Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Nọvemba 2017

Na-eṅomi Jehova n’Ikpe Ikpe Ziri Ezi na n’Ime Ebere

Na-eṅomi Jehova n’Ikpe Ikpe Ziri Ezi na n’Ime Ebere

“Na-ekpenụ ikpe ziri ezi; jirikwanụ obiọma na ọmịiko na-emeso ibe unu ihe.”—ZEK. 7:9.

ABỤ: 125, 88

1, 2. (a) Olee otú obi dị Jizọs maka Iwu Chineke? (b) Olee otú ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii si na-eme ihe dị iche n’ihe Iwu Chineke kwuru?

JIZỌS ejighị Iwu Mozis gwuo egwu. Nke a ekwesịghị iju anyị anya n’ihi na ọ bụ Nna ya bụ́ Jehova nyere Iwu ahụ. Ọ bụ ya bụ Onye kacha mkpa ná ndụ ya. Baịbụl kwuru n’Abụ Ọma 40:8, na Iwu Chineke na-atọ Jizọs ezigbo ụtọ. Ọ sịrị: “Chineke m, ime uche gị na-atọ m ụtọ, Iwu gị dịkwa n’ime obi m.” Jizọs si n’okwu ọnụ ya nakwa n’omume ya gosi na Iwu Chineke zuru okè, baa uru, nakwa na ọ ga-emezurịrị.—Mat. 5:17-19.

2 Ọ ga-abụrịrị na o wutere Jizọs mgbe ọ hụrụ ka ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii na-eme ihe dị iche n’ihe Iwu Nna ya kwuru. Ha na-akpachapụ anya eme ihe ndị kacha nta dị n’Iwu ahụ. Ọ bụ ya mere Jizọs ji gwa ha, sị: “Unu na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri nke mkpá akwụkwọ mint nakwa mkpá akwụkwọ dil nakwa mkpụrụ kọmin.” N’ihi ya, gịnị bụ nsogbu ha? O kwukwara, sị: “Ma unu na-eleghara ihe ndị ka mkpa n’Iwu ahụ anya, ya bụ, ikpe ziri ezi na ebere na ikwesị ntụkwasị obi.” (Mat. 23:23) Ihe bụ mkpa ndị Farisii bụ ime iwu. Ha aghọtaghị ihe Iwu ahụ Jehova nyere pụtara. Ha chekwara na ha ka ndị ọzọ mma. Ma Jizọs ghọtara ihe mere Chineke ji nye Iwu ahụ, nakwa ihe iwu nke ọ bụla na-akụziri anyị banyere Jehova.

3. Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a?

 3 Ebe ọ bụ na anyị bụ Ndị Kraịst, anyị anaghị edebe Iwu Mozis. (Rom 7:6) Ma, Jehova mere ka e dee Iwu ndị ahụ n’Okwu ya, bụ́ Baịbụl. Jehova achọghị ka anyị na-echekasị onwe anyị banyere Iwu, kama, ọ chọrọ ka anyị ghọta “ihe ndị ka mkpa n’Iwu ahụ,” ya bụ, ihe ndị mere e ji nye Iwu ahụ, ma na-eme ha eme. Dị ka ihe atụ, gịnị ka ndokwa Jehova mere maka obodo mgbaba ndị ahụ na-akụziri anyị? N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị mụtara ihe onye gbabara n’obodo mgbaba ahụ ga-eme. Obodo mgbaba ndị ahụ kụzikwaara anyị banyere Jehova nakwa otú anyị nwere ike isi na-akpa àgwà ka ya. N’ihi ya, n’isiokwu a, anyị ga-aza ajụjụ atọ ndị a: Olee otú obodo mgbaba ndị ahụ si gosi na Jehova na-eme ebere? Olee ihe ha na-akụziri anyị gbasara otú o si ele ndụ anya? Olee otú ha si gosi na Jehova na-ekpe ikpe ziri ezi? Mgbe a na-aza ajụjụ nke ọ bụla, chọpụta otú i nwere ike isi ṅomie Nna gị nke eluigwe.—Gụọ Ndị Efesọs 5:1.

EBE OBODO MGBABA NDỊ AHỤ DỊ GOSIRI NA CHINEKE NA-EME EBERE

4, 5. (a) Olee otú e si mee ka ọ dịrị mmadụ mfe ịgbaba n’obodo mgbaba? N’ihi gịnịkwa? (b) Gịnị ka nke a na-akụziri anyị banyere Jehova?

4 Jehova haziri ka obodo mgbaba isii ndị ahụ dịrị ndị mmadụ mfe ịgbaba na ha. Ọ gwara ndị Izrel ka ha họrọ obodo atọ n’otu akụkụ Jọdan, họrọkwa obodo atọ n’akụkụ nke ọzọ. Maka gịnị? Ọ bụ ka ọ dịrị onye ọ bụla gburu mmadụ n’amaghị ama mfe ịgbaga n’otu n’ime ha ngwa ngwa. (Ọnụ Ọgụ. 35:11-14) A rụziri ụzọ ndị e si agbaga na ha arụzi. (Diut. 19:3) Akwụkwọ ndị Juu kwuru na e nwere ihe ndị a rụnyere n’okporo ụzọ ndị ahụ iji nyere ndị na-agbaba n’obodo mgbaba ndị ahụ aka ịmata ụzọ. Ebe ọ bụ na e nwere obodo mgbaba ndị ahụ, onye Izrel gburu mmadụ n’amaghị ama ga-agbaba n’otu n’ime ha, kama ịgbaga mba ọzọ, bụ́ ebe o nwere ike ịna-efe chi ọzọ.

5 Chegodị echiche: Jehova nyere iwu ka e gbuo onye gburu ọchụ. Ma, o kwukwara ka e meere onye gburu mmadụ n’amaghị ama ebere, ma chebe ya. Otu onye ọkà mmụta Baịbụl kwuru, sị: “A gbara ihe niile n’anwụ, ya adị mfe nghọta. Ihe a bụ otú Chineke si eme ebere.” Jehova abụghị onye ọkàikpe obi tara mmiri na-achọ otú ọ ga-esi ata ndị ohu ya ahụhụ. Kama, ọ bụ “onye ebere ya dị ukwuu.”—Efe. 2:4.

6. Ndị Farisii hà na-emere ndị ọzọ ebere ka Jehova? Kọwaa.

6 Ma, ndị Farisii anaghị achọ imere ndị ọzọ ebere. Dị ka ihe atụ, iwu ndị Juu kwuru na ọ bụrụ na mmadụ emee ndị Farisii otu ihe karịa ugboro atọ, ha anaghị agbaghara ya. Iji gosi otú ihe ha na-eme jọruru  ná njọ, Jizọs mere ihe atụ banyere onye Farisii nọ n’akụkụ onye ọnaụtụ na-ekpe ekpere. Onye Farisii ahụ sịrị: “Chineke, ana m ekele gị na adịghị m ka ụmụ mmadụ ndị ọzọ, bụ́ ndị na-apụnara mmadụ ihe, ndị ajọ omume, ndị na-akwa iko ma ọ bụ ọbụna dị ka onye ọnaụtụ a.” Gịnị ka Jizọs ji ihe atụ a na-akụzi? O ji ya na-akụzi na ndị Farisii ‘na-ewere ndị ọzọ dị ka ndị na-enweghị ihe ha bụ.’ Ha echeghịkwa na ha kwesịrị imere ndị ọzọ ebere.—Luk 18:9-14.

Ọ̀ na-adịrị ndị ọzọ mfe ịrịọ gị mgbaghara, dịkwara gị mfe ịgbaghara ha? Mee ka ọ dịrị ndị ọzọ mfe ịbịakwute gị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4 ruo na nke 8)

7, 8. (a) Ọ bụrụ na mmadụ emee gị ihe ọjọọ, olee otú ị ga-esi ṅomie Jehova? (b) Gịnị mere anyị ga-eji kwesị ịdị umeala n’obi ka anyị nwee ike ịgbaghara ndị ọzọ?

7 Na-eṅomi Jehova, ọ bụghị ndị Farisii. Na-emere ndị ọzọ ebere. (Gụọ Ndị Kọlọsi 3:13.) Otu ụzọ i nwere ike isi eme ya bụ ime ka ọ dịrị ndị ọzọ mfe ịrịọ gị mgbaghara. (Luk 17:3, 4) Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-agbaghara ndị mere m ihe ọjọọ, n’agbanyeghị ugboro ole ha mere m ya? M̀ dị njikere ime ka mụ na onye mejọrọ m ma ọ bụ kpasuru m iwe dịghachi ná mma?’

8 Ka anyị nwee ike ịna-agbaghara ndị ọzọ, anyị ga-adị umeala n’obi. Ndị Farisii anaghị agbaghara ndị ọzọ n’ihi na ha na-ewere ha ka ndị na-enweghị ihe ha bụ. Ma, ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi, ‘na-ewere na ndị ọzọ ka anyị,’ ma na-agbaghara ha. (Fil. 2:3) Ị̀ ga-eṅomi Jehova ma dịrị umeala n’obi? I mee otú ahụ, ọ ga-adịrị ndị ọzọ mfe ịrịọ gị mgbaghara, dịkwara gị mfe ịgbaghara ha. Na-emere ndị ọzọ ebere ngwa ngwa, ewela iwe ọsọsọ.—Ekli. 7:8, 9.

I JIRI NDỤ KPỌRỌ IHE, ‘IKPE ỌBARA Ọ BỤLA AGAGHỊKWA ADỊ N’ISI GỊ’

9. Olee otú Jehova si mee ka ndị Izrel ghọta na ndụ dị nsọ?

9 Otu n’ime ihe mere e ji nwee obodo mgbaba ndị ahụ bụ iji mee ka ikpe ọbara ghara ịdị n’isi ndị Izrel. (Diut. 19:10) Jehova ji ndụ kpọrọ ihe. Ọ kpọkwara “aka na-awụfu ọbara nke na-emeghị ihe ọjọọ,” asị. (Ilu 6:16, 17) Ebe ọ bụ na Chineke dị nsọ ma na-ekpe ikpe ziri ezi, ọ naghị eleghara onye gburu mmadụ n’amaghị ama anya. N’agbanyeghị na a na-emere onye gburu mmadụ n’amaghị ama ebere, ma ọ ga-ebu ụzọ gwa ndị okenye mkpa ya. Ọ bụrụ na ndị okenye ekpechaa ya ikpe ma hụ na o gburu mmadụ n’amaghị ama, ọ ga-anọgide n’obodo ahụ ruo mgbe nnukwu onye nchụàjà nwụrụ. Nke a pụtara na o nwere ike ịnọgide ebe ahụ ruo ọnwụ. Ihe a na-akụziri ndị Izrel niile na ndụ dị nsọ. Ka ha nwee ike ịsọpụrụ Onye nyere ha ndụ, ha ga-agbalịsi ike ka ha ghara ime ihe ọ bụla nwere ike ịkpatara ndị ọzọ ọnwụ.

10. Olee ihe Jizọs kwuru gosiri na ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ejighị ndụ kpọrọ ihe?

10 Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ejighị ndụ kpọrọ ihe ka Jehova. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Jizọs gwara ha, sị: “Unu wepụrụ mkpịsị ugodi nke ihe ọmụma; unu onwe unu abanyeghị, unu gbochikwara ndị chọrọ ịbanye!” (Luk 11:52) Ha kwesịrị ịna-akụziri ndị mmadụ Okwu Chineke, ma nyere ha aka inweta ndụ ebighị ebi. Kama ime otú ahụ, ha achọghị ka ndị  mmadụ bịakwute Jizọs, bụ́ “Onye Nnọchiteanya Ukwu nke ndụ.” Ha na-emekwa ka ndị mmadụ na-eme ihe ga-eme ka e bibie ha. (Ọrụ 3:15) Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii dị mpako ma na-achọ ihe ga-abara naanị onwe ha uru. Ha ejighịkwa ndụ ndị ọzọ kpọrọ ihe. Ha bụ ndị obi tara mmiri na ndị na-anaghị eme ebere.

11. (a) Olee otú Pọl onyeozi si gosi na o ji ndụ kpọrọ ihe otú Jehova ji ya kpọrọ? (b) Gịnị ga-enyere anyị aka ime ka Pọl n’ozi anyị?

11 Olee otú anyị ga-esi ṅomie Jehova ma ghara ịna-eme ka ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii? Anyị kwesịrị iji ndụ kpọrọ ihe. Pọl onyeozi ziri ọtụtụ ndị ozi ọma, ma si otú ahụ gosi na o ji ndụ kpọrọ ihe. Ọ bụ ya mere o ji kwuo, sị: “Aka m dị ọcha n’ebe ọbara mmadụ niile dị.” (Gụọ Ọrụ Ndịozi 20:26, 27.) Ma, ihe mere Pọl ji zie ozi ọma abụghị ka o mezuo iwu ma ọ bụ ka ikpe ọbara ghara ịma ya. Kama, ọ bụ n’ihi na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya, jirikwa ndụ ha kpọrọ ihe. (1 Kọr. 9:19-23) Anyị kwesịkwara iji ndụ kpọrọ ihe ka Jehova. Ọ “chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.” (2 Pita 3:9) Ị̀ na-eme ka Jehova? Ọ bụrụ na ị na-emere ndị ọzọ ebere, ọ ga-eme ka i jirikwuo ịnụ ọkụ n’obi na-ezi ndị mmadụ ozi ọma, obi ana-atọkwu gị ụtọ.

12. Gịnị mere mmadụ ilezi anya na-eme ihe ji dị ndị Chineke mkpa?

12 Otú ọzọ anyị si jiri ndụ kpọrọ ihe ka Jehova bụ ilezi anya na-eme ihe ka anyị ghara imerụ ahụ́. Anyị kwesịrị ilezi anya mgbe anyị na-anya ụgbọala na mgbe anyị na-arụ ọrụ. Anyị kwesịkwara ime otú ahụ ma anyị na-arụ ụlọ, na-edozi ihe ma ọ bụ na-aga ebe anyị na-anọ efe Chineke. Anyị ekwesịghị iji ego ma ọ bụ oge kpọrọ ihe karịa ndụ na ahụ́ ike. Chineke anyị bụ́ onye ikpe ziri na-eme ihe ziri ezi mgbe niile. Anyị kwesịrị ịna-eme ka ya. Ndị okenye karịchaa kwesịrị ịhụ na o nweghị ihe ga-eme ma ha ma ụmụnna ha na ha so na-arụ ọrụ. (Ilu 22:3) Ọ bụrụ na okenye agwa gị ihe ndị ị ga-eme ka ị ghara imerụ ahụ́, mee ihe o kwuru. (Gal. 6:1) I jiri ndụ kpọrọ ihe ka Jehova, “ikpe ọmụma ọbara ọ bụla agaghịkwa adị n’isi gị.”

NA-EKPE IKPE “DỊ KA MKPEBI NDỊ A SI DỊ”

13, 14. Olee otú ndị okenye Izrel ga-esi ṅomie Jehova n’ikpe ikpe ziri ezi?

13 Jehova gwara ndị okenye Izrel ka ha na-ekpe ikpe ziri ezi ka ya. Ihe mbụ ndị okenye kwesịrị ime bụ ịchọpụta ma ihe niile onye ahụ kwuru ọ̀ bụ eziokwu. Ihe ọzọ ha ga-eme mgbe ha na-ekpebi ma hà ga-emere ya ebere ma ọ bụ na ha agaghị emere ya bụ ịchọpụta ihe mere onye ahụ ji gbuo mmadụ, àgwà ya, na ihe ndị o mere n’oge gara aga. Ndị okenye ga-achọpụtakwa ma onye ahụ gburu mmadụ n’amaghị ama ọ̀ kpọrọ onye ahụ asị ma chọọ igbu ya. (Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 35:20-24.) Ọ bụrụ na e nwere ndị akaebe, ọ dịkarịala ala mmadụ abụọ ga-agba akaebe tupu ha ekpebie na onye ahụ leziri anya gbuo mmadụ.—Ọnụ Ọgụ. 35:30.

14 Ndị okenye chọpụtachaa nke bụ́ eziokwu, ha ga-echebara onye ahụ echiche, ọ bụghị naanị ihe o mere. Ndị okenye kwesịrị iji amamihe chọpụta ihe mere o ji mee ihe ahụ. Nke ka nke, ha kwesịrị ịrịọ Jehova ka o nye ha mmụọ nsọ ya nke ga-enyere ha aka iji amamihe kpee ikpe ahụ, ime ebere na ikpe ikpe ziri ezi ka ya.—Ọpụ. 34:6, 7.

15. Kọwaa ihe dị iche n’otú Jizọs si were ndị mmehie na otú ndị Farisii si were ha.

15 Ndị Farisii na-elekwasị anya karịchaa n’ihe ọjọọ mmadụ mere, kama ilekwasị anya n’ụdị onye onye ahụ bụ. Mgbe ndị Farisii hụrụ Jizọs n’oge ọ bịara oriri Matiu kpọrọ n’ụlọ ya, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Gịnị mere onye ozizi unu ji na-eso ndị ọnaụtụ na ndị mmehie eri ihe?” Jizọs zara ha, sị: “Mkpa ọgwọ ọrịa adịghị ndị ahụ́ dị mma, kama mkpa ya dị ndị ahụ́ na-enye nsogbu. Ya mere, gaanụ mata ihe ihe a pụtara, ‘Achọrọ m ebere, ọ bụghị àjà.’  N’ihi na ọ bụghị ndị ezi omume ka m bịara ịkpọ, kama ọ bụ ndị mmehie.” (Mat. 9:9-13) Jizọs ọ̀ na-agbachitere ndị mmehie? Mbanụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na otu n’ime ihe dị mkpa Jizọs kụziri bụ na ọ gwara ndị mmehie ka ha chegharịa. (Mat. 4:17) Ma, Jizọs ghọtara ma ọ dịghị ihe ọzọ na ụfọdụ “ndị ọnaụtụ na ndị mmehie” chọrọ ichegharị. Ha abịaghị n’ụlọ Matiu naanị ka ha rie ihe. Kama, ‘ha dị ọtụtụ malitere iso Jizọs.’ (Mak 2:15) Ọ dị mwute na ọtụtụ ndị Farisii ewereghị ndị mmehie otú Jizọs si were ha. Ha ekwetaghị na ha nwere ike ichegharị. Ha na-ele ha anya ka ndị na-enweghị olileanya. Ma, Jehova adịghị ka ha. Ọ na-eme ebere ma na-ekpe ikpe ziri ezi.

16. Gịnị ka kọmitii ikpe ga-agbalị chọpụta?

16 Taa, ndị okenye kwesịrị iṅomi Jehova, bụ́ onye “hụrụ ikpe ziri ezi n’anya.” (Ọma 37:28) Ihe mbụ ha ga-eme bụ ‘ịjụ ase nke ọma,’ ka ha chọpụta ma onye ahụ ò mere ihe ọjọọ ahụ. Ọ bụrụ na ha chọpụta na o mere ya, ha ga-eji Baịbụl dozie okwu ahụ. (Diut. 13:12-14) Kọmitii ikpe lebawa okwu ahụ anya, ha kwesịrị ịsa anya ná mmiri chọpụta ma Onye Kraịst ahụ ò chegharịala ma ọ bụ na o chegharịbeghị. Ma, ọ naghị adịcha mfe. Otú e si ama na onye ahụ echegharịala bụ otú o si ele ihe ahụ o mere anya, otú o si kpaa àgwà na otú obi dị ya. (Mkpu. 3:3) Ka e nwee ike meere onye mere mmehie ebere, ọ ga-echegharị. *

17, 18. Olee otú ndị okenye ga-esi chọpụta na mmadụ echegharịala n’eziokwu? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

17 Jehova na Jizọs na-enyocha obi, ma ndị okenye anaghị enyocha obi. Ọ bụrụ na ị bụ okenye, olee otú ị ga-esi chọpụta na mmadụ echegharịala n’eziokwu? Ihe mbụ ị ga-eme bụ ịrịọ Jehova ka o nye gị amamihe na nghọta. (1 Eze 3:9) Nke abụọ bụ ime nchọnchọ n’Okwu Chineke nakwa n’akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-ebipụtara anyị ka i nwee ike ịmata ihe dị iche ná “mwute nke ụwa” na ‘mwute dị ka uche Chineke si dị,’ ya bụ, ezigbo nchegharị. (2 Kọr. 7:10, 11) Chọpụta otú Baịbụl si kọwaa ndị chegharịrị ná mmehie ha na ndị na-echegharịghị. Olee otú Baịbụl si kọwaa otú obi dị ha, àgwà ha, na otú ha si eche echiche?

18 N’ikpeazụ, gbalịa ka i chebara onye ahụ echiche, ọ bụghị naanị ihe ahụ o mere. Chee otú e si zụọ ya, ihe o bu n’obi, na nsogbu ndị o nwere. Baịbụl kwuru banyere Jizọs, bụ́ onyeisi ọgbakọ Ndị Kraịst, sị: “Ọ bụghị naanị ihe anya ya hụrụ ka ọ ga-eji na-ekpe ikpe, ọ gaghịkwa adọ aka ná ntị naanị dị ka ihe ntị ya nụrụ si dị. Ọ ga na-ekpe ndị ogbenye ikpe ezi omume, ọ ga na-enyekwa ịdọ aka ná ntị n’izi ezi n’ihi ndị dị umeala n’obi n’ụwa.” (Aịza. 11:3, 4) Ndị okenye, Jizọs họpụtara unu ka unu na-elekọta ọgbakọ ya, ọ ga-enyekwara unu aka ịna-ekpe ikpe ziri ezi na ịna-eme ebere. (Mat. 18:18-20) Ọ̀ bụ na obi adịghị anyị ụtọ na anyị nwere ndị okenye na-elekọta anyị? Obi dị anyị ụtọ na ha na-agbalịsi ike ime ka anyị na-emere ụmụnna anyị ebere ma na-ekpe ikpe ziri ezi n’ọgbakọ.

19. Olee ihe ị mụtara banyere obodo mgbaba ndị ahụ ị ga-achọ ịna-eme?

19 “Ụkpụrụ nke ihe ọmụma na nke eziokwu” dị n’Iwu Mozis. Ọ na-akụziri anyị banyere Jehova nakwa ihe ndị ọ chọrọ ka anyị na-eme. (Rom 2:20) Dị ka ihe atụ, e ji obodo mgbaba ndị ahụ na-akụziri ndị okenye otú ha ga-esi ‘na-ekpe ikpe ziri ezi.’ E jikwa obodo ndị ahụ na-akụziri anyị otú anyị ga-esi ‘jiri obiọma na ọmịiko na-emeso ibe anyị ihe.’ (Zek. 7:9) Anyị anaghị edebe Iwu Mozis. Ma, Jehova anaghị agbanwe agbanwe. Ọ ka jikwa ikpe ziri ezi na ime ebere kpọrọ ihe. Obi dị anyị ụtọ na anyị na-efe Chineke, bụ́ onye kere anyị n’onyinyo ya, onye anyị nwere ike iṅomi, na onye anyị ga-agbaba n’ime ya.

^ para. 16 Gụọ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ,” nke dị n’Ụlọ Nche September 15, 2006, peeji nke 30.