ịchọpụta mgbe e dere amaokwu ndị ahụ ma hazie ha n’usoro. Ọ ga-eme ka ị mata na ndị só dee Baịbụl biri ndụ n’oge dị́ iche iche, ma onye nke ọ bụla dere ihe mere ka amụma ahụ dokwuo anya. Ọ ga-enyere gị aka ịghọta na Jehova ji mmụọ nsọ ya duzie ha.—2 Pita 1:21.

9 Otu nwanna bí na Jamanị chere banyere otú akwụkwọ Baịbụl nke ọ bụla si kọwakwuo gbasara Alaeze Chineke n’agbanyeghị na ọ bụ ihe dị́ ka mmadụ iri anọ dere Baịbụl. Ọ sịrị: “Oge ọtụtụ n’ime ha biri dị iche iche. Ọtụtụ n’ime ha amaghịkwa ibe ha.” Otu nwanna nwaanyị bí n’Ọstrelia mụrụ otu isiokwu dị́ n’Ụlọ Nche Disemba 15, 2013, mụta otú Ememme Ngabiga si gbasa amụma ahụ e buru na Jenesis 3:15 na ọbịbịa Mesaya. O dere, sị: “Ihe ahụ m mụrụ mere ka m ghọta na Jehova dị ebube. Otú o si chepụta ihe a ọ gwara ndị Izrel ka ha na-eme, meekwa ka o mezuo n’isi Jizọs tọgburu m atọgbu.  O mere ka m kwụsịtụ chee otú Ememme Ngabiga ahụ na-egosi ihe ga-eme n’ọdịnihu si dị́ ịtụnanya.” Gịnị mere obi ji dị́ nwanna nwaanyị a otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na o chebaara ihe ọ gụrụ echiche ma ghọta “ihe ọ pụtara.” Ihe a mere ka okwukwe ya bụrụ a kwaa akwụrụ, ya na Jehova adịkwuo ná mma.—Mat. 13:23.

10. Olee otú eziokwu ndị só dee Baịbụl kwuru si eme ka obi sie anyị ike na ihe ha dere bụ eziokwu?

10 Ihe ọzọ ga-eme ka okwukwe anyị sie ike bụ iche banyere obi ike ndị só dee Baịbụl nwere nakwa otú ha si kwuo eziokwu. Ọtụtụ ndị dere akwụkwọ n’oge ochie na-etokarị ndị ndú ha na obodo ha. Ma, ndị amụma Jehova kwuru eziokwu mgbe niile. Ha kwuru ihe ndị obodo ha na ndị eze ha mejọrọ. (2 Ihe 16:9, 10; 24:18-22) Ha kwuru hoo haa banyere ihe hanwa na ndị ọzọ fere Chineke na-emetaghị. (2 Sam. 12:1-14; Mak 14:50) Otu nwanna bí na Briten kwuru, sị: “Ndị mmadụ anaghị ekwukarị eziokwu otú ahụ. Ihe a na-eme ka obi sikwuo anyị ike na Baịbụl bụ Okwu Jehova.”

11. Olee otú ndị na-eto eto ga-esi gosi na ha ghọtara na ime ihe Baịbụl kwuru na-abara ha uru?

11 Obi siri ọtụtụ ndị ike na Baịbụl bụ Okwu Chineke n’ihi na ọ na-eme ka ha mata ihe ha kwesịrị ime. (Gụọ Abụ Ọma 19:7-11.) Otu nwanna nwaanyị bí na Japan dere, sị: “Mgbe ndị ezinụlọ anyị mewere ihe Baịbụl kwuru, obi malitere ịdị anyị ezigbo ụtọ. Anyị malitere ibi n’udo, dịrị n’otu, hụkwa ibe anyị n’anya.” Ihe Baịbụl kwuru na-eme ka anyị ghara ikpere arụsị ma ọ bụ ikwere n’ihe na-enweghị isi na ọdụ na-eme ka ọtụtụ ndị nọrọ n’ohu. (Ọma 115:3-8) Ihe a ụfọdụ ndị na-ekwu na Chineke adịghị, ọ̀ na-akpa ha aka ọjọọ? Ụdị ozizi ahụ na-eme ka ndị mmadụ na-eto ihe e kere eke, kama itowe Jehova, bụ́ Onye kere ya. Ndị sịrị na Chineke adịghị na-ekwu na ọ bụ ụmụ mmadụ ga-eme ka ihe ka mma n’ọdịnihu. Ma anyị lechaa ihe ha merela, anyị ga-achọpụta na ha enwebeghị ike ịkwụsị nsogbu juru n’ụwa a.—Ọma 146:3, 4.

OTÚ Ị GA-ESI MEE KA NDỊ ỌZỌ GHỌTA IHE Ị NA-EKWU

12, 13. Olee otú kacha mma ị ga-esi gwa ụmụ akwụkwọ ibe gị, ndị nkụzi, ma ọ bụ ndị ọzọ banyere Baịbụl nakwa na ọ bụ Chineke kere ihe niile?

12 Ị gwawa ndị ọzọ banyere Baịbụl nakwa na e kere ihe niile eke, olee otú ị ga-esi kwuo ihe ga-eru ha n’obi? Nke mbụ bụ na i kwesịghị iche ozugbo na ị ma ihe ha kweere. E nwere ndị na-ekwu na ha kweere na e keghị ihe eke, ma ha kweere na Chineke dị. Ha chere na Chineke kere otu ihe, hapụzie ya ka o jiri nwayọọ nwayọọ ghọwa ụdị ihe dị́ iche iche dị́ ndụ. Ụfọdụ ndị na-ekwu na ihe mere ha ji kwere na e keghị ihe eke bụ na a gaaraghị na-akụzi ya n’ụlọ akwụkwọ ma a sị́ na ọ bụghị eziokwu. E nwere ndị na-ekweghịzi na Chineke dị n’ihi na okpukpe azụtaghị ihe a tụrụ ya n’ahịa. N’ihi ya, gị na mmadụ kwuwe banyere otú ihe ndị dị́ ndụ si malite, ọ ga-akacha mma ka i buru ụzọ jụọ ya ajụjụ ka ị mata ihe o kweere na ihe kpatara ya. I gosi na i nwere ezi uche ma gee ya ntị nke ọma, o nwere ike ige gị ntị.—Taị. 3:2.

13 Mmadụ kwuwe na ị dị iberiibe maka na i kweere na ọ bụ Chineke kere ihe niile, wetuo obi gwa ya ka ọ kọwaa otú ihe ndị dị́ ndụ si malite ma a sị na e nweghị Onye kere ha. Ihe ga-eme ka ihe mbụ dị́ ndụ ghara ịnwụ bụ na ọ ga-enwe ike imepụtaghachi onwe ya. Otu ọkachamara na sayensị kwuru na ụfọdụ n’ime ihe ndị ọzọ ga-eme ka ihe ahụ ghara ịnwụ bụ (1) ihe yiri akpụkpọ ahụ́ ga-ekpuchi ya,  (2) inweta ikike na iji ya na-arụ ọrụ, (3) ihe ga-eme ka ọdịdị ya na-agbanwe, ya ana-etokwa, na (4) ikike imepụtaghachi ihe ga-eme ka ọ na-eto. O kwukwara, sị: “Mmadụ chechaa otú obere ihe ọ bụla dị́ ndụ si dị́ mgbagwoju anya, ọ ga-eri ya ọnụ.”

14. Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ọ na-adị gị ka ị maghị otú ị ga-esi gwa ndị ọzọ na ọ bụ Chineke kere ihe niile?

14 Ọ bụrụ na ọ na-adị gị ka ị maghị otú ị ga-esi gwa ndị ọzọ na ọ bụ Chineke kere ihe niile, i nwere ike ikwu ụdị ihe ahụ Pọl kwuru. O dere, sị: “Ụlọ ọ bụla nwere onye rụrụ ya, ma onye rụrụ ihe niile bụ Chineke.” (Hib. 3:4) Ihe ahụ o kwuru ga-eme ka onye nụrụ ya chee echiche. Ọ bụ onye ụbụrụ ya na-aghọ nkọ ga-arụpụtali ihe bụ́ ọkpọka. I nwere ike iji akwụkwọ anyị nyere onye ahụ aka. Otu nwa okorobịa kwuru na ya ekweghị na Chineke nakwa na e keghị ihe eke. Otu nwanna nwaanyị enye ya broshọ abụọ ahụ anyị kwuburu banyere ha. Mgbe ihe dị́ ka otu izu gara, nwa okorobịa ahụ sịrị: “Ekwetala m ugbu a na Chineke dị.” E mechara mụwara ya Baịbụl, ya aghọọ nwanna.

15, 16. Gịnị ka i kwesịrị ibu ụzọ mee tupu gị akọwaara mmadụ na Baịbụl bụ Okwu Chineke, gịnịkwa ka i kwesịrị iburu n’obi?

15 Ọ bụrụ onye na-ekwu na Baịbụl abụghị Okwu Chineke, i nwekwara ike ime otu ihe ahụ ma gị na ya kwurịtawa okwu. Chọpụta ihe onye ahụ kweere na ihe na-amasị ya. (Ilu 18:13) Ọ bụrụ na ihe gbasara sayensị na-amasị ya, obi nwere ike ịdị ya ụtọ ma ị gwa ya ihe ndị gosiri na ihe ọ bụla Baịbụl kwuru banyere sayensị bụ eziokwu. Ihe nwere ike ịmasị ụfọdụ ndị bụ igosi ha na amụma ndị e buru na Baịbụl na-emezu nakwa na ihe Baịbụl kọrọ mere n’oge ochie bụ eziokwu. I nwekwara ike igosi onye ahụ otú ihe Jizọs kụziri n’elu ugwu ma ọ bụ ihe ọzọ Baịbụl kwuru ga-esi mee ka ndụ ya ka mma.

16 Cheta na ihe i kwesịrị iburu n’obi bụ ka i kwuo ihe ga-eru mmadụ n’obi, ọ bụghị ka okwu bie n’ọnụ gị. N’ihi ya, na-ege ntị nke ọma. Na-ajụ ezigbo ajụjụ, wetuokwa obi kwuo ihe i chere. Na-akwanyere ndị ị na-agwa okwu ùgwù, nke ka nke, ma ọ bụrụ ndị tọrọ gị. I mee otú ahụ, ha ga-akwanyere gị ùgwù ma gee gị ntị. Ha ga-amatakwa na i chebarala ihe i kweere echiche nke ọma. Ọ bụ ihe ọtụtụ ndị na-eto eto na-emebeghị. Ma, ọ bụrụ na ihe dị́ onye jụrụ gị ajụjụ mkpa bụ ịrụwa ụka ma ọ bụ ịchị gị ọchị maka ihe i kweere, ọ bụghị iwu na ị ga-aza ajụjụ ya.—Ilu 26:4.

JIRI EZIOKWU BAỊBỤL KPỌRỌ IHE

17, 18. (a) Olee ihe ga-enyere gị aka iji eziokwu Baịbụl kpọrọ ihe? (b) Olee ajụjụ anyị ga-aza n’isiokwu na-esonụ?

17 Ihe ga-eme ka okwukwe gị sie ike abụghị naanị ịmụta ihe ụfọdụ dị́ mkpa Baịbụl kwuru. N’ihi ya, na-amụsi Okwu Chineke ike. Chọsie ihe o kwuru ike otú ahụ e si achọ ọlaọcha. (Ilu 2:3-6) Jiri ihe ndị ọzọ e nwere n’asụsụ unu na-eme nchọnchọ, dị́ ka Watchtower Library nke dị́zi na diiviidi, Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N’ỊNTANET, na Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ. Gbalịsiekwa ike gụchaa Baịbụl. I nwere ike iji otu afọ gụchaa ya. Ịgụ Okwu Chineke so n’ihe kacha eme ka okwukwe anyị sie ike. Otu onye nlekọta sekit chetara ihe nyeere ya aka mgbe ọ bụ okorobịa. Ọ sịrị: “Otu n’ime ihe ndị nyeere m aka ịghọta na Baịbụl bụ Okwu Chineke bụ ịgụcha ya. O mere ka m ghọtakwuo akụkọ Baịbụl ndị m mụtara malite mgbe m bụ nwata. Ọ bụ mgbe ahụ ka m malitere imekwu nke ọma n’ọgbakọ.”

18 Ndị nne na nna, ọ bụ unu ga-akacha akụziri ụmụ unu banyere Jehova. Olee otú unu ga-esi nyere ha aka ka okwukwe ha sie ike? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ a.