Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Nọvemba 2017

Echela Echiche Ka Ndị Ụwa

Echela Echiche Ka Ndị Ụwa

“Nọrọnụ na nche: ma eleghị anya, a pụrụ inwe onye ga-eburu unu dị ka anụ oriri ya site na nkà ihe ọmụma na aghụghọ efu . . . nke ụwa.”—KỌL. 2:8.

ABỤ: 38, 31

1. Olee ihe Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst nọ na Kọlọsi? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

PỌL ONYEOZI degaara Ndị Kraịst nọ na Kọlọsi akwụkwọ ozi mgbe a tụrụ ya mkpọrọ na Rom n’ihe dị ka afọ 60 ruo afọ 61. Ọ gwara ha ihe mere ha ji kwesị inwe “nghọta ime mmụọ,” ya bụ, ile ihe anya otú Jehova si ele ihe anya. (Kọl. 1:9) Ọ gwakwara ha, sị: “Ana m ekwu nke a ka onye ọ bụla ghara iji arụmụka ire ụtọ duhie unu. Nọrọnụ na nche: ma eleghị anya, a pụrụ inwe onye ga-eburu unu dị ka anụ oriri ya site na nkà ihe ọmụma na aghụghọ efu, dị ka ọdịnala mmadụ si dị, dị ka ihe ndị mbụ nke ụwa si dị, ọ bụghị dị ka Kraịst si dị.” (Kọl. 2:4, 8) Pọl gwaziri ha ihe mere na ụfọdụ ihe ndị mmadụ na-eche abụghị eziokwu, nakwa ihe mere o ji dị ọtụtụ ndị mma. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ime ka mmadụ na-eche na ọ ma ihe karịa ndị ọzọ, nakwa na ọ ka ndị ọzọ. Ihe mere Pọl ji degara ha akwụkwọ ozi ahụ bụ iji nyere ụmụnna aka ka ha ghara ịna-eche echiche ka ndị ụwa, nakwa ịgbara omume ọjọọ ọsọ.—Kọl. 2:16, 17, 23.

2. Gịnị mere anyị ga-eji leba anya n’ihe ndị gosiri otú ndị ụwa si eche echiche?

2 Ndị na-eche echiche ka ndị ụwa anaghị eji ihe Jehova kwuru kpọrọ ihe. Ọ bụrụ na anyị akpachaghị anya, o nwere ike ịkpa okwukwe anyị aka ọjọọ. Taa, anyị na-ahụ otú ndị ụwa si eche echiche. Anyị na-ahụ ya na tiivi, n’Ịntanet, n’ebe anyị na-arụ ọrụ, ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe  anyị ga-eme ka anyị ghara ịna-eche echiche ka ndị ụwa. Anyị ga-atụle ihe ise gosiri otú ndị ụwa si eche echiche na otú anyị ga-esi gbaara ha ọsọ.

ÀNYỊ KWESỊRỊ IKWERE NA CHINEKE?

3. Olee ihe ndị mmadụ na-ekwu nke na-amasị ọtụtụ ndị? N’ihi gịnị?

3 “Enwere m ike ịbụ ezigbo mmadụ ọ bụrụgodị na ekweghị m na Chineke.” N’ọtụtụ obodo, ọtụtụ ndị na-ekwu na ha ekweghị na Chineke. Ha na-ele onwe ha anya na o nweghị ihe gbasara ha na chọọchị. O nwere ike ịbụ na ha anaghị eche echiche ma Chineke ọ̀ dị. O nwekwara ike ịbụ na ha na-eche na ha nweere onwe ha ime ihe ọ bụla masịrị ha. (Gụọ Abụ Ọma 10:4.) E nwekwara ndị nwere ike ịna-eche na ndị ọzọ ga-ewere ha ka ndị ma ihe ma ha kwuo, sị: “Enwere m ike inwe àgwà ọma ọ bụrụgodị na ekweghị m na Chineke.”

4. Olee ihe anyị ga-agwa onye na-ekwu na o nweghị Onye kere ihe niile?

4 Ọ̀ dị mma ikwere na e nweghị Onye kere ihe niile? Mmadụ nwere ike ịnọ ná mgbagwoju anya ma ọ chọọ isi n’aka ndị sayensị mata ma è nwere Onye kere ihe niile n’ihi ọtụtụ ihe ndị sayensị na-akụzi. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na azịza ya dị mfe. Ọ bụrụ na ụlọ nwere onye rụrụ ya, ihe ndị dị ndụ karịrị ụlọ, nwekwara onye kere ha. O doro anya na mkpụrụ ndụ dị mgbagwoju anya karịa ụlọ ọ bụla n’ihi na ha nwere ike ime ihe ụlọ na-enweghị ike ime, ya bụ, ha nwere ike imepụta mkpụrụ ndụ ndị ọhụrụ. Nke a pụtara na mkpụrụ ndụ nwere ike ichekwa ozi ma bufeere ya mkpụrụ ndụ ndị ọhụrụ ka ha nwee ike mepụta ndị nke ọhụrụ. Ònye kere mkpụrụ ndụ ndị a? Baịbụl zara ajụjụ a. Ọ sịrị: “Ụlọ ọ bụla nwere onye rụrụ ya, ma onye rụrụ ihe niile bụ Chineke.”—Hib. 3:4.

5. Gịnị ka anyị ga-agwa onye na-ekwu na mmadụ nwere ike mara ihe dị mma ọ bụrụgodị na o kweghị na Chineke?

5 Gịnị ka anyị ga-agwa onye na-ekwu na mmadụ nwere ike mara ihe dị mma n’agbanyeghị na o kweghị na Chineke? Okwu Chineke kwuru na ndị na-ekweghị na Chineke nwere ike inwe ụfọdụ àgwà ọma. (Rom 2:14, 15) Dị ka ihe atụ, ha nwere ike na-asọpụrụ ndị mụrụ ha ma hụ ha n’anya. Ma ọ bụrụ na ha anaghị eme ihe Jehova kwuru, ha nwere ike ime mkpebi na-adịghị mma. (Aịza. 33:22) Ọtụtụ ndị ma ihe n’ụwa taa kwetara na ọ bụ Chineke ga-enyere anyị aka wepụ nsogbu ndị na-echi anyị ọnụ n’ala n’ụwa a. (Gụọ Jeremaya 10:23.) N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịna-eche na mmadụ nwere ike ịma ihe dị mma ọ bụrụgodị na o kweghị na Chineke, ma ghara ime ihe o kwuru.—Ọma 146:3.

ÀNYỊ KWESỊRỊ INWE CHỌỌCHỊ ANYỊ NA-AGA?

6. Olee ihe ọtụtụ ndị na-eche gbasara chọọchị?

6 “Ọ bụrụgodị na o nweghị chọọchị ị na-aga, ị ka ga na-enwe obi ụtọ.” Ihe a ndị mmadụ na-ekwu na-amasị ọtụtụ ndị n’ihi na ha weere chọọchị ka ihe na-abaghị uru na ihe na-agwụ ike. Ọtụtụ chọọchị na-akụziri ndị mmadụ gbasara ọkụ ala mmụọ, na-ana otu ụzọ na ụzọ iri, ma ọ bụ na-akwado ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Nke a emeela ka ndị mmadụ gharazie ịna-aga chọọchị. Ka a sịkwa ihe mere ọtụtụ ndị ji na-eche na ha ka ga na-enwe obi ụtọ ọ bụrụgodị na o nweghị chọọchị ha na-aga. Ndị na-ekwu otú ahụ nwere ike sị, “Ihe gbasara Chineke na-amasị m, ma o nweghị chọọchị m chọrọ ị na-aga.”

7. Olee otú ofufe Chineke ga-esi na-eme ka mmadụ na-enwe obi ụtọ?

7 Ọ̀ bụ eziokwu na mmadụ ka ga na-enwe obi ụtọ ọ bụrụgodị na o nweghị chọọchị ọ na-aga? O doro anya na mmadụ nwere ike na-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na ọ nọghị n’okpukpe ụgha. Ma, mmadụ agaghị enwe ezigbo obi ụtọ ma ya na Jehova adịghị ná mma n’ihi na ọ bụ “onye obi ụtọ.” (1 Tim. 1:11) Ihe niile Chineke na-eme na-abara ndị ọzọ uru. Ndị ohu ya na-enwekwa obi ụtọ n’ihi na ha na-elekwasị anya n’inyere ndị  ọzọ aka. (Ọrụ 20:35) Dị ka ihe atụ, chegodị otú ofufe Chineke si na-eme ka ezinụlọ na-enwe obi ụtọ. A na-akụziri anyị ka anyị na-asọpụrụ di anyị ma ọ bụ nwunye anyị, ka anyị were nkwa anyị kwere di ma ọ bụ nwunye anyị mgbe anyị na-agba akwụkwọ ka ihe dị nsọ, ka anyị gbaara ịkwa iko ọsọ, ka anyị zụọ ụmụ anyị nke ọma, na ka anyị na-ahụ ndị ezinụlọ anyị n’anya. N’ihi ya, ofufe Chineke na-eme ka ndị Jehova n’ụwa niile dịrị n’otu, ma hụ ibe ha n’anya n’ọgbakọ.—Gụọ Aịzaya 65:13, 14.

8. Olee otú Matiu 5:3 ga-esi nyere anyị aka ịghọta ihe na-eme ka ndị mmadụ na-enwe obi ụtọ?

8 Olee otú anyị nwere ike isi kọwaa ihe ndị ụwa na-ekwu, ya bụ, na mmadụ nwere ike ịna-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị na ọ naghị efe Chineke? Chegodị ajụjụ a, Gịnị na-eme ka ndị mmadụ na-enwe obi ụtọ? Ihe na-eme ka ụfọdụ ndị na-enwe obi ụtọ bụ ọrụ ha, egwuregwu, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ na-amasị ha. Ndị ọzọ na-enwe obi ụtọ ma ha na-elekọta ezinụlọ ha ma ọ bụ ndị enyi ha. Ihe ndị a niile na-eme ka mmadụ na-enwe obi ụtọ, ma o nwere ihe na-eme ka mmadụ na-enwe obi ụtọ karịa ihe ndị a. Anyị dị iche n’ụmụ anụmanụ, n’ihi ya, anyị nwere ike ịmata Onye kere anyị ma na-efe ya. Jehova kere anyị ka anyị na-enwe obi ụtọ ma anyị na-eme ihe ndị a. (Gụọ Matiu 5:3.) Dị ka ihe atụ, a na-agba ndị na-efe Chineke ume, obi ana-atọkwa ha ụtọ ma ha na ụmụnna ha zukọta ife Jehova. (Ọma 133:1) Obi na-atọkwa ha ụtọ na ha na ụmụnna ha dị n’otu n’ụwa niile, na-ebi ndụ dị ọcha, nweekwa olileanya magburu ya n’ọdịnihu.

È KWESỊRỊ INYE ANYỊ IWU KA ANYỊ GBAARA ỊKWA IKO ỌSỌ?

9. (a) Olee ihe ndị mmadụ na-ekwukarị banyere mmekọahụ? (b) Gịnị mere Okwu Chineke ji kwuo na ọ dị njọ mmadụ na onye na-abụghị di ya ma ọ bụ nwunye ya inwe mmekọahụ?

9 “Ò nwere ihe dị njọ mmadụ na onye na-abụghị di ya ma ọ bụ nwunye ya inwe mmekọahụ?” Ndị mmadụ nwere ike ịna-agwa anyị, sị: “Anyị kwesịrị ịna-ekpori ndụ. Gịnị mere na mmadụ na onye na-abụghị di ya ma ọ bụ nwunye ya inwe mmekọahụ ji dị njọ?” Ọ dịghị mma mmadụ ikwu na Onye Kraịst kwesịrị ịkwa iko. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Okwu Chineke kwuru na ịkwa iko adịghị mma. * (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 4:3-8.) Jehova kwesịrị inye anyị iwu n’ihi na ọ bụ ya kere anyị. Iwu Chineke kwuru na ọ bụ naanị ndị lụrụ di na nwunye kwesịrị inwe mmekọahụ. Chineke na-enye anyị iwu n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. Ha na-abara anyị uru. Ezinụlọ ndị na-edebe iwu ndị ahụ na-ahụ ibe ha n’anya, na-asọpụrụ ibe ha, obi eruokwa ha ala. Chineke ga-ata ndị kpachaara anya na-enupụrụ ya isi, ahụhụ.—Hib. 13:4.

10. Olee otú Onye Kraịst ga-esi gbaara ịkwa iko ọsọ?

10 Baịbụl gwara anyị otú anyị ga-esi gbaara ịkwa iko ọsọ. Otu ụzọ dị mkpa anyị ga-esi eme ya bụ ịkpachara anya n’ihe ndị anyị na-ele. Jizọs kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-ele nwaanyị anya, o wee gụọ ya agụụ ka ya na ya nwee mmekọahụ, ọ kwasowo ya iko n’obi ya. Ọ bụrụkwa na anya aka nri gị na-eme ka ị sụọ ngọngọ, ghụpụ ya tụfuo.” (Mat. 5:28, 29) N’ihi ya, Onye Kraịst ekwesịghị ịna-ele ndị gba ọtọ ma ọ bụ na-ege egwú ndị na-ekwu gbasara omume rụrụ arụ. Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst ibe ya akwụkwọ ozi, si: “Meenụ ka akụkụ ahụ́ unu ndị dị n’elu ụwa nwụọ n’ihe banyere ịkwa iko.” (Kọl. 3:5) Ihe ọzọ bụ na anyị kwesịrị ịkpachara anya n’ihe anyị na-eche n’echiche nakwa n’ihe anyị na-ekwu. —Efe. 5:3-5.

 ÀNYỊ KWESỊRỊ IJI OGE ANYỊ NA IKE ANYỊ NIILE NA-ARỤ ỌRỤ EGO?

11. Gịnị nwere ike ime ka anyị nwewe mmasị iji oge anyị na ike anyị niile na-arụ ọrụ ego?

11 “Ịrụ ọrụ ego ga-eme ka ị na-enwe obi ụtọ.” Ọtụtụ ndị na-agwa anyị ka anyị jiri oge anyị na ike anyị niile na-arụ ọrụ ego, nke ka nke, ma ọ bụrụ na ọ ga-eme ka anyị bụrụ ndị a ma ama, ndị ọnụ na-eru n’okwu, ma ọ bụ ndị ọgaranya. Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị na-eche na ịrụ ọrụ ego ga-eme ka mmadụ na-enwe obi ụtọ, anyị nwekwara ike chewe otú ahụ.

12. Ịrụ ọrụ ga-eme ka mmadụ bụrụ onye ọnụ na-eru n’okwu, ọ̀ na-eme ka mmadụ na-enwe obi ụtọ?

12 Ọ̀ bụ eziokwu na mmadụ ịrụ ọrụ ga-eme ka ọ bụrụ onye ọnụ na-eru n’okwu ma ọ bụ onye a ma ama ga-eme ka ọ na-enwe obi ụtọ? Mba. Chebara ihe a echiche. Setan chọrọ ka ọ bụrụ onye a ma ama na onye ọnụ na-eru n’okwu. E nwere ike kwuo na o nwetara ihe ọ chọrọ. Ma obi anaghị atọ ya ụtọ, ọ na-ewekwa ezigbo iwe. (Mat. 4:8, 9; Mkpu. 12:12) Ma, anyị adịghị ka Setan. Chegodị ụdị obi ụtọ anyị na-enwe ma anyị na-enyere ndị mmadụ aka ịmụta banyere Chineke na nkwa ndị magburu onwe ya o kwere anyị. O nweghị ọrụ e nwere n’ụwa a ga-enye anyị ụdị obi ụtọ a. Ihe ọzọkwa bụ na ka ndị mmadụ nwee ike inweta ọrụ, ha na-ewe iwe ọkụ, na-enwere ibe ha anyaụfụ, ha na ibe ha ana-amarịtakwa aka. E mechaa, ndụ ha atọgbọrọ chakoo. Baịbụl sịrị na ha ‘na-achụso ifufe.’—Ekli. 4:4.

13. (a) Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ọrụ anyị anya? (b) N’akwụkwọ ozi Pọl degaara Ndị Tesalonaịka, olee ihe mere ka o nwee ezigbo obi ụtọ?

13 Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị kwesịrị ịrụ ọrụ anyị ga-eji na-akpa afọ anyị. Ọ dịghị njọ ịrụ ọrụ ga-eme ka obi na-atọ anyị ụtọ. Ma, ọrụ anyị ekwesịghị ịbụ ihe kacha anyị mkpa ná ndụ. Jizọs sịrị: “Ọ dịghị onye pụrụ ịbụ ohu nke nna ukwu abụọ; n’ihi na, ma ọ́ bụghị na ọ ga-akpọ otu asị ma hụ onye nke ọzọ n’anya, ya abụrụ na ọ ga-arapara n’otu ma leda onye nke ọzọ anya. Unu apụghị ịbụ ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.” (Mat. 6:24) Ọ bụrụ na anyị ewere ife Jehova na ịkụziri ndị ọzọ Okwu ya ka ihe kacha mkpa ná ndụ anyị, anyị ga na-enwe ezigbo obi ụtọ. Pọl onyeozi nwekwara ụdị obi ụtọ a. Mgbe ọ na-eto eto, o tinyere isi n’ịbụ onye a ma ama n’okpukpe ndị Juu. Ma, o nwere ezigbo obi ụtọ mgbe ọ ghọrọ onye na-eso ụzọ Jizọs ma hụ otú ndị o ziri ozi ọma si na-eme ihe Chineke kwuru, nakwa otú o si nyere ha aka ịgbanwe ndụ ha. (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 2:13, 19, 20.) O nweghị ọrụ ọzọ nwere ike inye mmadụ ụdị obi ụtọ a.

Ị ga na-enwe obi ụtọ ma ị na-enyere ndị mmadụ aka ịmụta banyere Chineke (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12 na nke 13)

 ÀNYỊ GA-AKWỤSỊLI NSOGBU ỤMỤ MMADỤ?

14. Gịnị nwere ike ime ka ndị mmadụ nwewe mmasị n’ihe a ndị mmadụ na-ekwu na mmadụ ga-akwụsị nsogbu ya?

14 “Ụmụ mmadụ ga-akwụsị nsogbu ha.” Ihe a ndị mmadụ na-ekwu nwere ike na-amasị ọtụtụ ndị. Maka gịnị? Ọ bụrụ na ọ bụ eziokwu, ọ pụtara na anyị achọghị ka Chineke na-eduzi anyị, nakwa na mmadụ nwere ike ime ihe ọ bụla dị ya mma. Ihe ọzọ bụ na ndị mmadụ nwere ike ikwe n’ihe a ha na-ekwu, n’ihi na nchọpụta e mere gosiri na agha, ime mpụ, ọrịa, na ịda ogbenye na-ebelata. Otu akụkọ kwuru, sị: “Ihe mere ihe ji na-adịrị ndị mmadụ mma bụ na ụmụ mmadụ ekpebiela ime ka ụwa kakwuo mma.” Ụmụ mmadụ hà emechaala chọpụta otú ha ga-esi kwụsị nsogbu ndị e nwere n’ụwa? Iji zaa ajụjụ a, ka anyị leba anya ná nsogbu ndị ahụ.

15. Olee ihe ndị mere anyị ji kwuo na nsogbu ụwa karịrị akarị?

15 Agha: Agha ụwa nke mbụ na nke abụọ tara isi ihe ruru iri nde mmadụ isii ma ọ bụ karịa. Kemgbe a lụchara Agha Ụwa nke Abụọ, o doro anya na ụmụ mmadụ akwụsịbeghị agha. Si mgbe ahụ ruo n’afọ 2015, ndị gbara ọsọ ndụ n’ihi agha ma ọ bụ mmekpọ ọnụ eruola ihe dị ka iri nde mmadụ isii na ise. N’afọ 2015 naanị, ihe dị ka nde mmadụ iri na abụọ na narị puku anọ gbara ọsọ ndụ. Mpụ: Ọ bụ eziokwu na mpụ ndị mmadụ na-eme n’ebe ụfọdụ ebelatala. Ma, mpụ ndị ọzọ ndị mmadụ na-eme na-arị ibe ya elu. Ha bụ iji Ịntanet egwu wayo, mmadụ iti nwunye ya ma ọ bụ di ya ihe, na tigbuo zọgbuo. Ihe ọzọ bụ na ọtụtụ ndị kweere na nrụrụaka a na-arụrụ n’ụwa niile na-aka njọ. Ụmụ mmadụ enwebeghị ike ịkwụsị ime mpụ. Ọrịa: Ndị mmadụ emepụtala ọgwụ e ji agwọ ụfọdụ ọrịa. Ma, akụkọ e nwetara n’afọ 2013 kwuru na kwa afọ, nde mmadụ itoolu na-erubeghị afọ iri isii na-anwụ n’ihi ọrịa obi, strok, ọrịa kansa, ọrịa na-eme ka mmadụ ghara iku ume nke ọma, na ọrịa shuga. Ịda ogbenye: Akụkọ e si n’Ụlọ Akụ Ụwa nweta kwuru na ndị dara ogbenye ọnụ ntụ n’Afrịka naanị dị narị nde mmadụ abụọ na iri asatọ n’afọ 1990, ma n’afọ 2012, ha dịzi narị nde mmadụ atọ na iri atọ.

16. (a) Gịnị mere o ji bụrụ naanị Alaeze Chineke ga-akwụsị nsogbu ndị mmadụ? (b) Olee ihe Aịzaya na Abụ Ọma kwuru Alaeze Chineke ga-emere anyị?

16 Taa, ndị nọ n’isi ọchịchị na ndị akụnụba ụwa a dị n’aka bụcha ndị anyaukwu. O doro anya na ha enweghị ike ịkwụsịli agha, mpụ, ọrịa, na ịda ogbenye. Ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-akwụsịli ha. Chegodị ihe Jehova ga-emere ụmụ mmadụ. Agha: Alaeze Chineke ga-ewepụ ihe niile na-akpata agha. Ha bụ anyaukwu, nrụrụaka, ịhụ mba n’anya, okpukpe ụgha, nakwa Setan n’onwe ya. (Ọma 46:8, 9) Mpụ: Alaeze Chineke na-akụziri ọtụtụ nde mmadụ ka ha hụ ibe ha n’anya, nakwa ka ha tụkwasị ibe ha obi. O nweghị ọchịchị ga-emeli ya. (Aịza. 11:9) Ọrịa: Jehova ga-eme ka ndị ya kwụsị ịna-arịa ọrịa. (Aịza. 35:5, 6) Ịda ogbenye: Jehova ga-ewepụ ịda ogbenye. Ọ ga-emekwa ka ndị ya na-enwe obi ụtọ, ha na ya adịrịkwa ná mma. Nke a bara uru karịa mmadụ ịba ọgaranya.—Ọma 72:12, 13.

“MARA OTÚ UNU KWESỊRỊ ISI AZAGHACHI”

17. Olee otú ị ga-esi ghara ịna-eche echiche ka ndị ụwa?

17 Ọ bụrụ na ị nụ ihe ndị mmadụ na-ekwu nke nwere ike ịkpa okwukwe gị aka ọjọọ, mee nchọnchọ n’Okwu Chineke ka ị chọpụta ihe o kwuru banyere ihe ahụ, gị na nwanna ma nke a na-akọ kwurịtakwa ya. Chọpụta ihe mere ndị mmadụ ji na-enwe mmasị na ya, na ihe mere ihe ahụ ji ghara ịbụ eziokwu, nakwa ihe i nwere ike ikwu ma mmadụ gwa gị ya. N’eziokwu, anyị niile nwere ike ịgbalị ka anyị ghara ịna-eche echiche ka ndị ụwa. Ihe ga-enyere anyị aka ime ya bụ ime ihe a Pọl gwara ọgbakọ dị na Kọlọsi. Ọ sịrị: “Na-ejenụ ije n’amamihe n’ebe ndị nọ n’èzí nọ . . . mara otú unu kwesịrị isi azaghachi.”—Kọl. 4:5, 6.

^ para. 9 Ọtụtụ ndị amaghị na Jọn 7:53–8:11 dị ná nsụgharị Baịbụl ụfọdụ adịghị na Baịbụl mbụ e dere n’oge ochie. N’ihi ihe amaokwu Baịbụl ndị ahụ kwuru, ụfọdụ na-asị na ọ bụ naanị onye na-enweghị mmehie nwere ike ịgwa onye kwara iko na o mere ihe ọjọọ. Ma, iwu Chineke nyere ndị Izrel kwuru, sị: “Ọ bụrụ na a hụ ka nwoke na nwunye onye ọzọ dina, ha abụọ ga-anwụkọ ọnụ.”—Diut. 22:22.