Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Ọgọst 2016

 AKỤKỌ NDỤ

Otú Inye Ihe Si Mee Ka M Nwee Obi Ụtọ

Otú Inye Ihe Si Mee Ka M Nwee Obi Ụtọ

MGBE m dị afọ iri na abụọ, m matara na m nwere ihe bara uru m ga-enyeli ndị ọzọ. N’otu mgbakọ, otu nwanna jụrụ m ma m̀ ga-achọ ikwusa ozi ọma. M sịrị ya ee n’agbanyeghị na ekwusatụbeghị m ozi ọma. Anyị gara ebe anyị ga-ezi ozi ọma, ya enye m akwụkwọ nta ole na ole kwuru banyere Alaeze Chineke. Ọ sịrị m: “Gaa ziwe ndị bí n’akụkụ ebe a, ka m gaa ziwe ndị bí n’akụkụ nke ọzọ.” M chị obi n’aka gawa, sí n’ụlọ ruo n’ụlọ. O juru m anya na m nyechara ndị mmadụ akwụkwọ ahụ niile. O doro anya na ọtụtụ ndị chọrọ inweta ihe m bịara inye ha.

A mụrụ m n’afọ 1923, n’obodo Katam dị́ na Kent, n’Ịngland. Mgbe Agha Ụwa Mbụ gachara, ndị mmadụ tụrụ anya na agha ahụ ga-eme ka ihe ka mma n’ụwa. Ma, mgbe ihe ha tụrụ anya ya na-emezughị, ike ụwa gwụrụ ọtụtụ ndị, ma papa m na mama m. Ike ndị ụkọchukwu Chọọchị Baptist gwụkwara papa m na mama m. Ọ dị ka ihe kacha ndị ụkọchukwu ndị ahụ mkpa ọ̀ bụ ka ọkwá ha na-arị na chọọchị. Mgbe m dị ihe dị́ ka afọ itoolu, mama m malitere ịga n’ebe Ndị Mmụta Baịbụl na-amụ ihe. N’oge ahụ, ọ dịbeghị anya ha malitere ịza Ndịàmà Jehova. N’ebe ahụ, otu nwanna nwaanyị na-eji Baịbụl na akwụkwọ a kpọrọ The Harp of God akụziri mụ na ụmụaka ndị ọzọ ihe. Ihe m na-amụta na-atọgbu m atọgbu.

M MỤTARA IHE N’AKA ỤMỤNNA KATARALA AHỤ́

Mgbe m na-eto, ọ na-amasị m iji Baịbụl akụziri ndị mmadụ ihe ga-eme ka ha nwee olileanya. N’agbanyeghị na naanị m na-agakarị ekwusa ozi ọma ụlọ n’ụlọ, m na-amụta ọtụtụ ihe ma mụ na ndị ọzọ soro gaa. Dị ka ihe atụ, otu ụbọchị mụ na otu nwanna katarala ahụ́ gba ígwè na-aga ebe anyị ga-ezi ndị mmadụ ozi ọma, anyị gbafere otu ụkọchukwu. Mụ asị, “Onye a anyị gbafere bụ ewu.” Nwanna ahụ kwụsịrị ígwè ya, sị m bịa nọrọ ọdụ n’otu osisi e gbuturu egbutu. Ọ sịrị m: “Ònye nyere gị ikike ikpebi onye bụ́ ewu? Ka anyị jiri obi ụtọ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma ma hapụrụ Jehova ikpe.” N’oge ahụ, amụtara m ọtụtụ ihe gbasara otú inye ihe si eme ka mmadụ nwee obi ụtọ.—Mat. 25:31-33; Ọrụ 20:35.

Nwanna ọzọ katarala ahụ́ kụziiri m na ọ bụrụ na anyị chọrọ ka inye ihe na-eme anyị obi ụtọ, anyị kwesịrị ịna-enwe ndidi. N’oge mbụ, nwunye ya anaghị achọ iji anya ahụ Ndịàmà Jehova. O nwere otu ụbọchị nwanna ahụ gwara m ka m bịa rie ihe n’ụlọ ya. Otú iwe si ju nwunye ya obi maka ozi ọma di ya gara kemgbe mere ka ọ malite ịtụ anyị paket tii. Kama ịbara ya mba, nwanna ahụ ji obi ụtọ debeghachi paket ndị ahụ n’ebe ha na-adị. Mgbe ọtụtụ afọ  gara, ndidi o nwere baara ya uru. Nwunye ya mere baptizim, bụrụzie Onyeàmà Jehova.

M chọkwuru ime ka ndị ọzọ nwee olileanya maka ọdịnihu. Mụ na mama m mere baptizim na Dova n’ọnwa Mach afọ 1940. Ndị Briten malitere ịlụso ndị Jamanị agha n’ọnwa Septemba afọ 1939. Adị m afọ iri na isii mgbe ahụ. N’ọnwa Jun afọ 1940, m nọ n’ọnụ ụzọ ụlọ anyị hụ ka e bu ọtụtụ ndị agha chị obi n’aka na gwongworo dị́ iche iche na-agafe. Ha bụ ndị fọrọ ndụ mgbe a lụchara agha n’obodo Dọnkek. Mgbe m lere ha anya n’ihu, ahụghị m ihe gosiri na ha nwere olileanya. Ọ gụsiri m agụụ ike ịgwa ha banyere Alaeze Chineke. N’afọ ahụ ka ndị Jamanị mechara malite ịtụ bọmbụ na Briten. N’abalị ọ bụla, m na-ahụ ụgbọelu ndị Jamanị e ji atụ bọmbụ ka ha na-efefe n’ebe anyị bi. Anyị nụ ka bọmbụ ndị ahụ dara, obi na-awụbakwu anyị n’afọ. Anyị pụọ n’ụtụtụ echi ya, anyị na-ahụ ọtụtụ ụlọ bọmbụ ndị ahụ mebisịrị. Ihe ndị ahụ mere ka obi sie m ike na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-eme ka ihe dị́ mma n’ọdịnihu.

OTÚ M SI MALITE ỊNA-ENYE IHE

N’afọ 1941, m malitere ije ozi oge niile. Ọ na-atọgbu m atọgbu. M na-amụbu ọrụ n’ebe a na-arụ ụgbọ mmiri n’obodo Katam. Ọ bụ ụdị ọrụ ọtụtụ ndị na-achọ achọ n’ihi na uru dị́ na ya karịrị akarị. O teela ndị ohu Jehova matara na Ndị Kraịst ekwesịghị ịdụnyere otu mba úkwù, na-alụso mba ọzọ agha. N’ihe dị́ ka n’afọ 1941, anyị matara na anyị ekwesịghị ịna-arụ ọrụ n’ebe a na-akpụ ngwá agha. (Jọn 18:36) Ebe ọ bụ na ndị ahụ m na-arụrụ ọrụ na-arụ ụgbọ mmiri e ji alụ agha, nke na-agba n’okpuru mmiri, m kpebiri na o ruola mgbe m ga-agba arụkwaghịm, malitezie ozi oge niile. Ebe mbụ m jere ozi bụ na Saịrensesta, bụ́ ọmarịcha obodo dị́ na Kọtswolds.

Mgbe m gbara afọ iri na asatọ, a tụrụ m mkpọrọ ọnwa itoolu maka na ekweghị m aga agha. Ezigbo ụjọ tụrụ m mgbe ha kwachiri ụzọ hapụ naanị m n’ọnụ ụlọ mkpọrọ ahụ. Ma ọ dịghị anya, ndị nche na ndị ọzọ a tụrụ mkpọrọ amalite ịjụ m ihe mere e ji tụọ m mkpọrọ. Ọ tọgburu m atọgbu ịkọwara ha ihe m kweere.

Mgbe a tọhapụrụ m, m sooro Leonard Smith * kwusawa ozi ọma n’obodo ndị dị́ na Kent, bụ́ ebe a mụrụ m. Malite n’afọ 1944, ihe karịrị otu puku ụgbọelu a na-enweghị onye nọ́ na ha dara na Kent. Ihe juru na ha bụ bọmbụ. Ụgbọelu ndị Jamanị na-efefekarị ebe anyị bi gaa tụọ bọmbụ na Lọndọn. Ọ na-abụ, anyị nụ ka njin ụgbọelu nyụrụ ọkụ, anyị amata na ọ gaghị egbu oge ya adaa, bọmbụ ndị dị́ na ya agbawaa. N’oge ahụ, anyị mụụrụ otu ezinụlọ dị́ mmadụ ise Baịbụl. Mgbe ụfọdụ, anyị na-anọ n’okpuru tebụl e ji ígwè rụọ ka ọkọ ghara ịkọ anyị ma ụlọ ha daa. Ha niile mechara mee baptizim.

 IKWUSA OZI ỌMA NÁ MBA ỌZỌ

Ebe anyị nọ na-akpọsa mgbakọ mgbe m bidoro ịsụ ụzọ n’Ayaland

Mgbe agha ahụ biri, m sụrụ ụzọ afọ abụọ n’ebe ndịda Ayaland. Anyị amaghị na otú e si eme ihe n’Ayaland abụghị otú e si eme ya n’Ịngland. Anyị gawara n’ụlọ ndị mmadụ na-agwa ha na anyị bụ ndị ozi ala ọzọ nakwa na anyị na-achọ ụlọ ebe anyị ga-ebi. Anyị nọkwa na-enye ndị mmadụ magazin n’okporo ámá. Ọtụtụ ndị chere na anyị dị iberiibe ịna-eme otú ahụ n’ụdị obodo ahụ Chọọchị Katọlik riri ndị mmadụ isi. Mgbe otu nwoke gwara anyị na ya ga-emesi anyị ike, m gwara onye uwe ojii, ya asị na ọ bụ anyị kpara nkụ ahụhụ. Anyị aghọtaghị na ọ bụ ndị ụkọchukwu na-ekwu nke na-eme. Ha mere ka a chụọ ndị mmadụ n’ọrụ maka na ha natara anyị akwụkwọ. Ha chụpụkwara anyị n’ebe anyị bi.

N’oge na-adịghị anya, anyị chọpụtara na anyị gaa ebe ọhụrụ, ọ kacha mma ịgba ígwè gaa ebe dị́ ezigbo anya, na-ezi ozi ọma naanị n’ebe ụkọchukwu ha na-amaghị ndị anyị bụ. E mechaa, anyị eziwezie ndị bí anyị nso ozi ọma. N’obodo Kilkeni, e nwere otu nwa okorobịa anyị nọ na-amụrụ ihe ugboro atọ n’izu n’agbanyeghị na e nwere ìgwè mmadụ iwe ji kwuru na ha ga-emesi anyị ike. Otú ịkụzi eziokwu Baịbụl si na-atọ m ụtọ mere ka m kpebie idejupụta akwụkwọ maka ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilied, ka m nwee ike ịbụ onye ozi ala ọzọ.

Anyị ji ụgbọ mmiri a kpọrọ Sibia mere ụlọ malite n’afọ 1948 ruo n’afọ 1953

Mgbe anyị gụchara akwụkwọ ọnwa ise na Niu Yọk, e zigara anyị anọ bụ́ ndị gụrụ akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied n’obere agwaetiti ndị dị́ n’Oké Osimiri Karibian. N’ọnwa Nọvemba afọ 1948, anyị banyere n’otu ụgbọ mmiri dị́ ogologo a kpọrọ Sibia, sí na Niu Yọk Siti gawa ebe ahụ e zigara anyị. Obi dị m ezigbo ụtọ n’ihi na abatụbeghị m ụgbọ mmiri. Aha otu n’ime ụmụnna ndị anyị na ha gụkọrọ akwụkwọ bụ Gust Maki. Ọ bụ aka ochie n’ịkwọ ụgbọ mmiri. Ọ kụziiri anyị ihe ụfọdụ gbasara njem ụgbọ mmiri, dị́ ka otú e si eweli ákwà ụgbọ mmiri na otú e si ewetu ya, otú e si eji kọmpas amata ebe a na-aga, na otú e si akwọ ụgbọ mmiri ma ifufe na-achọ ibughachi ya azụ. Nwanna Gust kwọrọ ụgbọ mmiri anyị ruo ụbọchị iri atọ n’agbanyeghị oké ifufe nyere anyị nsogbu ruo mgbe anyị rutere n’agwetiti ndị a kpọrọ Bahama.

“KỌSAANỤ YA N’AGWAETITI”

Mgbe anyị kwusachara ozi ọma ọnwa ole na ole n’agwaetiti ndị ka obere na Bahama, anyị banyere n’ụgbọ mmiri gawa agwaetiti ndị ọzọ a kpọrọ Liwọd na Windwọd. Agwaetiti ndị ahụ dị n’ihe dị́ ka narị kilomita asatọ n’agbata Agwaetiti Vejin, nke dị́ nso na Pueto Riko, na Trinidad. Anyị kwusara ozi ọma afọ ise n’agwaetiti ndị dịpụrụ adịpụ a na-enweghị Ndịàmà Jehova na ha. Mgbe ụfọdụ, anyị na-anọcha ọtụtụ izu n’enwetaghị akwụkwọ ozi, n’enweghịkwanụ nke anyị zipụrụ. Ma, obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị kwusara okwu Jehova n’agwaetiti ndị ahụ.—Jere. 31:10.

Ebe anyị bụ́ ndị ozi ala ọzọ anọ nọ n’ụgbọ mmiri anyị (sí n’aka ekpe gaa n’aka nri): Ron Parkin, Dick Ryde, Gust Maki, na Stanley Carter

N’ebe ọ bụla ụgbọ mmiri anyị kwụsịrị, ndị bí n’obodo ahụ na-amata na e nwere ndị bịaranụ, ha agbakọọ ka ha mara ndị anyị bụ. Ụfọdụ ahụtụbeghị ụdị ụgbọ mmiri ahụ anyị ji bịa, ma ya fọkwa ịhụ onye ọcha. Ndị bí n’agwaetiti ndị ahụ na-anabata ndị ọbịa. Ha ji okpukpe kpọrọ ihe, marakwa Baịbụl nke ọma. Ọtụtụ mgbe, ha na-enye anyị azụ̀ ndụ, ube bekee, na ahụekere. N’agbanyeghị na ụgbọ mmiri anyị ebughị ibu, anyị na-ehi ụra, na-esi nri, na-asakwa ákwà na ya.

Anyị na-akwọrọ ụgbọ mmiri ahụ gaa n’akụkụ mmiri, zigide ozi ọma ruo ná mgbede. Anyị na-agwa ha na a ga-ekwu okwu sí na Baịbụl. Chi jie, anyị na-akụ mgbịrịgba dị́ n’ụgbọ mmiri anyị. Obi na-adị anyị ụtọ ịhụ ka ndị mmadụ na-abịa ka ha gere okwu ahụ.  Ọkụ ndị ha ji abịa n’abalị na-adịcha ka kpakpando ndị sí n’akụkụ ugwu ndị dị́ n’ebe ahụ na-agbadata. Mgbe ụfọdụ, otu narị mmadụ na-abịa. Ha na-anọgide ruo n’ime abalị, na-ajụ ọtụtụ ajụjụ. Ịbụ abụ na-atọgbu ha atọgbu. N’ihi ya, anyị na-eji ígwè taịpraịta edere ha ụfọdụ abụ anyị. Ka anyị anọ na-agbalị ịbụ abụ ndị ahụ, ha na-eso na-abụ, olu ha ana-adakọ, na-atọkwa ụtọ. Oge ahụ na-atọ m ụtọ ma m cheta ya.

Ọ na-abụ, anyị mụchaara mmadụ Baịbụl, ụfọdụ ndị anyị mụụrụ ihe ejiri ụkwụ soro anyị gaa n’ebe anyị ga-amụrụ ezinụlọ ọzọ ihe, ka ha nọrọkwa mgbe a ga-amụrụ ndị ahụ ihe. N’agbanyeghị na anyị na-ahapụ ha ma anyị nọchaa izu ole na ole, anyị na-agwa ndị kacha nwee mmasị ka ha mụwara ndị ọzọ ihe ruo mgbe ọzọ anyị ga-abịa. Obi na-adị anyị ụtọ ịhụ ka ụfọdụ n’ime ha ji ọrụ ahụ anyị nyere ha kpọrọ ezigbo ihe.

Taa, ọtụtụ ndị na-esizi n’obodo ndị ọzọ aga elegharị anya n’agwaetiti ndị ahụ. Ma n’oge ahụ, o nwedịghị onye ma ebe ndị ahụ. Naanị ihe a na-ahụ na ha bụ osimiri na-acha anụnụ anụnụ, ájá ndị juru n’akụkụ osimiri nakwa nkwụ dị́ iche iche. N’abalị, anyị na-esi n’otu agwaetiti gaa n’ọzọ. Azụ̀ ndị a na-akpọ dọfịn na-amịgharị n’akụkụ ụgbọ mmiri anyị. Naanị ihe mmadụ ga na-anụ bụ mkpọtụ ụgbọ mmiri anyị ka a kwọ ya na-aga. I lee anya n’elu mmiri, ìhè ọnwa na-eme ka o yie ka à rụrụ okporo ụzọ sí n’osimiri ruo na mbara igwe.

Mgbe anyị kwusachara ozi ọma afọ ise n’agwaetiti ndị ahụ, anyị kwọ ụgbọ mmiri anyị gaa Pueto Riko ka anyị jiri ya gbanweta ụgbọ mmiri nwere njin. Mgbe anyị ruru ebe ahụ, m hụrụ otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Maxine Boyd, hụkpọọ anya. Mma ọ mara ekweghị apụ m apụ n’obi. Ọ bụ onye ozi ala ọzọ. O ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma kemgbe ọ dị obere. O mechara bụrụ onye ozi ala ọzọ na Dọminikan Ripọblik ruo mgbe ndị Katọlik nọ́ n’obodo ahụ mere ka ndị ọchịchị gbaara ya ụgbọ nwa mkpi n’afọ 1950. Ebe m na-akwọ ụgbọ mmiri, e kwere ka m nọọ na Pueto Riko naanị otu ọnwa. Ọ pụtara na m ga-akwọrọkwa ụgbọ mmiri gawa agwaetiti ndị ọzọ. Afọ ole na ole ga-aga tupu mụ abịa ebe ahụ ọzọ. N’ihi ya, m gwara onwe m, sị, ‘Ronald, ọ bụrụ na ị chọrọ ịlụ nwa agbọghọ a, i kwesịghị imewe anya ụra.’ Mgbe izu atọ gara, m gwara ya na m chọrọ ịlụ ya. Mgbe izu isii gara, anyị lụrụ. E zigara mụ na Maxine na Pueto Riko ka anyị ka bụrụkwa ndị ozi ala ọzọ. N’ihi ya, o nweghị mgbe m banyere n’ụgbọ mmiri ọhụrụ ahụ.

N’afọ 1956, m ghọrọ onye nlekọta sekit, anyị eletawa ọgbakọ dị́ iche iche. Ọtụtụ ụmụnna nọ́ ebe ahụ dara ogbenye. Ma, ileta ha na-atọ anyị ụtọ. Dị ka ihe atụ, n’otu obodo a na-akpọ Potala Pastilo, e nwere ezinụlọ abụọ bụ́ Ndịàmà Jehova. Ha mụrụ ọtụtụ ụmụ. M na-adị afụrụ ha opi. M jụrụ otu n’ime ụmụ ha ndị nwaanyị aha ya bụ Hilda ma ọ̀ ga-achọ iso anyị gaa ozi ọma. Ya asị m: “Achọrọ m. Ma, m gaghị agali maka na enweghị m akpụkpọ ụkwụ.” Anyị zụtaara ya akpụkpọ ụkwụ, ya esoro anyị gawa ozi ọma. Mgbe ọtụtụ afọ gachara, mụ na Maxine gara Betel dị́ na Bruklin n’afọ 1972. Otu nwanna nwaanyị bịakwutere anyị. Ọ ka gụchara akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied, chọwazie ịgawa n’Ekwedọ e zigara ya. Ọ sịrị anyị: “Ọ̀ kwa unu amataghịzi m? Ọ bụ m bụ nwata nwaanyị ahụ na-enwebughị akpụkpọ ụkwụ, onye Pastilo.” Ọ bụ Hilda. Obi ụtọ anyị nwere mere ka anyị bewe ákwá.

N’afọ 1960, a gwara anyị ka anyị gaa jewe ozi n’alaka ụlọ ọrụ dị́ na Pueto Riko, nke dị́ n’otu obere ụlọ elu na Santọse, n’obodo San Juan. Ná mmalite, ọ bụ naanị mụ na Nwanna Lennart Johnson na-arụ ọtụtụ n’ime ọrụ a na-arụ ebe ahụ. Ya na nwunye ya bụ Ndịàmà Jehova mbụ e nwere na Dọminikan Ripọblik. Ha bịara Pueto Riko n’afọ 1957. Maxine mechara hụwa maka ọda magazin ndị mmadụ tụrụ. Ọ na-akarị otu puku n’izu ọ bụla. Ọrụ ahụ tọrọ ya ụtọ n’ihi na ọ na-echeta ndị niile na-esi na magazin ndị ahụ amụta banyere Jehova.

Ozi Betel na-atọ m ụtọ n’ihi na ọ na-eme ka m jiri ike m na-ejere Jehova ozi. Ma, ọ naghị adị mfe mgbe niile. Dị ka ihe atụ, ná mgbakọ mba niile mbụ e mere na Pueto Riko n’afọ 1967, ọrụ e nyere m buru m aka. Nwanna Nathan Knorr bịara Pueto Riko. Ọ bụ ya na-elekọta ọrụ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ. O chere na mụ ahazighị otú a ga-esi bute ndị ozi ala ọzọ bịara Pueto Riko n’agbanyeghị na m haziri ya. Mgbe e mechara, ọ baara m mba, kwuo na ihe m mere were  ya iwe nakwa na m kwesịrị ịna-ahazi ihe nke ọma. Achọghị m ịrụwa ya ụka. Ma, m ma na ihe o mere m adịghị mma, iwe eweekwa m obere oge. Ma, n’oge ọzọ mụ na Maxine hụrụ Nwanna Knorr, ọ gwara anyị ka anyị bịa n’ụlọ ya, ya esiere anyị nri.

Anyị si Pueto Riko gaa leta ndị ezinụlọ m ọtụtụ ugboro n’Ịngland. Mgbe mụ na mama m batara n’ọgbakọ, papa m abataghị. Ma, ọ na-abụ, ụmụnna sí Betel bịa ikwu okwu, mama m akpọta ha ka ha nọrọ n’ụlọ anyị. Papa m hụrụ otú ụmụnna ndị ahụ si dị́ umeala n’obi. Ha anaghị eme ka ndị ụkọchukwu, ndị ihe ha gbụrụ ya ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ. E mere ya baptizim n’afọ 1962, ya abụrụzie Onyeàmà Jehova.

Foto mụ na Maxine sere na Pueto Riko obere oge anyị lụchara nakwa nke anyị sere n’afọ 2003, mgbe anyị chetara afọ iri ise anyị gbara akwụkwọ

Nwunye ọma m bụ́ Maxine nwụrụ n’afọ 2011. M na-atụsi anya ike ịhụ ya ma a kpọlite ya n’ọnwụ. Obi na-abụ m sọ aṅụrị ma m cheta ya. N’afọ iri ise na asatọ mụ na ya biri, anyị hụrụ ka ndị Jehova nọ́ na Pueto Riko hikwuru nne, sí n’ihe dị́ ka narị isii na iri ise ruo puku iri abụọ na isii. N’afọ 2013, e mechiri alaka ụlọ ọrụ dị́ na Pueto Riko, ndị nọ́ na ya agafee na nke dị́ n’Amerịka. A gwaziri m ka m gaa jewe ozi na Wọlkil, dị́ na Niu Yọk. Afọ iri isii ahụ m biri n’agwaetiti ahụ mere ka ọ dịzie m ka m̀ bụ onye Pueto Riko. Ọ bụ eziokwu na obi dị m ụtọ n’ebe ahụ m bi, ma oge eruola ka m gaa ebe ọzọ.

“CHINEKE HỤRỤ ONYE NA-EJI OBI ỤTỌ ENYE IHE N’ANYA”

Ijere Chineke ozi na Betel ka na-atọ m ụtọ. Akarịala m afọ iri itoolu ugbu a. Ọrụ m bụ ịna-agba ndị nọ́ na Betel ume. Kemgbe m bịara Wọlkil, ụmụnna m gbarala ume akarịala narị isii. Ụfọdụ ndị na-abịa ka mụ na ha kpaa ihe gbasara nsogbu hanwa ma ọ bụ ezinụlọ ha na-enwe. Ndị ọzọ na-asị m dụọ ha ọdụ ka ha mata otú ha ga-esi na-eme nke ọma n’ozi Betel. E nwekwara ndị ka lụrụ ọhụrụ na-abịa ka m nye ha ndụmọdụ gbasara alụmdi na nwunye. E zipụla ụfọdụ ka ha gaa bụrụ ndị ọsụ ụzọ. M na-ege ndị ọ bụla na-agwa m okwu ntị. Mgbe ọ bụla ọ dabara adaba, m na-agwakarị ha, sị: “‘Chineke hụrụ onye na-eji obi ụtọ enye ihe n’anya.’ N’ihi ya, jiri obi ụtọ na-arụ ọrụ gị. Ọ bụ Jehova ka ị na-arụrụ ya.”—2 Kọr. 9:7.

Ị chọọ ịna-enwe obi ụtọ na Betel ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ, i kwesịrị ịna-echeta ihe mere ozi ị na-eje ji dị́ mkpa. Ihe niile anyị na-arụ na Betel bụ ọrụ Jehova. Ọrụ a na-enyere “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” aka iwepụta ihe a na-akụziri ụmụnna n’ụwa niile. (Mat. 24:45) Anyị nwere ike ịna-eto Jehova n’agbanyeghị ebe anyị nọ na-efe ya. Ka anyị jiri obi ụtọ na-eme ihe ọ bụla Chineke gwara anyị mee n’ihi na ọ “hụrụ onye na-eji obi ụtọ enye ihe n’anya.”

^ para. 13 A kọrọ akụkọ ndụ Nwanna Leonard Smith n’Ụlọ Nche Eprel 15, 2012.