Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Ọktoba 2017

Josef Onye Arimatia Ekpebie Ịbụ Onye Na-eso Ụzọ Jizọs

Josef Onye Arimatia Ekpebie Ịbụ Onye Na-eso Ụzọ Jizọs

JOSEF ONYE ARIMATIA amaghị na ọ ga-akatali obi gakwuru gọvanọ Rom bụ́ Pọntiọs Paịlet. A ma gọvanọ a ama ka ekwe ekwe. Ma ọ bụrụ na a ga-eli Jizọs otú kwesịrị ekwesị, mmadụ ga-aga gwa Paịlet ka o bunye ya ozu Jizọs. Josef mechara gaa hụ Paịlet. Otú Josef si chee na ọ ga-adị abụghị otú ọ dị. Mgbe Paịlet chọpụtara n’aka onyeisi ndị agha na Jizọs anwụọla, o nyere Josef ikike ka o buru ozu Jizọs. N’agbanyeghị na obi ka na-ajọ Josef njọ, o mere ngwa ngwa laghachi n’ebe ahụ e gburu Jizọs.​—⁠Mak 15:​42-45.

  • Ònye bụ Josef onye Arimatia a?

  • Olee ihe jikọrọ ya na Jizọs?

  • Gịnị mere anyị kwesịrị iji nwee mmasị n’akụkọ ya?

 ONYE ÒTÙ SANHEDRIN

Oziọma Mak kpọrọ Josef ‘onye òtù Nzukọ a na-akwanyere ùgwù.’ Òtù Nzukọ a bụ Sanhedrin, ya bụ, ụlọikpe kacha elu nke ndị Juu. Ụlọikpe a bụ o kwuchaa o bie. (Mak 15:​1, 43) Josef bụ otu n’ime ndị ndú ndị obodo ya, ọ bụ ya mere o ji nwee ike ịgakwuru gọvanọ Rom. O doro anya na Josef bụ ọgaranya.​—⁠Mat. 27:⁠57.

Obi ọ̀ na-esi gị ike ịgwa ndị mmadụ na Jizọs bụ Eze anyị?

Ndị òtù Sanhedrin achọghị iji anya ahụ Jizọs. Ha gbara izu ka ha gbuo ya. Ma, a kpọrọ Josef “ezi mmadụ na nwoke ezi omume.” (Luk 23:50) Ọ naghị akpa àgwà ka ọtụtụ ndị òtù Sanhedrin ibe ya. Ọ na-akwụwa aka ya ọtọ, ọ naghị ebi ndụ rụrụ arụ. Ọ na-agbalịkwa irubere iwu Chineke isi. Ọ “nọkwa na-echere alaeze Chineke.” O nwere ike ịbụ Alaeze a mere o ji ghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs. (Mak 15:43; Mat. 27:57) Ọ ga-abụ na ihe mere o ji nwee mmasị n’ihe Jizọs kụziri bụ n’ihi na o ji eziokwu na ikpe ziri ezi kpọrọ ihe.

ONYE NA-ESO ỤZỌ NZUZO

Baịbụl kwuru na Jọn 19:38 na Josef “bụ onye na-eso ụzọ Jizọs, kama ọ bụ na nzuzo.” Gịnị mere o ji na-atụ ụjọ? Ọ bụ n’ihi na ọ ma na ndị Juu kpọrọ Jizọs asị nakwa na ha dị njikere ịchụpụ onye ọ bụla kweere na Jizọs n’ụlọ nzukọ. (Jọn 7:​45-49; 9:22) Ịchụpụ mmadụ n’ụlọ nzukọ pụtara na ndị Juu ga na-akwa onye ahụ emo, na-eme ya ka ọ̀ bụ onye mba ọzọ. N’ihi ya, ụjọ na-atụ Josef ikwu n’ihu ọha na ya kweere na Jizọs. Ikwu na ya bụ onye na-eso ụzọ Jizọs pụtara na ọ gaghị abụzi onye òtù Sanhedrin, a gaghịzi na-akwanyere ya ùgwù.

Ọ bụghị naanị Josef nọ ná nsogbu a. Baịbụl kwuru na Jọn 12:​42, sị: “Ọbụna n’etiti ndị na-achị achị, ọtụtụ ndị nwere okwukwe n’ezie n’ebe ọ nọ, ma n’ihi ndị Farisii, ha adịghị ekwupụta ya, ka e wee ghara ịchụpụ ha n’ụlọ nzukọ.” Onye ọzọ ọ dị otú ahụ ọ dị Josef bụ Nikọdimọs. Ọ bụkwa otu n’ime ndị òtù Sanhedrin.​—⁠Jọn 3:​1-10; 7:​50-52.

Ọ bụ eziokwu na Josef bụ onye na-eso ụzọ Jizọs, ma o kwupụtaghị ya n’ihu ọha. Nke a bụ ezigbo nsogbu n’ihi ihe a Jizọs kwuru. O kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-ekwupụta na mụ na ya dị n’otu n’ihu ụmụ mmadụ, m ga-ekwupụtakwa na mụ na ya dị n’otu n’ihu Nna m nke nọ n’eluigwe; ma onye ọ bụla nke na-agọnahụ m n’ihu mmadụ, m ga-agọnahụkwa ya n’ihu Nna m nke nọ n’eluigwe.” (Mat. 10:​32, 33) Josef agọnahụghị Jizọs. Ma, obi akaghị ya ikwu na ya bụ onye na-eso ụzọ Jizọs. Obi ọ̀ na-esi gị ike ikwu na ị bụ onye na-eso ụzọ Jizọs?

E nwekwara ihe dị mma Josef mere. Baịbụl kwuru na ọ kwadoghị izu ndị Sanhedrin  gbara igbu Jizọs. (Luk 23:51) Ụfọdụ kwuru na o nwere ike ịbụ na ọ nọghị ya mgbe a na-ekpe Jizọs ikpe. Nke ọ bụla ọ bụ, ọ ga-abụ na ikpe arụrụala ahụ e kpere Jizọs wutere Josef. Ma o nweghị ihe ọ ga-emeli.

Ọ KWỤSỊRỊ ỊTỤ ỤJỌ

Tupu e gbuo Jizọs, ọ ga-abụ na Josef akwụsịla ịtụ ụjọ ma kpebie ịkwado ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ihe Mak 15:43 kwuru gosiri na o mere otú ahụ. Ọ sịrị: “O ji obi ike gaa n’ihu Paịlet ma rịọ ka e bunye ya ozu Jizọs.”

Ọ ga-abụ na Josef nọ ebe ahụ mgbe Jizọs nwụrụ. O doro anya na o bu Paịlet ụzọ mata na Jizọs anwụọla. N’ihi ya, mgbe Josef gwara ya ka o bunye ya ozu Jizọs, Paịlet “chọrọ ịma ma [Jizọs] ọ̀ nwụọla.” (Mak 15:44) Ọ bụrụ na Josef hụrụ Jizọs ka ọ na-ahụsi anya n’elu osisi ịta ahụhụ, ò nwere ike imetụ ya n’obi, ya ejiri obi ike kwupụta na ya bụ otu n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs? O nwere ike. Ma, ihe doro anya bụ na Josef kwụsịrị ịtụ ụjọ. Ọ gaghịzi abụ onye na-eso ụzọ nzuzo.

JOSEF ELIE JIZỌS

Iwu ndị Juu kwuru na a ga-eli ndị a kwụwara n’elu osisi tupu anyanwụ adaa. (Diut. 21:​22, 23) Ma, ndị Rom na-ahapụ ozu ndị omekome n’elu osisi ka ha nọrọ ebe ahụ ree ma ọ bụ ha elie ha n’ebe a na-eli ndị nkịtị. Ma, ihe ahụ abụghị ihe Josef bu n’obi ime ozu Jizọs. Josef nwere ili ọhụrụ  o gwuru na nkume. Ili a dị nso n’ebe a kpọgburu Jizọs. O gosiri na ọ dịbeghị anya Josef si n’Arimatia * kwaga na Jeruselem nakwa na ọ chọrọ iji ebe ahụ mere ebe a ga-eli ndị ezinụlọ ya. (Luk 23:53; Jọn 19:41) Ili Jizọs n’ili ahụ a ga-eli Josef ma ọ nwụọ gosiri na ọ bụ ihe ọma ka o mere. O mezukwara amụma ahụ e buru banyere Mezaya na ili ya ga-adị “n’etiti ndị ọgaranya.”​—⁠Aịza. 53:​5, 8, 9.

Ò nwere ihe ndị i ji kpọrọ ihe karịa adịm ná mma gị na Jehova?

Akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn kwuru na mgbe e budara ozu Jizọs n’elu osisi, Josef ji ákwà linin ọma fụchie ya ma lie ya n’ili nke ya. (Mat. 27:​59-61; Mak 15:​46, 47; Luk 23:​53, 55; Jọn 19:​38-40) Naanị onye e kwuru nyeere Josef aka bụ Nikọdimọs, bụ́ onye wetaara ya ihe na-esi ísì ụtọ e ji akwadebe ozu. Ebe ọ bụ na ha abụọ bụ ndị a ma ama, o nwere ike ịbụ na ọ bụghị ha ji aka ha buru ozu Jizọs. Ọ ga-abụkwa na ọ bụ ndị ohu buuru Jizọs gaa lie. Ọ bụrụgodị na ọ bụ ndị ohu buuru Jizọs gaa lie, ihe a Josef na Nikọdimọs mere abụghị obere ihe. Onye ọ bụla metụrụ ozu aka agaghị adị ọcha ruo otu izu. Ihe ọ bụla ha metụrụ aka agaghịkwa adị ọcha. (Ọnụ Ọgụ. 19:11; Hag. 2:13) Ụdị ihe ahụ ga-eme ka ha na ndị ọzọ ghara imekọ ihe n’izu ahụ a ga-eme Ememme Ngabiga. Ha agaghịkwa eso eme ememme ahụ. (Ọnụ Ọgụ. 9:⁠6) Olili Jizọs Josef kwadebere ga-eme ka ndị òtù ya na-akparị ya. Ma, ọ dị njikere ili Jizọs otú kwesịrị ekwesị ma kwupụta n’ihu ọha na ya bụ onye na-eso ụzọ Jizọs n’agbanyeghị ihe ọ bụla a ga-eme ya.

NGWỤCHA AKỤKỌ JOSEF

Mgbe e lichara Jizọs, e nweghị ihe ọzọ Baịbụl kwuru banyere Josef onye Arimatia. Ma ajụjụ bụzi: Olee ihe mere ya? Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị amaghị. Ma, ihe ndị anyị kwurula n’isiokwu a banyere Josef gosiri na o nwere ike ịbụ na o kwuru n’ihu ọha na ya bụ onye na-eso ụzọ Jizọs. A sị ka e kwuwe, n’oge ndị ahụ ihe tara akpụ, okwukwe ya nọ na-esikwu ike. Nke a gosiri na o kwuru na ya bụ onye na-eso ụzọ Jizọs.

Akụkọ Josef onye Arimatia kwesịrị ime ka anyị niile jụọ onwe anyị ma ànyị ji ọkwá, ọrụ, ihe onwunwe, ịhụ ezinụlọ n’anya, ma ọ bụ ihe ndị anyị họọrọ ime kpọrọ ihe karịa adịm ná mma anyị na Jehova?

^ para. 18 O nwere ike ịbụ na aha e ji mara Arimatia bụ Rema. Ihe a na-akpọ ya ugbu a bụ Rentis ma ọ bụ Rantis. Ọ bụ obodo Samuel onye amụma. Ọ dị ihe dị ka kilomita iri atọ na ise ma e si n’ebe ugwu Jeruselem gawa ya.​—1 Sam. 1:19, 20.