Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

Ekwela Ka Ihe Ọ Bụla Gbochie Gị Inweta Ihe Ahụ A Na-agbata n’Ọsọ

Ekwela Ka Ihe Ọ Bụla Gbochie Gị Inweta Ihe Ahụ A Na-agbata n’Ọsọ

“Unu ekwela ka onye ọ bụla gbochie unu inweta ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ.”—KỌL. 2:18.

ABỤ: 122, 139

1, 2. (a) Olee ihe a na-agbata n’ọsọ ndị ohu Chineke na-atụsi anya ike inweta? (b) Gịnị na-enyere anyị aka ilekwasị anya n’ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

TAA, Ndị Kraịst e tere mmanụ nwere olileanya magburu onwe ya otú ahụ Pọl onyeozi nwere. Olileanya ahụ bụ inweta “ihe a na-agbata n’ọsọ, bụ́ òkù a kpọrọ ịga eluigwe, nke Chineke kpọrọ.” (Fil. 3:14) Ha na-atụsi anya ike iso Jizọs Kraịst chịa n’Alaeze eluigwe, nakwa iso ya mee ka ụmụ mmadụ zuo okè. (Mkpu. 20:6) Ihe a bụ olileanya magburu onwe ya Chineke chọrọ ka ha nweta. Ndị so n’atụrụ ọzọ nwere olileanya dị iche. Ha na-atụsi anya ike inweta ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ, ya bụ, ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Olileanya a na-atọgbu ha atọgbu.—2 Pita 3:13.

2 Ka Ndị Kraịst e tere mmanụ nwee ike ikwesị ntụkwasị obi ma nweta ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ, Pọl gwara ha, sị: “Na-atụkwasịnụ uche n’ihe ndị dị n’elu.” (Kọl. 3:2) Ha ekwesịghị ichefu olileanya a magburu onwe ya ha nwere, ya bụ, inweta ndụ ebighị ebi n’eluigwe. (Kọl. 1:4, 5) N’eziokwu, ọ bụrụ na ndị ohu Chineke niile echebara ihe ọma a Jehova kwuru na ọ ga-emere  ha echiche, ọ ga-enyere ha aka ilekwasị anya n’ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ, ma hà nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’eluigwe ma ọ̀ bụ n’ụwa a.—1 Kọr. 9:24.

3. Olee aka ná ntị Pọl dọrọ Ndị Kraịst ibe ya?

3 Pọl dọrọ Ndị Kraịst ibe ya aka ná ntị banyere ihe ndị nwere ike ime ka ha ghara inweta ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ. Dị ka ihe atụ, o degaara ọgbakọ dị na Kọlọsi akwụkwọ ozi banyere Ndị Kraịst ụgha na-edebe Iwu Mozis n’ihi na ha chọrọ ka ha na Chineke dịrị ná mma, kama, inwe okwukwe na Kraịst. (Kọl. 2:16-18) Pọl gwakwara anyị ihe ndị e nwere taa ndị nwere ike ime ka anyị ghara inweta ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ. Dị ka ihe atụ, ọ gwara anyị otú anyị ga-esi gbaara agụụ mmekọahụ rụrụ arụ ọsọ, dozie nsogbu anyị na ụmụnna anyị nwere, nakwa otú anyị ga-esi dozie nsogbu ezinụlọ. Ihe ndị a ọ gwara anyị baara anyị uru taa. N’ihi ya, ka anyị tụlee ụfọdụ aka ná ntị Pọl dọrọ ndị Kọlọsi, nke dị n’akwụkwọ ozi o degaara ha.

GBAARA AGỤỤ MMEKỌAHỤ RỤRỤ ARỤ ỌSỌ

4. Gịnị ka agụụ mmekọahụ rụrụ arụ nwere ike ịnapụ anyị?

4 Mgbe Pọl gwachara ụmụnna ya banyere olileanya ahụ magburu onwe ya ha nwere, ọ gwakwara ha, sị: “Ya mere, meenụ ka akụkụ ahụ́ unu ndị dị n’elu ụwa nwụọ n’ihe banyere ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ mmekọahụ, ọchịchọ ọjọọ, na anyaukwu.” (Kọl. 3:5) Agụụ mmekọahụ rụrụ arụ nwere ike ịkpatara anyị oké nsogbu. O nwere ike ime ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma, meekwa ka anyị ghara inweta ihe anyị na-atụ anya ya n’ọdịnihu. E nwere ihe otu nwanna kwara iko ma hapụ ọgbakọ, mechaa bataghachi kwuru. O kwuru, sị: “Agụụ mmekọahụ rụrụ arụ bịara rie m isi nke na akwụsịghị m ya ruo mgbe o mere ka m kwaa iko.”

5. Gịnị ka anyị ga-eme ma e nwee ihe nwere ike ime ka anyị mee omume rụrụ arụ Jehova kpọrọ asị?

5 Anyị kwesịrị ịkpachara anya, nke ka nke, ma e nwee ihe nwere ike ime ka anyị mee omume rụrụ arụ Jehova kpọrọ asị. Dị ka ihe atụ, nwoke na nwaanyị chọrọ ịlụ kwesịrị ịmalite mgbe ahụ ha kwekọrịtara ịlụ kwurịta ihe ha na-ekwesịghị ime ma a bịa n’ihe gbasara imetụ ibe ha aka, isusu ọnụ ma ọ bụ ịnọ naanị ha n’ebe na-ekwesịghị ekwesị. (Ilu 22:3) Ihe ọzọ nwere ike ime ka anyị mee omume rụrụ arụ Jehova kpọrọ asị bụ mgbe anyị gara ihe banyere achụmnta ego ebe ọzọ, ma ọ bụ mgbe anyị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe anyị na-arụkọ ọrụ. (Ilu 2:10-12, 16) Ọ bụrụ na nke ọ bụla n’ime ihe ndị a adabara gị, mee ka ha mara na ị bụ Onyeàmà Jehova. Na-akpa àgwà ọma, echefula na ịchụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị nwere ike ịkpatara gị nsogbu. Anyị kwesịkwara ịkpachara anya mgbe obi na-adịghị anyị mma na mgbe owu na-ama anyị. N’oge ndị ahụ, anyị nwere ike chọwa onye ga-egosi anyị na ọ hụrụ anyị n’anya. Anyị nwedịrị ike chọwa ịnabata onye ọ bụla bịakwutere anyị. Ọ bụrụ na ụdị ihe a emee gị, kọọrọ Jehova na ụmụnna ka ha nyere gị aka. Ime otú ahụ ga-eme ka i nweta ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ.—Gụọ Abụ Ọma 34:18; Ilu 13:20.

6. Olee ihe anyị kwesịrị iburu n’obi ma a bịa ná ntụrụndụ ndị anyị na-ahọrọ?

6 Ka anyị nwee ike ịgbara agụụ mmekọahụ rụrụ arụ ọsọ, anyị kwesịrị ịkpọ ntụrụndụ rụrụ arụ asị. Taa, ihe ụlọ ọrụ dị iche iche na-emepụta ndị mmadụ ji na-atụrụ ndụ yiri ụdị ihe ndị mmadụ mere na Sọdọm na Gọmọra oge ochie. (Jud 7) Ndị na-emepụta ihe ndị ahụ na-eme ka mmekọahụ rụrụ arụ yie ka ọ bụghị ihe ọjọọ, nakwa na o nweghị nsogbu ọ ga-akpata. Anyị kwesịrị ịkpachara anya. Anyị ekwesịghị iji ihe niile ha mepụtara na-atụrụ  ndụ. Kama, anyị kwesịrị ịhọrọ ihe ndị anyị ji atụrụ ndụ nke na-agaghị eme ka anyị ghara inweta ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ, ya bụ, ndụ.—Ilu 4:23.

“YIRINỤ” ỊHỤNANYA NA OBIỌMA

7. Olee nsogbu anyị nwere ike inwe n’ọgbakọ?

7 O doro anyị niile anya na ịnọ n’ọgbakọ Jehova bụ ihe ọma o meere anyị. Okwu Chineke anyị na-amụ n’ọmụmụ ihe nakwa aka anyị na-enyerịtara ibe anyị na-enyere anyị aka ilekwasị anya n’ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ. Ma, mgbe ụfọdụ, nghọtahie nwere ike ime ka anyị na ụmụnna anyị sewe okwu. Ọ bụrụ na anyị edozighị ya, o nwere ike ime ka anyị buwere ha iwe n’obi.—Gụọ 1 Pita 3:8, 9.

8, 9. (a) Olee àgwà ndị ga-enyere anyị aka inweta ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ? (b) Olee ihe ga-enyere anyị aka ime ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’udo ma ha kpasuo anyị iwe?

8 Gịnị ka anyị ga-eme ka iburu ụmụnna anyị iwe n’obi ghara ịnapụ anyị ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ? Pọl gwara ndị Kọlọsi, sị: “Dị ka ndị Chineke họọrọ, ndị dị nsọ a hụrụ n’anya, yirinụ obi ọmịiko, obiọma, ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ, na ogologo ntachi obi, dị ka uwe. Na-ediri ibe unu ihe ma na-agbaghara ibe unu kpamkpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya. Ọbụna dị ka Jehova gbaghaara unu kpamkpam, na-emekwanụ otú ahụ. Ma, e wezụga ihe ndị a niile, yirinụ ịhụnanya dị ka uwe, n’ihi na ọ bụ ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.”—Kọl. 3:12-14.

9 Anyị hụ ụmụnna anyị n’anya ma nwee obiọma, anyị ga na-agbaghara ha. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nwanna agwa anyị ma ọ bụ mee anyị ihe were anyị iwe, anyị nwere ike icheta mgbe anyị mekwara ndị ọzọ otú ahụ. Ọ̀ bụ na obi atọghị anyị ụtọ na ha gbaghaara anyị mgbe anyị mejọrọ ha? (Gụọ Ekliziastis 7:21, 22.) Ihe kacha atọ anyị ụtọ bụ na Kraịst mere ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’otu. (Kọl. 3:15) Anyị niile hụrụ otu Chineke ahụ n’anya, na-ekwusa otu ihe, ọtụtụ nsogbu ndị anyị na-enwe ka ụmụnna anyị na-enwekwa. Ọ bụrụ na anyị adị obiọma, hụ ụmụnna anyị n’anya ma na-agbaghara ha, ọgbakọ anyị ga na-adị n’otu. Ọ ga-emekwa ka ihe ọ bụla ghara imegharị anyị anya n’ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ.

10, 11. (a) Gịnị mere anyaụfụ ji dị njọ? (b) Olee ihe anyị ga-eme ka anyaụfụ ghara ime ka ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ kwaa anyị?

10 Ihe atụ ndị e nwere na Baịbụl na-echetara anyị na anyaụfụ nwere ike ime ka anyị ghara inweta ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ. Dị ka ihe atụ, Ken nweere nwanne ya Ebel anyaụfụ ma gbuo ya. Kora, Detan, na Abaịram nwekwaara Mozis anyaụfụ ma megide ya. Eze Sọl nweere Devid anyaụfụ n’ihi otú ihe si na-agara ya nke ọma ma gbalịa igbu ya. Ka a sịkwa ihe mere Baịbụl ji kwuo, sị: “N’ebe e nwere ekworo na esemokwu, n’ebe ahụ ka ọgba aghara na ihe ọjọọ niile na-adị.”—Jems 3:16.

11 Ọ bụrụ na anyị agbaa mbọ hụ ndị ọzọ n’anya ma dịrị obiọma, anyị agaghị na-enwere ha anyaụfụ. Baịbụl kwuru, sị: “Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi na obiọma. Ịhụnanya adịghị ekwo ekworo.” (1 Kọr. 13:4) Ka anyaụfụ ghara ịgba mgbọrọgwụ n’obi anyị, anyị ga-agbalịsi ike na-ele ihe anya otú Chineke si ele ya, were ụmụnna anyị na anyị na ha bụ otu ahụ́. Nke a ga-eme ka ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi otú ahụ Baịbụl kwuru. O kwuru, sị: “Ọ bụrụ na e mee ka otu akụkụ ahụ́ dị ebube, akụkụ ahụ́ ndị ọzọ niile na-eso ya aṅụrị ọṅụ.” (1 Kọr. 12:16-18, 26) Ma, kama ịna-enwere ndị ọzọ anyaụfụ, obi kwesịrị ịna-atọ anyị ụtọ ma ihe ọma meere ha. Chegodị banyere nwa Eze Sọl aha ya bụ Jọnatan. O nwereghị Devid anyaụfụ mgbe Jehova họpụtara ya ka ọ bụrụ eze kama ịhọpụta ya. Kama, ọ kwadoro Devid. (1 Sam. 23:16-18) Ànyị  nwere ike dịrị obiọma ma na-ahụ ndị ọzọ n’anya ka Jọnatan?

OTÚ ANYỊ NA NDỊ EZINỤLỌ ANYỊ GA-ESI NWETA IHE AHỤ A NA-AGBATA N’ỌSỌ

12. Olee ihe Baịbụl kwuru ezinụlọ ga-eme ka ha nwee ike inweta ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ?

12 Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ezinụlọ anyị ana-eme ihe Baịbụl kwuru, udo ga-adị n’ezinụlọ anyị, obi ana-atọkwa anyị ụtọ. Ọ ga-emekwa ka anyị nweta ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ. Olee ihe Pọl gwara Ndị Kraịst nọ na Kọlọsi ka ha na-eme n’ezinụlọ ha? O kwuru, sị: “Unu ndị bụ́ nwunye, na-edonụ onwe unu n’okpuru di unu, dị ka o kwesịrị ekwesị n’ime Onyenwe anyị. Unu ndị bụ́ di, na-ahụnụ nwunye unu n’anya, unu ewesola ha oké iwe. Unu ndị bụ́ ụmụ, na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi n’ihe niile, n’ihi na nke a na-atọ Onyenwe anyị ụtọ. Unu ndị bụ́ nna, unu adịla na-akpasu ụmụ unu iwe, ka ha wee ghara ịda mbà n’obi.” (Kọl. 3:18-21) O doro anya na ime ihe a Pọl kwuru ka ga na-abara ndị di, nwunye ha, nakwa ụmụ ha, uru.

13. Olee ihe nwanna nwaanyị ga-eme ka di ya na-anaghị efe Jehova bata n’ọgbakọ?

13 Ọ bụrụ na ị bụ nwunye, ọ̀ na-adị gị ka di gị na-anaghị efe Jehova anaghị eleta gị anya nke ọma? I nwere ike iwe iwe, gị na ya arụwa ụka, ma nke a ò nwere ike ime ka ihe ka mma? Ọ bụrụgodị na ị gbalịa mee ka okwu bie n’ọnụ gị, ị̀ ga-eme ka ọ bata n’ọgbakọ? O nwere ike ọ gaghị eme. Ma,  ọ bụrụ na ị sọpụrụ di gị n’ihi na ọ bụ ya bụ onyeisi ezinụlọ, ị ga-eme ka udo dị n’ezinụlọ, meekwa ka i too Jehova. O nwedịrị ike ime ka di gị bata n’ọgbakọ, unu abụọ enwetakwa ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ.—Gụọ 1 Pita 3:1, 2.

14. Olee ihe di bụ́ Onye Kraịst ga-eme ma ọ bụrụ na nwunye ya na-anaghị efe Jehova anaghị akwanyere ya ùgwù?

14 Ọ bụrụkwanụ na ị bụ di, ọ̀ na-adị gị ka nwunye gị na-anaghị efe Jehova anaghị akwanyere gị ùgwù? Ọ bụrụ na ị na-abara ya mba iji gosi na ị bụ onyeisi, nke a ọ̀ ga-eme ka ọ kwanyewara gị ùgwù? Mbanụ. Chineke chọrọ ka ị bụrụ ezigbo di na-eṅomi Jizọs. (Efe. 5:23) Jizọs, bụ́ onyeisi ọgbakọ Ndị Kraịst hụrụ ha n’anya ma na-enwere ha ndidi. (Luk 9:46-48) Ọ bụrụ na di ana-eme ka Jizọs, ka oge na-aga, nwunye ya nwere ike ịbata n’ọgbakọ.

15. Olee otú di bụ́ Onye Kraịst ga-esi gosi na ọ hụrụ nwunye ya n’anya?

15 Baịbụl gwara ndị bụ́ di, sị: “Na-ahụnụ nwunye unu n’anya, unu ewesola ha oké iwe.” (Kọl. 3:19) Di hụrụ nwunye ya n’anya ga na-ege nwunye ya ntị ma na-eme ka obi sie ya ike na o ji ihe o kwuru kpọrọ ihe. (1 Pita 3:7) Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị mgbe niile ka ọ ga na-eme ihe nwunye ya gwara ya, ige nwunye ya ntị ga-eme ka o mee mkpebi dị mma. (Ilu 15:22) Di hụrụ nwunye ya n’anya anaghị agwa ya ka ọ sọpụrụ ya, kama, ọ na-eme ihe nwunye ya ga-eji na-asọpụrụ ya. Ọ bụrụ na di ana-ahụ nwunye ya na ụmụ ya n’anya, ha ga-eji obi ụtọ na-efe Jehova, ma nweta ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ.

Gịnị ka anyị ga-eme ka nsogbu ezinụlọ ghara ịnapụ anyị ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13 ruo na nke 15)

NDỊ NA-ETO ETO, UNU EKWELA KA IHE Ọ BỤLA MEE KA UNU GHARA INWETA IHE AHỤ A NA-AGBATA N’ỌSỌ

16, 17. Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto, olee otú ị ga-esi ghara ịna-ewere ndị mụrụ gị iwe?

16 Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto, ọ̀ na-adị gị ka ndị mụrụ gị anaghị aghọta gị ma ọ bụ na ha anaghị ekwe gị megharịa ahụ́? Nke a nwere ike na-ewe gị ezigbo iwe nke na o nwere ike mee ka ị na-eche ma ife Jehova ọ̀ bụ ihe kacha mma ime ná ndụ. Ma, ọ bụrụ na i jiri iwe hapụ Jehova, ị ga-emecha chọpụta na o nweghị onye ọ bụla n’ụwa a hụrụ gị n’anya karịa ndị mụrụ gị na-efe Jehova na ndị ọgbakọ unu.

17 Ọ bụrụ na ndị mụrụ gị anaghị agbazi gị, ọ̀ bụ na ị gaghị na-eche ma hà hụrụ gị n’anya? (Hib. 12:8) Ma, o nwere ike bụrụ otú ndị mụrụ gị si agbazi gị na-ewe gị iwe. Kama iwewa iwe n’otú ha si gbazie gị olu, gbalịa ka ị ghọta na o nwere ihe mere ha ji mee ya. N’ihi ya, wetuo obi, ma mee ihe niile i nwere ike ime ka ị ghara ịna-ewe iwe mgbe ha na-agbazi gị. Baịbụl kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-adịghị ekwu ọtụtụ okwu maara ihe, mmụọ nke onye nwere nghọta na-adị jụụ.” (Ilu 17:27) Gbalịa ka ị na-akpa àgwà ka nwa ṅụjuru mmiri ara afọ, nke na-ewetu obi anabata ndụmọdụ, onye na-amụta ihe na ya n’agbanyeghị otú e si nye ya. (Ilu 1:8) Cheta na inwe nne na nna hụrụ Jehova n’anya bara ezigbo uru. Ha chọrọ inyere gị aka ka i nweta ndụ ebighị ebi.

18. Gịnị mere i ji kpebisie ike ilekwasị anya n’ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ?

18 Ma ànyị na-atụ anya ịdị ndụ ebighị ebi n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa a, anyị niile kwesịrị ịna-atụsi anya ọdịnihu magburu onwe ya anyị nwere, ike. Ọ bụ olileanya e ji n’aka, nke Onye kere anyị kwere anyị ná nkwa. Chineke kwuru banyere Paradaịs ahụ a ga-enwe n’ụwa, sị, “Ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa.” (Aịza. 11:9) Ndị niile dị ndụ n’oge ahụ ga-abụ ndị Chineke ziri ihe. Ihe a bụ ihe anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ka anyị nweta. N’ihi ya, kwee ka obi gị niile dịrị ná nkwa Jehova kwere anyị. Ekwekwala ka ihe ọ bụla megharịa gị anya ka ị ghara inweta ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ.