Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Ọktoba 2017

Uru Ọhụụ Zekaraya Baara Anyị

Uru Ọhụụ Zekaraya Baara Anyị

“Lọghachikwutenụ m, . . . m ga-alọghachikwute unu.”​—⁠ZEK. 1:⁠3.

ABỤ: 120, 117

1-3. (a) Olee otú ihe si dịrị ndị Izrel mgbe Zekaraya malitere ibu amụma? (b) Gịnị mere Jehova ji gwa ndị Izrel ka ha ‘lọghachikwute ya’?

E NWERE ụfọdụ ọhụụ Zekaraya hụrụ. N’ọhụụ ahụ, e gosiri ya akwụkwọ mpịakọta na-efe efe, otu nwaanyị nke nọ ọdụ n’ime nkata, nakwa ụmụ nwaanyị abụọ ji nku ha na-efe n’ikuku. Nku ha yiri nku ụgbala. Ihe ndị a niile dị n’akwụkwọ Zekaraya. (Zek. 5:​1, 7-9) Gịnị mere Jehova ji gosi onye amụma a ọhụụ ndị a? Olee otú ihe si dịrị ndị Izrel n’oge ahụ? Olee uru ọhụụ ndị ahụ baara anyị taa?

2 N’afọ 537 Tupu Oge Ndị Kraịst, ndị Izrel ṅụrịrị ezigbo ọṅụ. O ruola afọ iri asaa a dọọrọ ha n’agha laa Babịlọn, ma ugbu a ha enwerela onwe ha. Ha jizi obi ụtọ laghachi Jeruselem ka ha wughachi ụlọ nsọ Jehova, malitekwa ife ya. Mgbe otu afọ gachara, ha tọrọ ntọala ụlọ nsọ ahụ. Obi tọrọ ha ezigbo ụtọ nke na ‘ha nọ na-eti oké mkpu, a nọkwa ọbụna n’ebe dị anya na-anụ ya.’ (Ezra 3:​10-13) Ma, n’oge na-adịghị anya, ndị iro ha nyesiwere ha nsogbu ike  ka ha kwụsị ụlọ nsọ ahụ ha na-arụ. Nke a mere ka ike gwụ ndị Izrel, ha akwụsị ịrụ ụlọ nsọ ahụ. Kama ilekwasị anya na-arụ ụlọ nsọ ahụ, ha rụwara ụlọ nke ha, na-akọkwa ugbo. Mgbe afọ iri na isii gachara, ha arụchabeghịkwa ụlọ nsọ ahụ. E kwesịrị ichetara ha ka ha lọghachikwute Jehova ma kwụsị iche ihe ga-abara naanị onwe ha uru. Jehova chọrọ ka ha lọghachikwute ya, kwụsị ụjọ ha na-atụ ma jiri obi ha niile na-efe ya.

3 N’ihi ya, n’afọ 520 Tupu Oge Ndị Kraịst, Jehova zigara onye amụma ya bụ́ Zekaraya ka o chetara ha ihe mere o ji kwe ka ndị Babịlọn hapụ ha. Aha ahụ bụ́ Zekaraya pụtara “Jehova Echetala,” nwere ike ichetara ha eziokwu dị mkpa. Ọ bụ eziokwu na ha echefuola ihe Jehova meere ha, ma ọ ka na-echeta ndị ya. (Gụọ Zekaraya 1:​3, 4.) O mesiri ha obi ike na ọ ga-enyere ha aka ịmaliteghachi ife ya. Ma, o mesiri ha obi ike na ha jiri obi ha niile na-efe ya, na ọ ga-anabata ofufe ha. Ka anyị leba anya n’ọhụụ nke isii na nke asaa Zekaraya hụrụ. Anyị ga-amụta otú Jehova si gbaa ndị Izrel ume, ha amaliteghachi ọrụ, nakwa otú ọhụụ abụọ a ga-esi nyere anyị aka taa.

IHE JEHOVA GA-EME NDỊ NA-EZU OHI

4. Gịnị ka Zekaraya hụrụ n’ọhụụ nke isii? Gịnị mere e ji dee ihe n’ihu nakwa n’azụ akwụkwọ mpịakọta ahụ? (Lee ihe nke mbụ e sere ná mmalite isiokwu a.)

4 E ji ọhụụ pụrụ iche malite Zekaraya Isi Ise. (Gụọ Zekaraya 5:​1, 2.) Zekaraya hụrụ akwụkwọ mpịakọta na-efe efe. Akwụkwọ a fọrọ obere ka o ruo amaụkwụ iri atọ n’ogologo na amaụkwụ iri na ise na mbara. E meghere ya ma deekwa ihe na ya. Ihe e dere n’ihu nakwa n’azụ ya bụ ihe Jehova ga-eme ndị na-eme ihe ọjọọ. (Zek. 5:⁠3) N’oge ochie, ndị mmadụ na-edekarị ihe naanị n’ihu ma ọ bụ n’azụ akwụkwọ. Ma, e dere ihe n’ihu nakwa n’azụ akwụkwọ mpịakọta a. N’ihi ya, ozi a dị ezigbo mkpa.

Ndị Kraịst ekwesịghị izu ohi n’ụdị ya ọ bụla (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5 ruo nke 7)

5, 6. Olee otú Jehova si ele ụdị ohi ọ bụla anya?

5 Gụọ Zekaraya 5:​3, 4Mmadụ niile ga-aza Jehova ajụjụ ihe ha metere ma ndị na-efe ya ga-akadị aza ajụjụ n’ihi na ha na-aza aha ya. Ha hụrụ ya n’anya ma marakwa na izu ohu n’ụdị ya ọ bụla ‘na-emetọ aha Chineke ha.’ (Ilu 30:​8, 9) Ụfọdụ ndị nwere ike iche na ọ dịghị njọ izu ohi ma e nwee ezigbo ihe kpatara ya. Ma, n’agbanyeghị ezigbo ihe ha chere kpatara ya, onye na-ezu ohi na-egosi na ya ji ihe ahụ o zuru n’ihi anyaukwu kpọrọ ihe karịa Jehova, Aha ya, nakwa Iwu ya.

6 Ị̀ hụrụ na Zekaraya 5:​3, 4 kwuru na ‘ọbụbụ ọnụ ga-abanye n’ụlọ onye ohi nakwa na ọ ga-ebiri ebiri n’ime ụlọ ya wee kpochapụ ya’? N’ihi ya, Jehova ga-agba onye ọ bụla sị na ya na-efe ya ma na-eme ihe ọjọọ n’anwụ ma taa ya ahụhụ. Ọ bụrụgodị na onye na-ezu ohi ezochiere ya ndị uwe ojii, ndị were ya n’ọrụ, ndị okenye, ma ọ bụ ndị mụrụ ya, ọ gaghị ezochiliri ya Jehova. Jehova ga-eme ka a mata ụdị ohi ọ bụla mmadụ zuru. (Hib. 4:13) Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị na ndị na-agbalị na-akwụwa aka ha ọtọ “n’ihe niile” na-akpa. ​—⁠Hib. 13:⁠18.

7. Olee ihe anyị na-amụta n’ọhụụ akwụkwọ mpịakọta ahụ na-efe efe?

7 Ụdị ohi ọ bụla na-ewe Jehova iwe. Obi na-atọ anyị ụtọ na anyị ma onye Jehova bụ, na-erubere ya isi ma na-ebi ndụ otú na-agaghị eme ka ndị mmadụ na-akatọ aha ya. Ime otú ahụ ga-eme ka Jehova ghara ime anyị ihe ọ ga-eme ndị na-anaghị erubere ya isi.

 NA-EME IHE I KWURU “KWA ỤBỌCHỊ”

8-10. (a) Gịnị bụ ịṅụ iyi? (b) Olee iyi Eze Zedekaya ṅụrụ nke ọ na-emezughị?

8 Ihe ọzọ akwụkwọ mpịakọta ahụ na-efe efe kwuru bụ ihe Jehova ga-eme ndị ji aha ya “na-aṅụ iyi ụgha.” (Zek. 5:⁠4) Ịṅụ iyi bụ ihe mmadụ ji egosi na ihe o kwuru bụ eziokwu. Mmadụ jikwa ya egosi na ọ ga-emezu nkwa o kwere ma ọ bụkwanụ na ọ gaghị eme ihe.

9 Mmadụ iji aha Jehova aṅụ iyi abụghị ihe e ji egwu egwu. Ọ bụ ihe Zedekaya bụ́ eze ikpeazụ chịrị na Jeruselem mere. O ji aha Jehova ṅụọ iyi na ya ga na-erubere eze Babịlọn isi. Ma, o mezughị ya. Ọ bụ ya mere Jehova ji gwa ya, sị: “Dị nnọọ ka m dị ndụ, . . . n’obodo eze ahụ nke mere [Zedekaya] eze, bụ́ onye ahụ ledara iyi ọ ṅụrụ anya, mebiekwa ọgbụgba ndụ ya, n’ebe ya na eze ahụ nọ n’ime Babịlọn, ka ọ ga-anwụ.”​—⁠Ezik. 17:⁠16.

10 Eze Zedekaya ejirila aha Jehova ṅụọ iyi, o kwesịkwara imezu ya. (2 Ihe 36:13) Ma, o mezughị ya. Ọ gakwuuru ndị Ijipt ka ha nyere ya aka ka o nwere onwe ya n’aka ndị Babịlọn.​—⁠Ezik. 17:​11-15, 17, 18.

11, 12. (a) Olee nkwa kacha mkpa anyị kwetụrụla? (b) Olee otú nkwa anyị kwere Chineke mgbe anyị nyefere ya onwe anyị si gbasa ihe ndị anyị na-eme kwa ụbọchị?

11 Jehova na-anụkwa nkwa ndị anyị na-ekwe. Ọ naghị eji nkwa ndị anyị na-ekwe ya egwu egwu. Anyị kwesịkwara imezu ha ka anyị na ya nwee ike ịdị ná mma. (Ọma 76:11) Ná nkwa niile anyị na-ekwe Jehova, nke kacha mkpa bụ nke anyị kwere mgbe anyị nyefere ya onwe anyị. Mgbe anyị kwere nkwa a, anyị gwara ya na anyị ga na-efe ya, ihe ọ sọkwara ya mee.

12 Olee otú anyị nwere ike isi mezuo nkwa anyị kwere Jehova mgbe anyị nyefere ya onwe anyị? Ihe anyị mere  mgbe nnukwu ọnwụnwa ma ọ bụ obere ọnwụnwa bịaara anyị kwesịrị igosi na anyị ejighị nkwa ahụ anyị kwere na anyị ga na-eto ya “kwa ụbọchị,” egwu egwu. (Ọma 61:⁠8) Dị ka ihe atụ, mgbe onye ọrụ ibe anyị ma ọ bụ nwa akwụkwọ ibe anyị na-achụ anyị, ànyị na-agbara ya ọsọ ma si otú ahụ gosi na ‘ụzọ anyị na-atọ anya Jehova ụtọ?’ (Ilu 23:26) Ọ bụrụ na ọ bụ naanị anyị na-efe Jehova n’ezinụlọ anyị, ànyị na-arịọ Jehova ka o nyere anyị aka ka anyị na-akpa àgwà Onye Kraịst na-akpa? Ànyị na-ekele Nna anyị nke eluigwe n’ekpere kwa ụbọchị maka ịhụ anyị n’anya, nakwa iduzi anyị? Ị̀ na-ewepụta oge na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị? A sị ka ekwuwe, anyị kwere ya nkwa na anyị ga na-eme ihe ndị a. Ọ bụrụ na anyị na-erubere Jehova isi ma jiri obi anyị niile na-ejere ya ozi, anyị na-egosi na anyị hụrụ ya n’anya, nakwa na anyị bụ nke ya. Ofufe anyị na-efe Jehova bụ ihe anyị kwesịrị ime, ọ bụghị iji mezuo iwu. Jehova kwere anyị nkwa na ọ ga-agọzi anyị n’ọdịnihu n’ihi na anyị na-erubere ya isi.​—⁠Diut. 10:​12, 13.

13. Gịnị ka anyị na-amụta n’ọhụụ nke isii Zekaraya hụrụ?

13 Ọhụụ nke isii Zekaraya hụrụ enyerela anyị aka ịghọta na ndị hụrụ Jehova n’anya ekwesịghị izu ohi ma ọ bụ ṅụọ iyi ụgha. Anyị aghọtakwala na n’agbanyeghị na ndị Izrel mejọrọ ihe ugboro ugboro, Jehova ahapụghị ha. Ọ ghọtara nsogbu ha na ha na-alụ ebe ọ bụ na ndị iro gbara ha gburugburu. Jehova na-emezu nkwa ya, ọ chọkwara ka anyị na-emezu nkwa ndị anyị kwere ya. Ọ ga-enyekwara anyị aka imezu ha. Otu ụzọ o si na-enyere anyị aka bụ na ọ gwara anyị na n’oge na-adịghị anya, ọ ga-ewepụ ihe ọjọọ niile n’ụwa. Ọhụụ ọzọ Zekaraya hụrụ mesiri anyị obi ike na Jehova ga-eme ihe a o kwuru.

JEHOVA GA-EWEPỤ NDỊ ỌJỌỌ

14, 15. (a) Gịnị ka Zekaraya hụrụ n’ọhụụ nke asaa? (Lee ihe nke abụọ e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Gịnị ka nwaanyị ahụ nọ n’ime nkata a kpọrọ efa nọchiri anya ya? Gịnị mere e ji kwuchisie nkata ahụ ike?

14 Mgbe Zekaraya hụchara akwụkwọ mpịakọta ahụ na-efe efe, otu mmụọ ozi gwara ya ka o “lelie anya.” Gịnị ka Zekaraya hụrụ n’ọhụụ nke asaa? Ọ hụrụ nkata a kpọrọ “efa,” ebe o fe na-aga. (Gụọ Zekaraya 5:​5-8.) Nkata a na-ebuchaghị ibu nwere ‘okwuchi dị okirikiri nke e ji opu mee.’ Mgbe e wepụrụ okwuchi ya, Zekaraya hụrụ “nwaanyị nke nọ ọdụ n’ime” ya. Mmụọ ozi ahụ gwara ya na nwaanyị ahụ nọ ọdụ n’ime nkata a bụ “Ajọ Omume.” Chegodị ụdị ụjọ tụrụ Zekaraya mgbe ọ hụrụ ka nwaanyị a na-agbalị ka ọ pụta na nkata ahụ. Ma, mmụọ ozi ahụ mere ihe ngwa ngwa nubaghachi nwaanyị ahụ na nkata ahụ ma jiri okwuchi dị arọ kwuchisie ya ike. Gịnị ka ihe a pụtara?

15 Ọhụụ a na-akụziri anyị na Jehova agaghị ekwe ka ndị na-eme ihe ọjọọ nọgide n’ọgbakọ. Ọ ga-ahụ na a chụpụrụ ha ozugbo. (1 Kọr. 5:13) Otú mmụọ ozi ahụ si gosi na Jehova ga-eme ya bụ iji okwuchi dị arọ kwuchie nkata ahụ ozugbo.

Jehova na-agba mbọ na-ahụ na nzukọ ya na-adị ọcha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16 ruo nke 18)

16. (a) Olee ihe ọzọ Zekaraya hụrụ mere nkata efa ahụ? (Lee ihe nke atọ e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Olee ebe ụmụ nwaanyị abụọ ahụ nwere nku bugara nkata ahụ?

16 Ihe ọzọ Zekaraya hụrụ n’ọhụụ ya bụ ụmụ nwaanyị abụọ nku ha siri ike ka nku ụgbala. (Gụọ Zekaraya 5:​9-11.) Ụmụ nwaanyị abụọ a dị ezigbo iche na nwaanyị ajọ omume ahụ nọ n’ime nkata ahụ. Ha ji nku ha siri ike  buru nkata ahụ “Ajọ Omume” nọ n’ime ya felie elu. Olee ebe ha bu ya na-aga? Ha bugara ya “n’ala Shaịna” ma ọ bụ Babịlọn. Ma, gịnị mere ha ji buga ya Babịlọn?

17, 18. (a) Gịnị mere Shaịna ji bụrụ ebe ‘kwesịrị ekwesị’ ibuga “Ajọ Omume”? (b) Gịnị ka anyị kpebisiri ike ime gbasara ihe ọjọọ?

17 Ndị Izrel dịrị ndụ n’oge Zekaraya ghọtara na “Ajọ Omume” ahụ e bugara Shaịna kwesịrị ekwesị. Zekaraya na ndị Juu ibe ya ma na arụrụala juru na Babịlọn n’oge ahụ. Ebe ọ bụ na ha toro n’obodo a ndị mmadụ na-eme omume rụrụ arụ ma na-ekpere arụsi, ha na-agbasi mbọ ike na-agbara omume ọjọọ ndị ahụ ọsọ. N’ihi ya, ọhụụ a mere ka ha mata na Jehova ga na-eme ka ọgbakọ ya dịrị ọcha.

18 Ọhụụ ahụ chetakwaara ndị Juu ka ha ghara itinye aka n’ihe ọjọọ. Ndị na-efe Jehova ekwesịghị ikwe ka ihe ọjọọ bata n’ọgbakọ ma ọ bụ kwe ka ọ nọgide. Taa, Jehova akpọbatala anyị n’ọgbakọ ya dị ọcha. Ọ na-echebe anyị ma na-egosi anyị na ọ hụrụ anyị n’anya. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike na-eme ka nzukọ Jehova dịrị ọcha. E kwesịghị ikwe ka ndị na-eme ihe ọjọọ nọgide ná nzukọ Jehova.

NDỊ DỊ ỌCHA NA-ERUBERE JEHOVA ISI

19. Olee uru ọhụụ ndị ahụ Zekaraya hụrụ baara anyị?

19 Jehova ji ọhụụ nke isii na nke asaa Zekaraya hụrụ dọsie ndị na-eme ihe ọjọọ aka ná ntị ike. Ọ gaghị ekwe ka ihe ọjọọ dịgide. Ebe anyị bụ ndị na-efe ya, anyị kwesịrị ịkpọ ihe ọjọọ asị. Ọhụụ ndị a na-emesikwu anyị obi ike na ọ bụrụ na anyị agbalịa na-eme ihe dị Nna anyị nke eluigwe mma, ọ gaghị abụ anyị ọnụ, kama, ọ ga-echebe anyị ma gọzie anyị. Mbọ niile anyị na-agba ịnọgide na-adị ọcha n’ụwa a ihe ọjọọ juru agaghị efu ọhịa. Ka obi sie gị ike na Jehova ga-enyere gị aka ịnọgide na-adị ọcha. Ma, gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na nzukọ Jehova ga-adịgide n’ụwa a ihe ọjọọ juru? Ka oké mkpagbu na-eru nso, olee otú anyị si mara na Jehova ga-echebe nzukọ ya? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu na-eso nke a.