Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Ọgọst 2016

Otú e si malite alụmdi na nwunye na ihe mere e ji malite ya

Otú e si malite alụmdi na nwunye na ihe mere e ji malite ya

“Jehova bụ́ Chineke wee sị: ‘Ọ dịghị mma ka mmadụ ahụ nọgide naanị ya. M gaje imere ya onye inyeaka, ka ọ bụrụ onye ga-eme ka o zuo ezu.’”—JEN. 2:18.

ABỤ: 36, 11

1, 2. (a) Olee otú alụmdi na nwunye si malite? (b) Gịnị ka nwoke mbụ na nwaanyị mbụ kwesịrị ịghọta banyere alụmdi na nwunye? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

ALỤMDI NA NWUNYE abụghị ihe ọjọọ. Ịmata otú o si malite na ihe mere e ji malite ya ga-enyere anyị aka ịma otú anyị kwesịrị isi na-ele ya anya, ya abaakwara anyị uru. Mgbe Chineke kechara mmadụ mbụ bụ́ Adam, o mere ka ụmụ anụmanụ na-abịakwute ya ka ọ gụọ ha aha. “Ma mmadụ ahụ enweghị onye inyeaka nke ga-eme ka o zuo ezu.” Ọ bụ ya mere Chineke ji mee ka ezigbo ụra buru Adam, ya ewepụta otu ọgịrịga ya, were ya kpụọ nwaanyị, kpọrọ ya kpọtara Adam. (Gụọ Jenesis 2:20-24.) N’ihi ya, ọ bụ Chineke malitere alụmdi na nwunye.

2 Jizọs kwughachiri ihe Jehova kwuru, nke bụ́: “Nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ́.” (Mat. 19:4, 5) Otú ahụ Chineke  ji ọgịrịga Adam kee Iv kwesịrị ime ka ha abụọ ghọta na ha bụ otu. Jehova achọghị ka a na-agba alụkwaghịm ma ọ bụ na-alụ karịa otu di ma ọ bụ nwunye.

OTÚ ALỤMDI NA NWUNYE SI EMEZU IHE JEHOVA BU N’OBI

3. Olee otu n’ime ihe dị́ mkpa mere Chineke ji malite alụmdi na nwunye?

3 Obi dị Adam ụtọ mgbe ọ hụrụ nwunye ọma ya, bụ́ onye o mechara kpọọ Iv. Ebe ọ bụ na Iv ‘ga-eme ka Adam zuo ezu,’ ọ ga-abụrụ ya “onye inyeaka.” Ha abụọ ga na-eme ihe ha kwesịrị ime ka obi nwee ike ịna-adị ha ụtọ kwa ụbọchị. (Jen. 2:18) Otu n’ime ihe dị́ mkpa mere Chineke ji malite alụmdi na nwunye bụ ka ha mụjuo ụwa. (Jen. 1:28) N’agbanyeghị na ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị hụrụ nne ha na nna ha n’anya, ha ga-ahapụ ha gaa lụọ di ma ọ bụ nwunye, malitezie ezinụlọ nke ha. Ndị mmadụ ga-amụju ụwa, mee ka ọ bụrụ paradaịs.

4. Gịnị mere alụmdi na nwunye mbụ Chineke malitere?

4 Adam na Iv nupụụrụ Jehova isi, sí otú ahụ mee ka nsogbu dịzie n’alụmdi na nwunye ha. “Agwọ mbụ ahụ,” bụ́ Ekwensu, ghọgburu Iv, mee ka o kweta na ọ ga-amata ihe ọ na-amabughị ma o rie mkpụrụ sí ‘n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ.’ Setan kwuru na o rie mkpụrụ osisi ahụ, ọ ga-enyere ya aka ịna-ekpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Iv akwanyeghịrị di ya bụ́ onyeisi ezinụlọ ùgwù. O riri mkpụrụ osisi ahụ n’ebughị ụzọ jụọ ya. Kama irubere Chineke isi, Adam naara Iv mkpụrụ osisi ahụ rie.—Mkpu. 12:9; Jen. 2:9, 16, 17; 3:1-6.

5. Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’ihe Adam na Iv zara Jehova?

5 Mgbe Chineke jụrụ Adam ihe merenụ, Adam boro ya nwunye ya. Ọ sịrị: “Nwaanyị ahụ i nyere m ka mụ na ya biri, ọ bụ ya nyere m mkpụrụ si n’osisi ahụ, m wee rie.” Iv kwuru na ọ bụ agwọ duhiere ya. (Jen. 3:12, 13) Ihe ahụ ha kwuru enweghị isi na ọdụ. Isi ha nupụụrụ Jehova mere ka ọ maa ha ikpe. Anyị kwesịrị ịmụta ihe na ya. Ọ bụrụ na di na nwunye chọrọ ịna-ebi n’udo, ha kwesịrị ịna-erubere Jehova isi. Ha mejọọ, ha ekwesịghị ibo ya onye ọzọ.

6. Olee otú ị ga-esi kọwaa Jenesis 3:15?

6 N’agbanyeghị ihe Setan mere n’ogige Iden, amụma mbụ Jehova buru na Baịbụl mere ka ụmụ mmadụ nwee olileanya. (Gụọ Jenesis 3:15.) ‘Mkpụrụ nwaanyị ahụ’ ga-egwepịa Ekwensu. Jehova si otú ahụ gosi ụmụ mmadụ na ya na ndị mmụọ ozi ya kwesịrị ntụkwasị obi dị ná mma. Ndị mmụọ ozi ndị ahụ yiri nwunye ya. Chineke ga-ezite otu n’ime ha ka ọ bịa ‘gwepịa’ Ekwensu, meekwa ka ụmụ mmadụ nwee olileanya ahụ Adam na Iv tụfuru, nke bụ́ ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa otú ahụ Jehova bu n’obi ná mmalite.—Jọn 3:16.

7. (a) Gịnị merela alụmdi na nwunye kemgbe Adam na Iv nupụchara isi? (b) Gịnị ka Baịbụl gwara di na nwunye ka ha na-eme?

7 Isi ahụ Adam na Iv nupụrụ kpara ma alụmdi na nwunye ha ma nke ndị ọzọ niile aka ọjọọ. Dị ka ihe atụ, Iv na ụmụ ya ndị nwaanyị niile ga-ahụsi anya ma ha dị́ ime nakwa ma ha mụwa nwa. Agụụ di ha ga na-agụ ha. Ma ụmụ nwoke ga na-achị ha, mgbe ụfọdụ, na-echi ha ọnụ n’ala otú ahụ ọtụtụ ndị na-eme nwunye ha taa. (Jen. 3:16) Baịbụl kwuru na di kwesịrị ịbụ onyeisi ezinụlọ hụrụ nwunye ya na ụmụ ya n’anya. Ndị bụ́ nwunye kwesịkwara ịna-erubere di ha isi. (Efe. 5:33) Ọ bụrụ na di na nwunye enwee otu obi, ha agaghị na-esekarị okwu.

 ALỤMDI NA NWUNYE MALITE N’OGE ADAM RUO N’OGE NOA

8. Olee otú ndị mmadụ si lụọ di na nwunye malite n’oge Adam ruo n’oge Iju Mmiri?

8 Tupu Adam na Iv anwụọ n’ihi mmehie na ezughị okè, ha mụtara ụmụ, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị. (Jen. 5:4) Ọkpara ha bụ́ Ken lụrụ nwanne ya nwaanyị. Lemek, sí n’agbụrụ Ken, bụ onye mbụ Baịbụl kwuru na ọ lụrụ nwaanyị abụọ. (Jen. 4:17, 19) Malite n’oge Adam ruo n’oge Noa, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole fere Jehova. Ụfọdụ n’ime ha bụ Ebel, Inọk, na Noa na ezinụlọ ya. N’oge Noa, Baịbụl kwuru na “ụmụ ndị ikom nke ezi Chineke malitere ịhụ ụmụ ndị inyom nke mmadụ, na ha mara mma; ha wee na-alụrụ ndị inyom, bụ́ ndị niile ha họọrọ.” Ma, Chineke ekeghị ndị mmụọ ozi ka ha lụọ ụmụ mmadụ. Ndị mmụọ ozi ahụ na ụmụ nwaanyị ndị ahụ mụtara ụmụ gbara ajọ dimkpa a kpọrọ ndị Nefilim. N’oge ahụ, ‘ihe ọjọọ nke mmadụ dị ukwuu n’ụwa, ihe niile obi ya na-eche mgbe niile bụkwa naanị ihe ọjọọ.’—Jen. 6:1-5.

9. Gịnị ka Jehova mere ndị ọjọọ n’oge Noa? Gịnịkwa ka anyị kwesịrị ịmụta n’ihe mere mgbe ahụ?

9 Jehova ji Iju Mmiri bibie ndị ọjọọ n’oge Noa. N’oge ahụ, ihe ka ndị mmadụ mkpa bụ ime ihe ndị dịịrị ha n’ụbọchị, ma ịlụ di na nwunye ma ihe ndị ọzọ. Ọ bụ ihe mere na ha egeghị ntị mgbe “Noa, onye na-ekwusa ezi omume,” na-agwa ha na Chineke ga-ebibi ụwa. (2 Pita 2:5) Jizọs ji ihe mere mgbe ahụ tụnyere ihe ga-eme n’oge anyị a. (Gụọ Matiu 24:37-39.) Taa, ọtụtụ ndị achọghị iji ntị anụ ozi ọma Alaeze Chineke a na-ekwusa n’ụwa niile ka ọ bụrụ àmà nye mba niile tupu Chineke ebibie ụwa a. Ihe anyị kwesịrị ịmụta n’ihe ahụ mere n’oge Noa bụ na anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ndị dị́ ka ịlụ di na nwunye na ịzụ ụmụ mee ka anyị chefuo na ụbọchị Jehova adịla ezigbo nso.

ALỤMDI NA NWUNYE MALITE N’OGE IJU MMIRI RUO N’OGE JIZỌS

10. (a) Olee omume rụrụ arụ ọtụtụ ndị mere n’ọtụtụ ebe? (b) Olee otú Ebreham na Sera si kpaa àgwà ọma n’alụmdi na nwunye ha?

10 Noa na ụmụ ya atọ lụrụ otu nwaanyị otu nwaanyị. Ma, mgbe Iju Mmiri gachara, ọtụtụ ndị malitere ịlụ karịa otu nwaanyị. N’oge ahụ, ndị mmadụ na-aṅụ ịkwa iko ka mmiri n’ọtụtụ ebe. O sodị n’ihe ụfọdụ okpukpe na-eme n’oge ememme ha. Mgbe Ebreham na Sera nwunye ya kwagara na Kenan otú Chineke gwara ha, ụdị omume ọtụtụ ndị obodo ahụ na-eme gosiri na o nweghị ihe ha ji alụmdi na nwunye kpọrọ. Jehova bibiri Sọdọm na Gọmọra n’ihi na ndị bí na ha na-eme omume rụrụ arụ ma ọ bụ na-agbachi ndị na-eme ya nkịtị. Ebreham bụ ezigbo onyeisi ezinụlọ, Sera ana-erubekwara ya isi. (Gụọ 1 Pita 3:3-6.) Ebreham mere ka nwa ya Aịzik lụta onye na-efe Jehova. Otú ahụkwa ka Aịzik meere nwa ya Jekọb, onye ebo iri na abụọ nke Izrel si n’agbụrụ ya.

11. Olee otú Iwu Mozis si chebe ụmụ Izrel?

11 Ka oge na-aga, Jehova mere ka ya na ụmụ Izrel gbaa ndụ. O nyere ha Iwu Mozis. Dị ka ihe atụ, o nyere ha iwu ụfọdụ gbasara ịlụ di na nwunye nakwa ịlụ karịa otu nwaanyị. Ọ gwakwara ndị Izrel ka ha ghara ịlụ ndị na-ekpere arụsị, ka ha ghara ime ka ha kwụsị ife Jehova. (Gụọ Diuterọnọmi 7:3, 4.) Di na nwunye see ezigbo okwu, ndị okenye obodo ha na-enyere ha aka. E nwere iwu ndị kwuru ihe a ga-eme ma di ma  ọ bụ nwunye gbawa n’èzí, na-ekwo ekworo, ma ọ bụ na-enyo ibe ya enyo. Ha nwere ike ịgba alụkwaghịm. Ma e nwere iwu kwuru otú ha ga-esi mee ya. Nwoke nwere ike ịgba nwunye ya alụkwaghịm ma ọ hụ “ihe na-ekwesịghị ekwesị n’ebe nwaanyị ahụ nọ.” (Diut. 24:1) Baịbụl akpọghị aha ‘ihe ahụ na-ekwesịghị ekwesị,’ ma o doro anya na ọ bụghị maka obere ihe.—Lev. 19:18.

AGHỌKWALA DI GỊ MA Ọ BỤ NWUNYE GỊ AGHỤGHỌ

12, 13. (a) Gịnị ka ụfọdụ ụmụ nwoke nọ na-eme nwunye ha n’oge Malakaị? (b) N’oge anyị a, ọ bụrụ na nwanna e mere baptizim ahapụ di ya ma ọ bụ nwunye ya gbakwuru onye ọzọ, olee nsogbu ọ ga-akpatara ya?

12 N’oge Malakaị, ọtụtụ ndị Juu bụ́ di na-aghọ nwunye ha aghụghọ. O nweghị ụdị ihe ha na-anaghị ekwo agba ha alụkwaghịm. Ha na-achụpụ nwunye ha lụrụ n’okorobịa, ikekwe lụọ ndị ka bụ́ ụmụ agbọghọ ma ọ bụdị ụmụ nwaanyị na-ekpere arụsị. N’oge Jizọs, ụmụ nwoke ndị Juu ka jikwa aghụghọ na-agba nwunye ha alụkwaghịm “n’ihi ụdị ihe ọ bụla.” (Mat. 19:3) Jehova Chineke kpọrọ ụdị ịgba alụkwaghịm ahụ asị.—Gụọ Malakaị 2:13-16.

13 Taa, ndị Jehova anaghị eji aghụghọ agba di ha ma ọ bụ nwunye ha alụkwaghịm. Ma, ka e were ya na nwanna e mere baptizim hapụrụ di ya ma ọ bụ nwunye ya gbakwuru onye ọzọ, gbaa di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm, lụwazie onye ahụ ọ gbakwuuru. Ọ bụrụ na o chegharịghị, a ga-achụ ya n’ọgbakọ iji mee ka ọgbakọ dị́ ọcha. (1 Kọr. 5:11-13) Ọ ga-ebu ụzọ ‘mịa mkpụrụ kwesịrị nchegharị’ tupu a nabata ya. (Luk 3:8; 2 Kọr. 2:5-10) E nweghị oge a kapịrị ọnụ ga-agafe tupu a nabata ya. A naghị agbachi onye ọ bụla ghọrọ ụdị aghụghọ ahụ nkịtị, ọ bụ eziokwu na ụdị ihe ahụ anaghị emekarị n’ọgbakọ. O nwere ike iwe otu afọ ma ọ bụ karịa tupu a mata ma onye ahụ ò chegharịala n’eziokwu tupu a nabata ya n’ọgbakọ. A nabatagodị ya, ọ ka ga-aza ajụjụ ‘n’ihu oche ikpe Chineke.’—Rom 14:10-12; gụọ Ụlọ Nche May 15, 1980, peeji nke 31-32.

ALỤMDI NA NWUNYE NDỊ KRAỊST

14. Olee uru Iwu Mozis bara?

14 Chineke ji Iwu Mozis na-eduzi ndị Izrel ruo ihe karịrị otu puku afọ na narị ise. Iwu ahụ nyeere ha aka ịmata ihe Chineke chọrọ ka ha na-eme ma n’ihe gbasara ezinụlọ ma n’ihe ndị ọzọ. O dukwa ha gakwuru Kraịst. (Gal. 3:23, 24) Mgbe Jizọs nwụrụ, Chineke kagburu Iwu Mozis, mezie ka e nwee iwu ọhụrụ. (Hib. 8:6) N’iwu ọhụrụ ahụ, Ndị Kraịst agaghịzi na-eme ihe ụfọdụ a na-emebu n’Iwu Mozis.

15. (a) N’ọgbakọ Ndị Kraịst, olee otú alụmdi na nwunye kwesịrị ịdị? (b) Onye Kraịst chewe ma ọ̀ ga-agba di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm, olee ihe ndị o kwesịrị ichebara echiche?

15 Mgbe ndị Farisii jụrụ Jizọs ajụjụ gbasara ịgba alụkwaghịm, ọ gwara ha na ọ bụ n’ihi na obi kpọrọ ha nkụ ka Mozis ji kwuo na ha nwere ike ịgba nwunye ha alụkwaghịm. Ọ gwakwara ha na ọ dịghị otú ahụ “site ná mmalite.” (Mat. 19:6-8) Ihe ahụ Jizọs zara ha gosiri na otú ahụ Chineke si hazie alụmdi na nwunye n’ogige Iden ka o kwesịrị ịdị n’ọgbakọ Ndị Kraịst. (1 Tim. 3:2, 12) Ebe di na nwunye bụ ‘otu anụ ahụ́,’ ha ekwesịghị ịhapụ ibe ha. Otú ha si hụ Chineke na ibe ha n’anya kwesịrị ime ka ha bụrụ otu. Mmadụ gbaa di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm n’abụghị n’ihi na ọ kwara iko, o kwesịghị ịlụ  onye ọzọ. (Mat. 19:9) N’eziokwu, mmadụ kwaa iko ma chegharịa, di ya ma ọ bụ nwunye ya nwere ike ịgbaghara ya otú ahụ Hosia gbaghaara Goma nwunye ya. Otú ahụkwa ka Jehova gbaghaara ụmụ Izrel mgbe ha fere chi ọzọ ma chegharịa. (Hos. 3:1-5) Ọ bụrụkwa na mmadụ ma na di ya ma ọ bụ nwunye ya kwara iko, ya ekwetakwa ka ha nwewe mmekọahụ, o gosiri na ọ gbagharala ya. Baịbụl akwadoghịzi ka ọ gbaa ya alụkwaghịm.

16. Gịnị ka Jizọs kwuru gbasara ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye?

16 Mgbe Jizọs kwuchara na ọ bụ naanị ịkwa iko nwere ike ime ka mmadụ gbaa di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm, o kwukwara gbasara “ndị nwere onyinye” ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye. Ọ sịrị: “Onye ọ bụla nke ga-emeli ya, ya mee ya.” (Mat. 19:10-12) Ọtụtụ ndị ekpebiela na ha agaghị alụ di ma ọ bụ nwunye ka ha nwee ike ijekwuru Jehova ozi n’enweghi ihe ga-adọpụ ha uche. Anyị kwesịrị ịna-aja ndị dị́ otú ahụ ike.

17. Olee ihe ga-enyere mmadụ aka ikpebi ma ọ̀ ga-alụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ na ọ gaghị alụ?

17 Olee ihe ga-enyere mmadụ aka ikpebi ma ọ̀ ga-alụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ na ọ gaghị alụ? Onye ahụ kwesịrị ibu ụzọ mata ma ọ̀ ga-anọli n’alụghị di ma ọ bụ nwunye. Pọl onyeozi kwuru na ịnọ otú ahụ bara uru. Ma, ọ sịrị: “Ebe ọ bụ na ịkwa iko zuru ebe niile, ka nwoke ọ bụla nwee nwunye nke ya, ka nwaanyị ọ bụla nweekwa di nke ya. Ma ọ bụrụ na ha enweghị njide onwe onye, ka ha lụọ di ma ọ bụ nwunye, n’ihi na ọ ka mma ịlụ di ma ọ bụ nwunye kama ịbụ onye agụụ mmekọahụ na-agụgbu.” Ịlụ di ma ọ bụ nwunye nwere ike inyere mmadụ aka ka agụụ mmekọahụ ghara ime ka ọ na-egbo onwe ya agụụ mmekọahụ ma ọ bụ na-akwa iko. Mmadụ kwesịkwara ịjụ onwe ya ma ò toruola ịlụ di ma ọ bụ nwunye. Ọ bụ ya mere Pọl ji sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla echee na ya na-akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị mgbe ọ bụ onye na-amaghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị, ọ bụrụ na onye ahụ agafewo oge ntoju ntorobịa, ọ bụrụkwa na ọ bụ ihe a ka o kwesịrị ime, ya mee ihe ọ chọrọ; o mehieghị. Ka ha lụọ di ma ọ bụ nwunye.” (1 Kọr. 7:2, 9, 36; 1 Tim. 4:1-3) Ma, e kwesịghị ịgwawa onye ka na-eto eto ka ọ gbara ọsọ gaa lụọ di ma ọ bụ nwunye n’ihi na mmekọahụ agụgbuola ya. O nwere ike ịbụ na o torubeghị ime ihe dị́ n’ịlụ di na nwunye.

18, 19. (a) Olee ụdị onye Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ịlụ? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

18 N’ọgbakọ, nwoke na nwaanyị chọrọ ịlụ kwesịrị ịbụ ndị e mere baptizim, ndị jikwa obi ha niile hụ Jehova n’anya. Ha abụọ kwesịrị ịhụ ibe ha n’anya nke na ha ga-achọ ibi n’oge niile ha dị ndụ. Jehova ga-agọzi ha n’ihi na ha rubeere ya isi lụọ “naanị n’ime Onyenwe anyị.” (1 Kọr. 7:39) Ha lụhaala, o doro anya na ha ga-ekweta na ime ihe Baịbụl kwuru ga-eme ka ha na-ebi n’udo.

19 N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle ihe ndị Baịbụl kwuru ga-enyere di na nwunye aka ịna-ebi n’udo n’agbanyeghị na anyị bi “n’oge ikpeazụ,” mgbe ọtụtụ ndị na-akpa àgwà ọjọọ ndị na-eme ka di na nwunye ghara ịna-ebi n’udo. (2 Tim. 3:1-5) Jehova ejirila Baịbụl gwa anyị ihe anyị ga na-eme ka anyị na di anyị ma ọ bụ nwunye anyị na-ebi n’udo ma na-enwe obi ụtọ ka anyị so ndị ya na-aga n’ụzọ ahụ na-eduga ná ndụ ebighị ebi.—Mat. 7:13, 14.