Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Nọvemba 2016

 IHE SÍ N’EBE ANYỊ NA-EDEBE IHE OCHIE

“Ndị Nkwusa Alaeze Nọ́ na Briten—Tetanụ n’Ụra!!”

“Ndị Nkwusa Alaeze Nọ́ na Briten—Tetanụ n’Ụra!!”

A GWARA ụmụnna hoo haa, sị: “Ndị Nkwusa Alaeze Nọ́ na Briten—Tetanụ n’Ụra!!” (Informant, * December 1937, nke e biri maka ndị bi na Lọndọn) Otu isiokwu nta dị́ na ya kwuru, sị: “O Nweghị Ezigbo Ihe A Rụpụtarala Kemgbe Afọ Iri.” Akụkọ ozi e biri n’ihu akwụkwọ ahụ gosiri na o nweghị ezigbo ihe a rụpụtara malite n’afọ 1928 ruo 1937.

NDỊ ỌSỤ ỤZỌ HÀ KARỊRỊ AKARỊ?

Gịnị mere ozi ọma ji nyụwa ọkụ na Briten? O doro anya na ọgbakọ ndị dị n’ebe ahụ na-agba ọnyụpa n’ozi ọma n’oge ahụ. Ka ọtụtụ afọ na-aga, ha ka nọkwa ebe ha nọ. Ihe ọzọ bụ na alaka ụlọ ọrụ kpebiri na ókèala ha ga-ezuru naanị narị ndị ọsụ ụzọ abụọ, bụ́ ndị na-eje ozi n’ebe ndị dịpụrụ adịpụ, kama ịna-eje ozi n’ọgbakọ ndị e nwere. N’ihi ya, alaka ụlọ ọrụ gwara ndị chọrọ ịbụ ndị ọsụ ụzọ na e nweghịzi ebe ha ga na-eje ozi na Briten. Ha gwaziri ha ka ha gaa jewe ozi ná mba ndị ọzọ dị na Yurop. Ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ hapụrụ Briten gaa Frans na mba ndị̇ ọzọ n’agbanyeghị na ha amachaghị asụsụ ndị ebe ahụ.

‘A GWARA HA KA HA MEE IHE OZUGBO’

Isiokwu ahụ e biri n’afọ 1937 gwara ụmụnna ka ha gbasie mbọ ike rụta otu nde awa n’afọ 1938. Ha ga-emeli ya ma onye nkwusa ọ bụla rụta awa iri na ise n’ọnwa, ndị ọsụ ụzọ arụta otu narị awa na iri. Ụfọdụ aro a tụụrụ ha bụ ka ha wepụta ụbọchị ndị ha ga-eji na-aga ozi ọma n’izu, ma rụta awa ise n’ụbọchị nke ọ bụla. Ha ga-elekwasị anya n’ịga nletaghachi, nke ka nke, ná mgbede ndị na-abụghị ngwụcha izu.

Ndị ọsụ ụzọ na-anụ ọkụ n’obi ji ozi ọma kpọrọ ihe

Obi tọrọ ọtụtụ ụmụnna ụtọ maka otú ahụ e si kwusie okwu ozi ọma ike. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Hilda Padgett sịrị: “Isi ụlọ ọrụ anyị gwara anyị mee ihe ozugbo. Ọtụtụ n’ime anyị nọ na-atụsi anya ya ike. Ọ rụpụtakwara ezigbo ihe n’oge na-adịghị anya.” * Nwanna nwaanyị ọzọ aha ya bụ E. F. Wallis kwuru, sị: “Aro ahụ a tụụrụ anyị ịrụta awa ise n’ụbọchị magburu onwe ya. Ò nwere ihe ga-eme anyị obi ụtọ karịa iji ụbọchị ndị ahụ jeere Onyenwe anyị ozi? . . . O nwere ike ịbụ na ike na-agwụcha anyị ma anyị lawa, ma obi na-abụ anyị sọ aṅụrị.” Nwa okorobịa aha ya bụ Stephen Miller ghọtara na ozi ọma dị ezigbo mkpa, ya aza òkù ahụ a kpọrọ. Ọ chọrọ ime otú ahụ tupu oge agaa. O chetara otú ọtụtụ ụmụnna si agba ígwè ha aga ozi ọma n’ụbọchị ndị ahụ. O ruo ná mgbede, ha na-akpọnyere ndị mmadụ okwu ndị e tinyere na teepụ. Ha gbasiri mbọ ike n’iji obodobo akwụkwọ e dere ihe na ya na-ezi ozi ọma, jirikwa magazin na-ezi ozi ọma n’okporo ámá.

Isiokwu ahụ e biri n’afọ 1937 kwukwara, sị: “Anyị chọrọ otu puku ndị ọsụ ụzọ.” Ntụziaka ọhụrụ e nyere gbasara ókèala pụtara na ndị ọsụ ụzọ agaghịzi na-eje ozi n’ebe dịpụrụ adịpụ, kama ha ga-eso ọgbakọ na-eje ozi, na-akwado ha,  na-agbakwa ha ume. Nwanna Nwaanyị Joyce Ellis kwuru, sị: “Ọtụtụ ụmụnna malitere ịghọta na ha kwesịrị ịsụ ụzọ. Ọ bụ eziokwu na adị m afọ iri na atọ n’oge ahụ, ọ bụ ihe m chọrọ ime. M chọrọ ịbụ ọsụ ụzọ.” Ọ ghọrọ ọsụ ụzọ n’ọnwa Julaị afọ 1940, mgbe ọ dị afọ iri na ise. Nwanna Peter, bụ́ onye mechara lụọ Joyce, nụrụ ihe ahụ a gwara ụmụnna nọ́ na Briten, “ya echewe gbasara ịsụ ụzọ.” N’ọnwa Jun afọ 1940, mgbe ọ dị afọ iri na asaa, ọ gbara ígwè ihe dị ka otu narị kilomita na ise gaa Skabọro ma malite ịsụ ụzọ n’ebe ahụ.

Nwanna Cyril Johnson na nwunye ya Kitty bụ ndị ọsụ ụzọ ọhụrụ e ji ama atụ. Ha kpebiri ire ụlọ ha na ngwongwo ha ka ha nweta ego ha ga-eji na-egbo mkpa ha n’ozi oge niile. Cyril gbara arụkwaghịm n’ọrụ ya. N’ime otu ọnwa, ha adịla njikere ịmalite ịsụ ụzọ. Ọ sịrị: “Obi siri anyị ezigbo ike. Anyị ji obi anyị niile mee ya. Obi dịkwa anyị ụtọ.”

E NWETARA EBE NDỊ ỌSỤ ỤZỌ GA-EBI

Ka ndị ọsụ ụzọ na-ebukwu ibu, ụmụnna ndị na-elekọta ọgbakọ chewere otú ha ga-esi na-akwado ha. Nwanna Jim Carr, bụ́ ohu zoonụ n’afọ 1938, nke a na-akpọzi onye nlekọta sekit, nabatara aro a tụrụ inweta ebe ndị ọsụ ụzọ ga-ebi n’obodo ndị mepere emepe. A gbara ndị ọsụ ụzọ ume ka ha na-ebikọta ọnụ, na-agakọkwa ozi ọma ka ego ha na-emefu belata. N’obodo Shefild, ha chọtara otu nnukwu ụlọ ha ga na-akwụ ụgwọ ya, nwanna ma nke a na-akọ n’ọgbakọ ana-elekọta ya. Ọ bụ ọgbakọ dị́ n’ebe ahụ wetara ego na oche a chọrọ. Nwanna Jim sịrị: “Onye ọ bụla gbara mbọ ka ihe niile gaa nke ọma.” Ndị bi n’ebe ahụ bụ ndị ọsụ ụzọ iri na-arụsi ọrụ ike. Ha ejighị ihe gbasara ofufe Chineke gwuo egwu. “Ha na-atụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị ma ha riwe nri ụtụtụ kwa ụbọchị.” “N’ụbọchị ọ bụla, ndị ọsụ ụzọ na-aga ebe e kenyere ha ikwusa ozi ọma n’ebe dị iche iche n’obodo ahụ.”

Ndị ọsụ ụzọ ọhụrụ mechara ju ebe niile na Briten

Ma ndị nkwusa ma ndị ọsụ ụzọ zara òkù ahụ. Ha rụtara otu nde awa ahụ e bu n’obi n’afọ 1938. N’eziokwu, akụkọ ozi ụmụnna nyere gosiri na awa na ihe ndị ọzọ karịrị ihe ha na-enyebu. N’ime afọ ise, ọ fọrọ obere ka ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa rịa elu okpukpu atọ. Otú e si kwusiwe okwu ozi ọma ike mere ka ndị Jehova nwee ike idi nsogbu ndị bịaara ha n’agha e mechara lụọ.

Taa, ndị ọsụ ụzọ ebuwela ibu ọzọ na Briten ka agha Amagedọn na-eru nso. Ọnụ ọgụgụ ndị ọsụ ụzọ na-arị elu kemgbe afọ iri. N’ọnwa Ọktoba afọ 2015, ha dị puku iri na atọ, narị abụọ na iri abụọ na anọ. Ndị ọsụ ụzọ ndị a anaghị echefu na ije ozi oge niile so n’ihe kacha mma ha ga-eji ndụ ha mee.

^ para. 3 E mechara kpọwa ya Ozi Alaeze Anyị.

^ para. 8 Akụkọ ndụ Nwanna Nwaanyị Padgett gbara n’Ụlọ Nche October 1, 1995, peeji nke 19 ruo 24.