Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Nọvemba 2017

Jirinụ Ọṅụ Na-abụku Jehova Abụ

Jirinụ Ọṅụ Na-abụku Jehova Abụ

“Ọ dị mma ịbụku Chineke anyị abụ olu ụtọ.”—ỌMA 147:1.

ABỤ: 10, 2

1. Olee uru ịbụ abụ na-abara anyị?

OTU onye a ma ama na-ede abụ kwuru, sị: “Okwu, na-eme ka i chee echiche. Egwú, na-eme ka obi na-atọ gị ụtọ. Ma, abụ na-eru gị n’obi.” Anyị na-eji abụ anyị eto Nna anyị nke eluigwe bụ́ Jehova, jirikwa ya na-egosi na anyị hụrụ ya n’anya. Ha na-eme ka anyị bịarukwuo ya nso. Ka a sịkwa ihe mere ịbụ abụ ji dị ezigbo mkpa n’ofufe anyị na-efe Chineke ma ànyị na-abụ ya n’onwe anyị ma ànyị na-abụ ya mgbe anyị na ụmụnna anyị zukọtara.

2, 3. (a) Olee otú ụfọdụ ndị nwere ike isi na-ele ịbụ abụ n’ọgbakọ anya? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-eleba anya na ha?

2 Ma, olee otú obi na-adị gị ma ị na-abụ abụ n’ọmụmụ ihe? Ihere ọ̀ na-eme gị? N’obodo ụfọdụ, ahụ́ anaghị erucha ụmụ nwoke ala ịbụ abụ n’ihu ọha. Ụdị ihe a nwere ike ịkpa ọgbakọ aka ọjọọ, nke ka nke, ma ọ bụrụ na ndị okenye achọghị iso na-abụ abụ n’ọmụmụ ihe ma ọ bụ na ha na-eme ihe ndị ọzọ mgbe a na-abụ abụ.—Ọma 30:12.

3 Ọ bụrụ na anyị ghọta na ịbụ abụ so n’otu ụzọ anyị si efe Jehova, anyị agaghị achọ ịpụ mgbe a na-abụ abụ ma ọ bụ ghara iso n’ihe omume ahụ a na-aga ime. N’ihi ya, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Olee otú m si ele ịbụ abụ  n’ọmụmụ ihe anya? Olee ihe m ga-eme ma ọ bụrụ na ọ na-esiri m ike ịbụ abụ n’ihu ọha? Olee otú m ga-esi jiri obi m niile na-abụ abụ?’

ỊBỤ ABỤ BỤ OTU ỤZỌ DỊ MKPA ANYỊ SI EFE JEHOVA

4, 5. Olee otú e si hazie maka ịbụ abụ n’ụlọ nsọ n’Izrel oge ochie?

4 Kemgbe ụwa, ndị na-efe Jehova na-eji abụ eto ya. Anyị kwesịrị icheta na mgbe ndị Izrel oge ochie na-erubere Jehova isi, ịbụ abụ bụ otu ụzọ dị mkpa ha si efe Chineke. Dị ka ihe atụ, mgbe Eze Devid kwadebere otú a ga-esi na-eje ozi n’ụlọ nsọ Chineke, ọ họpụtara puku ndị Livaị anọ ka ha jiri abụ na-eto Jehova. N’ime ọnụ ọgụgụ a, narị mmadụ abụọ na iri asatọ na asatọ bụ ‘ndị a zụrụ azụ ịbụrụ Jehova abụ, ha niile bụ ndị ọkà.’—1 Ihe 23:5; 25:7.

5 Mgbe ndị Izrel na-enyefe Jehova ụlọ nsọ ahụ, ha bụkwara abụ. Baịbụl kwuru, sị: “O wee ruo na ozugbo ndị ahụ bụ́ ndị na-afụ opi na ndị ahụ na-abụ abụ ji otu olu na-agụ egwú iji too Jehova ma kelee ya, ozugbo ha jikwa opi na ájà na ngwá egwú na-abụ abụ wee na-eto Jehova, . . . ebube Jehova jupụtara n’ụlọ ezi Chineke.” O doro anya na nnọkọ ahụ mere ka okwukwe ha sikwuo ike.—2 Ihe 5:13, 14; 7:6.

6. Kọwaa otú Nehemaya si hazie ndị Livaị ka ha bụọ abụ mgbe ọ bụ gọvanọ na Jeruselem.

6 Mgbe Nehemaya duuru ndị Izrel ka ha wughachi mgbidi Jeruselem, ọ hazikwara ndị Livaị ka ha bụọ abụ ma kụọ egwú. Mgbe ha rụchara mgbidi ahụ ma nyefee ya Jehova, abụ ndị pụrụ iche ha bụrụ mere ka obi tọọ onye ukwu na onye nta ụtọ n’ụbọchị ahụ. E nwere “nnukwu ìgwè abụọ na-ekwe ukwe ekele.” Otu ìgwè nọ na-aga n’aka nri, nke ọzọ ana-aga n’aka ekpe ruo mgbe ha zukọrọ n’elu mgbidi dị nso n’ụlọ nsọ. Abụ ha na-abụ dasiri ụda ike nke na ndị nọ n’ebe dị anya nọ na-anu olu ha. (Nehe. 12:27, 28, 31, 38, 40, 43) O doro anya na obi tọrọ Jehova ụtọ mgbe ọ nụrụ ka ndị Izrel si n’ala ala obi ha bụọ abụ iji too ya.

7. Olee otú Jizọs si gosi na ịbụ abụ ga-abụ otu ụzọ dị mkpa Ndị Kraịst ga-esi na-efe Jehova?

7 Mgbe e hiwere ọgbakọ Ndị Kraịst, abụ ka bụkwa otu ihe dị mkpa a na-eji efe Jehova. Chegodị ihe mere n’abalị kacha mkpa kemgbe e kere mmadụ. Mgbe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nwechara Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, ha niile bụrụ abụ iji too Jehova.—Gụọ Matiu 26:30.

8. Olee ihe ndị na-eso ụzọ Jizọs mere iji too Chineke?

8 Ndị na-eso ụzọ Jizọs n’oge ochie bụkwara abụ mgbe ha zukọrọ iji too Chineke. Ha anaghị ezukọ n’ụlọ nsọ ka ndị Izrel, ha na-ezukọ n’ụlọ ndị mmadụ. Ọ bụ eziokwu na ụlọ ndị ahụ amaghị mma ma ọ bụ buo ibu ka ụlọ nsọ ahụ, ha ka na-eji ịnụ ọkụ n’obi bụkuo Jehova abụ. Ọ bụ ya mere Pọl onyeozi ji gwa ụmụnna ya, sị: “Jirinụ abụ ọma na otuto a na-enye Chineke na abụ ime mmụọ na amara na-ezi ibe unu ihe, na-adụkwa ibe unu ọdụ, na-abụkunụ Jehova abụ n’ime obi unu.” (Kọl. 3:16) Abụ ndị dị n’akwụkwọ abụ anyị bụ “abụ ime mmụọ” anyị kwesịrị iji obi anyị na-abụ. Ha so ná nri “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” na-enye anyị n’oge kwesịrị ekwesị.—Mat. 24:45.

OTÚ Ị GA-ESI JIRI OBI IKE NA-ABỤ ABỤ

9. (a) Gịnị nwere ike ime ka ọ na-esiri ụfọdụ ndị ike ịna-abụ abụ n’ọmụmụ ihe nakwa ná mgbakọ? (b) Olee otú anyị kwesịrị isi jiri abụ na-eto Jehova? Olee ndị kwesịrị ibute ụzọ n’ịbụ abụ? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

9 Olee ihe ụfọdụ nwere ike ime ka ọ na-esiri gị ike ịbụ abụ? O nwere ike ịbụ na  a naghị abụkarị abụ n’ezinụlọ unu ma ọ bụ n’obodo unu. O nwekwara ike ịbụ na ị na-ege otú ndị bụ́ aka ochie n’ịbụ abụ si abụ abụ na redio ma ọ bụ na tiivi. Ma, i jiri olu gị tụnyere olu ha, ihere nwere ike imewe gị ma ọ bụ ike ụwa agwụ gị. Ma, nke a ekwesịghị ime ka ị ghara iji abụ na-eto Jehova n’ihi na ọ bụ ihe anyị kwesịrị ịna-eme. N’ihi ya, ị bụwa abụ, welie akwụkwọ abụ gị elu, weliekwa isi gị elu, ma jiri obi gị niile bụọ ya. (Ezra 3:11; gụọ Abụ Ọma 147:1.) Taa, n’ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze nwere tiivi, a bụwa abụ, a na-egosi ya na tiivi. Nke a nwekwara ike inyere anyị aka ịbụ abụ. E meela ka ịbụ abụ Alaeze soro n’ihe a na-eme n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze maka ndị okenye. Nke a ga-eme ka ndị okenye bute ụzọ n’ịbụ abụ n’ọmụmụ ihe.

10. Gịnị ka anyị kwesịrị icheta ma ọ bụrụ na ụjọ na-eme ka ọ na-esiri anyị ike iji olu dara ụda bụọ abụ?

10 Otu ihe mere o ji esiri ọtụtụ ndị ike iji olu dara ụda bụọ abụ bụ ụjọ. O nwere ike ịbụ na ụjọ na-atụ ha na olu ha nwere ike ịka nke ndị ọzọ ma ọ bụkwanụ na olu ha adịghị mma. Ma, anyị kwesịrị iburu n’obi na mgbe anyị na-ekwu okwu, “anyị niile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro.” (Jems 3:2) Ma, nke a anaghị eme ka anyị ghara ikwu okwu. N’ihi ya, gịnị mere anyị ga-eji kwe ka olu abụ anyị na-adịghị mma mee ka anyị ghara iji abụ na-eto Jehova?

11, 12. Olee ihe ndị anyị nwere ike ime ka olu abụ anyị kakwuo mma?

11 O nwere ike ịbụ na ụjọ na-atụ anyị ịbụ abụ n’ihi na anyị amaghị otú e si abụ abụ. Ma, e nwere ihe ndị anyị nwere ike ime ka olu abụ anyị kakwuo mma. *

12 I nwere ike iji olu dara ụda bụọ abụ ma ọ bụrụ na ị mụta otú ị ga-esi na-eku ume nke ọma. Otú ahụ ọkụ eletrik si eme ka bọlb nwuo, ka iku ume na-eme ka olu  gị na-ada ụda mgbe ị na-ekwu okwu ma ọ bụ na-abụ abụ. I kwesịrị ịbụ abụ ka ọ daa ụda otú i si ekwu okwu, ma ọ bụ daa ụda karịa otú i si ekwu okwu. (Gụọ ihe ndị i nwere ike ime n’akwụkwọ Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, peeji nke 181 ruo nke 184, n’isiokwu nta bụ́ “Chịkwaa Otú I Si Eku Ume n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị.”) Nke bụ́ eziokwu bụ na Baịbụl gwara ndị na-efe Jehova ka ha ‘tie mkpu ọṅụ’ mgbe ha na-abụ abụ otuto.—Ọma 33:1-3.

13. Kọwaa otú anyị nwere ike isi jirikwuo obi anyị niile na-abụ abụ.

13 Anyị nwewe ofufe ezinụlọ ma ọ bụ na-amụ ihe n’onwe anyị, gbalịa mee ihe ndị a: Họrọ abụ kacha atọ gị ụtọ n’akwụkwọ abụ anyị. Jiri obi gị niile gụpụta ihe e dere na ya n’olu dara ụda. Ihe ọzọ ị ga-eme bụ iji ụda olu ahụ i ji gụpụta ya gụpụta okwu niile dị n’otu ahịrịokwu n’abụ ahụ n’akwụsịghị ka i kuru ume. Ị gụpụtachaa ya, gị ejirizie ụda olu ahụ i ji gụpụta ya bụzie ya. (Aịza. 24:14) Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, olu gị ga-adasikwu ụda ike. Nke ahụ dịkwa mma. Ekwela ka ọ tụwa gị ụjọ ma ọ bụ mewe gị ihere.

14. (a) Olee otú imeghe ọnụ anyị nke ọma ga-esi nyere anyị aka n’ịbụ abụ? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Ihe Ị Ga-eme Ka Olu Abụ Gị Kakwuo Mma.”) (b) A bịa n’ihe ndị e kwuru mmadụ ga-eme ka olu ya dị mma n’abụ, olee ndị nke nyerela gị aka?

14 Ka i nwee ike inwe ezigbo olu abụ, i kwesịrị imeghe ọnụ gị. N’ihi ya, ị bụwa abụ, meghee ọnụ gị nke ọma karịa otú i si emeghe ọnụ ma i kwuwa okwu. Gịnị ka ị ga-eme ma i chee na olu gị anaghị ada ụda ma ọ bụ na ọ na-adasi ụda ike? Ị ga-ahụ ihe ndị ga-enyere gị aka n’akwụkwọ Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, peeji nke 184, n’igbe isiokwu ya bụ́ “Imeri Ihe Isi Ike Ụfọdụ Kpọmkwem.”

IJI OBI GỊ NIILE NA-ABỤ ABỤ

15. (a) Olee ọkwa a mara n’afọ 2016 ná nnọkọ a na-enwe kwa afọ? (b) Olee ihe ụfọdụ mere e ji wepụta akwụkwọ abụ ọhụrụ?

15 Ná nnọkọ Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania na-enwe  kwa afọ, nke afọ 2016, Nwanna Stephen Lett, so n’Òtù Na-achị Isi kwuru na n’oge na-adịghị anya, a ga-ewepụta akwụkwọ abụ ọhụrụ isiokwu ya bụ ‘Jiri Ọṅụ Bụkuo Jehova Abụ,’ a ga na-abụ n’ọmụmụ ihe. Obi tọrọ ndị bịara nnọkọ a ezigbo ụtọ mgbe ha nụrụ ya. Nwanna Lett kwuru na ihe mere e ji ewepụta akwụkwọ abụ ọhụrụ a bụ n’ihi na n’afọ 2013, e degharịrị Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ nke Bekee. A gbanwere okwu ndị dị n’akwụkwọ abụ a n’ihi na ha adịkwaghị ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ. N’akwụkwọ abụ ọhụrụ ahụ, e nwekwara abụ ndị ọhụrụ kwuru banyere ozi ọma anyị na-ezi nakwa ihe mgbapụta ahụ. Ebe ọ bụ na ịbụ abụ so n’otu ụzọ dị mkpa anyị si efe Chineke, Òtù Na-achị Isi chọrọ ka e wepụta akwụkwọ abụ ọhụrụ ga-ama ezigbo mma. N’ihi ya, mkpo ya dị ka nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ.

16, 17. Olee ihe ndị a gbanwere n’akwụkwọ abụ ọhụrụ anyị?

16 Ka ọ dịrị mmadụ mfe ịchọta abụ ndị dị na ‘Jiri Ọṅụ Bụkuo Jehova Abụ,’ e mere ka isiokwu ndị kwuru gbasara otu ihe nọkọta ọnụ. Dị ka ihe atụ, abụ iri na abụọ ndị mbụ kwuru gbasara Jehova, abụ asatọ na-eso ya ekwuo gbasara Jizọs na ihe mgbapụta ahụ. Otú ahụ ka e mekwara isiokwu ndị ọzọ. E depụtara ha niile ná mbido akwụkwọ abụ ahụ. Nke a ga-enyere nwanna chọrọ ikwu okwu ihu ọha aka ịhọrọ abụ nke ọ ga-achọ ka a bụọ.

17 Iji nyere mmadụ niile aka isi n’ala ala obi ha bụọ abụ, a gbanwere okwu ụfọdụ dịbu n’abụ anyị ka o dokwuo anya. A gbanwere abụ isiokwu ya bụ “Ogologo Ntachi Obi” ka ọ bụrụ “Na-enwenụ Ndidi.” A gbanwekwara okwu ndị dị n’abụ a. Ọ dabara adaba na a gbanwere abụ a isiokwu ya bụ́ “Chebe Obi Gị” ka ọ bụrụ “Anyị Na-echebe Obi Anyị.” Gịnị mere e ji gbanwee ya? Ọ bụ n’ihi na n’oge mbụ, mmadụ bụwa abụ a, ọ na-agwa ndị ọzọ ihe ha ga-eme. Nke a nwere ike ime ka ahụ́ ghara ịna-eru ndị ọhụrụ, ndị nwere mmasị, ụmụaka, na ụmụnna nwaanyị, ala. Ọ bụ ya mere e ji gbanwee isiokwu abụ a na okwu ndị e ji dee ya.

Na-amụ otú e si abụ abụ ma i nwewe ofufe ezinụlọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18)

18. Gịnị mere anyị ji kwesị ịmụ otú e si abụ abụ ọhụrụ anyị? (Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji.)

18 Ọtụtụ abụ ndị dị na ‘Jiri Ọṅụ Bụkuo Jehova Abụ,’ dị ka ekpere. Abụ ndị a ga-enyere gị aka ịgwa Jehova otú obi dị gị. Abụ ndị ọzọ ‘ga-akpali anyị ịhụ ibe anyị n’anya na ịrụ ezi ọrụ.’ (Hib. 10:24) Anyị kwesịrị ịmata ụda abụ ndị ahụ na ihe ha na-ekwu. Ọ bụrụ na anyị na-amụ otú e si abụ abụ n’ụlọ anyị, anyị nwere ike ịmụta otú anyị ga-esi jiri obi anyị niile na-abụ ha, ha ana-erukwa anyị n’obi. *

19. Olee otú mmadụ niile nọ n’ọgbakọ nwere ike isi fee Jehova?

19 Cheta na ịbụ abụ bụ otu ụzọ dị mkpa anyị si efe Jehova. Ọ bụ otu ụzọ anyị si egosi Jehova na anyị hụrụ ya n’anya, nakwa na obi dị anyị ụtọ maka ihe ndị o meere anyị. (Gụọ Aịzaya 12:5.) Ọ bụrụ na anyị jiri ọṅụ na-abụku Jehova abụ, ọ ga-eme ka ndị ọzọ jiri obi ha niile na-abụ abụ. N’eziokwu, mmadụ niile nọ n’ọgbakọ, ma ụmụaka ma ndị katarala ahụ́ ma ndị ọhụrụ nwere ike iji abụ fee Jehova. N’ihi ya, gbalịa ka i jiri obi gị niile na-abụ abụ. Mee ihe a otu onye ọbụ abụ kwuru. Ọ sịrị: ‘Bụkuo Jehova abụ.’ N’ihi ya, jiri ọṅụ bụkuo Jehova abụ.—Ọma 96:1.

^ para. 11 Ị chọọ ịmatakwu ihe ga-enyere gị aka ime ka olu abụ gị kakwuo mma, lee Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova nke ọnwa Disemba afọ 2014 e mere n’asụsụ Bekee (Gaa n’ebe e dere Video on Demand, pịa ebe e dere FROM OUR STUDIO).

^ para. 18 Tupu a malite ihe omume nke ụtụtụ na nke ehihie n’ụbọchị mgbakọ ọ bụla, a na-enwe abụ ndị a ga-eji egosi ihe ndị dị iche iche na tiivi nke ga-ewe nkeji iri. Abụ ndị a e ji ngwá egwú kụọ ga-enyere anyị aka kwadebe obi anyị maka ihe omume ndị a na-aga ime. N’ihi ya, tupu abụ ndị a ebido, a na-agba anyị niile ume ka anyị nọrọ n’oche anyị gere ha.