Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Ọktoba 2017

“Ka Anyị Hụ Ụmụnna Anyị n’Anya . . . n’Omume Nakwa n’Eziokwu”

“Ka Anyị Hụ Ụmụnna Anyị n’Anya . . . n’Omume Nakwa n’Eziokwu”

“Ka anyị hụ ụmụnna anyị n’anya, ọ bụghị n’ọnụ ma ọ bụ n’ire, kama n’omume nakwa n’eziokwu.”​—⁠1 JỌN 3:⁠18.

ABỤ: 72, 124

1. Olee ụdị ịhụnanya kachanụ? Oleekwa otú ị ga-esi kọwaa ya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

IHỤNANYA si n’aka Jehova. (1 Jọn 4:⁠7) Ihe e ji mara ịhụnanya kachanụ bụ ime ihe ziri ezi. Na Baịbụl, ihe a kpọrọ ụdị ịhụnanya a n’asụsụ Grik bụ a·gaʹpe. Ọ bụ eziokwu na mmadụ inwe mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ so n’ihe e ji mara ụdị ịhụnanya a. Ma ihe kachanụ e ji mara ya bụ mmadụ iji obi ya niile meere ndị ọzọ ihe ga-abara ha uru. Ọ bụ ịhụnanya na-eme ka anyị na-emere ndị ọzọ ihe ọma. Ụdị ịhụnanya a na-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ, na-emekwa ka ndụ anyị nwee isi.

2, 3. Olee otú Jehova sirila gosi na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya?

2 Jehova mere ihe gosiri na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya tupudị ya ekee Adam na Iv. O kere ụwa ka ndị mmadụ biri na ya ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụghị naanị ebe mmadụ ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi, o kere ihe niile ha ga-eji na-ekpori ndụ na ya. Jehova mere ihe ndị a maka anyịnwa, ọ bụghị maka yanwa. Otú ọzọ o si gosi na ọ hụrụ anyị n’anya bụ na ọ gọziri ụmụ mmadụ ma  mee ka ha nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi na Paradaịs ahụ o doziiri ha.

3 Mgbe Adam na Iv nupụụrụ Jehova isi, o kwuru ihe gosiri na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya nke ukwuu. Ọ haziri ka Ọkpara ya jiri ndụ ya chụọ àjà iji gbapụta ụmụ Adam na Iv ga-amụ. Obi sikwara ya ike na ụfọdụ n’ime ha ga-ahụ ya n’anya. (Jen. 3:15; 1 Jọn 4:10) Ozugbo Jehova kwere nkwa na Ọkpara ya ga-abịa gbapụta ụmụ Adam na Iv, o weere ya na ọ gbapụtala ha. Mgbe ihe dị ka puku afọ anọ gachara, Jehova nyere ụmụ mmadụ Ọkpara ọ mụrụ naanị ya ka o jiri ndụ ya chụọ àjà. (Jọn 3:16) Obi dị anyị ezigbo ụtọ maka otú a Jehova si hụ anyị n’anya.

4. Olee ihe ndị gosiri na anyị ga-ahụli ndị ọzọ n’anya n’agbanyeghị na anyị ezughị okè?

4 Chineke kere anyị n’onyinyo ya. N’ihi ya, anyị nwere ike ịhụli ụmụ mmadụ n’anya otú ọ hụrụ ha. Ezughị okè na-eme ka ọ na-esiri anyị ike ịhụ ndị mmadụ n’anya. Ma, anyị ga-ahụli ndị mmadụ n’anya. Ebel gosiri na ọ hụrụ Chineke n’anya mgbe o ji ihe kacha mma o nwere chụọrọ ya àjà. (Jen. 4:​3, 4) Noa gosikwara na ọ hụrụ mmadụ ibe ya n’anya. Otú o si gosi ya bụ na o ji ọtụtụ afọ zie ndị mmadụ ozi Chineke ziri ya zie ha n’agbanyeghị na ha egeghị ya ntị. (2 Pita 2:⁠5) Ebreham hụrụ Chineke n’anya karịa ihe ọ bụla n’ihi na o ji obi ya niile kweta iji nwa ya Aịzik chụọrọ Chineke àjà. (Jems 2:21) N’agbanyeghị nsogbu ndị na-abịara anyị, anyị kwesịkwara ịhụ ndị ọzọ n’anya otú ahụ ndị fere Chineke n’oge ochie mere.

GỊNỊ BỤ EZIGBO ỊHỤNANYA?

5. Olee otú anyị ga-esi egosi ezigbo ịhụnanya?

5 Baịbụl kwuru na otú e si egosi ezigbo ịhụnanya ‘abụghị n’ọnụ ma ọ bụ n’ire, kama n’omume nakwa n’eziokwu.’ (1 Jọn 3:18) Nke a ọ̀ pụtara na anyị agaghị agwa mmadụ ihe ndị gosiri na anyị hụrụ ya n’anya? Mbanụ. (1 Tesa. 4:18) Ihe ọ pụtara abụghị naanị ikwu na anyị hụrụ mmadụ n’anya, kama, anyị kwesịrị inyere onye ahụ aka mgbe ọ dị mkpa. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nwanna enweghị ihe e ji enyere ndụ aka, anyị ekwesịghị ịgwa ya naanị okwu ọma. (Jems 2:​15, 16) Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova na ndị mmadụ nọ na-eme ka anyị na-ejechi ozi ọma anya, ọ bụghị naanị ịna-ekpe ekpere ka Jehova “ziga ndị ọrụ n’owuwe ihe ubi ya.” ​—⁠Mat. 9:⁠38.

6, 7. (a) Gịnị ka ‘ịhụnanya nke na-abụghị nke ihu abụọ’ pụtara? (b) Ole ndị ụfọdụ gosiri ịhụnanya nke na-abụghị nke ezigbo ya?

Jọn onyeozi kwuru na anyị kwesịrị ịhụ ndị mmadụ n’anya “n’omume nakwa n’eziokwu.” N’ihi ya, ịhụnanya anyị ekwesịghị “ịbụ nke ihu abụọ.” (Rom 12:9; 2 Kọr. 6:⁠6) Mgbe ụfọdụ, mmadụ nwere ike na-eme ka ọ̀ hụrụ mmadụ n’anya, ma ịhụnanya ahụ ọ̀ bụ nke ezigbo ya? Olee ihe o bu n’obi? Ma, è nwere ihe dị ka ịhụnanya nke ihu abụọ? Mbanụ. Nke a abụghị ịhụnanya ma otu ma otu n’ihi na ọ baghị uru.

7 Ka anyị tụlee ndị ụfọdụ gosiri ịhụnanya nke na-abụghị nke ezigbo ya. N’ogige Iden, Setan gwara Iv okwu ka à ga-asị na ọ chọrọ ka ihe dịrị ya ná mma. Ma, ihe o mere gosiri na ọ bụ onye ihu abụọ nke na-achọ ihe ga-abara naanị onwe ya uru. (Jen. 3:​4, 5) N’oge Devid dịrị ndụ, Ahitofel mere ihe gosiri na ọ bụghị ezigbo enyi Devid. Ọ gbara Devid mgba okpuru ka o nweta ihe ga-abara naanị onwe ya uru. (2 Sam. 15:31) N’oge anyị a, ndị si n’ezi ofufe dapụ na ndị ọzọ na-akpata nkewa n’ọgbakọ na-ejikwa “ire ụtọ na okwu ịja mma” eme ka hà hụrụ anyị n’anya. Ma, ihe ha na-eme bụ ịchọ ihe ga-abara naanị onwe ha uru.​—⁠Rom 16:​17, 18.

8. Olee ajụjụ anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?

8 Ịhụnanya nke na-abụghị nke ezigbo  ya adịghị mma n’ihi na a na-eji ya eduhie ndị ọzọ. Mmadụ nwere ike megharịa mmadụ anya, ma o nweghị ike imegharị Jehova. Jizọs kwuru na a ga-ata ndị na-eme ka ndị ihu abụọ “oké ahụhụ.” (Mat. 24:51) Ebe anyị bụ ndị ohu Jehova, anyị ekwesịghị ime ka ndị ihu abụọ. Ma, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị, ‘Ịhụnanya m, ọ̀ bụ nke ezigbo ya, ka m̀ na-achọ ihe ga-abara naanị onwe m uru?’ Ka anyị tụlee ụzọ itoolu anyị ga-esi gosi na ịhụnanya anyị ‘abụghị nke ihu abụọ.’

OTÚ ANYỊ GA-ESI “HỤ ỤMỤNNA ANYỊ N’ANYA . . . N’OMUME NAKWA N’EZIOKWU”

9. Gịnị ka ezigbo ịhụnanya ga-eme ka anyị mee?

9 Jiri obi ụtọ na-ejere Jehova ozi ọ bụrụgodị na o nweghị onye na-ahụ ihe ị na-eme. Anyị mewere ụmụnna anyị ihe ọma iji gosi na anyị hụrụ ha n’anya, anyị kwesịrị ime ya “na nzuzo,” ma o kwe omume. (Gụọ Matiu 6:​1-4.) Ananayas na Safaịra emeghị otú ahụ mgbe ha na-enye onyinye. Ha chọrọ ka ndị ọzọ hụ ihe ha nyere ma ghaa ụgha n’onyinye ha nyere. N’ihi ya, a tara ha ahụhụ maka ihu abụọ ha. (Ọrụ 5:​1-10) Ma, ọ bụrụ na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya n’eziokwu, obi ga na-atọ anyị ụtọ ịna-emere ha ihe ọma n’emeghị ka ndị ọzọ mata. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịmụta ihe n’aka ndị na-enyere Òtù Na-achị Isi aka akwadebe ihe ndị a na-akụziri anyị. Ha anaghị achọ ime ka ndị mmadụ mata ha ma ọ bụ mata ihe ndị ha so rụọ.

10. Olee otú anyị ga-esi na-asọpụrụ ndị ọzọ?

10 Na-asọpụrụ ndị ọzọ. (Gụọ Ndị Rom 12:10.) Jizọs sara ụkwụ ndị na-eso ụzọ ya ma si otú ahụ kwanyere ha ùgwù. (Jọn 13:​3-5, 12-15) Anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike na-adị umeala n’obi ka Jizọs ma na-ejere ndị ọzọ ozi. Ndịozi Jizọs aghọtachaghị ihe ahụ o mere ruo mgbe ha natara mmụọ nsọ. (Jọn 13:⁠7) Otú anyị ga-esi na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù bụ ma anyị ghara ịna-eche na anyị ka ha mma n’ihi na anyị gụrụ akwụkwọ karịa ha, baa ọgaranya ma ọ bụ nwee ọrụ pụrụ iche anyị na-arụ n’ọgbakọ karịa ha. (Rom 12:⁠3) Kama ịna-enwere ndị a na-eto anyaụfụ, anyị kwesịrị iso ha ṅụrịa ọṅụ ọ bụrụgodị na anyị chere na e kwesịkwara ito anyị.

11. Gịnị mere anyị ga-eji kwesị iji obi anyị niile jaa ndị ọzọ mma?

11 Jiri obi gị niile na-aja ụmụnna gị mma. Anyị hụ ihe ụmụnna anyị mere, anyị kwesịrị ịja ha mma n’ihi na ime otú ahụ ‘dị mma maka iwuli ha elu.’ (Efe. 4:29) Ma, anyị kwesịrị ịhụ na mma anyị jara ha si anyị n’obi. Ọ bụrụ na anyị emeghị otú ahụ, anyị nwere ike towe onye ahụ, isi ebuwe ya, ma ọ bụ ghara inye onye ahụ ndụmọdụ anyị kwesịrị inye ya. (Ilu 29:⁠5) Anyị na-eme ihu abụọ ma anyị jaa mmadụ mma n’ihu ma na-akatọ ya n’azụ. Pọl onyeozi emeghị ụdị ihe a. Otú o si jaa ndị ọzọ mma gosiri na ọ hụrụ ha n’anya n’eziokwu. Dị ka ihe atụ, ọ jara Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt ezigbo mma banyere ebe ndị ha na-eme nke ọma. (1 Kọr. 11:⁠2) Mgbe ha mere ihe a na-ekwesịghị iji jaa ha mma, o medara obi gwa ha ihe mere na ọ jaghị ha mma.​—⁠1 Kọr. 11:​20-22.

Inyere ụmụnna anyị ndị nọ ná mkpa aka bụ otu ụzọ anyị si egosi na anyị hụrụ ha n’anya ma na-emesapụrụ ha aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12)

12. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya n’eziokwu ma a bịa n’ile ọbịa?

12 Na-emesapụ aka. Jehova gwara anyị ka anyị na-emesapụrụ ụmụnna anyị aka. (Gụọ 1 Jọn 3:17.) Anyị kwesịrị ibu ihe ọma n’obi na-eme ya ma ghara ime ya ka anyị nweta ihe n’aka ha. Anyị nwere ike jụọ onwe anyị, sị: ‘Ndị m na-akpọ ka ha bịa n’ụlọ m, ọ̀ bụ naanị ndị mụ na ha dị n’ezigbo mma, ka ọ bụ ndị m weere na ha dị mkpa n’ọgbakọ? M̀ na-akpọ ndị m ma na m ga-erite ihe n’aka ha? Ka m̀ na-akpọ ụmụnna ndị m na-amachaghị ma ọ bụ ndị  m na-enweghị ike irite ihe n’aka ha?’ (Luk 14:​12-14) Ka e were ya na nwanna bara ná nsogbu n’ihi na ọ hazighị ihe ọ chọrọ ime nke ọma ma ọ bụkwanụ na anyị lechara nwanna ọbịa, o keleghị anyị. Ọ bụrụ na nke ọ bụla n’ime ihe ndị a mee, anyị kwesịrị ime ihe Baịbụl kwuru. Ọ sịrị: “Na-elenụ ibe unu ọbịa n’atamughị ntamu.” (1 Pita 4:⁠9) I mee ihe a Baịbụl kwuru, ị ga-enweta obi ụtọ n’ihi na i ji obi gị niile meere ha ya.​—⁠Ọrụ 20:⁠35.

13. (a) Olee mgbe ọ na-akacha esi ike inyere ndị na-adịghị ike aka? (b) Olee ihe ndị anyị ga-eme iji nyere ndị na-adịghị ike aka?

13 Na-enyere ndị na-adịghị ike aka. Baịbụl kwuru, sị: “Na-akwadonụ ndị na-adịghị ike, na-enwenụ ogologo ntachi obi n’ebe mmadụ niile nọ.” (1 Tesa. 5:14) E nwere ike iji ihe a Baịbụl kwuru chọpụta ma ịhụnanya anyị ọ̀ bụ nke ezigbo ya. Ọtụtụ ụmụnna anyị ndị na-adịghị ike n’ọgbakọ na-emecha dị ike n’ọgbakọ. E nwekwara ndị nke anyị kwesịrị ịna-enwere ndidi ma na-akwado. Otú anyị ga-esi nyere ha aka bụ iji Baịbụl na-agba ha ume, ịgwa ha ka anyị na ha rụọ n’ozi ọma, ma ọ bụ ige ha ntị mgbe ha na-agwa anyị okwu. Anyị ekwesịghị iwere nwanna ka onye “dị ike” n’ọgbakọ were nwanna ọzọ ka onye “na-adịghị ike,” n’ihi na anyị niile nwere ebe anyị na-eme nke ọma na ebe anyị na-anaghị eme nke ọma. Pọl onyeozi kwetadịrị na o nwere ebe ọ na-anaghị eme nke ọma. (2 Kọr. 12:​9, 10) N’ihi ya, anyị niile kwesịrị ịna-agbarịta ibe anyị ume.

14. Olee ihe ndị anyị kwesịrị ịna-eme ka anyị na ụmụnna anyị na-adị n’udo?

14 Na-eme udo. Anyị na-eme ihe niile anyị nwere ike ime ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’udo ọ bụrụgodị na anyị chere na a ghọtahiere anyị ma ọ bụ mejọọ anyị. (Gụọ Ndị Rom 12:​17, 18.) Ọ bụrụ na anyị mejọrọ mmadụ, anyị kwesịrị ịrịọ onye ahụ mgbaghara. Ma, o kwesịrị isi anyị n’obi. Dị ka ihe atụ, kama ikwu, sị, “Ewela iwe na o wutere gị,” i nwere ike ikweta na o nwere ebe i mejọrọ onye ahụ, ma gwa onye ahụ sị, “Ewela iwe na ihe a m gwara gị gbawara gị obi.” Di na nwunye kwesịkwara ịna-eme udo. Ha ekwesịghị ịpụta n’ihu ndị mmadụ na-eme ka hà hụrụ ibe ha n’anya, ma ha laa n’ụlọ, ha anaghị atụpụrụ ibe ha ọnụ, ha ana-agwa ibe ha okwu ọjọọ, ma ọ bụ na-alụ ọgụ.

15. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị ji obi anyị niile gbaghara onye mejọrọ anyị?

15 Jiri obi gị niile na-agbaghara ndị ọzọ. Ọ bụrụ na mmadụ emejọọ anyị, anyị kwesịrị ịgbaghara ya ma kwụsị iburu ya iwe n’obi. Anyị kwesịkwara ime ya ọ bụrụgodị na onye ahụ amaghị na o mejọrọ anyị. Otú anyị ga-esi gbaghara ya kpamkpam bụ ‘iji ịhụnanya na-ediri ya ihe, na-agbasi mbọ ike ka anyị nọgide n’ịdị n’otu nke mmụọ nsọ, n’ihe nkekọ nke bụ́ udo.’ (Efe. 4:​2, 3) Ka anyị nwee ike ịna-agbaghara onye ahụ kpamkpam, anyị ekwesịghị ịna-eche ihe ahụ onye ahụ mere anyị ka anyị ghara ‘ịgụkọrọ ya ihe ọjọọ.’ (1 Kọr. 13:​4, 5) Ọ bụrụ na anyị eburu ihe  ahụ n’obi, ọ ga-eme ka anyị na Jehova na ụmụnna anyị ghara ịna-adị ná mma. (Mat. 6:​14, 15) Anyị kwesịrị ịna-ekpere ndị mere anyị ihe ọjọọ ekpere ma si otú ahụ gosi na anyị agbagharala ha kpamkpam.​—⁠Luk 6:​27, 28.

16. Olee otú anyị kwesịrị isi were ọrụ pụrụ iche e nyere anyị n’ọgbakọ?

16 Na-achọ ihe ga-abara ndị ọzọ uru. E nye anyị ọrụ pụrụ iche n’ọgbakọ, anyị kwesịrị iwere ya ka ohere anyị ga-eji gosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ‘ịna-achọ, ọ bụghị uru nke anyị, kama nke onye nke ọzọ.’ (1 Kọr. 10:24) Dị ka ihe atụ, anyị gaa mgbakọ, anyị na-ahụ na ndị atendantị na-ebu ụmụnna ndị ọzọ ụzọ abịa. Kama ha iji ohere ahụ chọrọ oche kacha mma ma ọ bụ chọtara ndị ezinụlọ ha oche kacha mma, ọtụtụ n’ime ha na-anọ ọdụ n’oche ha na-agaghị atụsachara ahụ́ n’ebe ahụ ha na-arụ ọrụ. Ihe a ha na-eme gosiri na ha hụrụ ụmụnna ha n’anya, nakwa na ha anaghị achọ ihe ga-abara naanị onwe ha uru. Olee otú ị ga-esi na-eme ka ha?

17. Olee ihe ezigbo ịhụnanya ga-eme ka mmadụ mee ma o mee mmehie dị oké njọ?

17 Na-ekwupụta mmehie ndị i mere na nzuzo ma kwụsị ha. Ụfọdụ ụmụnna ndị mere mmehie dị oké njọ na-ekpuchi mmehie ha ka ha ghara imechu onwe ha na ndị ọzọ ihu. (Ilu 28:13) Ma, ime otú ahụ gosiri na ha ahụghị ndị ọzọ n’anya n’ihi na o nwere ike ịkpatara onwe ha na ndị ọzọ nsogbu. O nwekwara ike ime ka Jehova wepụ mmụọ nsọ ya n’ọgbakọ, meekwa ka udo ghara ịdị. (Efe. 4:30) Ezigbo ịhụnanya na-eme ka Ndị Kraịst mere mmehie dị oké njọ gaa kọọrọ ndị okenye ka ha nyere ha aka.​—⁠Jems 5:​14, 15.

18. Olee otú inwe ezigbo ịhụnanya dịruru ná mkpa?

18 Ịhụnanya bụ àgwà kachanụ. (1 Kọr. 13:13) Ọ bụ àgwà e ji amata na anyị bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, nakwa na anyị na-eṅomi Jehova, onye ịhụnanya si n’aka ya. (Efe. 5:​1, 2) Pọl kwuru, sị: ‘Ọ bụrụ na enweghị m ịhụnanya, ọ dịghị ihe m bụ.’ (1 Kọr. 13:⁠2) Ka onye ọ bụla n’ime anyị na-ahụ ndị ọzọ n’anya, ọ bụghị naanị “n’ire,” kama “n’omume nakwa n’eziokwu.”