Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) ỌGỌST 2016

Ị̀ Ghọtara na I Kwesịrị Ịna-emekwu Nke Ọma n’Ọgbakọ?

Ị̀ Ghọtara na I Kwesịrị Ịna-emekwu Nke Ọma n’Ọgbakọ?

“Na-etinyesi mgbalị ike n’ịgụ ihe n’ihu ọha, n’inye ndụmọdụ, n’izi ihe.”—1 TIM. 4:13.

ABỤ: 45, 70

1, 2. (a) Olee otú Aịzaya 60:22 si na-emezu n’oge ikpeazụ a? (b) Olee mkpa e nwere ugbu a ná nzukọ Jehova?

AỊZAYA 60:22 sịrị: “Onye nta ga-aghọ otu puku mmadụ, onye kasị nta ga-aghọkwa mba dị ike.” Amụma a na-emezu n’oge ikpeazụ a. N’eziokwu, n’afọ ije ozi 2015, nde mmadụ asatọ, narị puku abụọ na iri abụọ, otu narị na ise kwusara ozi ọma n’ụwa niile. Ihe ikpeazụ e kwuru n’amụma ahụ kwesịrị ịgbasa onye ọ bụla bụ́ Onye Kraịst, n’ihi na Nna anyị nke eluigwe kwuru, sị: “Mụ onwe m, Jehova, ga-eme ka o mezuo ọsọ ọsọ n’oge ya.” Otú ahụ ndị nọ́ n’ụgbọala na-ama ma ọ gbasiwe ike ka anyị na-ahụ otú e si na-agbapụ ozi ọma ahụ ọsọ. N’ihi ya, gịnị ka onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịna-eme? Ànyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke? Ọtụtụ ụmụnna na-edejupụta akwụkwọ ka ha bụrụ ndị ọsụ ụzọ oge niile ma ọ bụ ndị ọsụ ụzọ inyeaka. Ọ̀ bụ na obi adịghị anyị ụtọ ịhụ ka ọtụtụ ndị na-akwaga n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa ma ọ bụ soro na-arụ ihe ndị ọzọ a na-arụ ná nzukọ Jehova?

2 Anyị na-ahụkwa ihe gosiri na a chọkwuru ndị ọrụ. A na-ehiwe ihe dị́ ka puku ọgbakọ abụọ n’afọ ọ bụla. Ọ bụrụ  na ọ bụ ndị okenye ise ga na-eje ozi n’ọgbakọ nke ọ bụla, ọ pụtara na kwa afọ, puku ndị ohu na-eje ozi iri kwesịrị ịgbalịsi ike ka ha ruo eruo ịbụ ndị okenye. Ọ pụtakwara na ọ ga-adị mkpa ka ọtụtụ puku ụmụnna ruo eruo ịbụ ndị ohu na-eje ozi. Ihe ọzọ bụ na, ma ànyị bụ nwoke ma ànyị bụ nwaanyị, anyị ‘nwere ọtụtụ ihe anyị ga-arụ n’ọrụ Onyenwe anyị.’—1 Kọr. 15:58.

IHE IMEKWU NKE ỌMA N’ỌGBAKỌ PỤTARA

3, 4. Gịnị ka ị ghọtara imekwu nke ọma n’ọgbakọ pụtara?

3 Gụọ 1 Timoti 3:1. N’amaokwu a, okwu Grik e si sụgharịta “na-agbalị” pụtara mmadụ ịmatị aka ka o were ihe, ikekwe ihe dị́ n’ebe aka ya na-erughị. Pọl ji okwu ahụ mee ka o doo anya na onye chọrọ ịna-emekwu nke ọma n’ọgbakọ kwesịrị ịna-agbasi mbọ ike. Chegodị banyere nwanna na-eche gbasara ihe ọ ga-abụ n’ọgbakọ n’ọdịnihu. O nwere ike ọ bụbeghị ohu na-eje ozi, ma ọ ghọtara na ya kwesịrị ịna-akpakwu àgwà ka Onye Kraịst. Ọ ga-ebu ụzọ gbalịsiwe ike ka ọ bụrụ ohu na-eje ozi. Ka oge na-aga, ọ ga-ebu n’obi na ọ ga-eru eru ịbụ okenye. Ọ ga na-agbasi mbọ ike ka o ruo eruo ịrụkwu ọrụ n’ọgbakọ.

4 Otú ahụkwa ka ụmụnna ndị chọrọ ịbụ ndị ọsụ ụzọ, ndị na-eje ozi na Betel, ma ọ bụ ndị na-enyere ndị na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze aka kwesịrị ịna-agba mbọ ka ha ruo eruo. Ka anyị leba anya n’otú Baịbụl si gbaa anyị niile ume ịna-emekwu nke ọma n’ọgbakọ.

NA-AGBA MBỌ KA Ị NA-EMEKWU NKE ỌMA N’ỌGBAKỌ

5. Olee otú ndị na-eto eto nwere ike isi jiri ike ọkpụkpụ aka ha na-ejere Jehova ozi?

5 Ndị na-eto eto nwere ike ọkpụkpụ aka ha ga-eji na-ejekwuru Jehova ozi. (Gụọ Ilu 20:29.) Na Betel, ụfọdụ ndị na-eto eto na-arụ n’ebe a na-ebi Baịbụl na akwụkwọ ndị ọzọ. Ọtụtụ ụmụnna bụ́ ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa so na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, sorokwa na-arụzi ndị nke a chọrọ ịrụzi. Ụfọdụ na-eso enyere ndị ọdachi dakwasịrị aka. E nwekwara ọtụtụ ndị na-eto eto bụ́ ndị ọsụ ụzọ na-amụ asụsụ ọzọ ma ọ bụ gaa na-ezi ndị mmadụ ozi ọma n’obodo ọzọ.

6-8. (a) Olee otú otu nwa okorobịa si gbanwee otú o sibu ele ozi Chineke anya, oleekwa uru ọ baara ya? (b) Olee otú anyị nwere ike isi ‘detụ Jehova ire, hụ na ọ dị mma’?

6 O nwere ike ịbụ na ị ghọtara na ọ dị mkpa ka anyị jiri obi anyị niile na-ejere Chineke ozi. Ma, o nwere ike ịdị gị otú ọ dị otu nwanna aha ya bụ Aaron. Ọ bụ eziokwu na a mụrụ ya n’ọgbakọ, ọ sịrị: “Ọmụmụ ihe na ozi ọma na-agwụ m ike.” Ọ chọrọ iji obi ụtọ na-ejere Chineke ozi, ma ọ maghị ihe mere obi anaghị adị ya ụtọ. Gịnị ka o mere?

7 Aaron gbalịsiri ike na-agụchi Baịbụl anya, na-akwadebe maka ọmụmụ ihe, na-azakwa ajụjụ. Ọ malitekwara ịna-ekpe ekpere mgbe niile. Ka ọ na-ahụkwu Jehova n’anya, ọ malitere imekwu nke ọma n’ọgbakọ. Kemgbe ahụ, Aaron ejirila obi ụtọ sụọ ụzọ, soro nyere ụmụnna ọdachi dakwasịrị aka, kwusaakwa ozi ọma ná mba ọzọ. Ọ na-ejezi ozi na Betel, bụrụkwa okenye. Olee otú obi dị ya maka ihe a o mere? Ọ sịrị: “‘Edetụla m Jehova ire, hụ na ọ dị mma.’ Otú o si gọzie m emeela ka m ghọta na m kwesịrị ijekwuru ya ozi, meekwa ka m na-agbakwu mbọ n’ozi ya. Ọ bụ ya mere o ji na-agọzikwu m.”

8 Devid bụrụ abụ, sị: “Ndị na-achọ Jehova, ọ dịghị ihe ọma ga-akọ ha.” (Gụọ Abụ Ọma 34:8-10.) N’eziokwu, Jehova anaghị emechu ndị jí ịnụ ọkụ  n’obi na-ejere ya ozi ihu. Ka anyị na-eme ihe niile anyị nwere ike ime n’ozi ya, anyị ‘na-edetụ ya ire, hụ na ọ dị mma.’ Anyị jiri obi anyị niile na-efe Chineke, anyị na-enwe ọṅụ na-enweghị atụ.

JISIE IKE, ADALA MBÀ

9, 10. Gịnị mere o ji dị́ mkpa ka ị ‘na-echere Chineke’?

9 Ka ị na-agba mbọ ime ihe ndị i kpebiri ime n’ozi Jehova, ‘na-echere Chineke.’ (Maị. 7:7) Jehova na-akwado ndị jí obi ha niile na-efe ya n’agbanyeghị na o nwere ike ikwe ka ha chere tupu ha enweta ihe ùgwù ụfọdụ ma ọ bụ tupu ihe agbanwee ma dịtụrụ ha mma. O kwere Ebreham nkwa na ọ ga-amụta nwa, ma Ebreham kwesịrị inwe okwukwe na ndidi. (Hib. 6:12-15) Ọ bụ eziokwu na Ebreham cheere ọtụtụ afọ tupu a mụọ Aịzik, ma ọ daghị mbà, Jehova emechughịkwa ya ihu.—Jen. 15:3, 4; 21:5.

10 Ichere ihe anaghị adị mfe. (Ilu 13:12) Ma, anyị kwawa ụwa maka otú ihe si dịrị anyị, obi nwere ike ịda anyị mbà. Kama ime otú ahụ, anyị kwesịrị iji oge anyị na-emekwu nke ọma n’ọgbakọ. Ka anyị leba anya n’ụzọ atọ anyị ga-esi eme ya.

11. Olee àgwà ndị anyị nwere ike ịgbasi mbọ ike ka anyị mụta, gịnịkwa mere ha ji dị́ mkpa?

11 Na-amụta àgwà ndị ga-abara gị uru n’ọgbakọ. Ịmụ Baịbụl na ịtụgharị uche na ya ga-enyere anyị aka inwe amamihe, nghọta, ezi uche, ihe ọmụma, ikike iche echiche, na uche zuru okè. Àgwà ndị a na-enyere ụmụnna na-elekọta ọgbakọ aka ịrụ ọrụ ha. (Ilu 1:1-4; Taị. 1:7-9) Anyị mụwa Baịbụl, anyị nwere  ike ịmata otú Jehova si ele ihe dị́ iche iche anya. Anyị ga-eburuzi ihe Jehova chọrọ n’obi ma anyị kpebiwe ihe anyị ga-eme kwa ụbọchị. Dị ka ihe atụ, anyị ga-amata otú anyị ga-esi na-emeso ndị ọzọ, ihe anyị ga-eji ego anyị na-eme, na otú anyị ga-esi na-ekpebi ma ụdị uwe anyị ga-eyi ma ihe ndị anyị ga-eji na-atụrụ ndụ.

12. Olee otú ndị nọ́ n’ọgbakọ nwere ike isi gosi na a ga-atụkwasịli ha obi?

12 Bụrụ onye a ga-atụkwasịli obi. Ma ànyị bụ nwoke ma ànyị bụ nwaanyị, anyị kwesịrị iji ike anyị niile na-arụ ọrụ ọ bụla e nyere anyị n’ọgbakọ. Mgbe Nehemaya bụ gọvanọ, ọ chọrọ ndị Izrel ọ ga-enye ọrụ. Olee ndị ọ họọrọ? Ọ bụ ndị na-atụ egwu Chineke, bụ́ ndị a ga-atụkwasịli obi. (Nehe. 7:2; 13:12, 13) Taa, “ihe a na-achọkwa n’aka ndị na-elekọta ụlọ bụ ka ha bụrụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi.” (1 Kọr. 4:2) Onye ọ bụla na-ahụ ihe ọma anyị na-eme.—Gụọ 1 Timoti 5:25.

13. Ndị ọzọ mee gị ihe ọjọọ, olee otú i nwere ike isi mee ka Josef?

13 Kwe ka Jehova nụchaa gị. Gịnị ka ị ga-eme ma ndị ọzọ mee gị ihe ọjọọ? I nwere ike ịgwa ha otú obi dị gị ozugbo. Ma, mgbe ụfọdụ, i nwere ike ịnọ ebe ị na-esi ọnwụ ka a mata na aka gị dị ọcha, ihe akazie njọ. Ụmụnne Josef rụsara ya arụrụala, ma o burughị ha iwe n’obi. E mechara bo Josef ihe ọ na-emeghị ma tụọ ya mkpọrọ arụrụala. Ma, o kwere ka Jehova duzie ya n’oge ahụ niile ihe siiri ya ike. Olee uru o ritere? “Okwu Jehova nụchara ya.” (Ọma 105:19) Ọnwụnwa niile ahụ nyeere Josef aka iru eru ịrụ ọrụ pụrụ iche. (Jen. 41:37-44; 45:4-8) Ndị ọzọ mee gị ihe ọjọọ, rịọ Jehova ka o nye gị amamihe. Ọ ga-enyere gị aka iwetu obi, meekwa ka i jiri obiọma gwa ha okwu.—Gụọ 1 Pita 5:10.

NA-EMEKWU NKE ỌMA N’OZI ỌMA

14, 15. (a) Gịnị mere anyị ga-eji ‘na-elezi otú anyị si ezi ozi ọma anya’? (b) Olee ihe ụfọdụ i nwere ike ịgbanwe ka i nwee ike izi ndị ị na-anaghị ahụ n’ụlọ ozi ọma? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a, kwuokwa ihe dị́ n’igbe bụ́ “ Ị̀ Ga-esili Otú Ọzọ Zie Ndị Mmadụ Ozi Ọma??”)

14 Pọl gwara Timoti, sị: “Na-etinyesi mgbalị ike n’ịgụ ihe n’ihu ọha, n’inye ndụmọdụ, n’izi ihe. Na-elezi onwe gị na ozizi gị anya mgbe niile.” (1 Tim. 4:13, 16) Timoti abụrụlarị aka ochie n’ikwusa ozi ọma mgbe Pọl gwara ya ihe a, ma ọ ga na-emekwu nke ọma n’ozi ọma ma ọ bụrụ na ọ ‘na-elezi onwe ya na ozizi ya anya.’ Ihe ga-eme ka okwu ya na-eru ndị mmadụ n’obi mgbe niile bụ ma ọ na-agbanwe otú o si ezi ihe. Anyị kwesịkwara ime ka Pọl, na-agbanwe otú anyị si ezi ndị mmadụ ozi ọma ka o ruo ha n’obi.

15 Ọtụtụ mgbe, anyị anaghị ahụ ndị mmadụ n’ụlọ ma anyị gaa ozi ọma ụlọ n’ụlọ. N’ebe ụfọdụ, a naghị ekwe ka anyị gaa zie ndị mmadụ ozi ọma n’ụlọ ndị a gbara ogige. Ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ n’ókèala unu, ì nwere ike ịgba mbọ ka i sí ụzọ ndị ọzọ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma?

16. Olee otú ikwusa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị nwere ike isi baa uru?

16 Ikwusa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị so n’ụzọ ndị magburu onwe ha e si ezi ozi ọma. Ọtụtụ ụmụnna na-esi otú a ezi ọtụtụ ndị ozi ọma. Ha na-aga n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè, n’ebe bọs na-akwụsị, n’ọma ahịa, n’ebe a na-atụrụ ndụ nakwa n’ebe ndị ọzọ. Onye nkwusa ga-eji uche ya mata ma otú ọ ga-esi bido izi mmadụ ozi ọma ọ̀ bụ ịgwa ya ihe e kwuru n’akụkọ ụwa, ka ọ̀ bụ ịjawa ụmụ ya mma ka ọ̀ bụ ịjụwa ya  gbasara ọrụ ya. Ka ha na-akparịta, ya ekwuzie ihe gbasara Baịbụl ma jụọ onye ahụ ihe o chere banyere ya. Ọtụtụ mgbe, ihe onye ahụ zara ga-eme ka e zie ya ozi ọma.

17, 18. (a) Olee ihe nwere ike ime ka obi kakwuo gị ịna-ekwusa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị? (b) Gịnị mere abụ Devid ji too Jehova ga-eji baara gị uru n’ozi ọma?

17 Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike izi ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị, ike agwụla gị. E nwere otu ọsụ ụzọ bí na Niu Yọk aha ya bụ Eddie. Ọ na-esiburu ya ike izi ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị. Gịnịzi nyeere ya aka ịkata obi? Ọ sịrị: “Anyị nwewe ofufe ezinụlọ, mụ na nwunye m na-eme nchọnchọ ka anyị mata ihe anyị ga-aza ndị nwere ike ịjụ anyị ajụjụ, matakwa ihe ndị anyị na-ezi ozi ọma na-ekwukarị. Anyị na-agwakwa ụmụnna ndị ọzọ ka ha tụọrọ anyị aro.” Ọ na-adịzi Eddie ka oge e ji aga ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị ruwe eruwe.

18 Ọ bụrụ na ozi anyị ana-atọ anyị ụtọ, anyị ana-emekwa nke ọma n’ozi ọma, ndị ọzọ ga-ahụ ọganihu anyị. (Gụọ 1 Timoti 4:15.) Ihe ọzọ bụ na ọ ga-egosi na anyị na-eto Jehova otú ahụ Devid mere. Ọ sịrị: “M ga-agọzi Jehova mgbe niile; otuto ya ga-adị n’ọnụ m mgbe niile. Mkpụrụ obi m ga-eji Jehova nyaa isi; ndị dị umeala n’obi ga-anụ ya wee ṅụrịa ọṅụ.” (Ọma 34:1, 2) Ozi ọma anyị nwere ike ime ka ndị dị́ umeala n’obi bịa fewe Jehova.

KA OTÚ I SI EME NKE ỌMA N’ỌGBAKỌ GOSI NA Ị NA-ETO JEHOVA

19. Gịnị mere onye jí obi ya niile na-efe Jehova kwesịrị iji na-enwe obi ụtọ ọ bụrụgodị na ọ gaghị emeli ihe ndị o kwesịrị ime?

19 Devid sịkwara: “Jehova, ọrụ gị niile ga-eto gị, ndị na-eguzosi ike n’ebe ị nọ ga-agọzikwa gị. Ha ga na-ekwu banyere ịdị ebube nke ọbụbụeze gị, ha ga na-ekwukwa banyere ịdị ike gị, iji mee ka ụmụ mmadụ mara oké ọrụ ya, nakwa ebube nke ịma mma ọbụbụeze ya.” (Ọma 145:10-12) Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị ndị niile jí obi ha niile na-erubere Jehova isi. Ma, ọ bụrụkwanụ na nká ma ọ bụ ọrịa emee ka ị ghara ịna-aga ozi ọma otú i kwesịrị? Na-echeta na mgbe ọ bụla i ziri ndị nọọsụ, ndị dọkịta ma ọ bụ ndị gị na ha nọ ozi ọma, ị na-eto Jehova. Ọ bụrụkwanụ na a tụrụ gị mkpọrọ n’ihi ihe i kweere? Cheta na ọ bụrụ na ị na-eji ohere ọ bụla ezi ndị mmadụ ozi ọma, obi ga-adị Jehova mma. (Ilu 27:11) Obi ga-adịkwa ya mma ma ọ bụrụ na ị na-efe ya n’agbanyeghị na ndị ọzọ nọ́ n’ezinụlọ unu anaghị efe ya. (1 Pita 3:1-4) A sịgodị na ihe esiere gị ezigbo ike, ị ka nwere ike ịna-eto Jehova, na-emekwa nke ọma n’ọgbakọ.

20, 21. Ọ bụrụ na e nwere ọtụtụ ihe ị na-arụ ná nzukọ Jehova, olee otú i nwere ike isi na-eme ihe ga-abara ndị ọzọ uru?

20 Jehova ga-agọzi gị ma ọ bụrụ na ị na-eme nke ọma n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na ị gbanwetụ ihe ndị ị na-eme ma ọ bụ otú i si ebi ndụ, i nwere ike inwekwu ohere inyere ndị mmadụ aka ka ha mụta banyere ọmarịcha nkwa ndị Jehova kwere anyị. Otú i si eme nke ọma n’ọgbakọ na otú i si ewepụta onwe gị ga-abara ụmụnna gị ọtụtụ uru. Mbọ ị na-agba n’ọgbakọ ga-eme ka ụmụnna hụ gị n’anya, jiri gị kpọrọ ihe, na-akwadokwa gị.

21 Ma ànyị efeela Jehova ọtụtụ afọ ma ọ bụ naanị ọnwa ole na ole, anyị niile ka nwere ike ịna-emekwu nke ọma n’ọgbakọ. Ma, olee otú ụmụnna nọterela aka n’ọgbakọ nwere ike isi nyere ndị ọhụrụ aka ịna-emekwu nke ọma n’ọgbakọ? Anyị ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-esonụ.