Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) SEPTEMBA 2016

‘Akụdakwala Aka’

‘Akụdakwala Aka’

“Enwela nkụda aka.”—ZEF. 3:16.

ABỤ: 81, 32

1, 2. (a) Olee ụdị nsogbu na-abịara ọtụtụ ndị taa, gịnịkwa ka ọ na-akpata? (b) Olee ihe Aịzaya 41:10, 13 kwuru kwesịrị ime ka i nwee olileanya?

OTU nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ oge niile, di ya bụ okenye, sịrị: “Ọ bụ eziokwu na m na-agbasi mbọ ike n’ọgbakọ, m na-echegbu onwe m kemgbe ọtụtụ afọ. Ọ naghị ekwe m hie ụra. Ọ na-eme ka m na-arịa ọrịa, na-emekwa ka m na-emeso ndị ọzọ otú na-adịchaghị mma. Mgbe ụfọdụ, ike ụwa na-agwụ m, ya adị m ka ala mepee ka m daba.”

2 Ị̀ ghọtara otú obi dị nwanna nwaanyị a? Ọ dị mwute na nsogbu juru n’ụwa a nwere ike ime ka mmadụ na-echegbu onwe ya, ya adị ya ka ọ̀ bụ ụwa nke ya kacha njọ. Onye ahụ nwere ike ịdị ka ụgbọala tọrọ n’ọpọtọpọtọ, nke na-ekweghị ya gaa ihu ma ọ bụ azụ. (Ilu 12:25) Olee ihe nwere ike ime ka ọ dị́ gị otú ahụ? O nwere ike ịbụ na ị na-eru uju onye nwụnahụrụ gị, na ị na-arịa ezigbo ọrịa, na ị na-agba mbọ ịkpa afọ ezinụlọ gị n’oge a ihe siri ike, ma ọ bụkwanụ na a na-emegide gị. I nwere ike ichekata ihe ndị a, ike ana-agwụ gị, ị gaghịzi na-enwe obi ụtọ. Ma, ka obi sie gị ike na Jehova dị njikere inyere gị aka.—Gụọ Aịzaya 41:10, 13.

3, 4. (a) Gịnị ka Baịbụl na-eji okwu ahụ bụ́ “aka” akọwa? (b) Olee ihe nwere ike ime ka mmadụ daa mbà?

3 Baịbụl na-ejikarị ebe dị́ iche iche n’ahụ́ mmadụ akọwa àgwà mmadụ ma ọ bụ ihe mmadụ mere. Dị ka ihe atụ,  ọ kpọrọ aka aha ọtụtụ ugboro. O kwuru banyere ‘ime ka mmadụ nwee ike’ na ‘mmadụ iji ihe kwado onye ọzọ.’ Otú e si kwuo ya n’asụsụ Hibru bụ ‘ime ka aka mmadụ dị ike’ na ‘iji ihe mee ka aka mmadụ dị ike.’ Ihe ọ pụtara bụ ịgba mmadụ ume, ime ka obi sie ya ike, na ime ka o jikere ịrụ ọrụ. (1 Sam. 23:16; Ezra 1:6) O nwekwara ike ịpụta na mmadụ nwere olileanya na ihe ga-emecha dị́ mma.

4 E nwere mgbe ụfọdụ Baịbụl na-ekwu na aka mmadụ kụdara akụda. Ọ pụtara na onye ahụ dara mbà ma ọ bụ ghara inwe olileanya. (2 Ihe 15:7; Hib. 12:12) Ike ụwa nwere ike ịgwụ ụdị onye ahụ. E nwee ihe ndị mere ka ike na-agwụ gị, ma ọ bụ mee ka i chewe na gị na Chineke adịghịzi ná mma, olee ebe ị ga-enweta ihe ga-eme ka obi sie gị ike? Olee ihe ga-enyere gị aka idi nsogbu bịaara gị, obi adịkwa gị ụtọ?

“AKA JEHOVA ADỊGHỊ MKPỤMKPỤ NKE NA Ọ PỤGHỊ ỊZỌPỤTA”

5. (a) Olee otú o nwere ike ịdị anyị ma nsogbu bịara anyị, ma gịnị ka anyị kwesịrị ịna-echeta? (b) Olee ihe anyị ga-amụ n’isiokwu a?

5 Gụọ Zefanaya 3:16, 17. Nsogbu bịara anyị, anyị nwere ike tụwa ụjọ, daa mbà, ma ọ bụ kwe ka ọ kụda anyị aka. Kama ime otú ahụ, anyị kwesịrị ime ihe Jehova, bụ́ Nna hụrụ anyị n’anya, gwara anyị. Ọ gwara anyị ka anyị ‘na-atụkwasị ya nchegbu anyị niile.’ (1 Pita 5:7) Anyị kwesịrị ịna-echeta ihe Chineke gwara ndị Izrel. Ọ gwara ha na ‘aka ya adịghị mkpụmkpụ’ nke na ọ gaghị azọpụtali ndị jí obi ha niile na-efe ya. (Aịza. 59:1) N’isiokwu a, anyị ga-amụ gbasara mmadụ atọ a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, nke ga-eme ka anyị mata na Jehova chọrọ inyere ndị ohu ya aka nakwa na ọ ga-enyeliri ha aka ịna-eme uche ya n’agbanyeghị nsogbu ndị siri ike na-abịara ha. Ka anyị hụ otú ihe gbasara ha atọ ga-esi gbaa gị ume.

6, 7. Olee ihe anyị kwesịrị ịmụta n’otú ụmụ Izrel si merie ndị Amalek?

6 Obere oge Jehova napụtachara ndị Izrel n’ohu ha nọ na-agba n’Ijipt, ndị Amalek bịara ịlụso ha ọgụ. Jọshụa ji obi ike duru ha gaa agha otú Mozis gwara ya. Mozis akpọrọzie Erọn na Họọ gawa n’otu ugwu dị́ nso, bụ́ ebe ha ga-anọ hụ ihe na-eme n’ọgbọ agha. Ọ̀ pụtara na ha ji ụjọ chọọ ịgbara agha ahụ ọsọ? Mbanụ.

7 Mozis mere ihe nyeere ndị Izrel aka imeri n’agha ahụ. O ji aka abụọ bulie mkpara Chineke elu. Aka ya abụọ dịrị n’elu otú ahụ, Jehova ana-eme ka ndị Izrel na-emeri ndị Amalek. Ma, Mozis wetuo aka ya maka na o gbuwela ya mgbu, ndị Amalek emeriwe. Erọn na Họọ buuru “nkume debe n’okpuru ya, o wee nọrọ ọdụ n’elu ya; Erọn na Họọ wee jide aka ya abụọ, otu onye n’otu akụkụ, onye nke ọzọ n’akụkụ nke ọzọ, aka ya wee kwụrụ otu ebe ruo mgbe anyanwụ dara.” Chineke ji aka ya dị́ ike mee ka ụmụ Izrel merie n’agha ahụ.—Ọpụ. 17:8-13.

8. (a) Gịnị ka Esa mere mgbe ndị Itiopia bịara ịlụso ndị Juda agha? (b) Olee otú anyị nwere ike isi tụkwasị Chineke obi otú ahụ Esa mere?

8 Jehova gosikwara na aka ya adịghị mkpụmkpụ n’oge Esa bụ́ eze Juda. Baịbụl kwuru banyere ọtụtụ agha a lụrụ n’oge ochie. Ma ìgwè ndị agha kachanụ a chị gaa agha bụ ndị agha Zira onye Itiopia. Ha dị otu nde mmadụ, bụ́ ndị agha a zụrụ nke ọma. Ọ fọrọ obere ka ha ka ndị agha Esa okpukpu abụọ. Ị manụ na ụdị ihe a  nwere ike ime ka Esa chịrị obi n’aka, ụjọ atụwa ya, ya adaa mbà. Kama ime otú ahụ, Esa gakwuuru Jehova ka o nyere ya aka. E jiri anya ndị agha lewe ya, ọ ga-adị ka o nweghị ihe ga-eme ka ha merie ndị agha Itiopia. Ma “n’ebe Chineke nọ, ihe niile kwere omume.” (Mat. 19:26) Chineke gosiri ike ya dị́ ukwuu “wee merie ndị Itiopia n’ihu Esa,” bụ́ onye ‘obi ya zuru ezu’ n’ebe Jehova nọ ‘n’ụbọchị ya niile.’—2 Ihe 14:8-13; 2 Ihe 15:17.

9. (a) Olee ihe na-emeghị ka Nehemaya kwụsị ịrụghachi mgbidi Jeruselem? (b) Olee otú Chineke si zaa ekpere Nehemaya?

9 Chegodị otú obi dị Nehemaya mgbe ọ gara Jeruselem. O yiri ka obodo ahụ ọ̀ bụziiri ndị iro anụ oriri. Ike ụwa gwụkwara ndị Juu ibe ya. Egwu ndị iro na-eyi ha mere ka obi ghara isi ha ike, ha akwụsịkwa ịrụghachi mgbidi Jeruselem. Nehemaya ò kwere ka ihe a mee ka ọ daa mbà? Mbanụ. Ọ tụkwasịrị Jehova obi mgbe niile otú ahụ Mozis, Esa, na ndị ọzọ jí obi ha niile fee Jehova mere. Ugbu a nsogbu bịaara ya, o kpere ekpere rịọ Jehova ka o nyere ya aka, Jehova aza ekpere ya, jiri ‘ike ya dị ukwuu’ na ‘aka ya dị ike’ mee ka ndị Juu nwee obi ike. (Gụọ Nehemaya 1:10; 2:17-20; 6:9.) Ì kwetara na Jehova na-eji ‘ike ya dị ukwuu’ na ‘aka ya dị ike’ eme ka ndị na-efe ya taa nwee obi ike?

JEHOVA GA-EME KA Ị DỊ́ IKE

10, 11. (a) Olee otú Ekwensu si agba mbọ ka anyị daa mbà? (b) Gịnị ka Jehova na-eji eme ka anyị dị́ ike ma nwee ume? (ch) Olee uru i riterela n’ụzọ dị́ iche iche Jehova si akụziri anyị ihe?

10 Anyị ma na ike agaghị agwụ Ekwensu ná mbọ ọ na-agba ka anyị kwụsị ife Jehova. Ọ na-eji ụgha, egwu ndị ọchịchị na-eyi anyị, ndị ndú okpukpe, na ndị sí n’ezi ofufe dapụ agbalị ime ya. Gịnị ka ọ chọrọ ime? Ọ chọrọ ka ike gwụ anyị ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ma Jehova ga-ejili mmụọ nsọ ya nyere anyị aka. Ọ chọkwara ime otú ahụ. (1 Ihe 29:12) Ọ dị ezigbo mkpa ka anyị na-arịọ Chineke ka o nye anyị mmụọ nsọ ya ka anyị nwee ike ịlụso Setan na ụwa ya ọgụ. (Ọma 18:39; 1 Kọr. 10:13) Obi kwesịkwara ịdị anyị ụtọ na anyị nwere Okwu Chineke e si n’ike mmụọ nsọ dee. Cheekwa banyere ọtụtụ ihe anyị na-amụta n’akwụkwọ ndị a na-ewepụtara anyị n’ọnwa ọ bụla. Na Zekaraya 8:9, 13 (gụọ ya), anyị ga-ahụ ihe Jehova kwuru mgbe a na-arụghachi ụlọ nsọ dị́ na Jeruselem. Ihe ahụ o kwuru ga-abakwara anyị uru taa.

11 Ihe ndị ọzọ Jehova ji eme ka anyị dị́ ike bụ ihe a na-akụziri anyị n’ọmụmụ ihe, ná mgbakọ dị́ iche iche nakwa n’ụlọ akwụkwọ ndị e nwere ná nzukọ ya. Ihe a a na-akụziri anyị ga-enyere anyị aka ibu ezigbo ihe n’obi na-efe ya, ịna-ekpebi ihe ndị anyị ga-eme n’ozi ya, na ịna-eme ihe dị́ iche iche Onye Kraịst kwesịrị ịna-eme. (Ọma 119:32) Ị̀ na-agbasi mbọ ike ka ihe ndị ọ na-akụziri anyị mee ka ị dị́ ike?

12. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka okwukwe anyị na-esi ike?

12 Jehova nyeere ndị Izrel aka ha emerie ndị Amalek na ndị Itiopia. O mekwara ka Nehemaya na ndị Juu ibe ya nwee ike ịrụzicha mgbidi Jeruselem. Chineke ga-emekwa ka anyị nwee ike ịna-ekwusa ozi ọma ọ bụrụgodị na e nwere ihe na-echegbu anyị, na a na-emegide anyị, ma ọ bụ na ndị mmadụ achọghị ịnụ ozi ọma anyị. (1 Pita 5:10) Anyị anaghị atụ anya  ka Jehova mee ka nsogbu anyị niile kwụsị n’otu ntabi anya. Kama, ka anyị mee ihe anyị kwesịrị ime. Anyị kwesịrị ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, na-amụ ihe a ga-amụ n’ọmụmụ ihe kwa izu ma na-agachi ọmụmụ ihe anya, na-amụ ihe nke onwe anyị, na-enwe ofufe ezinụlọ, na-ekpekwa ekpere mgbe niile. Ka anyị ghara ikwe ka ịchụ ihe ndị ọzọ gbochie anyị ime ihe ndị a Jehova ji eme ka anyị dị́ ike ma na-agba anyị ume. Ị chọpụta na ike agwụwala gị na nke ọ bụla n’ihe ndị a, rịọ Chineke ka o nyere gị aka. Ị ga-ahụ otú mmụọ nsọ ya ga-esi ‘na-arụ ọrụ n’ime gị,’ ka ime ihe dị́ mma gụwa gị agụụ, gị ana-emekwa ya. (Fil. 2:13) Ma, olee otú ị ga-esi na-eme ka ndị ọzọ dị́ ike?

NA-EME KA NDỊ NA-ADỊGHỊ IKE DỊ́ IKE

13, 14. (a) Olee otú e si nyere otu nwanna nwunye ya nwụrụ aka? (b) Olee ụzọ ndị anyị nwere ike isi nyere ndị ọzọ aka?

13 Jehova nyere anyị ụmụnna anyị nọ́ n’ụwa niile, bụ́ ndị hụrụ anyị n’anya ma na-agba anyị ume. Cheta na Pọl onyeozi dere, sị: “Na-agbatịnụ aka kụdara akụda na ikpere na-adịghị ike, na-emerenụ ụkwụ unu ụzọ kwụ ọtọ.” (Hib. 12:12, 13) N’oge ndịozi Jizọs, e nyeere ọtụtụ ndị nọ́ n’ọgbakọ ụdị aka ahụ. A na-emekwa otú ahụ taa. E nwere otu nwanna nwunye ya nwụrụ, nsogbu ndị ọzọ siri ike abịakwara ya. Ọ sịrị: “M mụtara na anyị agaghị ahọrọli ụdị ọnwụnwa ga-abịara anyị, mgbe ọ ga-abịa ma ọ bụ ugboro ole ọ ga-abịa. Ma, ekpere na ịmụsi Baịbụl ike na-enyere m aka ka nsogbu ụwa a ghara iri m ka mmiri. Aka ụmụnna na-enyere m akasiela m obi. Amatala m na ọ dị ezigbo mkpa ka anyị na Jehova dịrị n’ezigbo mma tupu nsogbu abịara anyị.”

Onye ọ bụla nọ́ n’ọgbakọ kwesịrị ịna-agba ndị ọzọ ume (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)

14 Erọn na Họọ jidere aka Mozis mgbe ndị Izrel na-alụ agha. Anyịnwa kwesịkwara ịna-achọ otú anyị ga-esi nyere ndị ọzọ aka. Olee ndị anyị ga-enyere aka? Ọ bụ ndị ha na nká na-alụ, ndị ọrịa na-enye nsogbu, ndị ndị ezinụlọ ha na-akpagbu, ndị owu na-ama ma ọ bụ ndị mmadụ nwụnahụrụ. Ndị ọzọ bụ ndị na-eto eto ndị ọgbọ ha na-enye nsogbu ka ha mee ihe ọjọọ ma ọ bụ ka ha chụwa ihe nke ụwa, ma ọ̀ bụ n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ n’ebe ọzọ. (1 Tesa. 3:1-3; 5:11, 14) Chọọ otú ị ga-esi gosi ndị ọzọ na ị hụrụ ha n’anya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, n’ozi ọma, mgbe unu na-erikọ nri, ma ọ bụ mgbe unu na-akparịta ụka n’ekwentị.

15. Olee uru okwu ọma anyị kwuru nwere ike ịbara ụmụnna anyị?

15 Mgbe Esa merichara ndị Itiopia, Azaraya onye amụma gbara ya na ndị ya ume, sị: “Ma unu onwe unu, nweenụ obi ike, unu enwela nkụda aka, n’ihi na unu ga-enweta ụgwọ ọrụ maka ọrụ unu.” (2 Ihe 15:7) Ihe a o kwuru mere ka Esa gbanwee ọtụtụ ihe iji mee ka ndị Juda malitekwa ife Jehova. Okwu ọma ị gwara ndị ọzọ nwere ike ịgba ha ume otú ahụ, meekwa ka ha na-agbakwu mbọ n’ozi Jehova. (Ilu 15:23) Ị gaa ọmụmụ ihe, echefula na i welie aka zaa ajụjụ otú ga-agba ndị ọzọ ume, ọ ga-abara ha ezigbo uru.

16. Olee otú ndị okenye ga-esi na-eme ka ụmụnna ha dị́ ike otú ahụ Nehemaya mere? Kọọ otú ụmụnna sirila nyere gị aka.

16 Jehova mere ka Nehemaya na ndị Juu ibe ya nwee ike ịrụcha ọrụ ha nọ na-arụ. Ha ji ụbọchị iri ise na abụọ rụchaa mgbidi Jeruselem. (Nehe. 2:18; 6:15, 16) Ihe Nehemaya mere abụghị ịnọ na-ele anya ka ndị ọzọ na-arụ ọrụ ahụ. O so rụghachi mgbidi Jeruselem.  (Nehe. 5:16) Ọtụtụ ndị okenye na-eme ka Nehemaya. Ha na-eso arụ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova ma ọ bụ na-arụzi Ụlọ Nzukọ Alaeze ha ma na-edowe ya ọcha. Ha na-emekwa ka ụmụnna ndị na-echegbu onwe ha dị́ ike. Otú ha si eme ya bụ na ha na ndị nkwusa na-arụ n’ozi ọma, ha ana-agakwara ha nleta ọzụzụ atụrụ.—Gụọ Aịzaya 35:3, 4.

‘AKỤDAKWALA AKA’

17, 18. Mgbe ọ bụla nsogbu bịaara anyị, olee ihe kwesịrị ime ka obi sie anyị ike?

17 Anyị na ụmụnna anyị jiri otu obi na-ejere Jehova ozi, ọ ga-eme ka anyị na ha dị́ n’otu. Ọ ga-eme ka anyị bụrụ ezigbo enyi, meekwa ka anyị na ha nwee obi ike n’ihe ọma Alaeze Chineke ga-eme n’oge na-adịghị anya. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ka ndị ọzọ dị́ ike, anyị ga na-enyere ha aka idi nsogbu ndị na-abiara ha, ha enweekwa olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu. Ime otú ahụ ga-enyere anyị aka ilekwasị anya n’ozi Chineke, mee ka obi sie anyị ike na nkwa Chineke ga-emezu. N’eziokwu, ọ ga-eme ka anyị dị́ ike.

18 Anyị cheta ụzọ dị́ iche iche Jehova si nyere ndị ohu ya aka n’oge ochie ma chebe ha, okwukwe anyị nwere n’ebe ọ nọ ga-esikwu ike, anyị atụkwasịkwuo ya obi. N’ihi ya, mgbe ọ bụla nsogbu bịaara gị, adala mbà. Kama, rịọ Jehova ka o nyere gị aka, kwekwa ka aka ya dị́ ike mee ka ị dị́ ike, na-edukwa gị ruo mgbe ị ga-enweta ihe ọma Alaeze ya ga-eme n’oge na-adịghị anya.—Ọma 73:23, 24.