Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Nọvemba 2017

Gịnị Ka Ị Ga-eme Ka Ọgbakọ Ọhụrụ Gị Mara Gị Ahụ́?

Gịnị Ka Ị Ga-eme Ka Ọgbakọ Ọhụrụ Gị Mara Gị Ahụ́?

OTU nwanna aha ya bụ Allen * kwuru, sị: “Ụjọ nọ na-atụ m ịgafe n’ọgbakọ ọhụrụ. Amaghị m ma m ga-emeta ndị enyi ma ọ bụkwanụ ma hà ga-anabata m.” Ọgbakọ ọhụrụ a Nwanna Allen nọ na ya amatawala ya ahụ́. Isi n’ebe o bibu gaa n’ebe ọgbakọ ọhụrụ ya dị, dị ihe karịrị otu puku kilomita na narị anọ.

Ọ bụrụ na ị gafere n’ọgbakọ ọhụrụ, ụjọ nwere ike na-atụ gị otú ahụ ọ tụrụ nwanna ahụ. Olee ihe ga-enyere gị aka ka ọgbakọ ọhụrụ a mara gị ahụ́? Olee ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike karịa otú ị tụrụ anya ya? Ihe ọzọ bụ na ọ bụrụ na ị naghị agafe n’ọgbakọ ọhụrụ, gịnị ka ị ga-eme ka ọgbakọ unu mara ndị gafetara na ya ahụ́?

OTÚ ỌGBAKỌ ỌHỤRỤ GỊ GA-ESI MARA GỊ AHỤ́, GỊ ANA-EMEKWA NKE ỌMA

Chegodị banyere ihe atụ a: Ọ bụrụ na e foro osisi gaa n’ebe ọzọ, ọ naghị adịchakwa otú ahụ ọ dị. Mgbe a na-efopụta osisi ahụ, ọtụtụ mgbọrọgwụ ya na-adọbikarị ka e nwee ike iburu ya gaa ebe a ga-adọ ya. Ozugbo a dọrọ ya, ọ na-amalite puwe mgbọrọgwụ ndị ọhụrụ. Ihe na-eme osisi a na-emekwa onye gafere n’ọgbakọ ọhụrụ. Ịgafe n’ọgbakọ ọhụrụ nwere ike ime ka ahụ́ ghara ịna-eru gị ala. N’ọgbakọ ochie gị, e nwere ike ikwu na ị gbanyela mgbọrọgwụ, ya bụ, na i nwere ezigbo ndị enyi, na-emekwa ihe ndị ga-enyere gị aka ịna-efe Chineke. Ma, ka i nwee ike ịna-eme nke ọma n’ọgbakọ ọhụrụ a, ị ga-enwe ndị enyi ọhụrụ, na-emekwa ihe ndị ga-enyere gị aka ịna-efe Chineke. Olee ihe nwere ike inyere gị aka ime otú ahụ? Ọ bụ ime ihe Baịbụl kwuru. Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ha.

Onye na-agụ Okwu Chineke mgbe niile “ga-adịkwa ka osisi a kụrụ n’akụkụ iyi, nke na-amị mkpụrụ ya n’oge ya, akwụkwọ ya adịghịkwa akpọnwụ akpọnwụ, ihe ọ bụla ọ na-eme ga-aga nke ọma.”Ọma 1:1-3.

Otú ahụ osisi ga na-amịrị mmiri ka o nwee ike ịna-adị mma n’anya ka Onye Kraịst kwesịkwara ịna-agụ Okwu Chineke mgbe niile ka ya na Jehova nwee ike ịna-adị n’ezigbo mma. N’ihi ya, na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, na-agachikwa ọmụmụ ihe anya. Na-enwe ofufe ezinụlọ mgbe niile, na-amụchikwa ihe anya n’onwe gị. Ihe ndị ị na-eme n’ọgbakọ ochie gị ka gị na Chineke na-adị ná mma ka i kwesịkwara ịna-eme n’ọgbakọ nke ọhụrụ a.

“Onye na-emekwa ka ndị ọzọ ṅụjuo mmiri afọ ka a ga-emekwa ka ọ ṅụjuo mmiri afọ.”Ilu 11:25.

Ọ bụrụ na i na-ejechi ozi ọma anya, ọ ga-eme ka ahụ́ ruo gị ala, meekwa ka ebe ahụ mara gị ahụ́ ngwa ngwa. Otu okenye aha ya bụ Kevin kwuru, sị: “Ihe kacha nyere mụ na nwunye m aka bụ na anyị malitere ọsụ ụzọ inyeaka ozugbo anyị gafere n’ọgbakọ ọhụrụ anyị. O mere ka anyị mata ụmụnna, matakwa ndị ọsụ ụzọ, nakwa ókèala anyị.” Nwanna Roger gafekwara n’ọgbakọ ọhụrụ. Isi n’ebe o bibu gaa n’ebe ọgbakọ ọhụrụ ya dị, karịrị otu puku kilomita na narị isii. O kwuru, sị: “Ihe kacha mma mmadụ ga-eme ka ọgbakọ ọhụrụ ya mara ya ahụ́ bụ ịna-agachi ozi ọma anya. Ihe ọzọ bụ ime ka ndị okenye mara na ị dị njikere inye aka n’ihe ọ bụla a na-eme n’ọgbakọ. O nwere ike ịbụ ihicha Ụlọ Nzukọ Alaeze, imechitere nwanna ihe omume, ma ọ bụ ibute nwanna n’ọmụmụ ihe. Ụmụnna hụ onye wepụtara onwe ya ịrụ ọrụ ndị a, ha na-anabata ya nke ọma.”

“Megheenụ obi unu.”2 Kọr. 6:13.

Gbalịa meta ụmụnna dị iche iche enyi. Mgbe otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Melissa na ndị ezinụlọ ya gafechara n’ọgbakọ ọhụrụ, ha lekwasịrị anya  n’imeta ndị enyi ọhụrụ. O kwuru, sị: “Anyị na ụmụnna anyị na-akparịta n’Ụlọ Nzukọ Alaeze tupu ọmụmụ ihe amalite, nakwa mgbe a gbasara. Nke a na-enye anyị ohere anyị na ụmụnna anyị ikwurịta okwu, ọ bụghị naanị ikele ha ekele.” Ihe a nyekwaara ezinụlọ ahụ aka ịmata aha ụmụnna ngwa ngwa. Ihe ọzọ ha mere bụ ile ụmụnna ọbịa n’ụlọ ha. O mekwara ka ha na ụmụnna dịrịkwuo ná mma. O kwukwara, sị: “Anyị nyere ụmụnna nọmba ekwentị anyị, ha enyekwa anyị nke ha, ka ha nwee ike ịkpọtụrụ anyị ma e nwee ihe a ga-eme n’ọgbakọ, nakwa ihe ndị ọzọ.”

Ọ bụrụ na ọ naghị adịrị gị mfe ikwuru onye ị na-amachaghị okwu, i nwere ike ịmalite obere obere. Dị ka ihe atụ, mụmụọ ọnụ ọchị, ọ bụrụgodị na ị chọghị ime ya ná mmalite. Ịmụmụ ọnụ ọchị ga-eme ka ndị ọzọ bịa gị nso. A sị ka e kwuwe, “ìhè nke anya na-eme ka obi ṅụrịa.” (Ilu 15:30) Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Rechel gafekwara n’ọgbakọ dị anya n’ebe ọ nọ too. O kwuru, sị: “Abụ m onye ihere. Mgbe ụfọdụ, m na-ejisi ike gwa ụmụnna okwu n’ọgbakọ ọhụrụ m. M na-achọ onye nọ ọdụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze n’enweghị onye ya na ya na-ekwurịta okwu. Onye ahụ nwekwara ike ịna-eme ihere ka mụ.” Ọ̀ bụ na ọ gaghị adị mma ka ị gbalịa ka gị na nwanna gị na ya na-ekwutụbeghị okwu kwurịta okwu tupu ọmụmụ ihe amalite nakwa mgbe a gbasara?

Ihe ọzọ bụ na obi nwere ike na-atọ gị ụtọ na ị na-aga imeta ndị enyi ọhụrụ n’izu ole na ole. Ma ka oge na-aga, obi ụtọ ahụ i nwere imeta ndị enyi ọhụrụ nwere ike ịnyụ ka ọkụ. Ihe i nwere ike ime n’oge ahụ bụ ịgbawazi mbọ ka ị na-emeta ndị enyi ọhụrụ.

Ọ bụrụ na e foro osisi gaa n’ebe ọzọ, ọ naghị adịchakwa otú ahụ ọ dị. Ma, ozugbo a dọrọ ya, ọ na-amalite puwe mgbọrọgwụ ndị ọhụrụ

NYE ONWE GỊ OGE KA Ọ MARA GỊ AHỤ́

Ụfọdụ osisi na-agbanyesi mgbọrọgwụ ike ngwa ngwa n’ebe ọhụrụ ahụ a dọrọ ha karịa osisi ndị ọzọ. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyị. E nwere ndị ọ na-ewe oge tupu ọgbakọ ọhụrụ ha amara ha ahụ́, nweekwanụ ndị ọ na-amara ahụ́ ngwa ngwa. Ọ bụrụ na ọ dịla anya ị gafere n’ọgbakọ ọhụrụ, ya aka na-esiri gị ike ịmara gị ahụ́, ime ihe ndị a Baịbụl kwuru nwere ike inyere gị aka:

“Ka anyị ghara ịda mbà n’ime ihe dị mma, n’ihi na mgbe oge ruru, anyị ga-aghọrọ mkpụrụ ya ma ọ bụrụ na ike agwụghị anyị.”Gal. 6:9.

Nyekwuo onwe gị oge ka o nwee ike ịmara gị ahụ́. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị gụrụ akwụkwọ na Gilied na-eje ozi ná mba ọzọ na-anọ ebe ahụ ọtụtụ afọ tupu ha agaa obodo ha. Ime otú ahụ na-enyere ha aka ha na ụmụnna adịrị n’otu, meekwa ka omenala ndị obodo ahụ mara ha ahụ́.

Otu nwanna aha ya bụ Alejandro agafeela n’ọtụtụ ọgbakọ. Ọ ma na ọgbakọ ọhụrụ ịmara mmadụ ahụ́ abụghị ihe a na-eme ọkụ ọkụ. O kwuru, sị: “N’ọgbakọ ikpeazụ anyị gafere, nwunye m kwuru, sị, ‘Ndị enyi m niile nọ n’ọgbakọ anyị si na ya gafeta na nke a.’” O chetaara nwunye ya na o kwuburu ụdị ihe a afọ abụọ gara aga n’oge ikpeazụ ha gafere n’ọgbakọ ọhụrụ. N’afọ abụọ ahụ niile, ọ nọ na-egosi ndị ọzọ na ihe ha masịrị ya, ndị ọ na-amaghị ndị ha bụ bịara ghọọ ndị enyi ya.

“Asịla: ‘Gịnị mere oge gara aga ji dị mma karịa oge a?’ n’ihi na ọ bụghị amamihe ka i ji jụọ ihe a.”Ekli. 7:10.

Ejila ọgbakọ ọhụrụ gị tụnyere ọgbakọ ochie gị. Dị ka ihe atụ, ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ ọhụrụ gị nwere ike na-eme ihere ịgakwuru mmadụ ma ọ bụkwanụ na ha na-ekwu ọtụtụ okwu karịa otú ụmụnna nọ n’ọgbakọ ochie gị na-ekwu. Lekwasị anya n’àgwà ọma ha, otú ahụ ị ga-achọ ka ha lekwasị anya na nke gị. Ọ na-eju ụfọdụ ndị gafetara n’ọgbakọ  ọhụrụ anya ịhụ na ọgbakọ ọhụrụ ha gafere mere ka ha jụọ onwe ha, sị, ‘M̀ hụrụ “òtù ụmụnna dum n’anya,” n’eziokwu?’—1 Pita 2:17.

“Na-arịọnụ, a ga-enye unu.”Luk 11:9.

Na-arịọ Jehova ka o nyere gị aka. Otu okenye aha ya bụ David kwuru, sị: “Achọla ka i die ya n’onwe gị. O nwere ọtụtụ ihe anyị na-agaghị emeli n’onwe anyị ọ gwụkwala ma Jehova ò nyeere anyị aka. Rịọ Jehova ka o nyere gị aka.” Nwanna Nwaanyị Rachel anyị kwuburu ná mbụ kwetara na ọ bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na ọ dị mụ na di m ka anyị bịara nke anyị iche, anyị na-arịọ Jehova, sị, ‘Biko, mee ka anyị mara mà anyị na-eme ihe na-esiri ndị ọzọ ike ịbịa anyị nso.’ Anyị na-agbalị iwepụtakwu oge ka anyị na ụmụnna nọrịa.”

Ndị nne na nna, ọ bụrụ na ọ na-esiri ụmụ unu ike ime ka ọgbakọ ọhụrụ unu mara ha ahụ́, wepụtanụ oge ka unu na ha kpee ekpere banyere ya. Na-akpọnụ ụmụnna ndị ọzọ ka unu na ha nọrịa si otú ahụ nyere ụmụ unu aka imeta ndị enyi ọhụrụ.

NYERE NDỊ GAFETARA ỌHỤRỤ N’ỌGBAKỌ UNU AKA KA AHỤ́ RUO HA ALA

Olee ihe ị ga-eme iji nyere ndị gafetara ọhụrụ n’ọgbakọ unu aka? Ozugbo ị hụrụ ha, gbalịa ka gị na ha bụrụ ezigbo enyi. Ka i nwee ike ime otú ahụ, chegodị ihe ndị ị chọrọ ka ndị mmadụ meere gị ma à sị na ị gafere n’ọgbakọ ha, ma mee ihe ndị ahụ. (Mat. 7:12) Ì nwere ike ịkpọ ndị ọhụrụ ka ha soro unu nwee ofufe ezinụlọ ma ọ bụ soro lee Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova a na-eme kwa ọnwa? Ì nwere ike ịkpọ ha ka gị na ha soro rụọ n’ozi ọma? Ọ bụrụ na gị na ha soro rie nri, ha agaghị echefu ya echefu. Olee ihe ọzọ i nwere ike imere ha?

Otu nwanna aha ya bụ Carlos sịrị: “Mgbe anyị gafetara n’ọgbakọ ọhụrụ, otu nwanna nwaanyị nyere anyị aha ụlọ ahịa dị iche iche na-ere ihe ọnụ ala. Nke a nyeere anyị ezigbo aka.” Ọ na-atọkwa ndị ọhụrụ si mba ọzọ bịa ụtọ ịmụta otú ha ga-esi na-eji ejiji n’oge oyi, n’oge okpomọkụ, ma ọ bụ n’oge udu mmiri. I nwekwara ike ịkọrọ ha banyere obodo unu ma ọ bụ ịkọrọ ha ihe chọọchị ndị e nwere n’obodo unu na-akụzi. Nke a ga-enyere ha aka izi ndị mmadụ ozi ọma ya eruo ha n’obi.

IME KA ỌGBAKỌ ỌHỤRỤ GỊ MARA GỊ AHỤ́ BARA EZIGBO URU

Nwanna Allen anyị kwuru okwu ya ná mmalite nọ n’ọgbakọ ọhụrụ ya kemgbe ihe karịrị otu afọ. Ọ sịrị: “M jisiri ike ná mmalite ịmata ụmụnna. Ma, ugbu a, ha na-eme ka ànyị bụ otu ezinụlọ. Obi na-atọkwa m ụtọ.” Allen ghọtara na ọgbakọ ọhụrụ a ọ gafetara emeghị ka ọ ghara inwe ndị enyi. Kama, o mere ka o nwekwuo ndị enyi nwere ike ịbụ ndị enyi ya ruo ọnwụ.

^ para. 2 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.