Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Ọktoba 2017

Ụgbọ Ịnyịnya na Okpueze Ga-echebe Gị

Ụgbọ Ịnyịnya na Okpueze Ga-echebe Gị

“Ọ ga-eme, ma ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu.”​—⁠ZEK. 6:⁠15.

ABỤ: 17, 136

1, 2. Olee otú ihe si dịrị ndị Juu na Jeruselem mgbe Zekaraya hụchara ọhụụ nke asaa?

KA Zekaraya hụchara ọhụụ nke asaa, o nwere ọtụtụ ihe ọ ga na-eche. Ọ ga-abụ na nkwa Jehova kwere na ọ ga-ata ndị ọjọọ ahụhụ gbara Zekaraya ume. Ma, o nwebeghị ihe gbanwerenụ. Ihe ọjọọ ka na-arị ibe ya elu. A rụchabeghịkwa ụlọ nsọ Jehova ha na-arụ na Jeruselem. Gịnị mere ndị Juu egbughị oge hapụ ọrụ ahụ Jehova nyere ha rụọ? Ihe mere ha ji laghachi Jeruselem, ọ̀ bụ ka ha chụwa ihe ga-abara naanị onwe ha uru?

2 Zekaraya ma na ndị Juu laghachiri Jeruselem na-efe Jehova. Ha bụ ndị “mmụọ nke ezi Chineke kpaliri,” ịhapụ ụlọ ha na ihe ndị ha na-eme na Babịlọn. (Ezra 1:​2, 3, 5) Ha hapụrụ obodo a ha ma nke ọma ma kwaga Jeruselem ọtụtụ n’ime ha na-ahụtụbeghị. Ịrụgharị ụlọ nsọ ahụ dị ha ezigbo mkpa. Ọ bụ ya mere ha ji dị njikere ịga ihe dị ka otu puku kilomita na narị isii n’okporo ụzọ na-adịghị larịị nke ihe ọjọọ nwere ike ime ha na ya.

3, 4. Olee nsogbu ndị Juu laghachiri Jeruselem nwere?

3 Chegodị otú njem ahụ ga-adị. Ka ha na-eme njem ahụ, o doro anya na ha ji ọtụtụ awa na-eche otú ebe ọhụrụ  ahụ ha na-aga ga-adị. Ha anụla na o nwere mgbe Jeruselem mara ezigbo mma. Ndị katarala ahụ́ n’ime ha hụrụ ụlọ nsọ ahụ mara ezigbo mma. (Ezra 3:12) Ọ bụrụ na gị na ha so mee njem ahụ, olee otú obi gaara adị gị mgbe mbụ ị hụrụ Jeruselem bụ́ ebe ị na-aga ibi? Obi ọ̀ gaara ajọ gị njọ ma ị hụ otú ahịhịa si tojuo n’ụlọ ndị dakasịrị adakasị? Ị̀ gaara eji nnukwu mgbidi Babịlọn siri ezigbo ike tụnyere mgbidi Jeruselem dakasịrị adakasị, bụ́ nke nweburu ọnụ ụzọ ámá nakwa ụlọ nche, ma ugbu a, ha niile ghezi oghe? Ma, obi ka siri ndị Juu ike. Ha ahụla otú Jehova si chebe ha n’ogologo njem ahụ ha mere. Ihe mbụ ha mere mgbe ha ruru bụ iwu ebe ịchụàjà n’ebe ụlọ nsọ mbụ ahụ dịbu ma malite ịchụrụ Jehova àjà kwa ụbọchị. (Ezra 3:​1, 2) Obi tọgburu ha atọgbu, ha adị njikere ịrụ ọrụ. O yiri ka o nweghị ihe ga-eme ka ha daa mbà.

4 E wezụga iwughachi ụlọ nsọ ahụ, ndị Izrel ga-ewughachikwa ụlọ ha na obodo ha dị iche iche. Ha kwesịrị ịkọ ugbo ka ha nwee ike ịna-akpa afọ ezinụlọ ha. (Ezra 2:70) Ọrụ ha ga-arụ dị ka ọ karịrị akarị. Ọ dịghị anya ha malitere ọrụ, ndị iro ha amalite inye ha nsogbu ma chọọ ka ha kwụsị ọrụ. Ha nyegidere ha nsogbu ahụ ruo afọ iri na ise. Ndị Juu ejirizie nwayọọ nwayọọ daa mbà. (Ezra 4:​1-4) Nsogbu ọzọ ha nwere bụ n’afọ 522 Tupu Oge Ndị Kraịst, mgbe eze Peshia nyere iwu ka ha kwụsị ụlọ ọ bụla ha na-arụ na Jeruselem. O yiri ka a gaghị ewughachi obodo ahụ ọzọ.​—⁠Ezra 4:​21-24.

5. Olee otú Jehova si nyere ndị ya aka mgbe ahụ ha kwụsịrị ọrụ?

5 Jehova ma ihe ndị ya chọrọ. O mere ka Zekaraya hụ ọhụụ ikpeazụ iji mesie ndị Juu obi ike na ọ hụrụ ha n’anya, nakwa na obi dị ya ụtọ n’ihe niile ha merela. O kwekwara ha nkwa na ọ ga-echebe ha ma ha maliteghachi ọrụ o nyere ha. Jehova kwuru gbasara ụlọ nsọ ahụ ha nọ na-ewughachi, sị: “Ọ ga-eme, ma ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu.”​—⁠Zek. 6:⁠15.

NDỊ MMỤỌ OZI DỊ IKE

6. (a) Olee otú ọhụụ nke asatọ Zekaraya hụrụ si malite? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Gịnị mere ụcha ịnyịnya ndị ahụ ji dị iche iche?

6 Ọhụụ nke asatọ Zekaraya hụrụ, ya bụ, ọhụụ ikpeazụ nwere ike ịkacha ọhụụ ndị ọzọ ọ hụrụ eme ka okwukwe ndị Juu sikwuo ike. (Gụọ Zekaraya 6:​1-3.) Were ya na ị na-ahụ ọhụụ ahụ Zekaraya hụrụ. E nwere ụgbọ ịnyịnya anọ “si n’agbata ugwu abụọ na-abịa.” Ugwu ndị ahụ bụkwa ugwu ọla kọpa. Ịnyịnya ndị ahụ dọkpụ ụgbọ ịnyịnya anọ. Ụcha ịnyịnya ndị ahụ dị iche iche. Ọ bụ ụcha ha ka e ji amata onye na-agba nke ọ na-agba. Zekaraya jụrụ, sị: “Gịnị bụ ihe ndị a?” (Zek. 6:⁠4) Anyịnwa kwesịkwara ịma n’ihi na ọhụụ ndị ahụ gbasara anyị.

Jehova ka na-eji ndị mmụọ ozi na-echebe ndị ya ma na-eme ka okwukwe ha sikwuo ike

7, 8. (a) Gịnị ka ugwu abụọ ahụ nọchiri anya ha? (b) Gịnị mere ugwu ndị ahụ ji bụrụ ọla kọpa?

7 Na Baịbụl, ugwu nwere ike ịnọchi anya alaeze, ma ọ bụ ọchịchị. Ugwu ndị ahụ Zekaraya hụrụ n’ọhụụ ya yiri ugwu abụọ a kọwara n’amụma Daniel. Otu n’ime ugwu ndị ahụ Zekaraya hụrụ nọchiri anya ọchịchị Chineke nke ga-achị eluigwe na ụwa. Ọchịchị a ga-adị ebighị ebi. Ugwu nke ọzọ nọchiri anya Alaeze Mezaya nke Jizọs ga-abụ Eze ya. (Dan. 2:​35, 45) Kemgbe afọ 1914, ugwu abụọ a jikọrọ aka na-arụ ọrụ pụrụ iche iji mezuo uche Chineke n’ụwa.

8 Gịnị mere ugwu ndị ahụ ji bụrụ ọla kọpa? Ọla kọpa bara ezigbo uru ma na-egbuke egbuke ka ọlaedo. Jehova gwara  ndị Izrel ka ha jiri ọla kọpa rụọ ụlọikwuu, jirikwa ya rụọ ụlọ nsọ dị na Jeruselem. (Ọpụ. 27:​1-3; 1 Eze 7:​13-16) Ebe ọ bụ na ugwu abụọ ahụ bụ ọla kọpa, ọ na-echetara anyị na ọchịchị Chineke nke ga-achị eluigwe na ụwa nakwa Alaeze Mezaya magburu nnọọ onwe ha, ga-agọzi ụmụ mmadụ, meekwa ka obi ruo ha ala.

9. Ole ndị na-agba ụgbọ ịnyịnya ndị ahụ? Oleekwa ọrụ e nyere ha?

9 Gịnị ka ụgbọ ịnyịnya ahụ na ndị na-agba ha nọchiri anya ha? Ndị na-agba ha bụ ndị mmụọ ozi. Ha nwere ike ịbụ ìgwè ndị mmụọ ozi dị iche iche. (Gụọ Zekaraya 6:​5-8.) Ha si “n’ihu Onyenwe elu ụwa dum,” na-aga ịrụ ọrụ pụrụ iche o nyere ha. Olee ọrụ o nyere ha? E zigara ụgbọ ịnyịnya ndị ahụ na ndị na-agba ha n’ebe ụfọdụ. Ihe mere e ji ziga ha n’ebe ndị ahụ bụ ka ha chebe ndị Chineke, nke ka nke, ndị Chineke si “n’ebe ugwu,” ya bụ, Babịlọn. Jehova ji ọhụụ a mee ka ndị ya mata na o nweghị mgbe ọzọ ha ga-agba ohu na Babịlọn. Nke a mere ka obi sie ndị Juu na-ewughachi ụlọ nsọ ahụ n’oge Zekaraya, ike. Ha ekwesịghị ịna-echegbu onwe ha na ndị iro ha ga-akwụsị ha ọrụ.

10. Olee otú amụma Zekaraya gbasara ụgbọ ịnyịnya ndị ahụ na ndị na-agba ha si emesi anyị obi ike taa?

10 Jehova nke ụsụụ niile nke ndị agha ka na-eji ndị mmụọ ozi na-echebe ndị ya ma na-eme ka ha dị ike otú ahụ o mere n’oge Zekaraya. (Mal. 3:6; Hib. 1:​7, 14) Kemgbe afọ 1919 a napụtara ndị Jehova n’aka Babịlọn ukwuu ahụ, ndị iro ha agbasiela mbọ ike ime ka ha kwụsị ọrụ ha na-arụrụ Chineke. Mbọ niile ahụ ha gbara kụrụ afọ n’ala. (Mkpu. 18:⁠4) Ebe ọ bụ na ndị mmụọ ozi na-echebe nzukọ Jehova, anyị ekwesịghị ịtụwa ụjọ na okpukpe ụgha ga-emesi anyị ike otú ha meburu. (Ọma 34:⁠7) Kama, obi kwesịrị isi anyị ike na ndị ohu Chineke n’ụwa niile ga-anọgide na-arụ ọrụ Chineke nyere ha. Amụma Zekaraya enyerela anyị aka ịghọta na ugwu abụọ ahụ ga na-echebe anyị.

11. Gịnị mere anyị ekwesịghị ịtụ ụjọ mgbe ndị iro anyị ga-achọ ịlụso anyị ọgụ?

11 N’oge na-adịghị anya, ndị ọchịchị nọ n’ụwa Setan a ga-agbakọ aka ọnụ ka ha lụso ndị Chineke ọgụ. (Ezik. 38:​2, 10-12; Dan. 11:​40, 44, 45; Mkpu. 19:19) Amụma Ezikiel kwuru na ha kpuchiri ala ka ígwé ojii. Ha gba ịnyịnya ma jiri ezigbo iwe na-abịa ka ha lụso ndị Chineke ọgụ. (Ezik. 38:​15, 16) * Ànyị kwesịrị itụ ha ụjọ? Mbanụ. Anyị nwere ndị agha Jehova na-akwado anyị. N’oge oké mkpagbu, ndị mmụọ ozi Jehova ga-echebe ndị Chineke ma bibie ndị na-emegide ọchịchị ya. (2 Tesa. 1:​7, 8) Ụbọchị ahụ ga-adị egwu. Ma, ònye ga-edu ndị mmụọ ozi Chineke n’agha a?

JEHOVA EKPUWE ONYE NCHỤÀJÀ OKPU KA Ọ BỤRỤ EZE

12, 13. (a) Oleezi ihe a gwara Zekaraya ka o mee? (b) Olee otú anyị si mata na onye ahụ a kpọrọ Ome nọchiri anya Jizọs Kraịst?

12 Ọ bụ naanị Zekaraya hụrụ ọhụụ asatọ ndị ahụ. O mere ihe ndị mmadụ ga-ahụ, nakwa ihe ga-agba ndị na-ewughachi ụlọ nsọ Chineke ume. (Gụọ  Zekaraya 6:​9-12.) A gwara Zekaraya ka ọ gaa nara Heldaị na Tobaịja na Jedeya ọlaọcha na ọlaedo. Mmadụ atọ a ka si Babịlọn lọta. Jehova gwara Zekaraya ka o were ọlaọcha na ọlaedo ndị ahụ mee “nnukwu okpueze.” (Zek. 6:11) À gwara Zekaraya ka o kpuwe Gọvanọ Zerubabel okpueze, bụ́ onye si n’agbụrụ Juda nakwa n’ezinụlọ Devid? Mba. Jehova gwara Zekaraya ka o kpuwe Jọshụa, bụ́ Nnukwu Onye Nchụàjà okpueze. Ọ ga-abụ na ihe a juru ndị nọ ebe ahụ anya.

13 Okpueze a e kpuwere Jọshụa, bụ́ Nnukwu Onye Nchụàjà, ò mere ka ọ bụrụ eze? Mba. Jọshụa esighị n’ezinụlọ Eze Devid, n’ihi ya, o kwesịghị ịbụ eze. Okpueze e kpuwere Jọshụa nọchiri anya okpueze a ga-ekpuwe onye ga-abụ eze mgbe ebighị ebi na onye nchụàjà. A kpọrọ onye nchụàjà ahụ ga-abụ eze Ome. Baịbụl kwuru na Ome a bụ Jizọs Kraịst.​—⁠Aịza. 11:1; Mat. 2:23. *

14. Ebe Jizọs bụ Eze na Nnukwu Onye Nchụàjà, olee ọrụ ọ ga-arụ?

14 Jizọs bụ ma Eze ma Nnukwu Onye Nchụàjà. Ọ bụ ya na-edu ndị mmụọ ozi Jehova. Ọ na-arụsikwa ọrụ ike iji hụ na ọ na-echebe ndị Jehova n’agbanyeghị tigbuo zọgbuo juru n’ụwa a. (Jere. 23:​5, 6) N’oge na-adịghị anya, Kraịst ga-emeri ụwa a iji kwado ọchịchị Chineke na ichebe ndị na-efe Jehova. (Mkpu. 17:​12-14; 19:​11, 14, 15) Ma, tupu ya ebibie ụwa a, Jizọs ma ọ bụ Ome nwere nnukwu ọrụ ọ ga-arụ.

Ọ GA-ARỤ ỤLỌ NSỌ

15, 16. (a) Olee otú e si mee ka ndị Chineke na-adị ọcha taa? Ònye mere ya? (b) Olee otú ụwa ga-adị mgbe Kraịst chịchara Ọchịchị Otu Puku Afọ ya?

15 Ọ bụghị naanị na e mere Jizọs Eze na Nnukwu Onye Nchụàjà, a gwakwara ya na ọ “ga-ewu ụlọ nsọ Jehova.” (Gụọ Zekaraya 6:13.) N’afọ 1919, Jizọs malitere ọrụ a e nyere ya. Otú o si mee ya bụ na o mere ka a ghara inwe ihe jikọrọ ndị Chineke na Babịlọn Ukwu ahụ, ya bụ, okpukpe ụgha. Ọ họpụtakwara “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” ka ọ na-eduzi ọrụ ndị Chineke na-arụ n’ụlọ nsọ ihe atụ ya n’ụwa. (Mat. 24:45) Jizọs na-emekwa ka ndị Chineke na-adị ọcha, na-enyekwara ha aka ka ha na-efe Chineke otú ọ chọrọ.​—⁠Mal. 3:​1-3.

16 Jizọs na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ya na ha ga-eso bụrụ eze na ndị nchụàjà ga-achị otu puku afọ. N’oge ahụ, ha ga-eme ka ndị na-erubere Jehova isi, zuo okè. Mgbe ha rụchara ọrụ ha, ọ bụ naanị ndị na-efe Jehova otú ọ chọrọ ga-adị ndụ n’ụwa. N’ikpeazụ, mmadụ niile ga na-efe naanị Jehova.

SORO NDỊ CHINEKE N’ỌRỤ HA NA-ARỤ

17. Olee ihe ọzọ Jehova gwara ndị Juu nke mere ka obi sie ha ike? Olee otú ihe ahụ ọ gwara ha si baara ha uru?

17 Ma, olee uru ozi Zekaraya baara ndị Juu n’oge ahụ? Jehova ekwela ha nkwa na ọ ga-enyere ha aka ma chebe ha ka ha nwee ike iwucha ụlọ nsọ ahụ. Ihe a ọ gwara ha mere ka obi sie ha ike. Ma, ha ka nwere ike ịna-eche otú mmadụ ole na ole ga-esi rụchaa nnukwu ọrụ ahụ. N’ihi ya, Zekaraya gwara ha ihe ga-eme ka ha kwụsị ịtụ ụjọ na inwe obi abụọ. Chineke kwuru na ọtụtụ ndị ọzọ “ga-abịa soro wuo ụlọ nsọ Jehova,” tinyekwara Heldaị na Tobaịja na Jedeya bịara inyere ha aka. (Gụọ Zekaraya 6:15.) O doro ndị Juu anya na Jehova na-enyere ha aka n’ọrụ ahụ ha na-arụ. Ha ji  obi ike maliteghachi iwu ụlọ nsọ ahụ, n’agbanyeghị na eze Peshia nyere iwu ka ha kwụsị ọrụ. Iwu a e nyere ha dị ka ugwu nọchiiri ha ụzọ, ma ọ dịghị anya Jehova ewepụ ya. N’ikpeazụ, e wuchara ụlọ nsọ ahụ n’afọ 515 Tupu Oge Ndị Kraịst. (Ezra 6:22; Zek. 4:​6, 7) Ma, ihe ndị ahụ Jehova kwuru kọwara ihe na-eme n’oge a nke karịrị ụlọ nsọ ahụ ndị Juu wuru.

Jehova agaghị echefu otú anyị si hụ ya n’anya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18 na nke 19)

18. Olee otú Zekaraya 6:15 si na-emezu n’oge anyị a?

18 Taa, ọtụtụ nde mmadụ na-abata n’ọgbakọ. Ha ji obi ha niile na-enye Jehova ihe “dị oké ọnụ ahịa” ha nwere. Ụfọdụ n’ime ha bụ oge ha, ike ha, na ihe ndị ha nwere iji kwado ụlọ nsọ ihe atụ nke Jehova. (Ilu 3:⁠9) Olee otú anyị ga-esi mata na Jehova ji ozi ndị anyị ji obi anyị na-ejere ya kpọrọ ihe? Cheta na ọ bụ Heldaị na Tobaịja na Jedeya wetara ọlaọcha na ọlaedo ndị ahụ Zekaraya ji rụọ okpueze. Okpueze ahụ ga-abụ “ihe ncheta” maka onyinye ha nyere iji kwado ofufe Jehova. (Zek. 6:14) Jehova agaghị echefu ọrụ anyị rụụrụ ya na otú anyị si hụ ya n’anya. (Hib. 6:10) Ọ ga na-echeta ha ruo mgbe ebighị ebi.

19. Olee uru ọhụụ ndị ahụ Zekaraya hụrụ baara anyị?

19 Ihe niile anyị rụrụla ná nzukọ Jehova n’oge ikpeazụ a na-egosi n’eziokwu na Jehova na-agọzi anyị nakwa na Jizọs na-edu anyị. Anyị nọ ná nzukọ Jehova nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. Jehova “ga-eme” ihe o zubere maka nzukọ ya. N’ihi ya, ejila nzukọ Jehova a egwu egwu. ‘Na-ege ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke gị.’ I mee otú ahụ, Eze anyị na Nnukwu Onye Nchụàjà anyị na ndị mmụọ ozi na-agba ụgbọ ịnyịnya ndị ahụ, ga-echebe gị. Na-eme ihe niile i nwere ike ime iji na-akwado ofufe Chineke. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, obi kwesịrị isi gị ike na Jehova nke ụsụụ niile nke ndị agha ga-echebe gị n’oge ole na ole ndị fọrọnụ tupu ya ebibie ụwa ọjọọ a, chebekwa gị ruo mgbe ebighị ebi.

^ para. 11 Ị chọọ ịmatakwu gbasara ọgụ a a ga-alụso ndị Chineke e kwuru okwu ya n’akwụkwọ Ezikiel, gụọ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” n’Ụlọ Nche Mee 15, 2015, peeji nke 29 ruo 30.

^ para. 13 Okwu ahụ bụ́ Nazaret si n’okwu Hibru e si sụgharịa “ome.”